Faịlimọn Na Ọnisimọs—Ndị E Jikọtara n’Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst
OTU n’ime akwụkwọ ozi ndị Pọl onyeozi dere site n’ike mmụọ nsọ kwuru banyere nsogbu chọrọ nlezianya metụtara ndị ikom abụọ. Otu bụ Faịlimọn, onye nke ọzọ bụkwa Ọnisimọs. Olee ndị ka ndị ikom a bụ? Gịnị mere Pọl ji nwee mmasị n’ebe ọnọdụ ha dị?
Faịlimọn, onye natara akwụkwọ ozi ahụ, bi na Kọlọsi n’Asia Minor. N’adịghị ka ọtụtụ ndị Kraịst ọzọ n’otu ógbè ahụ, Faịlimọn maara Pọl, n’ịbụ onye nabataworo ozi ọma ahụ n’ihi ọrụ nkwusa nke onyeozi ahụ. (Ndị Kọlọsi 1:1; 2:1) Pọl maara ya dị ka “onye anyị hụrụ n’anya, onye anyị na ya na-arụkọkwa ọrụ.” Faịlimọn bụ ihe nlereanya nke okwukwe na ịhụnanya. O nwere afọ ọma ma bụrụ isi iyi nke ume ọhụrụ nye ndị Kraịst ibe ya. O doro anya na Faịlimọn bụkwa nwoke bara ọgaranya, ebe ọ bụ na ụlọ ya buru ibu nke na o zuru ịnọ na ya na-enwe nzukọ nke ọgbakọ dị n’ógbè ahụ. A tụwo aro na Apfia na Akipọs, bụ́ mmadụ abụọ ọzọ a gwara okwu n’ime akwụkwọ ozi Pọl, pụrụ ịbụ nwunye ya na nwa ya nwoke. Faịlimọn nwekwararị, ọ dịkarịa ala otu ohu, bụ́ Ọnisimọs.—Faịlimọn 1, 2, 5, 7, 19b, 22.
Onye Gbara Ọsọ Gbaga Rom
Akwụkwọ Nsọ agwaghị anyị ihe mere Ọnisimọs ji gakwuru Pọl na Rom, ihe karịrị kilomita 1,400 site na be ha bụ́ ebe a nọ dee akwụkwọ ozi ahụ e degaara Faịlimọn n’ihe dị ka na 61 O.A. Ma Pọl gwara Faịlimọn: “Ọ bụrụ na [Ọnisimọs] mejọrọ gị n’ụzọ ọ bụla, ma ọ bụ na o ji gị ụgwọ ọ bụla, gụọ ya n’ụgwọ m ji gị.” (Faịlimọn 18) Okwu ndị a mere ka o doo anya na Ọnisimọs na nna ya ukwu, bụ́ Faịlimọn, na-ese okwu. E dere akwụkwọ ozi Pọl ná nzube nke ime ka ndị ikom abụọ ahụ dịghachi ná mma.
A tụwo aro na Ọnisimọs gbara ọsọ mgbe o zusịrị Faịlimọn ohi iji kwadoo mgbapụ ya gaa Rom. Ebe ahụ ka o zubere izo onwe ya n’etiti ụbara mmadụ.a N’ógbè ndị Gris na ndị Rom, ndị gbara ọsọ bụ oké nsogbu nye ọ bụghị nanị ndị nwere ohu kamakwa nye ndị ọchịchị ọha na eze. E kwuru na Rom n’onwe ya abụwo “nke a maara dị ka ebe a na-agbagakarị” nye ndị ohu gbara ọsọ.
Olee otú Pọl si zute Ọnisimọs? Bible agwaghị anyị. Otú ọ dị, mgbe nnwere onwe na-abụkwaghị ihe ọhụrụ, ọ pụrụ ịbụ na Ọnisimọs ghọtara na ya etinyewo onwe ya n’ọnọdụ dị oké ize ndụ. N’obodo ukwu bụ́ Rom, òtù ndị uwe ojii pụrụ iche na-achụgharị ndị ohu gbara ọsọ, bụ́ ndị iwu ha dara bụ otu n’ime ndị kasị njọ a maara n’iwu oge ochie. Dị ka Gerhard Friedrich si kwuo, “a na-ada ndị ohu gbara ọsọ e jidere ígwè ọkụ n’egedege ihu ha. A na-emekpọkarị ha ọnụ . . . , tụbanyere ha anụ ọhịa n’ime ọgbọ egwuregwu, ma ọ bụ kpọgbuo ha n’elu obe iji gbochie ndị ohu ọzọ iṅomi ihe atụ ha.” Eleghị anya, ka Friedrich na-atụ aro, mgbe ego ahụ Ọnisimọs zutere gwụnahụrụ ya, ọ chọọkwa ebe nzuzo na ọrụ n’enwetaghị, ọ rịọrọ nchebe na nrịọchitere nke Pọl, bụ́ onye ọ nụworo banyere ya n’ụlọ Faịlimọn.
Ndị ọzọ kwenyere na Ọnisimọs ma ụma gbakwuru otu n’ime ndị enyi nna ya ukwu, n’atụmanya nke na site n’ikike nke onye ahụ, a pụrụ ime ka ya na nna ya ukwu nke nwere ezi ihe ọzọ mere o ji eweso ya iwe dịghachi ná mma. Akwụkwọ akụkọ ihe mere eme na-egosi na nke ahụ bụ “ihe zuru ebe nile na ihe ndị ohu nọ ná nsogbu na-emekarị.” Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ ohi Ọnisimọs zuru “yikarịrị ka o zuru ya iji nwee ike iru na nke onye ogbugbo ahụ bụ́ Pọl kama ịbụ akụkụ nke atụmatụ e mere iji gbalaga,” ka ọkà mmụta bụ́ Brian Rapske na-ekwu.
Pọl Enye Aka
Ihe ọ bụla kpatara ịgba ọsọ ahụ, ihe àmà na-egosi na Ọnisimọs chọrọ enyemaka Pọl iji mee ka ya na nna ya ukwu a kpasuru iwe dịghachi ná mma. Nke ahụ chere nsogbu n’ihu Pọl. Onye a bụbu ohu na-ekweghị ekwe bụ́ onye omekome gbara ọsọ. Onyeozi a ò kwesịrị ịnwa inyere ya aka site n’ịmanye enyi ya bụ́ onye Kraịst ịhapụ ime ihe iwu nyere ya ike ya nke inye ya ahụhụ siri ike? Gịnị ka Pọl ga-eme?
Ka ọ na-erule oge ahụ Pọl degaara Faịlimọn akwụkwọ, ihe àmà gosiri na onye ahụ gbara ọsọ anọnyewororị onyeozi ahụ ruo oge ụfọdụ. Ọ dịwo nnọọ ogologo oge nke mere Pọl ji nwee ike ikwu na Ọnisimọs aghọwo ‘nwanna a hụrụ n’anya.’ (Ndị Kọlọsi 4:9) “Arịọ m gị arịrịọ banyere nwa nke m, onye m mụrụ n’ime agbụ m,” ka Pọl kwuru banyere mmekọrịta ime mmụọ nke ya na Ọnisimọs. N’ime ihe nile nwere ike isi na ya pụta, nke a aghaghị ịbụ nke Faịlimọn na-atụghị nnọọ anya ya. Onyeozi ahụ kwuru na ohu ahụ onye bụbu onye “na-abaghị n’ihe” na-alaghachi dị ka nwanna onye Kraịst. Ọnisimọs ga-abụzi ‘onye bara n’ihe,’ ma ọ bụ ‘bara uru,’ si otú a na-adị ndụ kwekọrọ n’ihe aha ya pụtara.—Faịlimọn 1, 10-12.
Ọnisimọs abaworo nnọọ onyeozi ahụ a tụrụ mkpọrọ uru. N’ezie, Pọl gaara eme ka ọ nọnyere ya n’ebe ahụ, ma e wezụga na o megidere iwu, nke a gaara abụkwa ịmabanye aka n’ihe ruuru Faịlimọn. (Faịlimọn 13, 14) N’akwụkwọ ozi ọzọ, e dere n’ihe dị ka n’otu oge ahụ nye ọgbakọ na-ezukọ n’ụlọ Faịlimọn, Pọl zoro aka n’ebe Ọnisimọs nọ dị ka “nwanna anyị kwesịrị ntụkwasị obi, onye a hụkwara n’anya, onye bụ otu onye n’etiti unu.” Nke a na-egosi na Ọnisimọs egosipụtaworị ihe àmà nke ikwesị ntụkwasị obi ya.—Ndị Kọlọsi 4:7-9.b
Pọl gbara Faịlimọn ume iji obiọma nabata Ọnisimọs ma o jighị ikike ndị ozi nwere mee ihe inye ya iwu ka o mee otú ahụ ma ọ bụ mee ka ohu ya nwere onwe ya. N’ihi ọbụbụenyi na ịhụnanya ha nwekọrọ, Pọl ji n’aka na Faịlimọn “ga-eme ọbụna karị” ka a rịọrọ ya. (Faịlimọn 21) Ihe “ọbụna karị” pụtara bụ nke a na-akọwachaghị n’ihi na nanị Faịlimọn pụrụ ikpebi n’ụzọ ziri ezi ihe ọ ga-eme banyere Ọnisimọs. Ụfọdụ aghọtawo okwu Pọl dị ka ihe ngosipụta nke arịrịọ ka ‘e zighachi onye ahụ gbara ọsọ ka o wee nwee ike ịnọgide na-enyere Pọl aka dị ka ọ malitewororị ime.’
Faịlimọn ọ̀ nakweere arịrịọ Pọl maka Ọnisimọs? O yiri ka e nwere ihe ịrụ ụka dị nta na o mere otú ahụ, ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịkpasuworị ndị Kọlọsi ndị ọzọ nwere ohu iwe bụ́ ndị gaara achọwo ịhụ ka Ọnisimọs natara ntaramahụhụ nlereanya iji gbochie ndị ohu nke ha iṅomi ihe atụ ya.
Ọnisimọs—Nwoke Mere Mgbanwe
Otú o sina dị, Ọnisimọs laghachiri na Kọlọsi na-eyikwasị mmadụ ọhụrụ. Echiche ya gbanwere site n’ike nke ozi ọma ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ghọrọ onye òtù kwesịrị ntụkwasị obi nke ọgbakọ ndị Kraịst dị n’obodo ahụ. E kpugheghị n’Akwụkwọ Nsọ ma Faịlimọn o mesịrị tọhapụ Ọnisimọs. Otú ọ dị, n’ụzọ ime mmụọ, onye ahụ gbaburu ọsọ aghọwo nwoke nweere onwe ya. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 7:22.) Nnwogha ndị yiri nke ahụ na-emekwa taa. Mgbe ndị mmadụ tinyere ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha, ọnọdụ na ụdị onye mmadụ bụ na-agbanwe. A na-enyere ndị e leburu anya na ha abaghị n’ihe n’obodo aka ịghọ ụmụ amaala kwesịrị nṅomi.c
Lee mgbanwe ntọghata gaa n’ezi okwukwe kpatara! Ọ bụ ezie na Ọnisimọs mbụ ahụ pụrụ ịbụworịị onye “na-abaghị n’ihe” nye Faịlimọn, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Ọnisimọs ọhụrụ biri ndụ kwekọrọ n’aha ya dị ka onye “bara uru.” N’ezie, ọ bụkwa ngọzi na Faịlimọn na Ọnisimọs ghọrọ ndị e jikọrọ n’òtù ụmụnna ndị Kraịst.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iwu Rom kọwara onye servus fugitivus (ohu gbara ọsọ) dị ka ‘onye hapụrụ nna ya ukwu, ná nzube nke alaghachighị.’
b Na njem a nke ịlaghachi Kọlọsi, o yiri ka e nyere Ọnisimọs na Tikikọs atọ n’ime akwụkwọ ozi ndị nke Pọl, e tinyere ugbu a n’ime Bible. Tinyere akwụkwọ ozi a e degaara Faịlimọn, ndị a bụ akwụkwọ ozi ndị Pọl degaara ndị Efesọs na ndị Kọlọsi.
c Maka inweta ihe atụ, biko lee Teta!, July 8, 1996, peji nke 10-15; March 8, 1997 (Bekee), peji nke 11-13; Ụlọ Nche, August 1, 1989, peji nke 30-31; February 15, 1997, peji nke 21-24.
[Igbe dị na peeji nke 30]
Ndị Ohu n’Okpuru Iwu Rom
N’okpuru iwu Rom nke dị irè ná narị afọ mbụ O.A., ihe ọ bụla bụ mmasị, ọchịchọ, na mkpali nna ya ukwu ka ohu na-eme. Dị ka onye na-enye nkọwa bụ́ Gerhard Friedrich si kọọ, “n’ụzọ bụ isi na n’ụzọ iwu, ohu abụghị mmadụ, kama ọ bụ arịa nke onye nwe ya pụrụ iji mee ihe otú masịrị ya. . . . E dotere [ya] na anụ ụlọ na ngwá ọrụ n’otu ọkwá, a naghịkwa echebara ya echiche ọ bụla n’iwu obodo.” Ohu apụghị ịgba akwụkwọ maka ikpe na-ezighị ezi ndị o nwetara. N’ụzọ bụ isi, ọ ghaghị ime ihe nile nke nna ya ukwu nyere ya n’iwu. E nweghị ịkpa ókè na ntaramahụhụ nna ya ukwu iwe ji pụrụ inye. Ọbụna maka ịda iwu dị nta, o ji ikike nke ndụ na ọnwụ.*
Ebe ndị bara ọgaranya pụrụ inweworị ọtụtụ narị ndị ohu, ọbụna ezinụlọ na-abaghị ọgaranya pụrụ inweworị abụọ ma ọ bụ atọ. “Ọrụ ndị ohu na-arụ n’ụlọ dịgasị nnọọ iche,” ka ọkà mmụta bụ́ John Barclay na-ekwu. “Anyị na-ahụ ndị ohu dị ka ndị odozi ụlọ, ndị osi ite, ndị na-eke nri, ndị nhicha, ndị obu ozi, ndị ole nwa, ndị na-eku nwa na ndị na-ejere mmadụ ụdị ozi nile, ka a hapụgodị ndị ọkà dị iche iche mmadụ pụrụ ịhụ n’ụlọ ndị bukarịrị ibu na nke ndị ka baa ọgaranya. . . . N’omume, ọdịdị ndụ nke ohu na-elekọta ụlọ dabeere nke ukwuu n’ọnọdụ uche nke nna ya ukwu, nke pụkwara ịrụpụta ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ: ịnọ nna ukwu dị obi ọjọọ nso pụrụ ịkpata nhụjuanya na ụdị ajọ ihe dị iche iche a na-akparaghị ókè, ma nna ukwu dị obiọma na afọ ọma pụrụ ime ka ndụ kwe nnagide, nweekwa olileanya. E nwere ihe atụ ndị a ma ama nke mmeso obi ọjọọ ndị e dekọrọ n’akwụkwọ mgbe ochie, ma e nwekwara ọtụtụ ihe odide na-agba àmà mmetụta na-ekpo ọkụ n’etiti ụfọdụ ndị nwere ohu na ohu ha.”
*Banyere ịgba ohu n’etiti ndị Chineke n’oge ochie, lee Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, Mpịakọta nke 2, peji nke 977-979.