Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 3/15 p. 10-11
  • Ndị Ohu Mmadụ Ka Ọ̀ Bụ Ndị Na-ejere Chineke Ozi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ohu Mmadụ Ka Ọ̀ Bụ Ndị Na-ejere Chineke Ozi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ize Ndụ nke Ịgbaso Ụmụ Mmadụ
  • Ndịàmà Jehova Hà Bụ Òtù Nzuzo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Kraịst Na Ọha Mmadụ Nke Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Okpukpe Ndịàmà Jehova Ọ̀ Bụ Okpukpe Ndị Amerịka?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Ndịàmà Jehova Hà Nọ n’Òtù?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 3/15 p. 10-11

Ndị Ohu Mmadụ Ka Ọ̀ Bụ Ndị Na-ejere Chineke Ozi?

“NDỊÀMÀ JEHOVA bụ ndị a ga-enwetụ mmasị na ha.” Nke ahụ ka akwụkwọ Germany bụ́ Seher, Grübler, Enthusiasten (Ndị Na-ahụ Ọhụụ, Ndị Na-eche Echiche, Ndị Na-anụ Ọkụ n’Obi) na-ekwu. Ọ bụ ezie na ọ katọtụrụ Ndịàmà, ọ na-ekweta, sị: “N’ozuzu, ha na-adị ndụ na-enweghị ịta ụta, nke ndị nwetụrụ ihe. Ha dị uchu, na-ejikwa akọ na uche arụ ọrụ, bụrụ ụmụ amaala dị nwayọọ, na-akwụ ụtụ isi ha n’eziokwu. Ha na-ezere ịchụso akụ̀ na ụba ọnwụ ọnwụ. . . . Ọzụzụ ha ná mgbakọ dị iche iche kwesịrị inye otuto. Mmụọ nke ịchụ onwe ha n’àjà na nke òtù okpukpe ọzọ ha nhata; n’ihe banyere ozi ahụ, ha karịrị ndị ọzọ nile. Ma ihe na-ebuli ha elu karịa chọọchị ndị Kraịst na òtù ndị ọzọ nke oge anyị bụ mkpebisi ike kwụụrụ chịm nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha ji akpọsa nkwenkwe ha n’okpuru ọnọdụ ọ bụla, n’agbanyeghịkwa ihe ize ndụ nile.”a

N’agbanyeghị ezi nchọpụta dị otú ahụ, ụfọdụ ndị na-anwa inye echiche dị nnọọ iche banyere Ndịàmà Jehova. N’ihe ka ọtụtụ ná mba ndị dị na gburugburu ụwa, Ndịàmà ekpewo okpukpe ha ọtụtụ iri afọ n’enweghị ihe mgbochi. Ọtụtụ nde ndị mmadụ maara ha, na-akwanyere ha ùgwù, kwetakwa na ha nwere ikike ikpe okpukpe ha. Gịnịzi mere e ji nwee mgbagwoju anya ọ bụla banyere ndị Ndịàmà Jehova bụ?

Ikekwe otu ihe kpatara mgbagwoju anya ahụ bụ na n’oge na-adịbeghị anya, ọtụtụ òtù okpukpe ndị ọzọ etinyewo aka n’idina ụmụaka, ìgwè mmadụ igbu onwe ha, na mwakpo nke ndị na-eyi egwu. N’ezie, ọ bụghị nanị ndị a na-akpọ ịrọ òtù na-eme ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị dị ka ndị a, n’ihi na ha na-apụta n’ụzọ na-arị elu—ọ bụghị n’etiti Ndịàmà Jehova kama n’okpukpe ndị ọzọ a ma ama. Ya mere, n’ihe banyere okpukpe, ọtụtụ ndị mmadụ enwewo obi abụọ, ọbụna ụfọdụ enweghị omume enyi.

Ihe Ize Ndụ nke Ịgbaso Ụmụ Mmadụ

A kọwawo “ịrọ òtù” dị ka “òtù na-araparasi ike ná nkwenkwe pụrụ iche ma ọ bụ n’otu onye ndú.” N’otu aka ahụ, ndị nọ “n’òtù nzuzo” nwere “nsọpụrụ dị ukwuu nye mmadụ, echiche, ma ọ bụ ihe.” N’ihi nraparasi ike dị otú ahụ nye ndị ndú bụ́ mmadụ na echiche ha, ndị òtù nke ịrọ òtù na òtù nzuzo nọ n’ihe ize ndụ nke ịghọ ndị odibo mmadụ. Mmekọrịta siri ike nke dabeere n’onye ndú pụrụ iduga ná ndabere mmetụta uche na nke ime mmụọ na-adịghị mma. A pụrụ ime ka ihe ize ndụ ahụ dịkwuo njọ mgbe a zụlitere mmadụ site na nwata n’ebe e nwere ịrọ òtù.

Ọ dị ndị nwere nchegbu ndị dị otú ahụ banyere okpukpe mkpa inweta ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya. Ọ pụrụ ịbụ na a gwawo ụfọdụ na Ndịàmà Jehova so n’òtù okpukpe nke na-eme ndị òtù ya ndị ohu, na-achịkwa ha n’ụzọ aka ike, na-akpara nnwere onwe ha ókè n’ụzọ na-adịghị mkpa, meekwa ha ndị na-ekwenyeghị n’ọha mmadụ n’ozuzu ya.

Ndịàmà Jehova maara na nchegbu ndị a enweghị ezi ihe kpatara ha. Ya mere, ha na-akpọ gị òkù ime nchọpụta n’onwe gị. Mgbe ị tụlesịrị ya nke ọma, kpebiziere onwe gị. Ndịàmà hà bụ ndị na-ejere Chineke ozi, dị ka ha na-azọrọ, ka hà bụ n’ezie ndị ohu mmadụ? Gịnị bụ isi iyi nke ume ha? Isiokwu abụọ na-esonụ ga-enye azịza na-eju afọ nye ajụjụ ndị dị otú ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Mbipụta 1950 mbụ enweghị okwu ndị dị n’elu. Mpụta ya ná mbipụtaghachi nke 1982 si otú a na-ekpughe àgwà nke ịghọta Ndịàmà Jehova nke ọma karị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya