Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 3/1 p. 25
  • Chineke Na-eme Ka Ọ Na-aba Ụba n’Alaska

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Na-eme Ka Ọ Na-aba Ụba n’Alaska
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Teta! Mee Ihe n’Ụzọ Dị Irè
    Teta!—2002
  • Obere Àjà Ndị Anyị Chụrụ Wetaara Anyị Ngọzi Dị Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • A Gọziri Anyị n’Ụba Maka Ịnọgide Na-enwe Mmụọ Ozi Ala Ọzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Ghọọ Enyi Chineke?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 3/1 p. 25

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Chineke Na-eme Ka Ọ Na-aba Ụba n’Alaska

N’OKPURU ihe mkpuchi nke snow na ice, otu ntakịrị mkpụrụ na-echere ohere iji tojuo. N’ime mkpirikpi ọnwa atọ ndị mejupụtara oge okpomọkụ Alaska, otu mkpụrụ nke akwụkwọ cabbage obosara ya dị milimita atọ pụrụ itoru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilogram 40! Ee, ala a ọtụtụ ndị cheburu na ọ bụ ọzara na-adịghị emepụta ihe, nke na-ajụ oké oyi pụrụ imepụta mkpụrụ bara ụba.

Nke a bụ eziokwu karịsịa banyere ubi ime mmụọ dị n’Alaska. N’ebe ahụ, n’ala nke ogologo oge oyi, Ndịàmà Jehova nọgidere na-akụ mkpụrụ Alaeze. Dị ka ọ dị n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, Chineke na-eme ka mkpụrụ ahụ na-aba ụba n’obi ndị na-amị mkpụrụ.—1 Ndị Kọrint 3:6, 7.

● Ka ọ nọ n’otu bọs ụlọ akwụkwọ, otu Onyeàmà na-eto eto aha ya bụ Vanessa hụrụ otu nwata akwụkwọ ibe ya, bụ́ Ann, onye na-anọkarị nanị ya. Ann yiri onye nọ ná mwute, ya mere Vanessa kpọrọ Ann ka ọ nọdewe ya. Ka a sịkwa ihe mere Ann ji nọrọ ná mwute! Nne ya anwụwo n’ihi nkụchi obi, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, nna ya nwụrụ n’ihi ọrịa cancer. Ọ bụ ya mere Ann ji binyere ndị ikwu ya n’Alaska.

Vanessa kwụsịtụrụ n’ụlọ enyi ọhụrụ ya ka ọ nọ n’ozi ubi otu Saturday ma hapụrụ ya broshuọ ahụ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? Na Monday na-esote ya n’ụlọ akwụkwọ, Ann chọtara Onyeàmà ahụ na-eto eto. Ann nwere ọtụtụ ajụjụ Bible, bụ́ ndị Vanessa zara. “Olee ebe unu na-eje ụka?” ka ọ jụrụ. Ná mgbede ahụ Ann gara nzukọ mbụ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

O weghị nwa mgbei a dị afọ 17 ogologo oge ịchọta ọtụtụ “nna” na “nne,” dị nnọọ ka Jisọs kwere ná nkwa. (Matiu 19:29) Leekwa oge ọṅụ ọ bụ ịhụ Ann nke na-enwe obi ụtọ ma na-amụmụ ọnụ ọchị ka o gosipụtara nrara ya nye Jehova site na baptism ime mmiri ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke”!

● N’ebe ime ime nke ógbè buru ibu nke Alaska Na-atụ Oyi—ebe ọzara ndị dị ọtụtụ narị kilomita kewapụrụ obodo nta dị iche iche—e jiwo ụgbọelu nwere injin abụọ nke Watch Tower Society kụọ mkpụrụ Alaeze n’ihe karịrị ógbè 150. Ma uto ime mmụọ site n’ọmụmụ Bible chiri anya na-adabere n’iderịta akwụkwọ ozi. Ebe ide akwụkwọ ozi bụ ihe ịma aka nye ọtụtụ, ọ dị mkpa ka onye na-akụzi Bible nwee nkà nchepụta ihe iji mee ka mmasị onye a na-amụrụ ihe dịgide. Olee otú a pụrụ isi rụzuo nke a?

Kathy duziiri Edna ọmụmụ Bible na-aga n’ihu, ọ bụ ezie na ha ji ihe karịrị kilomita 600 bisaa ebisaa! Kama idepụtaghachi nnọọ ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ ahụ e ji amụ ihe, Kathy mepụtara akwụkwọ nwere ajụjụ ndị ahụ ma nye ohere maka idenye azịza ha. Mgbe Edna dejupụtasịrị azịza ha, Kathy zaghachiri ma denye okwu ndị dị mkpa iji mee ka otu isi ihe doo anya karị. Kathy na-ekwu, sị: “Ana m esetịpụ uhuruchi Wednesday maka ‘ọmụmụ ihe’ anyị, ana m agbalịkwa ịnọgidesi ike na ya dị ka m ga-eme ná ndokwa ọmụmụ Bible ọ bụla ọzọ. Ezigakwaara m Edna envelopu a nyara stampụ, nke bu adres m. Ebe ọ na-ewe izu abụọ iji nweta akwụkwọ ozi, ọmụmụ ihe site n’iderịta akwụkwọ ozi yiri ihe na-adịghị aga ọsọ ọsọ.”

Cheedị obi ụtọ ha mgbe Kathy na Edna zutere ihu na ihu ná mgbakọ distrikti e nwere n’Anchorage mgbe ọnwa iri nke ịmụ ihe site ná nzirịta ozi gasịrị! Ndịàmà ahụ nwekwara obi ụtọ inwe n’etiti ha ndị a na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị sitere n’ọtụtụ obodo nta dịpụgasịrị adịpụ n’Alaska.

Ọ bụ ezie na uto pụrụ iyi ihe na-adịghị aga ọsọ ọsọ mgbe ụfọdụ, “mkpụrụ ọkụkụ” ụfọdụ na-epu ngwa ngwa mgbe e kpughere ha nye ìhè nke eziokwu. Ná nkezi, a na-eme ihe karịrị otu narị ndị ọhụrụ na-eto Jehova baptism kwa afọ n’Alaska! Anyị na-asị, “Ekele dịrị gị, Jehova,” maka ime ka ọ na-aba ụba!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya