Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 7/1 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ị̀ Ga-esi Aṅaa Guzo n’Ihu Oche Ikpe Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 7/1 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ihe ọmụmụ anyị banyere ihe atụ Jisọs nke atụrụ na ụmụ ewu kpaliri mmasị anyị. N’ihi nghọta ọhụrụ e nyere ‘n’Ụlọ Nche’ nke October 15, 1995, ànyị ka pụrụ ikwu na Ndịàmà Jehova taa na-ekere òkè n’ọrụ nkewa?

Ee. N’ụzọ a pụrụ ịghọta, ọtụtụ echewo banyere nke a n’ihi na Matiu 25:31, 32 na-asị: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: Ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu.” Ụlọ Nche nke October 15, 1995, gosiri ihe mere amaokwu ndị a ga-eji emezu mgbe mkpagbu ukwu ahụ malitesịrị. Jisọs ga-abịa n’ebube ya ya na ndị mmụọ ozi ya, ọ ga-anọkwasịkwa n’ocheeze nke ikpe ya. Mgbe ahụ, ọ ga-ekewa ndị mmadụ. N’echiche dị aṅaa? Ọ ga-ekpebi ikpe dabere n’ihe ndị mmadụ mere ma ọ bụ na-emeghị tupu oge ahụ.

Anyị pụrụ iji nke a tụnyere usoro iwu a na-agbaso n’ịkwadebe maka okwu ikpe. Ihe akaebe na-adị ọtụtụ n’ime ogologo oge tupu ụlọikpe ekpebie ikpe ma kwupụta mkpebi ikpe. Ihe akaebe ma ndị mmadụ dị ndụ ugbu a hà ga-abụ atụrụ ma ọ bụ ewu anọwo na-amụba eri ogologo oge. Ọ ka na-amụbakwa. Ma mgbe Jisọs nọdụrụ n’ocheeze ya, okwu ikpe ahụ ga-ezu ezu. Ọ ga-adị njikere ikpebi ikpe. A ga-ekewa ndị mmadụ gaa ná mbibi ebighị ebi ma ọ bụ ná ndụ ebighị ebi.

Otú ọ dị, eziokwu ahụ bụ na nkewa nke ndị mmadụ gaa ná ndụ ma ọ bụ ọnwụ e hotara na Matiu 25:32 ka dị n’ihu apụtaghị na ọ dịghị nkewa na-ewere ọnọdụ tupu mgbe ahụ. Bible, na Matiu isi nke 13, kwuru banyere otu ọrụ nkewa nke na-ewere ọnọdụ tupu mgbe ahụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, akwụkwọ bụ́ Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ, peji nke 180, tụlere nke a n’okpuru isiokwu bụ́ “Ikewasị Mmadụ”.a Akwụkwọ ahụ na-asị: “Ọ dịkwa ihe omume ndị ọzọ dị mkpa nke Jisọs jikọtara n’ụzọ pụtara ìhè ha na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Otu n’ime ihe ndị a bụ nkewapụta nke ‘ụmụ alaeze’ site ‘n’ụmụ ajọ onye ahụ.’ Jisọs kwuru nke a n’ime ilu ya banyere ubi ọka nke onye iro kụnyere ata n’ime ya.”

Akwụkwọ a na-ezo aka n’ihe atụ Jisọs e setịpụrụ na Matiu 13:24-30 ma kọwaa n’amaokwu nke 36-43. Rịba ama n’amaokwu nke 38 na ezi mkpụrụ ọka ahụ na-anọchite anya ụmụ Alaeze ahụ, ma ata ahụ na-anọchite anya ụmụ ajọ onye ahụ. Amaokwu nke 39 na 40 na-egosi na ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a’—n’oge anyị bi n’ime ya ugbu a—a na-achịkọta ata ahụ. A na-ekewapụ ya ma kpọọ ha ọkụ, bibie ha n’ikpeazụ.

Ihe atụ ahụ na-ekwu banyere ndị Kraịst e tere mmanụ (ndị a kpọrọ ụmụnna Jisọs n’ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ). Ma, isi ihe ahụ doro anya na nkewa dị mkpa na-ewere ọnọdụ n’oge anyị, na-edo ndị e tere mmanụ iche n’ebe ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst bụ́ ndị na-anwapụta onwe ha ịbụ “ụmụ ajọ onye ahụ” nọ.

Jisọs nyekwara ihe atụ ndị ọzọ nke ndị a na-ekewa. Cheta na o kwuru banyere ụzọ ahụ sara mbara nke na-eduje ná mbibi, sị: “Ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba.” (Matiu 7:13, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Nke ahụ abụghị okwu nanị banyere ihe ikpeazụ ga-esi na ya apụta. Ọ bụ okwu banyere ihe na-eme na-aga n’ihu, dị nnọọ ka ọ bụ eziokwu ugbu a banyere ole na ole na-achọta ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduje ná ndụ. Chetakwa na mgbe ọ na-ezipụ ndị ozi ya, Jisọs sịrị na ha ga-achọta ụfọdụ ndị kwesịrị. Ndị ọzọ agaghị ekwesị, ndị ozi ahụ gakwa etichapụ ájá dị n’ụkwụ ha “ka ha bụrụ àmà” megide ndị dị otú ahụ. (Luk 9:5) Ọ́ bụghị eziokwu na ihe yiri nke ahụ na-eme ka ndị Kraịst na-eje ozi ihu ọha ha taa? Ụfọdụ na-azaghachi nke ọma, ebe ndị ọzọ na-ajụ ozi Chineke nke anyị na-eweta.

Isiokwu ndị ahụ dị n’Ụlọ Nche kwuru banyere atụrụ na ụmụ ewu kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ikpe ikpe ahụ dị ka a kọwara ya n’ilu ahụ bụ n’ọdịnihu dị nso, ọbụna ugbu a ihe dị mkpa na-ewere ọnọdụ. Anyị bụ ndị Kraịst na-ekere òkè n’ọrụ na-azọpụta ndụ nke ịkpọsa ozi na-akpata nkewa n’etiti ndị mmadụ. (Matiu 10:32-39).” N’akụkụ ihe ndekọ ahụ dị na Matiu isi nke 10, anyị na-agụ na Jisọs kwuru na iso ya n’azụ ga-akpata nkewa—nna megide nwa ya, nwa nwanyị megide nne ya.

N’ikpeazụ, ụmụnna Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ebutewo ụzọ n’ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ikwusa ozi Alaeze ahụ. Ka ndị mmadụ na-anụ ya ma na-anakwere ma ọ bụ na-ajụ ya, ha na-egosi ihe ha bụ. Anyị bụ́ mmadụ apụghị, anyị ekwesịghịkwa, ịsị, ‘Onye a bụ atụrụ; onye ahụ bụ ewu,’ n’echiche Matiu isi nke 25 na-enye. Otú ọ dị, anyị izi ndị mmadụ ozi ọma ahụ na-enye ha ohere igosi ebe ha guzo—ihe ha bụ na ụzọ ha si emeghachi omume n’ebe ụmụnna Jisọs nọ. Ya mere, dị ka ihe akaebe na-amụba amụba maka okwu ikpe, nkewa n’etiti ndị na-akwado ụmụnna Jisọs na ndị jụrụ ịkwado ya na-apụta ìhè. (Malakaị 3:18) Dị ka Ụlọ Nche ahụ gosiri, n’oge na-adịghị anya Jisọs ga-anọdụ ala n’ocheeze ya ma kwupụta mkpebi ikpe, na-eji ụzọ ikpe ekewa ndị mmadụ n’echiche ikpeazụ gaa ná ndụ ma ọ bụ ná mbibi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1987.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya