Ndị Kraịst na Ụwa nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ
“Na-ejegharịnụ n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ.”—NDỊ KỌLỌSI 4:5.
1. Gịnị ka Jisọs kwuru n’ihe banyere ụmụazụ ya na ụwa?
N’EKPERE o kpegaara Nna ya nke eluigwe, Jisọs kwuru banyere ụmụazụ ya, sị: “Ụwa kpọkwara ha asị, n’ihi na ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” Ọ gbakwụnyeziri: “Ekpeghị m ekpere ka I wepụ ha n’ụwa, kama ka I debe ha ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ.” (Jọn 17:14, 15) A gajeghị ikewapụ ndị Kraịst n’ụwa n’ụzọ anụ ahụ—dị ka ihe atụ, site n’ịnọpụ iche n’ebe obibi ndị mọnk. Kama nke ahụ, Kraịst “zigakwara ha n’ime ụwa” ịbụ ndị àmà ya “ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Jọn 17:18; Ọrụ 1:8) Ma, ọ rịọrọ Chineke ka o legide ha anya n’ihi na Setan, “onye isi ụwa nke a,” ga-akpalite ịkpọasị megide ha n’ihi aha Kraịst.—Jọn 12:31; Matiu 24:9.
2. (a) Olee otú Bible si eji okwu bụ́ “ụwa” eme ihe? (b) Àgwà dị aṅaa guzoziri eguzozi ka Jehova na-egosi n’ebe ụwa dị?
2 N’ime Bible okwu ahụ bụ́ “ụwa” (Grik, koʹsmos) na-egosikarị ọha mmadụ nke ajọ omume, nke “na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) N’ihi na ndị Kraịst na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Jehova, na-erubekwa isi n’iwu ikwusara ụwa ozi ọma Alaeze Chineke, mgbe ụfọdụ mmekọrịta tara akpụ adịwo n’etiti ha na ụwa. (2 Timoti 3:12; 1 Jọn 3:1, 13) Otú ọ dị, e jikwa koʹsmos zoo aka n’ebe ezinụlọ mmadụ n’ozuzu ya nọ n’ime Akwụkwọ Nsọ. N’ikwu banyere ụwa n’echiche a, Jisọs sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. N’ihi na Chineke eziteghị Ọkpara Ya n’ụwa ka O kpee ụwa ikpe; kama ka e wee site n’aka Ya zọpụta ụwa.” (Jọn 3:16, 17; 2 Ndị Kọrint 5:19; 1 Jọn 4:14) Ya mere, ka ọ na-akpọ ihe ndị e ji mara ajọ usoro Setan asị, Jehova gosiri ịhụnanya ya maka ihe a kpọrọ mmadụ site n’izite Ọkpara ya n’ụwa ka o wee zọpụta ndị nile ‘ga-abịaru nchegharị.’ (2 Pita 3:9; Ilu 6:16-19) Àgwà guzoziri eguzozi nke Jehova n’ebe ụwa dị kwesịrị iduzi ndị na-efe ya ofufe.
Ihe Nlereanya nke Jisọs
3, 4. (a) Olee nguzo Jisọs weere n’ihe banyere ịchịisi? (b) Olee otú Jisọs si lee ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ anya?
3 Mkpirikpi oge tupu ọnwụ ya, Jisọs gwara Pọntiọs Paịlet: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.” (Jọn 18:36) N’ikwekọ n’okwu ndị a, Jisọs n’oge bu ụzọ ajụwo onyinye Setan nyere ya ikike n’isi alaeze nile nke ụwa, ọ jụwokwa ikwe ka ndị Juu mee ya eze. (Luk 4:5-8; Jọn 6:14, 15) Ma, Jisọs gosiri ịhụnanya dị ukwuu maka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ. Matiu onyeozi kọrọ banyere otu ihe atụ nke a, sị: “Mgbe Ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, O nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Site n’ịhụnanya, o mere nkwusa nye ndị ahụ n’obodo ukwu na n’obodo nta ha dị iche iche. O ziri ha ihe, gwọọkwa nrịanrịa ha dị iche iche. (Matiu 9:36) Mkpa anụ ahụ nke ndị bịara ịmụta ihe n’ọnụ ya metụkwara ya n’obi. Anyị na-agụ: “Jisọs wee kpọọ ndị na-eso ụzọ Ya ka ha bịakwute Ya, Ọ sị, Enwere m ọmịiko n’ahụ ìgwè mmadụ a, n’ihi na Mụ na ha nọgidere ụbọchị atọ ugbu a, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri: ma achọghị m izilaga ha n’ọnụ efu, ka ha ghara ịda mbà n’ụzọ ma eleghị anya.” (Matiu 15:32) Lee aha nchegbu ịhụnanya o gosiri!
4 Ndị Juu nwere ajọ mbunobi siri ike megide ndị Sameria, ma Jisọs kwunyeere otu nwanyị Sameria okwu ruo ogologo oge, nọọkwa ụbọchị abụọ na-agba àmà dị ukwuu n’otu obodo ukwu Sameria. (Jọn 4:5-42) Ọ bụ ezie na Chineke zigara ya ijekwuru “atụrụ furu efu nke ụlọ Israel,” n’otu oge Jisọs mere ihe n’ihi ngosipụta okwukwe nke ndị ọzọ na-abụghị ndị Juu. (Matiu 8:5-13; 15:21-28) Ee, Jisọs gosiri na o kwere omume ‘ịghara isite n’ụwa’ ma n’otu oge ahụ gosi ịhụnanya maka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, maka ụmụ mmadụ. Ànyị na-egosi ọmịiko n’otu aka ahụ maka ndị mmadụ n’ebe anyị bi, na-arụ ọrụ, ma ọ bụ na-azụ ahịa? Ànyị na-egosi nchegbu maka ọdịmma ha—ọ bụghị nanị maka mkpa ime mmụọ ha kamakwa maka mkpa ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ọ dị n’ike aka anyị inye aka n’ụzọ ezi uche dị na ya? Jisọs mere ya, sitekwa n’ime otú ahụ, o mepere ụzọ maka ịkụziri ndị mmadụ banyere Alaeze ahụ. N’eziokwu, anyị apụghị ịrụ ọrụ ebube nkịtị dị ka Jisọs rụrụ. Ma ọrụ obiọma na-arụkarị ọrụ ebube, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’itijasị ajọ mbunobi.
Àgwà Pọl n’Ebe Ndị “Nọ n’Èzí” Nọ
5, 6. Olee otú Pọl onyeozi si mesoo ndị Juu “nọ n’èzí”?
5 N’ọtụtụ akwụkwọ ozi ya, Pọl onyeozi na-ezo aka n’ebe ndị “nọ n’èzí” nọ, na-apụta ndị na-abụghị ndị Kraịst, ma hà bụ ndị Juu ma hà bụ ndị Jentaịl. (1 Ndị Kọrint 5:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:12; 1 Timoti 3:7) Olee otú o si mesoo ndị dị otú ahụ? Ọ ‘ghọrọ ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ, ka o wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ.’ (1 Ndị Kọrint 9:20-22) Mgbe o rutere n’otu obodo, usoro ime nkwusa ya bụ ibu ụzọ gakwuru ndị Juu bi n’ebe ahụ. Gịnị bụ ụzọ njekwu ya? N’ụzọ akọ na nkwanye ùgwù o nyere ihe nnwapụta Bible na-eme ka e kwere na Mesaịa ahụ abịawo, anwụwo ọnwụ ịchụàjà, nakwa na a kpọlitewo ya n’ọnwụ.—Ọrụ 13:5, 14-16, 43; 17:1-3, 10.
6 N’ụzọ dị otú a Pọl gbakwasịrị ụkwụ n’ihe ọmụma ndị Juu nwere banyere Iwu ahụ na ndị amụma iji kụziere ha banyere Mesaịa ahụ na Alaeze Chineke. O nwekwara ihe ịga nke ọma n’ime ka ụfọdụ kwere. (Ọrụ 14:1; 17:4) N’agbanyeghị mmegide ndị ndú ndị Juu, Pọl gosiri mmetụta na-ekpo ọkụ maka ndị Juu ibe ya mgbe o dere, sị: “Ụmụnna m, ihe dị obi m ezi mma na arịrịọ m na-arịọ Chineke n’ihi ha [ndị Juu] bụ, ka a zọpụta ha. N’ihi na ana m agbara ha àmà na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị.”—Ndị Rom 10:1, 2.
Inyere Ndị Kwere Ekwe Na-abụghị Ndị Juu Aka
7. Olee otú ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu si nabata ozi ọma Pọl kwusara?
7 Ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ ndị na-abụghị ndị Juu ndị ghọworo ndị e biri úgwù na-ekpe okpukpe ndị Juu. Ihe àmà na-egosi na e nwere ndị na-eso ụzọ ndị Juu na Rom, Antiọk nke Siria, Etiopia, na Antiọk dị na Pisidia—n’ezie, na Diaspora dum nke ndị Juu. (Ọrụ 2:8-10; 6:5; 8:27; 13:14, 43; tụlee Matiu 23:15.) N’adịghị ka ọtụtụ ndị ọchịchị ndị Juu, o yikarịrị ka ndị na-eso ụzọ ndị Juu adịghị mpako, ha apụghịkwa iji nganga tuo ọnụ ịbụ ụmụ Abraham. (Matiu 3:9; Jọn 8:33) Kama nke ahụ, ha agbahapụwo chi arụsị dị iche iche ma jiri obi umeala chigharịkwuru Jehova, na-enweta ihe ọmụma ụfọdụ banyere ya na iwu ya. Ha sokwa na-enwe olileanya ndị Juu nke Mesaịa na-abịanụ. Ebe ha gosiwororịị ọchịchọ obi ime mgbanwe n’ọchịchọ ha na-achọ eziokwu, ọtụtụ n’ime ha dị njikere imekwu mgbanwe ma nakwere ihe Pọl onyeozi na-ekwusa. (Ọrụ 13:42, 43) Mgbe onye na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ onye na-efebu chi arụsị dị iche iche tọghatara gaa n’Iso Ụzọ Kraịst, ọ na-akwadebe n’ụzọ pụrụ iche ịgba àmà nye ndị Jentaịl ndị ọzọ ka na-efe chi ndị ahụ.
8, 9. (a) E wezụga ndị na-eso ụzọ ndị Juu, olee ìgwè ọzọ nke ndị Jentaịl a dọtara mmasị ha n’okpukpe ndị Juu? (b) Olee otú ọtụtụ ndị na-atụ egwu Chineke a na-ebighị úgwù si nabata ozi ọma ahụ?
8 E wezụga ndị na-eso ụzọ ndị Juu e biri úgwù, a dọtara ndị ọzọ na-abụghị ndị Juu n’okpukpe ndị Juu. Onye mbụ n’etiti ndị a ghọrọ onye Kraịst bụ Kọniliọs onye, ọ bụ ezie na ọ bụghị onye na-eso ụzọ ndị Juu, bụ ‘onye na-asọpụrụ Chineke, na-atụkwa egwu Chineke.’ (Ọrụ 10:2) Ná nkọwa ya nke Ọrụ Ndị Ozi, Prọfesọ F. F. Bruce dere, sị: “A na-akpọkarị ndị Jentaịl dị otú ahụ ‘ndị na-atụ egwu Chineke’; ọ bụ ezie na nke a abụghị okwu nwere nkọwa doro anya, ọ bụ nke dabara adaba iji mee ihe. Ọtụtụ ndị Jentaịl n’oge ahụ, ọ bụ ezie na ha adịghị njikere ịbụ ndị a tọghatara n’ụzọ nile gaa n’okpukpe ndị Juu (ibi úgwù a chọrọ na-abụ oké ihe mkpọbi ụkwụ nye ndị ikom), bụ ndị ofufe otu chi nke ofufe ụlọ nzukọ ndị Juu na ụkpụrụ akparamàgwà nke ụzọ ibi ndụ ndị Juu dọọrọ mmasị ha. Ụfọdụ n’ime ha na-aga n’ụlọ nzukọ ma matatụ ekpere na ihe mmụta akwụkwọ nsọ nke ọma, bụ́ ndị ha na-anụ ka a na-agụ ná nsụgharị nke Grik.”
9 Pọl onyeozi zutere ọtụtụ ndị na-atụ egwu Chineke mgbe ọ na-eme nkwusa n’ụlọ nzukọ dị n’Asia Minor na Gris. N’Antiọk nke Pisidia ọ kpọrọ ndị zukọrọ n’ụlọ nzukọ ahụ “ndị ikom Israel, na ndị na-atụ egwu Chineke.” (Ọrụ 13:16, 26) Luk na-ede na mgbe Pọl mesịrị nkwusa ruo Sabat atọ n’ụlọ nzukọ dị na Tesalọnaịka, “e wee mee ka ụfọdụ n’ime ha [ndị Juu] kwenye [ghọọ ndị Kraịst], ha wee danyere Pọl na Saịlas; ha na oké ìgwè mmadụ n’etiti ndị Grik ndị na-atụ egwu Chineke, ọ dịghịkwa ndị inyom ole na ole n’ime ndị inyom ndị bụ ndị isi danyeere ha.” (Ọrụ 17:4) Ikekwe, ụfọdụ n’ime ndị Grik ahụ bụ ndị na-atụ egwu Chineke a na-ebighị úgwù. E nwere ihe àmà na ọtụtụ ndị Jentaịl dị otú ahụ sonyeere ìgwè ndị Juu dị iche iche.
Ime Nkwusa n’Etiti “Ndị Na-ekweghị Ekwe”
10. Olee otú Pọl si mee nkwusa nye ndị Jentaịl na-amaghị ihe ọ bụla banyere Akwụkwọ Nsọ, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
10 N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu bụ́ “ndị na-ekweghị ekwe” pụrụ izo aka n’ebe ndị nọ n’èzí nzukọ Kraịst n’ozuzu ha nọ. Ọtụtụ mgbe ọ na-ezo aka n’ebe ndị na-ekpere arụsị nọ. (Ndị Rom 15:31; 1 Ndị Kọrint 14:22, 23; 2 Ndị Kọrint 4:4; 6:14) N’Atens a kụziiri ọtụtụ ndị na-ekweghị ekwe nkà ihe ọmụma ndị Gris n’amaghị ihe ọ bụla banyere Akwụkwọ Nsọ. Nke a ọ̀ kụdara Pọl aka ịgbara ha àmà? Ee e. Otú ọ dị, ọ gbanwere ụzọ njekwu ya. O jiri nkà wepụta echiche Bible n’ehotaghị ihe kpọmkwem site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ nke ndị Atens na-amaghị. O ji akọ gosi myirịta dị n’etiti eziokwu Bible na echiche ụfọdụ nke ndị Stọịk oge ochie na-agụ uri kwupụtara. O wepụtakwara echiche nke otu ezi Chineke maka ihe nile a kpọrọ mmadụ, Chineke ga-ekpe ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke nke nwụrụ, a kpọlitekwa ya. Pọl si otú a jiri akọ kwusaara ndị Atens banyere Kraịst. Gịnị ka ọ rụpụtara? Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ kwara ya nnọọ emo ma ọ bụ nwee mgbagwoju anya, “ndị ikom ụfọdụ rapaara n’ahụ ya, wee kwere na Jisọs: n’etiti ha Daịọnisiọs onye Areọpagọs dịkwa, na otu nwanyị, aha ya bụ Damaris, ha na ndị ọzọ.”—Ọrụ 17:18, 21-34.
11. Obodo dị aṅaa ka Kọrint bụ, gịnịkwa ka ọrụ nkwusa Pọl rụpụtara n’ebe ahụ?
11 Na Kọrint e nwere ìgwè buru ibu nke ndị Juu, ya mere Pọl malitere ozi ya n’ebe ahụ site n’ime nkwusa n’ụlọ nzukọ ha. Ma mgbe ndị Juu malitere mmegide, Pọl gakwuuru ndị Jentaịl. (Ọrụ 18:1-6) Leekwa ìgwè buru ibu ọ bụ! Kọrint bụ obodo na-ekwo ekwo, nke buru ibu, nke azụmahịa, nke e ji ibi ndụ rụrụ arụ ya mara n’ụwa Gris na Rom dum. N’ezie, “ime ka onye Kọrint” pụtara ime omume rụrụ arụ. Ma, ọ bụ mgbe ndị Juu jụsịrị nkwusa Pọl ka Kraịst gosiri ya onwe ya ma sị: “Atụla egwu, kama na-ekwu . . . , n’ihi na enwere m ọtụtụ mmadụ n’obodo a.” (Ọrụ 18:9, 10) N’ezie, Pọl hiwere otu ọgbakọ na Kọrint, ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ndị òtù ya ebiwo ụzọ ndụ “ndị Kọrint” na mbụ.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
Ịgbalị Ịzọpụta “Mmadụ Nile” Taa
12, 13. (a) Olee otú ókèala anyị taa si dị ka nke e nwere n’ụbọchị Pọl? (b) Àgwà dị aṅaa ka anyị na-egosipụta n’ókèala ebe e hiweworo okpukpe ndị nke Krisendọm eri ogologo oge ma ọ bụ ebe ike okpukpe a haziri ahazi gwụworo ọtụtụ ndị?
12 Taa, dị ka na narị afọ mbụ, “amara nke Chineke . . . na-ewetara mmadụ nile nzọpụta.” (Taịtọs 2:11) Ókèala nke ikwusa ozi ọma ahụ agbasapụwo ịgụnye kọntinent nile na ihe ka ukwuu n’àgwàetiti nile nke oké osimiri. Dị ka n’ụbọchị Pọl, a na-ezutekwa n’ezie “mmadụ nile.” Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime anyị na-eme nkwusa n’ala ebe e hiweworo chọọchị dị iche iche nke Krisendọm ruo ọtụtụ narị afọ. Dị ka ndị Juu nke narị afọ mbụ, ọdịnala okpukpe dị iche iche pụrụ ikegidesi ndị òtù ha ike. Ma, obi dị anyị ụtọ ịchọta ndị nwere ọnọdụ obi dị mma ma jiri ihe ọmụma ọ bụla ha nweworo banyere Bible mere ihe mgbakwasị ụkwụ. Anyị adịghị agwa ha okwu ka ụmụaka ma ọ bụ na-elelị ha a sịgodị na ndị ndú okpukpe ha na-emegide ma ọ bụ na-akpagbu anyị mgbe ụfọdụ. Kama nke ahụ, anyị na-aghọta na ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịdị “na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ” ọ bụ ezie na ha enweghị ezi ihe ọmụma. Dị ka Jisọs na Pọl, anyị na-egosi ezigbo ịhụnanya maka ndị mmadụ, anyị nwekwara ọchịchọ siri ike ka a zọpụta ha.—Ndị Rom 10:2.
13 Ka anyị na-eme nkwusa, ọtụtụ n’ime anyị na-ezute ndị ike okpukpe a haziri ahazi gwụrụ. Otú ọ dị, ha ka pụrụ ịbụ ndị na-atụ egwu Chineke, na-ekwere na Chineke ruo n’ókè ụfọdụ ma na-anwa ibi ndụ ọma. N’ọgbọ a gbagọrọ agbagọ na nke ekwenyeghị na Chineke na-arị elu, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịṅụrị ọṅụ izute ndị kwenyetụrụ na Chineke? Ọ̀ bụkwa na ọ dịghị anyị ọkụ n’obi iduru ha gaa n’ụdị ofufe nke a na-ejighị ihu abụọ na ụgha kaa akara?—Ndị Filipaị 2:15.
14, 15. Olee otú ubi buru ibu siworo pụta maka ikwusa ozi ọma?
14 N’ilu ya nke ụgbụ ahụ, Jisọs buru amụma na a ga-enwe ókèala buru ibu maka ọrụ nkwusa ahụ. (Matiu 13:47-49) N’ịkọwa ilu a, Ụlọ Nche nke June 15, 1992, kwuru na peji nke 20, sị: “Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị so na Krisendọm keere òkè dị ukwuu n’ịsụgharị, idepụtaghachi, na ikesa Okwu Chineke. Chọọchị dị iche iche mesịrị guzobe ma ọ bụ kwadoo òtù Bible dị iche iche, bụ́ ndị sụgharịrị Bible gaa n’asụsụ dị iche iche nke mba ndị dị n’ebe dị anya. Ha zipụkwara ndị ozi ala ọzọ na-elekọta ahụ ike na ndị nkụzi bụ́ ndị rụrụ ọrụ n’inweta ndị Kristian osikapa. Nke a chịkọtara ọnụ ọgụgụ bara ụba nke azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, bụ́ ndị na-enweghị nnwapụta Chineke. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, o meghere anya ọtụtụ nde ndị na-abụghị ndị Kristian gaa na Bible nakwa n’otu ụdị nke Iso Ụzọ Kraịst, ọ bụ ezie na ọ bụ nke a gwagburu agwagbu.”
15 Krisendọm inweta ndị na-eso ụzọ adịwo irè karịsịa na Ndịda America, Africa, na n’àgwàetiti ụfọdụ nke oké osimiri. N’ụbọchị anyị, a chọtawo ọtụtụ ndị dị umeala n’obi n’ebe ndị a, anyị ka pụkwara ịnọgide na-arụpụta ihe ọma dị ukwuu ma anyị nwee àgwà dị mma, nke ịhụnanya n’ebe ndị dị otú ahụ dị obi umeala nọ, ọbụna dị ka Pọl nwere n’ebe ndị na-eso ụzọ ndị Juu nọ. N’etiti ndị enyemaka anyị dị mkpa e nwekwara ọtụtụ nde ndị a pụrụ ịkpọ ‘ndị na-emere Ndịàmà Jehova ebere.’ Ọ na-atọkarị ha ụtọ ịhụ ka anyị na-eleta ha. Ụfọdụ esowo anyị mụọ Bible, ha abịawokwa nzukọ anyị, karịsịa Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst a na-eme kwa afọ. Ọ̀ bụ na ndị dị otú ahụ abụghị ubi buru ibu maka ikwusa ozi ọma Alaeze?
16, 17. (a) Ụdị ndị dị aṅaa ka anyị na-eji ozi ọma ahụ ejekwu? (b) Olee otú anyị si eṅomi Pọl n’ime nkwusa nye ụdị mmadụ dị iche iche?
16 Ọzọ, olee banyere ndị si n’ọdịbendị ndị na-abụghị nke Krisendọm—ma ànyị zutere ha n’ala nke ha ma hà bụ ndị kwabatara n’ala Ọdịda Anyanwụ dị iche iche? Oleekwa banyere ọtụtụ nde ndị ahụ gbakụtaworo okpukpe azụ kpam kpam, na-aghọ ndị na-ekweghị na Chineke ma ọ bụ ndị kwere na a pụghị ịmata Chineke? Ọzọkwa, olee banyere ndị na-eji nnọọ ịnụ ọkụ n’obi okpukpe anakwere nkà ihe ọmụma ndị ọhụrụ ma ọ bụ nkà mmụta akparamàgwà ọgbara ọhụrụ a na-ebipụta n’ọtụtụ akwụkwọ inyere onwe onye aka a na-ahụ n’ebe dị iche iche a na-ere akwụkwọ? È kwesịrị ileghara nke ọ bụla n’ime ndị dị otú ahụ anya, na-ewere ha ná ndị a na-apụghị ịgbapụtali agbapụtali? Ee e ma ọ bụrụ na anyị eṅomie Pọl onyeozi.
17 Mgbe ọ na-eme nkwusa n’Atens, Pọl adabaghị n’ọnyà nke iso ndị na-ege ya ntị na-arụ ụka nkà ihe ọmụma. Ma, o mere ka ntụgharị uche ya kwesị ndị ha na ya na-emekọ ihe, na-ewepụta eziokwu Bible n’ụzọ doro anya, nke izu dị na ya. N’otu aka ahụ, ọ dịghị mkpa na anyị ga-aghọ ndị ọkà n’okpukpe ma ọ bụ nkà ihe ọmụma nke ndị anyị na-ekwusara. Otú ọ dị, anyị na-eme ka ụzọ njekwu anyị kwesị ekwesị iji mee ka ịgba àmà anyị dị irè, si otú ahụ na-aghọ “ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Ndị Kọrint 9:22) N’idegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsi akwụkwọ, Pọl kwuru, sị: “Na-ejegharịnụ n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ, na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile. Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mata otú unu na-aghaghị ịza mmadụ nile ọ bụla.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ndị Kọlọsi 4:5, 6.
18. Olee ibu ọrụ anyị nwere, oleekwa ihe anyị na-ekwesịghị ichezọ mgbe ọ bụla?
18 Dị ka Jisọs na Pọl onyeozi, ka anyị gosi ụdị mmadụ nile ịhụnanya. Karịsịa, ka anyị na-ewepụta obi anyị iji soro ndị ọzọ kerịta ozi ọma Alaeze ahụ. N’aka nke ọzọ, echezọla mgbe ọ bụla na Jisọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Ihe nke a pụtaara anyị ka a ga-atụlekwu n’isiokwu na-esonụ.
Ná Ntụleghachi
◻ Kọwaa àgwà guzoziri eguzozi nke Jisọs n’ebe ụwa dị.
◻ Olee otú Pọl onyeozi si mee nkwusa nye ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu?
◻ Olee otú Pọl si jekwuru ndị na-atụ egwu Chineke na ndị na-ekweghị ekwe?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi ghọọ “ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ” n’ọrụ nkwusa anyị?
[Foto dị na peeji nke 10]
Site n’ịrụrụ ndị agbata obi ha ọrụ obiọma, ndị Kraịst pụrụ ọtụtụ mgbe itijasị ajọ mbunobi