Ụwa Ezi Ikpe Abụghị Nrọ!
“EZI ikpe bụ oké ihe nchegbu nke mmadụ nwere n’ụwa,” ka onye America ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị bụ́ Daniel Webster rịbara ama. Bible na-ekwukwa, sị: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) N’ịbụ ndị e mere n’oyiyi Chineke, di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ nwere àgwà nke Chineke nke gụnyere echiche nke ezi ikpe.—Jenesis 1:26, 27.
Akwụkwọ Nsọ na-ekwukwa banyere ‘ndị mba ọzọ ndị na-enweghị iwu na-eme ihe nile dị n’iwu site ka e si mụọ ha.’ Otú a, ha “na-egosi ọrụ iwu na e dewo ya n’obi ha, akọ na uche ha na-esokwa ya na-agba àmà, ihe ha na-atụle n’obi ha n’etiti onwe ha na-ebokwa ha ebubo ma ọ bụ ma eleghị anya na-agọpụ ha.” (Ndị Rom 2:14,15) Ee, e nyere mmadụ ikike nke akọ na uche—nghọta dị n’ime nke ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ. N’ụzọ doro anya, mkpa maka ezi ikpe dị mmadụ n’ime site n’ọmụmụ.
Ihe e jikọtara ya na mkpa maka ezi ikpe n’ụzọ chiri anya bụ ọchịchọ mmadụ na-achọ obi ụtọ, n’ihi na Abụ Ọma 106:3 na-ekwu, sị: “Ndị [obi ụtọ, NW] ka ndị na-edebe ikpe bụ, ha na onye na-eme ezi omume na mgbe nile.” Ma, gịnị mere na mmadụ enwebeghị ike iweta ụwa ezi ikpe?
Gịnị Mere Mmadụ Jiworo Daa?
Otu ọkpụrụkpụ ihe kpatara ọdịda n’iweta ụwa ezi ikpe bụ ntụpọ anyị ketara site n’aka nne na nna anyị mbụ, bụ́, Adam na Iv. Bible na-akọwa, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Ezughị okè ahụ bụ mmehie. Ọ bụ ezie na e kere ha n’enweghị ntụpọ, Adam na Iv kpebiri inupụrụ Chineke isi ma si otú ahụ mee onwe ha ndị mmehie. (Jenesis 2:16, 17; 3:1-6) N’ihi nke a, ha hapụụrụ ụmụ ha ihe nketa nke ọchịchọ ọjọọ, nke mmehie.
Ọ̀ bụ na àgwà njimara ndị dị ka anyaukwu na ajọ mbunobi, abụghị ihe ọchịchọ ọjọọ na-arụpụta? Ọ̀ bụkwa na àgwà ndị a adịghị eso akpata ikpe na-ezighị ezi dị n’ụwa? Ee, anyaukwu bụ isi ihe na-akpata mmetọ gburugburu ebe obibi a ma ụma na-eme na mmegbu n’ụzọ akụ̀ na ụba! Ajọ mbunobi bụ kpọmkwem ihe na-akpata esemokwu nke agbụrụ na ikpe na-ezighị ezi megide ebo. Àgwà ndị dị otú ahụ na-enunyekwa ndị mmadụ izu ohi, ịghọ aghụghọ, na ime omume n’ụzọ na-emerụ ndị ọzọ ahụ.
Ọbụna mgbalị sitere ná mkpali kasị mma ikpe ikpe ziri ezi na ime ihe ọma na-adakarị n’ihi ọchịchọ ime mmehie anyị. Pọl onyeozi n’onwe ya kwupụtara, sị: “Ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme.” Ọ na-aga n’ihu ịkọwa ịgba mgba ahụ, na-asị: “Mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị: ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ.” (Ndị Rom 7:19-23) Ikekwe, anyị nwere otu ọgụ ahụ taa. Ọ bụ ya mere ikpe na-ezighị ezi ji adị nnọọ ọtụtụ mgbe.
Ụzọ mmadụ si achị isi esowokwa kpata ikpe na-ezighị ezi dị n’ụwa. N’ala ọ bụla, e nwere iwu nakwa ndị na-ahụ na e debere ha. N’ezie, e nwekwara ndị ọkàikpe na ụlọikpe. N’ezie, mmadụ ụfọdụ nwere ụkpụrụ anwawo ịkwado ihe ndị ruuru mmadụ na ịhụ na e nwere ikpe hà nhata maka mmadụ nile. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka ukwuu ná mgbalị ha adawo. N’ihi gịnị? N’ịchịkọta ihe dị iche iche tinyere aka n’ọdịda ha, Jeremaịa 10:23 na-akọwapụta, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” N’ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, mmadụ apụghị nnọọ iguzobe ụwa ezi omume na nke ezi ikpe.—Ilu 14:12; Eklisiastis 8:9.
Otu oké ihe mgbochi nye mgbalị mmadụ n’iwu ụwa ezi ikpe bụ Setan bụ́ Ekwensu. Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na mmụọ ozi nnupụisi ahụ bụ́ Setan bụ “ogbu mmadụ” na “onye ụgha” mbụ nakwa na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (Jọn 8:44; 1 Jọn 5:19) Pọl onyeozi mere ka a mata ya dị ka “chi nke oge a.” (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) N’ịbụ onye kpọrọ ezi omume asị, Setan na-eme ihe ọ bụla ọ pụrụ ime iji kwalite ajọ omume. Ruo ogologo oge nile ọ na-achị ụwa, ụdị ikpe na-ezighị ezi ọ bụla na ahụhụ ha na-akpata ga na-eme ihe a kpọrọ mmadụ ohu.
Ihe a nile hà na-apụta na ọha mmadụ apụghị izere ikpe na-ezighị ezi? Ụwa ezi ikpe ọ̀ bụ nrọ na-apụghị ime eme?
Ụwa Ezi Ikpe Bụ Ihe Ga-adị Adị—N’ụzọ Dị Aṅaa?
Ka olileanya maka ụwa ezi ikpe wee bụrụ nke e mezuru, ihe a kpọrọ mmadụ aghaghị ilega anya n’isi iyi nke pụrụ ikpochapụ ihe ndị na-akpata ikpe na-ezighị ezi. Ma ònye pụrụ ifopu mmehie ma wepụ Setan na ịchịisi ya? O doro anya na e nweghị mmadụ ma ọ bụ òtù ụmụ mmadụ nke pụrụ ịrụzu ụdị ọrụ a siri ike. Nanị Jehova pụrụ! Banyere ya, Bible na-ekwu, sị: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ: n’ihi na ụzọ ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) N’ịbụkwa onye “na-ahụ ezi ikpe n’anya,” Jehova chọrọ ka ihe a kpọrọ mmadụ nụ ụtọ ndụ n’ụwa nke ezi ikpe.—Abụ Ọma 37:28.
N’ikwu banyere ndokwa Chineke iweta ụwa ezi ikpe, Pita onyeozi dere, sị: “Dị ka nkwa ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) “Eluigwe ọhụrụ” a abụghị eluigwe ọhụrụ nkịtị. Chineke mere eluigwe anyị nkịtị n’ụzọ zuru okè, ha na-ewetakwara ya otuto. (Abụ Ọma 8:3; 19:1, 2) “Eluigwe ọhụrụ” bụ ịchịisi ọhụrụ n’elu ụwa. Ihe mejupụtara “eluigwe” dị ugbu a bụ ọchịchị ụmụ mmadụ guzobere. N’isi nso, n’agha Chineke bụ́ Amagedọn, ndị a ga-enye ohere maka “eluigwe ọhụrụ”—Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị, eluigwe ya. (Mkpughe 16:14-16) Eze nke Alaeze ahụ bụ Jisọs Kraịst. N’iweta ịchịisi mmadụ n’ọgwụgwụ na-adịgide adịgide, ọchịchị a ga-achị ruo mgbe nile ebighị ebi.—Daniel 2:44.
Ma, gịnị bụ “ụwa ọhụrụ” ahụ? Ọ bụghị mbara ala ọhụrụ, n’ihi na Chineke mere ụwa ka ọ dị nnọọ mma maka ụmụ mmadụ ibi, ọ bụkwa uche ya ka ọ dịruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 104:5) “Ụwa ọhụrụ” ahụ na-ezo aka n’ọha mmadụ ọhụrụ. (Jenesis 11:1; Abụ Ọma 96:1) “Ụwa” nke a ga-ebibi bụ nke ụmụ mmadụ mere onwe ha akụkụ nke ajọ usoro ihe a mejupụtara. (2 Pita 3:7) “Ụwa ọhụrụ” ahụ nke ga-anọchi ha ga-abụ nke ezi ndị ohu Chineke, ndị na-akpọ ajọ omume asị ma na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya ga-emejupụta. (Abụ Ọma 37:10, 11) Otú a, ụwa Setan ga-apụ n’anya.
Ma gịnị na-echere Setan? Jọn onyeozi buru n’amụma, sị: “O [Kraịst Jisọs] wee jide dragọn ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye bụ́ Ekwensu na Setan, o wee kee ya agbụ [otu puku afọ], wee tụba ya n’ime abyss ahụ, mechie ya, kaakwa ya akara n’elu ya, ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ.” (Mkpughe 20:1-3) Mmetụta nke Setan e kere agbụ n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ agaghị akarị nke onye a tụrụ mkpọrọ n’olulu miri emi. Lee ahụ efe nke ahụ ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ, na-abịa dị ka obuụzọ nke ụwa ezi ikpe! Mgbe otu puku afọ ahụ gwụkwara, a ga-egwepịa Setan pụọ n’ịdị adị.—Mkpughe 20:7-10.
Ma, gịnị banyere mmehie e ketara eketa? Jehova atọworị ntọala maka ifopu mmehie. “Nwa nke mmadụ [Jisọs Kraịst] bịara . . . ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Okwu ahụ bụ́ “ihe mgbapụta” na-egosi ọnụ ahịa a chọrọ iji wee gbapụta ndị e ji eji. Jisọs ji ndụ mmadụ ya zuru okè kwụọ ụgwọ dị ka ihe mgbapụta iji wee napụta ihe a kpọrọ mmadụ.—2 Ndị Kọrint 5:14; 1 Pita 1:18, 19.
Àjà mgbapụta Jisọs pụrụ ịbara anyị uru ọbụna ugbu a. Site n’inwe okwukwe na ya, anyị pụrụ inwe nguzo dị ọcha n’ihu Chineke. (Ọrụ 10:43; 1 Ndị Kọrint 6:11) N’okpuru ịchịisi nke Alaeze Chineke, ihe mgbapụta ahụ ga-eme ka o kwe ihe a kpọrọ mmadụ omume inwetaghachi onwe ya kpam kpam site ná mmehie. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-akọwa otu “osimiri nke mmiri nke ndụ” nke ihe atụ nke na-asọpụta site n’ocheeze Chineke, e nwekwara n’ụsọ ya osisi ihe atụ ndị na-amị mkpụrụ bụ́ ndị nwere akwụkwọ maka “ime ka ahụ dị mba nile ike.” (Mkpughe 22:1, 2) Ihe Bible na-ese onyinyo ya ebe a na-anọchite anya ndokwa dị ebube nke Onye Okike iji nwetaghachi ihe a kpọrọ mmadụ site ná mmehie ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs. Iji ndokwa a mee ihe n’ụzọ zuru ezu ga-atọhapụ ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ná mmehie na ọnwụ.
Ndụ n’Ime Ụwa Ezi Ikpe
Cheedị ihe ndụ ga-adị ka ya n’okpuru ịchịisi Alaeze. Mpụ na ime ihe ike ga-abụ ihe ndị oge ha gafeworo. (Ilu 2:21, 22) A gaghị enwekwa ikpe na-ezighị ezi nke akụ̀ na ụba. (Abụ Ọma 37:6; 72:12, 13; Aịsaịa 65:21-23) A ga-ehichapụ ihe ncheta nile nke ịkpa ókè ọha mmadụ, agbụrụ na ebo. (Ọrụ 10:34, 35) Agha na ngwá agha agaghị adịkwa. (Abụ Ọma 46:9) A ga-eweghachite ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ ná ndụ n’ụwa nke ikpe na-ezighị na-adịghị. (Ọrụ 24:15) Onye ọ bụla ga-anụ ụtọ ezigbo ahụ ike zuru okè. (Job 33:25; Mkpughe 21:3, 4) “N’eziokwu,” ka Bible na-emesi anyị obi ike, “[Jisọs Kraịst] ga-eme ka ikpe pụta.”—Aịsaịa 42:3.
Ka ọ dịgodị ugbu a, ikpe na-ezighị ezi pụrụ ịdakwasị anyị, ma ka anyị ghara imeghachi omume n’ụzọ na-ezighị ezi. (Maịka 6:8) Ọbụna mgbe a na-aghaghị ịnagide ikpe na-ezighị ezi, ka anyị nwee nchekwube. Ụwa ezi ikpe e kwere ná nkwa ga-aghọ ihe dị adị n’isi nso. (2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:11-13) Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ekwuwo ya, ọ ghaghịkwa ‘ịdị.’ (Aịsaịa 55:10, 11) Ugbu a bụ oge ịkwado maka ndụ n’ụwa ezi ikpe ahụ site n’ịmụta ihe Chineke na-achọ n’aka anyị.—Jọn 17:3; 2 Timoti 3:16, 17.
[Foto dị na peeji nke 7]
A ga-ehichapụ ihe ncheta nile nke ikpe na-ezighị ezi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa