Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 7/15 p. 24
  • Ndị Na-akpọ Ụgba na Nkume Dị Elu nke Ugwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Na-akpọ Ụgba na Nkume Dị Elu nke Ugwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ugwu Nile Dị Elu Dịịrị Ewu Ọhịa”
  • ‘Ị̀ Maara Mgbe Ewu Ọhịa Ji Amụ Nwa?’
  • “Nne Ele nke Na-ahụ n’Anya na Nne Ewu Ọhịa Mara Mma”
  • ‘Ị Dị Ebube Karịa Ugwu Nile’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 7/15 p. 24

Ndị Na-akpọ Ụgba na Nkume Dị Elu nke Ugwu

OBODO oge gboo na ọzara gbara ya gburugburu a na-akpọ En-gedi dị n’akụkụ ikpere mmiri ebe ọdịda anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ụzọ juru na nkume na ebe ndị dị mkputamkpu bụ ebe obibi mara mma maka ewu ọhịa nke Ala Nkwa ahụ, nke yiri ndị a na-ahụ n’ebe a.

Anụ ọhịa a ụkwụ siri ike n’ala so n’ime ihe ndị dị ebube n’anụmanụ ndị e kere eke. Ka anyị saghee Bible ma lerukwuo anụmanụ a na-adọrọ mmasị anya.

“Ugwu Nile Dị Elu Dịịrị Ewu Ọhịa”

Otú ahụ ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. (Abụ Ọma 104:18) A kwadebere ewu ọhịa nke ọma maka ibi n’ebe ndị dị elu! Ha dị gara gara nke ukwuu, na-eji obi ike na ịdị ngwa dị ukwuu na-aga n’ala na-adịghị larịị. Nke a bụ n’otu akụkụ n’ihi otú e siri mee ọbọ ụkwụ ha. Oghere ya pụrụ ịgbasa n’okpuru ịdị arọ nke ewu ahụ, na-eme ka anụmanụ ahụ kwụsie ike mgbe o guzo ọtọ ma ọ bụ na-aga ije n’elu oké nkume dị warara.

Ewu ọhịa nwekwara nkwụsi ike pụrụ iche. Ha pụrụ ịwụfe ebe sara oké mbara ma wụda n’elu nkume ga-afọ nke nta ka ọ ghara ịba ụkwụ anọ ya dum. Ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ Douglas Chadwick hụrụ n’otu oge ka ụdị ewu ọhịa ọzọ na-eji nkwụsi ike ya ezere ịbụ nke a nwụchiri n’elu nkume nke dịrị ya oké warara ịtụgharị. Ọ na-asị: “Mgbe o gwutụsịrị nkume ọzọ n’ihe dị ka mita 120 ná mgbada anya, ewu ahụ gbagidesiri ụkwụ ihu ya ike n’elu ya ma ji nwayọọ chịlie ụkwụ azụ ya elu n’elu isi ya n’elu oké nkume ahụ dị ka a ga-asị na o ji isi aga ije. Ka m nọ na-eche ihe ga-emenụ, ewu ahụ gara n’ihu ruo mgbe ụkwụ azụ ya ruru ala nke mere ka o chee ihu n’ebe o siworo bịa.” (National Geographic) Ọ bụghị ihe ijuanya na a kpọwo ewu ọhịa “ndị na-akpọ ụgba na nkume dị elu nke ugwu”!

‘Ị̀ Maara Mgbe Ewu Ọhịa Ji Amụ Nwa?’

Ewu ọhịa bụ ihe e kere eke na-asọ ihere nke ukwuu. Ha na-ahọrọ ibipụ iche pụọ n’ebe ụmụ mmadụ nọ. N’ezie, ọ na-esiri ndị mmadụ ike irute nso nke ọma iji hụ ha n’ebe ha nọ n’ime ọhịa. N’ihi ya, Onye Nwe “anụ ọhịa ọ bụla nke oké ọhịa” nwere ike ịjụ nwoke ahụ bụ́ Job n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Ị̀ mawo mgbe ewu ọhịa nke nkume dị elu ji amụ nwa?”—Abụ Ọma 50:10; Job 39:1.

Amamihe ebumpụta ụwa nke Chineke nyere na-agwa nne ewu ọhịa mgbe oge ịmụ nwa ruru. Ọ na-achọpụta ebe nwere nchebe ma na-amụ otu nwa ọhụrụ ma ọ bụ abụọ, nke na-abụkarị ná ngwụsị May ma ọ bụ na June. Ụmụ ewu a mụrụ ọhụrụ na-enweta ụkwụ siri ike n’ala n’ime nanị ụbọchị ole na ole.

“Nne Ele nke Na-ahụ n’Anya na Nne Ewu Ọhịa Mara Mma”

Eze Solomọn nwere amamihe gbara ndị bụ di ume, sị: “Ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa. Dị ka nne ele nke na-ahụ n’anya na nne ewu ọhịa mara mma.” (Ilu 5:18, 19) E kwughị nke a iji wetuo ndị inyom ala. O doro anya na Solomọn na-ezo aka n’ịma mma, ịdị mma, na àgwà ndị ọzọ pụtara ìhè anụmanụ ndị a nwere.

Ewu ọhịa so n’ime “mkpụrụ obi dị ndụ” a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị na-agba akaebe dị ukwuu nye amamihe Onye Okike ahụ. (Jenesis 1:24, 25) Obi ọ́ dịghị atọ anyị ụtọ na Chineke ejiriwo ọtụtụ ihe e kere eke na-adọrọ mmasị gbaa anyị gburugburu?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Site n’ikike Athens University

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya