Constantine Onye Ukwu—Ọ̀ Bụ Onye Nkwado nke Iso Ụzọ Kraịst?
Eze Ukwu Rom bụ́ Constantine so n’ime ndị ikom ole na ole akụkọ ihe mere eme ji okwu ahụ bụ́ “Onye Ukwu” chọọ aha ha mma. Krisendọm agbakwụnyewo okwu ndị bụ́ “senti,” “onyeozi nke iri na atọ,” “onye ya ndị ozi hà nhata n’ịdị nsọ,” na ‘onye a họpụtara site ná nduzi Chineke iji wetazuo nchigharị kasị ukwuu n’ụwa nile.’ N’aka nke ọzọ, ụfọdụ na-akọwa Constantine dị ka “onye ọbara tetọrọ, e ji arụrụala a na-apụghị ịgụta ọnụ mara, jupụtakwara n’aghụghọ, . . . ajọ onye ọchịchị nchịgbu, nke ikpe mpụ ndị na-awụ ibobo n’ahụ mara.”
A KỤZIWORO ọtụtụ ndị na-azọrọ ịbụ ndị Kraịst na Constantine Onye Ukwu bụ otu n’ime ndị baara Iso Ụzọ Kraịst uru kasị pụta ìhè. Ha na-asị na ọ bụ ya gbapụtara ndị Kraịst site ná nhụsianya nke mkpagbu ndị Rom na inye ha nnwere onwe okpukpe. Ọzọkwa, e kweere n’ọtụtụ ebe na ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi na-agbaso nzọụkwụ Jisọs Kraịst na-enwe ọchịchọ dị ike ịkwado ihe omume ndị Kraịst. Chọọchị Ọtọdọks Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Chọọchị Kọptik akpọwo Constantine na nne ya, bụ́ Helena, “ndị senti.” A na-eme ememe ha na June 3 ma ọ bụ n’ikwekọ na kalenda chọọchị ahụ, na May 21.
Ònye n’ezie bụ Constantine Onye Ukwu? Gịnị bụ òkè o keere n’iwulite Iso Ụzọ Kraịst mgbe oge ndị ozi gasịrị? Ọ na-enye nnọọ ihe ọmụma ikwe ka akụkọ ihe mere eme na ndị ọkà mmụta zaa ajụjụ ndị a.
Constantine n’Akụkọ Ihe Mere Eme
A mụrụ Constantine, nwa Constantius Chlorus, na Naissus dị na Serbia n’ihe dị ka n’afọ 275 O.A. Mgbe nna ya ghọrọ eze ukwu nke ebe ọdịda anyanwụ nke Rom na 293 O.A., ọ nọ na-alụ ọgụ na Danube n’okpuru iwu si n’aka Eze Ukwu Galerius. Constantine laghachiri n’akụkụ nna ya na-anwụ anwụ na Britain n’afọ 306 O.A. Oge na-adịghị anya mgbe nna ya nwụsịrị, ndị agha bugoro Constatine n’ọkwá nke eze ukwu.
N’oge ahụ, mmadụ ise ọzọ zọọrọ na ha bụ Augusti. N’oge dị n’agbata 306 na 324 O.A., nke Constantine ghọrọ eze ukwu e nwere nanị ya mgbe ọ gasịrị, bụ oge agha obodo na-aga n’ihu. Mmeri n’agha abụọ nyere Constantine ọnọdụ n’akụkọ ihe mere eme nke Rom ma mee ya nanị onye ọchịchị nke Alaeze Ukwu Rom.
Na 312 O.A., Constantine meriri onye iro ya bụ́ Maxentius n’ọgụ nke Milvian Bridge ná mpụga Rom. Ndị nkwado okwukwe ndị Kraịst zọọrọ na n’oge agha ahụ, otu obe na-enwu ọkụ nke nwere okwu Latin ndị bụ́ In hoc signo vinces, pụtara “N’ihe ịrịba ama a merie,” pụtara n’okpuru anyanwụ. E kwekwaara na ná nrọ, a gwara Constantine ka ọ kanye mkpụrụ okwu abụọ mbụ nke aha Kraịst na Grik n’ọta usuu ndị agha ya. Otú ọ dị, a kọghị akụkọ a n’usoro o mere. Akwụkwọ bụ́ A History of Christianity na-ekwu, sị: “E nwere mmegiderịta nke ihe ama banyere oge, ebe na ụmụ irighiri ihe nke ọhụụ a.” Ka ọ na-anabata Constantine na Rom, otu onye Senate bụ́ onye ọgọ mmụọ kpọrọ ya Augustus bụ́ isi na Pontifex Maximus, nke bụ́, onyeisi nchụàjà nke okpukpe ndị ọgọ mmụọ nke alaeze ukwu ahụ.
Na 313 O.A., Constantine mere ndokwa ka ya na Eze Ukwu Licinius, bụ́ onye na-achị ógbè ebe ọwụwa anyanwụ, jikọọ aka. Site n’Iwu nke Milan, ha jikọrọ aka nye òtù okpukpe nile nnwere onwe ife ofufe na ikike hà nhata. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ebelata ịdị mkpa nke akwụkwọ a, na-ekwu na ọ bụ akwụkwọ ozi nkịtị a na-edekarị, na ọ bụghịkwa akwụkwọ ọchịchị gbara ọkpụrụkpụ na-egosi mgbanwe nke ụkpụrụ n’ebe Iso Ụzọ Kraịst dị.
N’ime afọ iri sochirinụ, Constantine meriri onye ikpeazụ fọdụrụ na-ama ya aka, bụ́ Licinius, wee ghọọ onye ọchịchị na-enweghị mgbagha n’ógbè Rom. Na 325 O.A., ka bụrụkwa onye a na-emebeghị baptism, ọ nọrọ n’isi nzukọ kansụl njikọ okpukpe nke chọọchị “ndị Kraịst,” nke katọrọ echiche Arius ma dee akwụkwọ nke nkwenkwe ndị bara uru a kpọrọ Ụkpụrụ Okwukwe Nicene.
Constantine dara ajọ ọrịa n’afọ 337 O.A. Ná ngwụsị nke ndụ ya, e mere ya baptism, o wee nwụọ. Mgbe ọ nwụsịrị, Senate dotere ya n’etiti chi ndị Rom.
Okpukpe n’Atụmatụ Constantine
N’izo aka n’àgwà zuru ebe nile nke ndị eze ukwu Rom nke narị afọ nke atọ na nke anọ nwere n’ebe okpukpe dị, akwụkwọ bụ́ Istoria tou Ellinikou Ethnous (Akụkọ Mba Gris) na-asị: “Ọbụna mgbe ndị nọ n’ocheeze na-enweghị àgwà okpukpe miri emi dị otú ahụ, na-ekwenyere echiche nke oge ahụ, ha hụrụ ya dị ka ihe dị mkpa inye okpukpe ọnọdụ mbụ n’atụmatụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha, iji mee ka, ma ọ dịghị ihe ọzọ, omume ha nwee njimara okpukpe.”
N’ezie, Constantine bụ nwoke nke oge ya. Ná mmalite nke ọrụ ya, nkwado onye bụ́ “Chi” dị ya mkpa, chi ndị Rom na-apụ n’anya apụghịkwa iweta nke a. Alaeze ukwu ahụ, tinyere okpukpe ya na òtù ndị ọzọ na-adakpọ, ihe ọhụrụ nke na-enye ume dịkwa mkpa iji wusighachi ya ike. Akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ Hidria na-asị: “Constantine nwere mmasị karịsịa n’Iso Ụzọ Kraịst n’ihi na ọ kwadoro, ọ bụghị nanị mmeri ya kamakwa nhazigharị nke alaeze ukwu ya. Chọọchị ndị Kraịst ndị dị ebe nile ghọrọ ihe nkwado nke ọchịchị ya. . . . O ji ndị ụkọchukwu nọ n’ọkwá ukwu n’oge ahụ gbaa onwe ya gburugburu . . . , ọ rịọkwara ka ha jigidesie ịdị n’otu ha ike.”
Constantine ghọtara na a pụrụ iji okpukpe “ndị Kraịst”—ọ bụ ezie na o si n’ezi ofufe dapụ ma rụọ nnọọ arụ n’oge ahụ—mee ihe dị ka ihe na-enye ume ọhụrụ, na-ewetakwa ịdị n’otu iji mee atụmatụ ukwu ya maka ọchịchị alaeze ukwu. N’iwere ntọala nke Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ mee ihe iji nweta nkwado n’iwere nzube ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya gaa n’ihu, o kpebiri ijikọta ndị mmadụ n’okpuru otu okpukpe “katọlik,” ma ọ bụ nke zuru ebe nile. E nyere omenala na ememe ndị ọgọ mmụọ aha “ndị Kraịst.” E nyekwara ndị ụkọchukwu “ndị Kraịst” ọkwá, ụgwọ ọnwa, na ike dị ukwuu nke ndị nchụàjà ndị ọgọ mmụọ.
N’ịchọ nkwekọ okpukpe n’ihi ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Constantine mere ngwa ichipịa echiche ndị dị iche, ọ bụghị n’ihi ozizi eziokwu, kama ná ndabere nke nnakwere ihe ka ọtụtụ. Esemokwu oké ikwesi olu ike dị n’ime chọọchị “ndị Kraịst” kewara ekewa nke ukwuu nyere ya ohere ime ihe dị ka onye ogbugbo “Chineke zitere.” Site ná mmekọrịta ya na ndị Donatist nọ n’Ugwu Africa na ụmụazụ Arius n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke alaeze ukwu ahụ, ọ chọpụtara ngwa ngwa na arịrịọ ezughị iji guzobe okwukwe siri ike, nke dị n’otu.a Ọ bụ ná mgbalị ikpezi esemokwu ndị Arius ka o ji kpọọ nzukọ mbụ nke chọọchị nile n’akụkọ ihe mere eme nke chọọchị ahụ.—Lee igbe bụ́ “Constantine na Kansụl nke Nicaea.”
Banyere Constantine, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Paul Johnson kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ndị bụ isi mere o ji nabata Iso Ụzọ Kraịst pụrụ ịbụwo na o nyere ya onwe ya na Ọchịchị ohere ịchịkwa ụkpụrụ Chọọchị banyere nkwenkwe ọtọdọks na otú e si emeso ịdịpụ iche n’ụkpụrụ.”
Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ghọrọ Onye Kraịst?
Johnson na-asị: “Ọ dịghị mgbe Constantine hapụrụ ofufe anyanwụ, ọ hapụkwara anyanwụ ná mkpụrụ ego ya.” Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “Constantine gosiri ihu ọma hà nhata n’ebe okpukpe abụọ ahụ dị. Dị ka pontifex maximus, o lekọtara ofufe ndị ọgọ mmụọ ma chebe ikike ya.” “Ọ dịghị mgbe Constantine ghọrọ onye Kraịst,” ka akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ Hidria na-ekwu, na-agbakwụnye: “Eusebius nke Caesarea, onye dere akụkọ ndụ ya, kwuru na ọ ghọrọ onye Kraịst n’oge ndị ikpeazụ nke ndụ ya. Nke a erijughị afọ, ebe ọ bụ na n’ụbọchị bu ya ụzọ, [Constantine] chụụrụ Zeus àjà n’ihi na o nwekwara utu aha ahụ bụ́ Pontifex Maximus.”
Ruo ụbọchị ọnwụ ya na 337 O.A., Constantine nwere utu aha ndị ọgọ mmụọ bụ́ Pontifex Maximus, onye isi kasịnụ n’okwu okpukpe. Banyere baptism ya, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịjụ, sị, Ezi nchegharị na nchigharị hà butere ya ụzọ, dị ka Akwụkwọ Nsọ chọrọ? (Ọrụ 2:38, 40, 41) Ọ̀ bụ mmikpu n’ime mmiri kpam kpam dị ka ihe na-egosi nrara Constantine raara onwe ya nye Jehova Chineke?—Tụlee Ọrụ 8:36-39.
Ọ̀ Bụ “Senti”?
Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “O ruuru Constantine ịbụ onye a kpọrọ Onye Ukwu n’ihi ihe ndị o mere karịa ihe ọ bụ. N’ezie, e jiri àgwà tụọ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, o so ná ndị kasị njọ a kpọworo utu aha ahụ bụ́ [Onye Ukwu].” Akwụkwọ bụ́ A History of Christianity na-agwakwa anyị, sị: “E nwere akụkọ ndị mbụ banyere obi ọkụ ya na obi ọjọọ ya n’iwe iwe. . . . O nweghị nkwanye ùgwù ọ bụla maka ndụ mmadụ . . . Ndụ onwe ya ghọrọ ihe ụjọ ka ọ na-aka nká.”
Dị ka ihe àmà na-egosi, Constantine nwere ajọ nsogbu omume. Otu onye nnyocha akụkọ ihe mere eme na-ekwu na “àgwà obi ọkụ ya na-abụkarị ihe mere ọ na-eji eme mpụ.” (Lee igbe bụ́ “Igbu Ọchụ n’Usoro Ndị Eze.”) Constantine abụghị “onye Kraịst,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ H. Fisher na-azọrọ n’akwụkwọ ya bụ́ History of Europe. Eziokwu ndị ahụ emeghị ka a mara ya dị ka ezi onye Kraịst yikwasịworo “mmadụ ọhụrụ ahụ” na onye a pụrụ ịhụ n’ime ya mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke—ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọ, na imeru ihe n’ókè.—Ndị Kọlọsi 3:9, 10; Ndị Galetia 5:22, 23.
Ihe Ndị Si ná Mgbalị Ya Pụta
Dị ka Pontifex Maximus ndị ọgọ mmụọ—n’ihi ya bụrụkwa onye isi okpukpe nke Alaeze Ukwu Rom—Constantine nwara inweta obi ndị bishọp nke chọọchị ahụ si n’ezi ofufe dapụ. O nyere ha ọkwá ọchịchị, ịbụ ndị a ma ama, na akụ̀ na ụba dị ka ndị ọrụ nke okpukpe mba Rom. Catholic Encyclopedia na-ekweta, sị: “Ụfọdụ ndị bishọp, n’ịbụ ndị ịdị ebube nke òtù ndị ọchịchị mere ka ha kpuo isi, gara n’ihu ọbụna n’ito eze ukwu ahụ dị ka mmụọ ozi Chineke, dị ka onye dị nsọ, na ibu amụma na ọ ga-achị n’eluigwe, dị ka Ọkpara Chineke.”
Ka Iso Ụzọ Kraịst nke si n’ezi ofufe dapụ bịara nwee ihu ọma nke ọchịchị, ọ ghọwanyere akụkụ nke ụwa a, nke usoro ihe a na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe, sikwa n’ozizi Jisọs Kraịst kpafuo. (Jọn 15:19; 17:14, 16; Mkpughe 17:1, 2) N’ihi ya, e jikọtara “Iso Ụzọ Kraịst” na ozizi na omume ụgha—Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ọkụ ala mmụọ, pọgatrị, ekpere maka ndị nwụrụ anwụ, iji chapleti, ihe oyiyi, onyinyo, na ihe ndị yiri ha na-eme ihe.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 6:14-18.
Site n’aka Constantine, chọọchị ketakwara ọchịchọ nke ịdị aka ike. Ndị ọkà mmụta bụ́ Henderson na Buck sịrị: “E merụrụ ịdị mfe nke Ozi Ọma ahụ, e webatara ihe omume mpako na ememe dị iche iche, e nyere ndị nkụzi nke Iso Ụzọ Kraịst nsọpụrụ na ihe ùgwù dị iche iche nke ndị ụwa, e wee gbanwee Alaeze nke Kraịst n’ụzọ dị ukwuu ịbụ alaeze nke ụwa a.”
Olee Ebe Ezi Iso Ụzọ Kraịst Dị?
Akụkọ ihe ndị mere eme na-ekpughe eziokwu dị “n’ịbụ onye ukwu” nke Constantine. Kama ịbụ nke Jisọs Kraịst guzobere, bụ́ Onyeisi nke ezi ọgbakọ ndị Kraịst, Krisendọm n’akụkụ ụfọdụ malitere site n’ime ihe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ngwa ngwa na ime ihe n’ụzọ aghụghọ nke eze ukwu bụ́ onye ọgọ mmụọ. N’ụzọ dabara nnọọ adaba, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Paul Johnson na-ajụ, sị: “Alaeze ukwu ahụ ọ̀ chịliiri Iso Ụzọ Kraịst aka elu, ka Iso Ụzọ Kraịst ọ̀ gbaara akwụna gbakwuru alaeze ukwu ahụ?”
A pụrụ inyere ndị nile chọrọ ịrapagidesi ike n’Iso Ụzọ Kraịst dị ọcha n’ezie aka ịmata na iso ezi ọgbakọ ndị Kraịst taa na-akpakọrịta. Ndịàmà Jehova n’ụwa nile dị nnọọ njikere inyere ndị nwere obi eziokwu aka ịmata ezi Iso Ụzọ Kraịst na ife Chineke ofufe n’ụzọ ọ na-anara.—Jọn 4:23, 24.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Donatism bụ ịrọ òtù “ndị Kraịst” nke narị afọ nke anọ na nke ise O.A. Ndị òtù ya zọọrọ na izi ezi nke sakramenti dabeere n’àgwà ọma nke ụkọchukwu nakwa na chọọchị aghaghị iwepụ ndị ikpe ajọ mmehie mara site n’òtù ya. Òtù Arius bụ òtù “ndị Kraịst” nke narị afọ nke anọ ndị jụrụ ịbụ chi nke Jisọs Kraịst. Arius kụziri na Chineke bụ onye a na-amụghị amụ na onye na-enweghị mmalite. Ọkpara ahụ, n’ihi na a mụrụ ya amụ, apụghị ịbụ Chineke n’otu echiche ahụ nke Nna ya bụ. Ọkpara ahụ adịghị adị site na mgbe nile ebighị ebi kama e kere ya eke, ọ na-adịkwa ndụ site n’ọchịchọ nke Nna ya.
[Igbe dị na peeji nke 28]
Constantine na Kansụl nke Nicaea
Òkè dị aṅaa ka Eze Ukwu Constantine ahụ a na-emebeghị baptism keere na Kansụl nke Nicaea? Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Constatine n’onwe ya nọrọ n’isi oche, na-eduzi nkwurịta okwu ahụ n’ụzọ pụtara ìhè . . . N’ịbụ ndị egwu nke eze ukwu ahụ tighasịrị anya, ndị bishọp ahụ, e wezụga nanị abụọ, bịanyere aka ná nkwekọrịta okwukwe ahụ, bụ́ nke ọtụtụ n’ime ha megidere ọchịchọ ha.”
Mgbe ọnwa abụọ nke nrụrịta ụka okpukpe kpụ ọkụ n’ọnụ gasịrị, ọgọ mmụọ a bụ́ onye ndọrọ ọchịchị tinyere ọnụ ma kpelaara ndị sịrị na Jisọs bụ Chineke. Ma n’ihi gịnị? “Constantine enweghị nghọta n’ụzọ bụ isi n’ajụjụ ndị a nọ na-ajụ ná nkà mmụta okpukpe Grik,” ka A Short History of Christian Doctrine na-ekwu. Ihe ọ ghọtara bụ na nkewa okpukpe bụ ihe iyi egwu nye alaeze ukwu ya, o kpebisikwara ike iwusi alaeze ukwu ya ike.
Banyere ihe odide ikpeazụ e dere na Nicaea n’okpuru nlekọta Constantine, Istoria tou Ellinikou Ethnous (Akụkọ Mba Gris) na-ekwu, sị: “Ọ na-egosi enweghị mmasị [Constantine] n’ihe banyere ozizi, . . . ojiji o ji isi ike sie ọnwụ ịnwa iweghachi ịdị n’otu n’ime chọọchị n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu, na n’ikpeazụ obi ike o nwere na dị ka ‘bishọp nke ndị na-adịghị aga chọọchị’ ọ bụ o kwuchaa o bie banyere ihe ọ bụla metụtara okpukpe.” Ọ̀ pụrụ ikwe omume mmụọ Chineke ịbụ ihe duziri mkpebi ndị ahụ e mere na Kansụl ahụ?—Tụlee Ọrụ 15:28, 29.
[Igbe dị na peeji nke 29]
“Igbu Ọchụ n’Usoro Ndị Eze”
N’okpuru isiokwu a, ọrụ bụ́ Istoria tou Ellinikou Ethnous (Akụkọ Mba Gris) na-akọwa ihe ọ kpọrọ “mpụ na-asọ oyi ndị Constantine mere n’ime ezinụlọ.” Ọ dịghị anya o guzobesịrị usoro ndị eze ya, o chefuru otú e si anụ ụtọ ihe a na-atụghị anya ya a rụzuru ma mata ihe ize ndụ ndị gbara ya gburugburu. N’ịbụ onye na-enyo ndị mmadụ enyo, ikekwe bụrụkwa onye ndị e rigbuo kpaliri, o bu ụzọ nyowa nwa nwanne ya bụ́ Licinianus—bụ́ nwa Augustus ibe ya o gbuwororịị—enyo dị ka onye nwere ike ịma ya aka. Ogbugbu ya bụ nke ogbugbu nwa nwoke mbụ nke Constantine n’onwe ya, bụ́ Crispus, sochiri, bụ́ onye nne nkụchi ya bụ́ Fausta mekpọrọ ọnụ n’ihi na o yiri ka ọ bụ ihe mgbochi nye nwa nke ya inwe ikike dum.
Ihe a Fausta mere bụ ihe mesịrị kpata ajọ ọnwụ nke ya onwe ya. O yiri ka Augusta Helena, onye nwere mmetụta n’ahụ nwa ya bụ́ Constantine ruo ná njedebe, tinyere aka n’ogbugbu a. Mmetụta ezi uche na-adịghị na ya ndị na-achịkwakarị Constantine tụnyekwara ụtụ n’ogbugbu nke ọtụtụ ndị enyi ya na ndị ya na ha na-akpakọrịta. Akwụkwọ bụ́ History of the Middle Ages kwubiri, sị: “Ogbugbu—ka a ghara ịsị igbu ọchụ—nke nwa ya na nwunye ya na-egosi na o nweghị mmetụta ime mmụọ ọ bụla n’Iso Ụzọ Kraịst.”
[Foto dị na peeji nke 30]
E jiwo ogidi a dị na Rom too Constantine
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]
Musée du Louvre, Paris