Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 1/1 p. 30-31
  • Elaịja Ebulie Ezi Chineke ahụ Elu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Elaịja Ebulie Ezi Chineke ahụ Elu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Iro Abụọ Ezute
  • E Bulie Jehova Elu
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • Ọ Gbachiteere Ofufe Chineke
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Kwadoro Ofufe Dị Ọcha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ị̀ Ga-ekwesị Ntụkwasị Obi Dị Ka Elaịja?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • A Matara Chi Nke Bụ́ Ezigbo Chi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 1/1 p. 30-31

Ha Mere Uche Jehova

Elaịja Ebulie Ezi Chineke ahụ Elu

Ọ BỤ nwoke Israel a chọsiri ike ka a nwụchie. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka na a ga-egbu ya ma ọ bụrụ na eze pụrụ ịchọta ya. Ònye bụ nwoke a a na-achụgharị? Onye amụma Jehova bụ́ Elaịja.

Eze Ehab na nwunye ya na-ekpere arụsị, bụ́ Jezebel, emewo ka ofufe Beal nwee ọganihu n’Israel. N’ihi ya, Jehova mere ka oké ọkọchị dakwasị ala ahụ, nke nọ ugbu a n’afọ nke anọ ya. Jezebel iwe ji malitere ịchọ ka e gbuo ndị amụma Jehova, ma Ehab chọrọ Elaịja kpọmkwem. Elaịja bụ onye gwaworo Ehab ihe karịrị afọ atọ tupu mgbe ahụ, sị: “Igirigi ma ọ bụ mmiri ozuzo agaghị adị ma ọlị n’afọ ndị a, ma ọ bụ nanị dị ka okwu m si dị.” (1 Ndị Eze 17:1) Oké ọkọchị si na ya pụta ka na-agakwa n’ihu.

N’ọnọdụ a dị ize ndụ, Jehova gwara Elaịja, sị: “Jee, mee ka Ehab hụ gị anya; M ga-enyekwa mmiri ozuzo n’elu ụwa.” N’oké ihe ize ndụ nye onwe ya, Elaịja rubere isi n’iwu Jehova.—1 Ndị Eze 18:1, 2.

Ndị Iro Abụọ Ezute

“Ọ̀ bụ gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Israel ahụ?” ka Ehab jụrụ mgbe ọ hụrụ Elaịja. “Emekpaghị m Israel ahụ,” ka Elaịja ji anyaike zaghachi, “kama ọ bụ gị onwe gị, na ụlọ nna gị, n’ime nhapụ unu hapụworo ihe nile Jehova nyere n’iwu, i wee jesoo Bealim.” Mgbe ahụ Elaịja tụziri aka ka Israel nile zukọọ n’Ugwu Kamel, tinyere “ndị amụma Beal, ndị dị [narị mmadụ anọ na iri ise], na ndị amụma Ashera, ndị dị [narị mmadụ anọ].” Mgbe ahụ Elaịja gwara ìgwè mmadụ ahụ okwu, sị: “Ruo ole mgbe ka unu onwe unu ga na-arụgharị n’etiti ụzọ abụọ ndị a?a Ọ bụrụ na Jehova bụ Chineke, jesoonụ Ya: ọ bụrụ Beal, jesoonụ ya.”—1 Ndị Eze 18:17-21.

Ndị ahụ gbachiri nkịtị. Ikekwe ha matara amamikpe ha n’ọdịda ha dara inye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Ọpụpụ 20:4, 5) Ma ọ bụ na ọ pụrụ ịbụ na e gbuwo akọ na uche ha nke na ha ahụghị ihe ọjọọ dị n’ikewa nguzosi ike n’ihe ha n’etiti Jehova na Beal. Ka o sina dị, Elaịja tụziri ndị mmadụ ahụ ka ha weta ụmụ oké ehi abụọ—otu maka ndị amụma Beal nke ọzọkwa maka ya. A ga-edozi ehi abụọ ahụ maka ịchụ àjà, ma a gaghị etinye ha ọkụ. “Unu ga-akpọkukwa aha chi unu,” ka Elaịja kwuru, “ma mụ onwe m ga-akpọku aha Jehova: ọ ga-erukwa, na chi ahụ nke na-ewere ọkụ za, onye ahụ bụ Chineke.”—1 Ndị Eze 18:23, 24.

E Bulie Jehova Elu

Ndị amụma Beal malitere ‘ịwụkwasị n’elu ebe ịchụàjà nke e mere.’ Ụtụtụ ahụ nile ha tiri mkpu, sị: “Beal, za anyị”! Ma Beal azaghị. (1 Ndị Eze 18:26) Mgbe ahụ Elaịja malitere ịkwa ha emo, sị: “Werenụ oké olu kpọọ: n’ihi na chi ka ọ bụ.” (1 Ndị Eze 18:27) Ọbụna na ndị amụma Beal malitere iji mma agha na ube bie onwe ha—omume ndị na-ekpere arụsị na-emekarị iji kpalie obi ebere nke chi ha.b—1 Ndị Eze 18:28.

Ọ gafeela etiti ehihie ugbu a, ndị na-efe Beal nọgidekwara “na-ebu amụma”—nkebi okwu nke n’ihe a na-ekwu ebe a na-enye echiche nke ime ihe n’ụzọ ara ara na enweghị njide onwe onye. Mgbe ehihie gamiri, n’ikpeazụ Elaịja gwara ndị ahụ nile, sị: “Bịaruonụ nso m.” Ha nile kiriri nke ọma mgbe Elaịja rụghachiri ebe ịchụàjà Jehova, gwuo olulu gburugburu ya, bọkasịa oké ehi ahụ, ma tụkwasị ya n’elu ebe ịchụàjà nke nkụ e ji esure ọkụ dị. Mgbe nke ahụ gasịrị, oké ehi ahụ, ebe ịchụàjà ahụ, na nkụ ahụ dere mmiri nke ọma, a gbajukwara mmiri n’olulu ahụ (ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ mmiri osimiri e kutere n’Osimiri Mediterranean). Mgbe ahụ, Elaịja kpegaara Jehova ekpere, sị: “Ka a mara taa na Gị onwe gị bụ Chineke n’Israel, na mụ onwe m bụkwa ohu Gị, na ọ bụkwa n’okwu Gị ka m meworo ihe ndị a. Za m, Jehova, za m, ka ndị nke a wee mara na Gị onwe gị, Jehova, bụ Chineke, na Gị onwe gị echigharịwokwa obi ha ịlata.”—1 Ndị Eze 18:29-37.

Na mberede, ọkụ si n’eluigwe daa wee “ripịa àjà nsure ọkụ ahụ, na nkụ ya, na nkume nile, na àjà, rachapụkwa mmiri nke dị n’ebe ahụ mmiri dọrọ.” Ndị ahụ na-ekiri ya dara n’ala ozugbo, na-asị: “Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke; Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke.” Mgbe Elaịja nyere iwu ya, e jichiri ndị amụma Beal ma kpụta ha na ndagwurugwu Kaịshọn, ebe e gburu ha.—1 Ndị Eze 18:38-40.

Ihe Mmụta Nye Anyị

Elaịja gosipụtara ihe pụrụ ịdị ka obi ike karịrị nke mmadụ. Ma, Jemes so dee Bible na-emesi anyị obi ike na “Elaịja bụ mmadụ yiri anyị n’ahụ ya.” (Jemes 5:17) Ọ bụghị onye na-enweghị ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịtụ egwu na inwe nchegbu. Dị ka ihe atụ, mgbe Jezebel mesịrị ṅụọ iyi ịbọ ọ́bọ̀ maka ọnwụ nke ndị amụma Beal, Elaịja gbalagara ma tikuo Jehova n’ekpere, sị: “O zuwo; ugbu a, Jehova, wepụ ndụ m.”—1 Ndị Eze 19:4.

Jehova ewepụghị mkpụrụ obi Elaịja n’ọnwụ. Kama, o ji obi ebere nyere ya aka. (1 Ndị Eze 19:5-8) Ndị na-ejere Chineke ozi taa pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-eme otu ihe ahụ mgbe ha chere oge oké nchegbu ihu, ikekwe n’ihi mmegide. N’ezie, ọ bụrụ na ha ekpee ekpere maka enyemaka Jehova, ọ pụrụ inye ha “ọkịka nke ike,” nke na ọ bụrụgodị na ‘a na-akpagbu ha n’akụkụ nile,’ a gaghị ‘akpagbubiga ha ókè.’ Otú a, a ga-enyere ha aka inwe ndidi, dị ka Elaịja nwere.—2 Ndị Kọrint 4:7, 8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-atụ aro na ọ pụrụ ịbụ na Elaịja zoro aka n’egwú ememe okpukpe nke ndị na-efe Beal. A na-ahụ otu ụzọ ahụ nke isi jiri okwu bụ maka ‘ịrụgharị’ mee ihe ná 1 Ndị Eze 18:26 iji kọwaa egwú nke ndị amụma Beal.

b Ụfọdụ na-atụ aro na mbekasị onwe onye metụtara omume nke iji mmadụ chụọ àjà. Omume abụọ a pụtara na ihe mgbu anụ ahụ ma ọ bụ mwụfu ọbara pụrụ ịkpali ihu ọma nke otu chi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya