Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 9/1 p. 29
  • Ike Nsachapụ nke Okwu Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ike Nsachapụ nke Okwu Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Isi Chebe Ụmụ Gị
    Teta!—2003
  • Ọgwụ Ọjọọ—Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Eji Ha Eme Ihe?
    Teta!—2001
  • Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Ndị Na-eto Eto na Ọgwụ Ọjọọ
    Teta!—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 9/1 p. 29

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ike Nsachapụ nke Okwu Chineke

A NA-AKỌ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ na-alaghachi n’àgwà ha mgbe a tọhapụsịrị ha site n’ogige mkpụzigharị uche. Ma Okwu Chineke pụrụ imezu ihe ụlọ ahụ ike na-adịghị enwekebe ike ime. (Ndị Hibru 4:12) Okwu na mmụọ nke Chineke enyeworo ọtụtụ ndị aka imeri iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ na itinye ndụmọdụ a n’ọrụ: “Ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ n’egwu Chineke.”—2 Ndị Kọrint 7:1.

Ahụmahụ sitere Myanmar na-enye ihe atụ nke a. Otu nwoke onye ya na iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ gbara mgba ruo ọtụtụ afọ na-akọ, sị: “Aghọrọ m onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ ka m nọ n’afọ iri na ụma m. Ọtụtụ ugbo agbalịrị m inwere onwe m, ma apụghị m. Iji kwadoo àgwà ịṅụ ọgwụ ọjọọ m, abanyere m n’izu ohi. N’ihi nke a, na 1988, e zigara m ụlọ mkpọrọ ịnọ otu afọ.

“Mgbe a tọhapụsịrị m site n’ụlọ mkpọrọ, amaliteghachiri m iso ndị enyi m ochie na-akpakọ. N’oge na-adịghị anya nke ahụ gasịrị alaghachiri m n’àgwà ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Omume ibibi onwe onye a dujere ndị òtù ezinụlọ m n’igbubi mmekọrịta nile n’ebe m nọ. Tụkwasị na nke ahụ, àgwà nnupụisi m kpataara ọtụtụ n’ógbè ahụ ịdị na-atụ m ụjọ, ha onwe ha malitekwara ize m eze.

“E mesịa otu ụbọchị ihe a na-apụghị izere ezere mere—aṅụbigara m ọgwụ ọjọọ ókè. E zigaghachiri m ụlọ mkpọrọ, n’oge a ịnọ afọ atọ. Ọ bụ ezie na ndụ n’ime ụlọ mkpọrọ siri oké ike, ejisiri m ike lanarị.

“Mgbe m lọtasịrị site n’ụlọ mkpọrọ, arịọrọ m ezinụlọ m mgbaghara maka ihie ụzọ m ndị gara aga. Ha ji amara nabataghachi m, ma ọzọkwa, ndị enyi dujere m n’ịlaghachi n’ụzọ ochie m.

“N’ikpeazụ, nne m ochie tụụrụ otu pastọ nọ n’ógbè anyị aro ka m gaa otu ụlọ akwụkwọ Bible. Pastọ ahụ kwetara. Otú ọ dị, tupu m malite ịga, nwanne nna m, onye bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, kwuru na ọ bụrụ n’ezie na m chọrọ ịmụ Bible, na m kwesịrị isoro Ndịàmà mụọ ihe.

“Agara m n’Ụlọ Nzụkọ Alaeze, e wee mee ka otu nwoke mata m bụ́ onye kwetara ịmụrụ m Bible. Ọtụtụ ndị bịaranụ kelere m n’ụzọ na-ekpo ọkụ ma mee ka ahụ ruo m ala.

“Mgbe m malitesịrị ịmụ Bible na ịga nzukọ ndị Kraịst, ọchịchọ ịbịaru Chineke nso nọchiri agụụ ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Otu afọ n’ihu enwewo m ọganihu ruo n’ókè nke ịrara ndụ m nye Jehova Chineke, egosikwara m nraranye ahụ site na baptism ime mmiri.

“N’oge na-adịbeghị anya, ka m na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ezutere m otu n’ime ndị bụbu ndị enyi m n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ọ pụghị ịghọta mgbanwe m dị ịrịba àmà. Nke a meghere ụzọ maka ịgba àmà, enwekwara m ike ịgwa ya okwu banyere olileanya Alaeze ahụ.

“N’ikpeazụ achọtawo m ezi nzube na ezi ihe ná ndụ. N’ihi enyemaka nke Chineke na ndụmọdụ sitere n’Okwu ya, enwere m ike ugbu a inyere ndị ọzọ aka iwepụ site n’ebe ha nọ àgwà na-emerụ emerụ nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya