Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ntachi Obi Eduga ná Ngọzi Chineke na Malawi
JOSEF bu ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. (Ndị Hibru 11:22) Ọ bụkwa nwoke nwere ntachi obi pụrụ iche. N’agbanyeghị na ụmụnne ya raara ya nye, e renye ya n’ịbụ ohu ugboro abụọ, e mesịakwa jiri ebubo ụgha tụọ ya mkpọrọ, Josef adaghị. Kama nke ahụ, o ji ntachi obi die mkpagbu ruo ọtụtụ afọ, jiri obi umeala na-echere ngọzi Jehova.—Jenesis 37:23-28, 36; 39:11-20.
N’otu aka ahụ taa, Ndịàmà Jehova bi na Malawi ejiriwo ndidi chere ngọzi Chineke. Ruo afọ 26, Ndịàmà a bụ́ ndị Kraịst diri mmachibido iwu gọọmenti, mmegide siri ike, na ọtụtụ arụrụala. Ma ntachi obi ha ewetawo uru!
Mgbe mkpagbu tiwapụrụ na Malawi ná ngwụsị 1967, e nwere ihe dị ka ndị nkwusa Alaeze 18,000. Chee echiche ọṅụ Ndịàmà ahụ nwere mgbe ha nụrụ na afọ ije ozi 1997 ji ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ ndị nkwusa 38,393 malite—ihe karịrị okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ha ná mbido mmachibido iwu ahụ! Ọzọkwa, ndị bịara Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” 13 na Malawi ruru ihe karịrị 117,000. N’ezie, Jehova agọziwo okwukwe na ntachi obi ha.
Ihe atụ nke ngọzi a bụ ahụmahụ nwa okoro dị afọ 14 a na-akpọ Machaka. Mgbe Machaka nakweere isoro Ndịàmà Jehova mụọ Bible, ndị mụrụ ya were iwe dị ukwuu. Ha sịrị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ Onyeàmà, ị ghaghị isi n’ụlọ a kwapụ.” Otú ọ dị, iyi egwu a emeghị ka ọ kwụsị ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe ya. N’ihi ya, nne na nna Machaka jichiri uwe ya nile. Ụmụnna meghachiri omume site n’ịzụrụ ya ndị ọzọ. Mgbe nne na nna Machaka matara nke a, ha gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na Ndịàmà ahụ na-aga ịkwado gị, ị ghaghị ịpụ ma gaa soro ha biri.” Mgbe ọ tụlesịrị okwu ahụ nke ọma, Machaka hapụrụ ụlọ, otu ezinụlọ Ndịàmà n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ nabatara ya.
Iwe were nne na nna Machaka nke na ha kpebiri ịkwapụ n’ógbè ahụ iji wee zere iso Ndịàmà ahụ nwee mmekọrịta ọ bụla. N’ezie, nke a nyere Machaka nsogbu, ma o nwetara nkasi obi dị ukwuu mgbe ụmụnna so ya tụlee Abụ Ọma 27:10, bụ́ nke na-asị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.”
Ka oge na-aga, nne na nna Machaka gbanwere obi ha, o kpebikwara ịlaghachi ụlọ. O doro anya na mkpebisi ike nke nwa ha nwoke ijere Jehova ozi nwere mmetụta dị ike n’ahụ ha n’ihi na ha chọkwara isoro Ndịàmà Jehova nwee ọmụmụ Bible! Ha gakwara ụbọchị atọ dum nke Mgbakọ Distrikti “Ndi Ozi nke Udo Chineke,” bụ́ nke a kpaliri ha ikwu mgbe ọ gasịrị, sị: “N’ezie, nke a bụ nzukọ Chineke.”
Ee, mmegide pụrụ iweta ule, ma ndị ozi Chineke na-eguzosi ike n’ihe adịghị ada mba. Ha na-eji obi ike na-aga n’ihu, na-amara na “mkpagbu na-arụta ntachi obi; ntachi obi ahụ na-arụtakwa [ọnọdụ a nwapụtara anwapụta, NW].” (Ndị Rom 5:3, 4) Ndịàmà Jehova bi na Malawi pụrụ ịgba akaebe n’ụzọ ziri ezi na ntachi obi na-eduje ná ngọzi Chineke.