Ha Mere Uche Jehova
Ihe Atụ nke Iji Onwe Onye Achụ Àjà na Iguzosi Ike n’Ihe
NYE onye ọrụ ubi na-eto eto aha ya bụ Elaịsha, ihe malitere dị ka ịkọ ubi ya ọ na-eme kwa ụbọchị ghọrọ ụbọchị kasị mkpa ná ndụ ya. Ka ọ nọ ọrụ n’ubi, Elaịsha nwetara nleta ọ na-atụghị anya ya site n’aka Elaịja, bụ́ onye amụma kasịnụ n’Israel. ‘Gịnị ka ọ pụrụ ịchọ n’aka m?’ ka Elaịsha pụrụ icheworị. Ọ dịghị ya mkpa ichere ogologo oge maka azịza. Elaịja chịsara uwe ọrụ ya n’ahụ Elaịsha, na-egosi na Elaịsha ga-anọchi ya otu ụbọchị. Elaịsha eleghị ọkpụkpọ òkù a anya dị ka ihe dị nta. Ozugbo, ọ hapụrụ ubi ya iji ghọọ onye na-ejere Elaịja ozi.—1 Ndị Eze 19:19-21.
N’ihe dị ka afọ isii n’ihu, oge ruru ka Elaịja hapụ. A kpọwo ihe ndekọ nke ọpụpụ ya “otu n’ime akụkọ ndị kasị mma” n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.
Elaịja Akwadoo Ịpụ
Elaịja chọrọ ileta Betel, Jeriko, na Jọdan nke ikpeazụ ya. Nke a ga-agụnye ịzọ njem ọtụtụ kilomita, nke ọtụtụ n’ime ha bụ n’akụkụ elu ugwu na-adịghị larịị. Na nkeji ọ bụla nke njem ahụ, Elaịja gbara Elaịsha ume ka ọ nọrọ ebe ahụ. Ma Elaịsha siri ọnwụ na ya ga-eso nna ya ukwu nọrọ ruo ná njedebe.—2 Ndị Eze 2:1, 2, 4, 6.
Mgbe ha nọ Betel nakwa na Jeriko, “ụmụ ndị amụma” bịakwutere Elaịsha.a “Ị̀ mawo na taa ka Jehova na-ewepụ onye nwe gị n’ịbụ onye isi gị?” ka ha jụrụ ya. “Mụ onwe m amawokwa ya,” ka ọ zara. “Gbanụ nkịtị.”—2 Ndị Eze 2:3, 5.
E mesịa Elaịja na Elaịsha gawara Osimiri Jọdan. Mgbe ha ruru Jọdan, Elaịja rụrụ ọrụ ebube ka ihe dị ka ụmụ ndị amụma 50 na-ekiri ya site n’ebe dị anya. “Elaịja wee chịrị uwe mwụda ya, pịakọta ya, tie mmiri ahụ, e wee kewaa ya, otu ụzọ gaa n’otu akụkụ, otu ụzọ gaa n’akụkụ ọzọ, ha abụọ wee gabiga n’ala akọrọ.”—2 Ndị Eze 2:8.
Ozugbo ha gafechara, Elaịja gwara Elaịsha, sị: “Rịọ ihe m ga-emere gị tutu e wepụ m n’ebe ị nọ.” Elaịsha rịọrọ maka “òkè abụọ” nke mmụọ Elaịja—ya bụ, akụkụ abụọ nke na-abụkarị nke kwesịrị ọkpara. N’ezie, Elaịsha asọpụrụwo Elaịja dị ka ọkpara ga-asọpụrụ nna ya. Ọzọkwa, e tere ya mmanụ ịbụ onye ga-anọchi Elaịja dị ka onye amụma Jehova n’Israel. N’ihi ya, arịrịọ ya abụghị nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị ma ọ bụ nke na-ekwesịghị ekwesị. Otú o sina dị, n’ịma na ọ bụ nanị Jehova pụrụ imezu arịrịọ a, Elaịja ji obi umeala zaghachi, sị: “Ị rịọwo ihe siri ike.” Mgbe ahụ, o kwukwasịrị: “Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m n’ebe ị nọ, ọ ga-adịrị gị otú a, ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ọ gaghị adị otú a.”—2 Ndị Eze 2:9, 10; Deuterọnọmi 21:17.
N’enweghị obi abụọ, Elaịsha kpebisiri nnọọ ike ịrapagidesi ike n’ahụ nna ya ukwu. Mgbe ahụ, “ụgbọala ọkụ na ịnyịnya ọkụ” pụtara. Kpọmkwem n’ihu Elaịsha nwere ijuanya, e bupụrụ Elaịja n’oké ifufe—jiri ụzọ ọrụ ebube kpọfee ya ebe ọzọ.b Elaịsha chilitere uwe mwụda Elaịja wee laghachikwa azụ n’ụsọ Osimiri Jọdan. O tiri mmiri ahụ ihe, sị: “Olee ebe Jehova nọ, bụ́ Chineke Elaịja?” Mmiri ahụ kewara, na-enye ihe àmà doro anya na Elaịsha nwere nkwado nke Chineke dị ka onye nọchiri Elaịja.—2 Ndị Eze 2:11-14.
Ihe Mmụta Nye Anyị
Mgbe a kpọrọ ya òkù isoro Elaịja jee ozi pụrụ iche, Elaịsha hapụrụ ubi ya ozugbo iji jeere onye amụma kasịnụ n’Israel ozi. Dị ka ihe àmà na-egosi, ọrụ ya ụfọdụ dị ala, n’ihi na a maara ya dị ka “onye wụkwasịrị mmiri n’aka Elaịja.”c (2 Ndị Eze 3:11) Otú o sina dị, Elaịsha weere ọrụ ya dị ka ihe ùgwù, ọ nọgidesikwara ike n’akụkụ Elaịja.
Ọtụtụ ndị ohu Chineke taa na-egosipụta mmụọ yiri nke a nke iji onwe onye achụ àjà. Ụfọdụ ahapụwo “ubi” ha, ihe ha ji ebi ndụ, iji kwusaa ozi ọma n’ókèala dịgasị anya ma ọ bụ ije ozi dị ka ndị òtù ezinụlọ Betel. Ndị ọzọ emewo njem gaa ala ọzọ iji rụọ ọrụ n’ihe owuwu nke Society. Ọtụtụ anabatawo ihe a pụrụ ịkpọ ọrụ ndị dị ala. Ma, o nweghị onye na-agara Jehova ozi nke na-eje ozi na-adịghị mkpa. Jehova na-enwe obi ekele maka ndị nile na-efe ya n’afọ ofufo, ọ ga-agọzikwa mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà.—Mak 10:29, 30.
Elaịsha nọgidere na-eso Elaịja ruo ná njedebe. Ọ jụrụ ịhapụ onye amụma ahụ tọrọ ya ọbụna mgbe e nyere ya ohere. N’enweghị obi abụọ, mkpakọrịta chiri anya nke ọ zụlitere n’ebe Elaịja nọ mere ka ịhụnanya ebere dị otú ahụ bụrụ nke obi ụtọ. Taa, ndị ohu Chineke na-agbalị ime ka mmekọrịta ha na Chineke sie ike, ha na-abịarukwa ndị kwere ekwe ibe ha nso. A ga-agọzi ihe nkekọ nke ịdị n’otu, n’ihi na Bible na-ekwu banyere Jehova, sị: “N’ebe onye ebere nọ Ị ga-egosi onwe gị onye zuru okè.”—2 Samuel 22:26.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu ahụ bụ “ụmụ ndị amụma” pụrụ inye echiche ụlọ akwụkwọ nke ntụziaka maka ndị a kpọrọ ịrụ ọrụ a ma ọ bụ nanị òtù njikọ ndị amụma.
b E dere ozi Elaịja nyere Eze Jehoram nke Juda afọ ole na ole ka e mesịrị.—2 Ihe Emere 21:12-15.
c Ọ bụ omenala ohu ịwụsa nna ya ukwu mmiri n’aka iji saa ya, karịsịa mgbe e risịrị nri. Omume a yiri ịsa ụkwụ, nke bụ omume ile ọbịa, nkwanye ùgwù, na ná mmekọrịta ụfọdụ, obi umeala.—Jenesis 24:31, 32; Jọn 13:5.