Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 3/15 p. 12-17
  • Nraranye Na Nnwere Onwe Ime Nhọrọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nraranye Na Nnwere Onwe Ime Nhọrọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nrara Nye “Chineke Israel”
  • Nraranye nke “Israel nke Chineke”
  • Iji Amamihe Na-egosipụta Nnwere Onwe Chineke Nyere
  • Ịhọrọ Ịbụ Ohu Ònye?
  • Ịmụta Ịbara Onwe Anyị Uru
  • A Mụrụ Ha ná Mba Chineke Họọrọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ị̀ Na-ebi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Anyị “Kwa Ụbọchị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gịnị Mere i ji Kwesị Ịrara Onwe Gị Nye Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 3/15 p. 12-17

Nraranye Na Nnwere Onwe Ime Nhọrọ

“Kraịst mere ka anyị pụọ n’ohu ka anyị wee nwee onwe anyị.”—NDỊ GALETIA 5:1.

1. Gịnị ka e ji okwu Hibru na Grik ndị a sụgharịrị ‘ite mmanụ,’ ‘ịrara ihe tifee n’aka,’ ma ọ bụ “ido nsọ” mee ihe banyere ya karịsịa?

NDỊ dere Bible jiri ọtụtụ okwu Hibru na Grik mee ihe iji nye echiche nke ịbụ ndị e kewapụrụ, ma ọ bụ e doro iche, ije ozi maka nzube dị nsọ. Na Bible Igbo dị iche iche e ji okwu ndị dị ka ‘ite mmanụ,’ ‘rara ihe tifee n’aka,’ ma ọ bụ “ido nsọ” sụgharịa okwu ndị a. Mgbe ụfọdụ a na-eji okwu ndị a eme ihe n’ihe metụtara ihe owuwu—karịsịa ụlọ nsọ Chineke dị na Jerusalem oge ochie na ofufe a na-efe n’ebe ahụ. Ọ na-ara ahụ iji okwu ndị a eme ihe n’ihe banyere ndị okwu na-abụghị nke okpukpe.

Nrara Nye “Chineke Israel”

2. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji zie ezi ịkpọ Jehova “Chineke Israel”?

2 Na 1513 T.O.A., Chineke gbapụtara ụmụ Israel site n’ịgbara Ijipt ohu. Nwa ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, o doro ha iche dị ka ndị pụrụ iche nye ya, na-akpọba ha ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ ya na ha. A gwara ha: “Ugbu a, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karị ndị nile: n’ihi na ọ bụ Mụ nwe ụwa nile.” (Ọpụpụ 19:5; Abụ Ọma 135:4) Ebe o meworo ụmụ Israel ihe nke aka ya, a pụrụ ịkpọ Jehova “Chineke Israel” n’izi ezi.—Joshua 24:23.

3. N’ihi gịnị ka Jehova na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu n’ịhọrọ Israel dị ka ndị ya?

3 N’ime ụmụ Israel ndị ya a raara nye, Jehova eleghị mmadụ anya n’ihu, n’ihi na o jikwa ịhụnaya chebara ndị na-abụghị ndị Israel echiche. Ọ tụziiri ndị ya: “Mgbe ọbịa ga-anọnyere gị dị ka ọbịa n’ala unu, unu emela ya ihe ike. Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu bụrịị n’ala Ijipt: Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu.” (Levitikọs 19:33, 34) Ọtụtụ narị afọ n’ihu, e mere ka echiche Chineke bamisie ike n’ime Pita onyeozi, bụ́ onye kwetara, sị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

4. Gịnị bụgasị ọnọdụ nke mmekọrịta dị n’etiti Chineke na Israel, ụmụ Israel hà biri ndụ kwekọrọ na ha?

4 Rịbakwa ama na ịbụ ndị Chineke a raara nye dabeere n’ọnọdụ. Nanị ma ọ bụrụ na ha aṅaa ntị n’olu Chineke ma debe ọgbụgba ndụ ya ka ha ga-abụ “ihe nke aka” ya. N’ụzọ dị mwute, ụmụ Israel emeghị ihe ndị a chọrọ ha n’aka. Mgbe ha jụsịrị Mesaịa ahụ Chineke zitere na narị afọ mbụ O.A., ha tụfuru ọnọdụ ihe ùgwù ha. Jehova abụkwaghị “Chineke Israel.” Ụmụ Israel anụ ahụ abụkwaghị ndị Chineke a raara nye.—Tụlee Matiu 23:23.

Nraranye nke “Israel nke Chineke”

5, 6. (a) Gịnị ka Jisọs bu n’uche site n’okwu amụma ya e dekọrọ na Matiu 21:42, 43? (b) Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka “Israel nke Chineke” si bịa dịrị?

5 Nke a ọ̀ pụtara na Jehova agaghị enwekwa ndị a raara nye ya? Ee e. N’ihota ọbụ abụ ahụ, Jisọs Kraịst buru n’amụma, sị: “Ọ́ dịghị mgbe ọ bụla unu gụrụ n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ, Nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ahụ ka e mere isi nkuku ụlọ: ọ bụ n’aka Onyenwe anyị ka nke a sitere, ọ bụkwa oké ọrụ n’anya anyị? N’ihi nke a ka M ji sị unu, A ga-anara unu alaeze Chineke, wee nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya.”—Matiu 21:42, 43.

6 “Mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya” nwapụtara ịbụ ọgbakọ ndị Kraịst. N’oge ọ nọ n’ụwa, Jisọs họọrọ ndị mbụ gaje ịbụ ndị òtù ya. Ma n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., ọ bụ Jehova Chineke n’onwe ya tọrọ ntọala nke ọgbakọ ndị Kraịst site n’ịwụkwasị mmụọ nsọ ya n’isi ndị òtù ya mbụ, ndị ọnụ ọgụgụ ha bụ ihe dị ka 120. (Ọrụ 1:15; 2:1-4) Dị ka Pita onyeozi mesịrị dee, ọgbakọ a e guzobere ọhụrụ wee ghọọ “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.” Gịnị mere e ji họpụta ha? Ka ha wee “kwusaa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara [ha] n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) Ụmụazụ Kraịst, ndị e jiri mmụọ Chineke tee mmanụ, bụ ugbu a mba raara onwe ha nye, “Israel nke Chineke.”—Ndị Galetia 6:16.

7. Gịnị ka ndị òtù nke Israel nke Chineke ga-enweta, n’ihi ya kwa gịnị ka a gwara ha zere?

7 Ọ bụ ezie na ndị òtù nke mba ahụ dị nsọ bụ “ndị nke Chineke nwetara,” a gaghị e ji ha mere ndị ohu. N’ụzọ dị iche, ha ga-enwe nnwere onwe dị ukwuu karịa nke ahụ mba Israel anụ ahụ raara onwe ha nye nwere. Jisọs kwere ndị gaje ịbụ ndị òtù nke mba ọhụrụ a nkwa, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:32) Pọl onyeozi rụtụrụ aka na e mere ka ndị Kraịst pụọ n’ohu nke ihe ndị ọgbụgba ndụ Iwu ahụ chọrọ. Banyere nke a ọ dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Galetia ọdụ, sị: “Kraịst mere ka anyị pụọ n’ohu ka anyị wee nwee onwe anyị: ya mere na-eguzosinụ ike, unu ekwela ka e were yoke nke bụ ịbụ ohu tụhịa unu ọzọ.”—Ndị Galetia 5:1.

8. N’echiche dị aṅaa ka ndokwa ndị Kraịst na-enye ndị mmadụ nnwere onwe dị ukwuu karịa nke e nwetara n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?

8 N’adịghị ka Israel anụ ahụ nke oge ochie, ruo taa Israel nke Chineke erubewo isi kpọmkwem n’ihe ndị nraranye ya chọrọ. Nke a ekwesịghị iju anya n’ihi na ndị òtù ya ji obi ha nile họrọ irube isi. Ọ bụ ezie na ndị òtù Israel anụ ahụ bụ ndị a raara nye site n’ọmụmụ, ndị òtù nke Israel nke Chineke ghọrọ nke ahụ site ná nhọrọ. N’ihi ya ndokwa ndị Kraịst dị iche n’ebe ọgbụgba ndụ Iwu ndị Juu dị, bụ́ nke manyere ndị mmadụ n’otu n’otu ịrara onwe ha nye n’enyeghị ha nnwere onwe ime nhọrọ.

9, 10. (a) Olee otú Jeremaịa si gosi na a ga-enwe mgbanwe n’ihe metụtara nraranye? (b) N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na ọ bụghị ndị Kraịst nile raara onwe ha nye taa bụcha ndị òtù nke Israel nke Chineke?

9 Jeremaịa onye amụma buru amụma banyere mgbanwe n’ihe metụtara nraranye mgbe o dere, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), mgbe Mụ na ụlọ Israel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ: ọ bụghị dị ka ọgbụgba ndụ ahụ si dị nke Mụ na ndị bụ nna ha gbara n’ụbọchị M jidere ha n’aka ime ka ha si n’ala Ijipt pụta; n’ihi na ha onwe ha mebiri ọgbụgba ndụ m ahụ, ọ bụ ezie na Mụ onwe bụ di nwe ha; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta. N’ihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ nke Mụ na ụlọ Israel ga-agba mgbe ụbọchị nile ahụ gasịrị, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta); M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka M ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ; M ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga-abụkwara m otu ndị.”—Jeremaịa 31:31-33.

10 N’ịbụ ndị e dere iwu Chineke, “n’ime ha,” dị ka a pụrụ isi kwuo ya, “n’obi ha,” a na-akwali ndị òtù Israel nke Chineke ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye ha. Nkwali ha dị ike karịa nke ụmụ Israel anụ ahụ, bụ́ ndị raara onwe ha nye site n’ọmụmụ, ọ bụghị site ná nhọrọ. Taa, nkwali siri ike ime uche Chineke, dị ka Israel nke Chineke gosipụtaworo, bụ nke ihe karịrị nde ise ndị ofufe ibe ha gburugburu ụwa na-ekerịta. Ha ararawokwa ndụ ha nye Jehova Chineke ime uche ya. Ọ bụ ezie na ndị a enweghị olileanya nke ndụ eluigwe dị ka ndị ahụ mejupụtara Israel nke Chineke nwere, ha na-aṅụrị ọṅụ n’atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala n’okpuru ọchịchị Alaeze eluigwe nke Chineke. Ha na-egosi ekele maka Israel ime mmụọ site n’ịkwadosi ndị òtù ya ole na ole ka fọdụrụnụ ike n’ịrụzu ọrụ e kenyere ha ‘ikwusa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara [ha] n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.’

Iji Amamihe Na-egosipụta Nnwere Onwe Chineke Nyere

11. Ikike dị aṅaa ka e kenyere n’ime mmadụ, oleekwa otú e kwesịrị isi jiri ya mee ihe?

11 Chineke kere ụmụ mmadụ iji nnwere onwe kpọrọ ihe. O nyere ha ikike nke inwere onwe ime nhọrọ. Di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ jiri nnwere onwe ime nhọrọ ha mee ihe. Otú ọ dị, ha mere otu nhọrọ n’ụzọ amamihe na ịhụnanya na-adịghị na ya nke dujere n’ọdachi nye ma ha ma ụmụ ha. Ma, nke a na-egosipụta n’ụzọ doro anya na ọ dịghị mgbe Jehova na-amanye ihe e kere eke nwere ọgụgụ isi ịgbaso ụzọ dị iche ná nzube na ọchịchọ ndị dị ha n’obi. Ebe ọ bụkwa na “Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya,” nanị nraranye dị ya mma bụ nke dabeere n’ịhụnanya, nke e ji obi nile mee n’obi ụtọ, nke e guzobere ná nnwere onwe ime nhọrọ. (2 Ndị Kọrint 9:7) Ọ dịghị anakwere ụdị ọ bụla ọzọ.

12, 13. Olee otú Timoti si bụrụ ihe ilereanya maka ọzụzụ nwatakịrị kwesịrị ekwesị, na gịnịkwa ka ihe nlereanya ya dujere ọtụtụ ndị na-eto eto?

12 N’ịmatazu ihe a a chọrọ, Ndịàmà Jehova na-akwado ịrara onwe onye nye Chineke, ma ọ dịghị mgbe ha na-amanye mmadụ ime nraranye dị otú ahụ, ọbụnadị ụmụ ha. N’ụzọ dị iche n’ebe ọtụtụ chọọchị dị, Ndịàmà adịghị eme ụmụ ha baptism mgbe ha ka bụ ụmụ ọhụrụ, dị ka a ga-asị na o kwere omume inunye ha n’ịrara onwe ha nye n’enweghị uru nke nhọrọ onwe onye. Ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ a ga-agbaso bụ nke nwa okorobịa bụ́ Timoti gbasoro. Dị ka onye toworo eto, Pọl onyeozi gwara ya: “Nọgide n’ime ihe nile ị mụtara, nke e mekwara ka i kwere ha, ebe ị matara mmadụ ndị ị mụtara ha n’ọnụ ha; ebe ị makwaara na i sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta site n’okwukwe nke i kwere na Kraịst Jisọs.”—2 Timoti 3:14, 15.

13 Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Timoti maara ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ n’ihi na e ziri ya ha site na nwa ọhụrụ. E mewo ka o kweta—ọ bụghị mmanye—ozizi ndị Kraịst site n’aka nne na nne nne ya. (2 Timoti 1:5) N’ihi ya, Timoti hụrụ amamihe dị n’ịghọ onye na-eso ụzọ Kraist ma si otú ahụ mee nhọrọ onwe onye nke nraranye ndị Kraịst. N’oge a, ọtụtụ iri puku ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị nne na nna ha bụ Ndịàmà Jehova agbasowo ihe nlereanya a. (Abụ Ọma 110:3) Ndị ọzọ emebeghị otú ahụ. Ọ bụ okwu metụtara nhọrọ onwe onye.

Ịhọrọ Ịbụ Ohu Ònye?

14. Gịnị ka Ndị Rom 6:16 na-agwa anyị banyere nnwere onwe zuru ezu?

14 Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nweere onwe ya kpam kpam. Iwu okike, ndị dị ka ike ndọda, bụ́ nke a na-apụghị ileghara anya n’enwetaghị ntaramahụhụ, na-akpara mmadụ nile ókè ná nnwere onwe ya. N’echiche ime mmụọ kwa, ọ dịghị onye nweere onwe ya kpam kpam. Pọl tụgharịrị uche, sị: “Ùnu amataghị na onye unu na-eche onwe unu n’ihu ya ka unu bụrụ ndị ohu ịṅa ya ntị, unu bụ ndị ohu nke onye ahụ unu na-aṅa ntị ya; ma ọ bụ nke mmehie na-eweta ọnwụ, ma ọ bụ nke ịṅa ntị na-eweta ezi omume?”—Ndị Rom 6:16.

15. (a) Gịnị ka ndị mmadụ na-eche banyere ịbụ ndị ohu, ma gịnị ka ihe ka ọtụtụ na-emesịa mee? (b) Olee ajụjụ kwesịrị ekwesị ndị anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?

15 Echiche nke ịbụ ohu mmadụ na-adị ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ dị ka ihe na-adịghị mma. Ma, n’ụwa nke taa ihe bụ eziokwu bụ na ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-ekwe ka e jiri ha mee ihe ma nwee ike n’ahụ ha n’ọtụtụ ụzọ dị aghụghọ nke na n’ikpeazụ ha na-eme ihe ndị ọzọ chọrọ ka ha mee ná mmanye. Dị ka ihe atụ, ụlọ ọrụ mkpọsa ngwá ahịa na ụwa ntụrụndụ na-agbalị ịkpụzi ndị mmadụ, na-eguzobere ha ụkpụrụ ha ga-agbaso. Òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke okpukpe dị iche iche na-arata ndị mmadụ ịkwado echiche na nzube ha, ọ bụghị mgbe nile site arụmụka na-eme ka mmadụ kwere ihe, kama ọtụtụ mgbe site n’ịkpali echiche nke nkwado ma ọ bụ iguzosi ike n’ihe. Ebe ọ bụ na Pọl kwuru na ‘anyị bụ ohu nke onye ahụ anyị na-aṅa ntị,’ onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe ya, ‘Ònye ka m bụ ohu ya? Ònye na-enwe mmetụta kasị ukwuu ná mkpebi m na ụzọ ndụ m? Ọ̀ bụ ndị ụkọchukwu, ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị aka ji akụ̀, ka ọ bụ ndị na-eme ihe ntụrụndụ? Ònye ka m na-aṅa ntị—Chineke ka ọ bụ ndị mmadụ?’

16. N’echiche dị aṅaa ka ndị Kraịst bụ ndị ohu Chineke, gịnịkwa bụ echiche kwesịrị ekwesị banyere ịbụ ohu dị otú ahụ?

16 Ndị Kraịst adịghị ewere irubere Chineke isi dị ka ihe mgbochi na-ezighị ezi nye nnwere onwe ha. Ha ji obi ha nile na-egosipụta nnwere onwe ha n’ụzọ Onye Nlereanya ha, bụ́ Jisọs Kraịst si mee, na-eme ka ọchịchọ na nhọrọ onwe onye ha kwekọọ n’uche Chineke. (Jọn 5:30; 6:38) Ha na-ewulite “uche nke Kraịst,” na-edo onwe ha n’okpuru ya dị ka Isi nke ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 2:14-16; Ndị Kọlọsi 1:15-18) Nke a yiri nnọọ nwanyị lụrụ di ma jiri obi ya na-ekwenyere nwoke ahụ ọ hụrụ n’anya. N’ezie, e kwuru banyere òtù ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka nwanyị na-amaghị nwoke nke e kwere nkwa inye Kraịst n’ọlụlụ.—2 Ndị Kọrint 11:2; Ndị Efesọs 5:23, 24; Mkpughe 19:7, 8.

17. Gịnị ka Ndịàmà Jehova nile họwooro ịbụ?

17 Onyeàmà Jehova nke ọ bụla, ma ò nwere olileanya eluigwe ma ọ bụ nke elu ala, emewo nraranye onwe onye nye Chineke ime uche ya na irubere ya isi dị ka Onye Ọchịchị. Nye Onyeàmà nke ọ bụla, nraranye abụrụwo nhọrọ onwe onye iji bụrụ onye na-ejere Chineke ozi karịa ịnọgide na-abụ ohu mmadụ. Nke a kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi: “E weere ọnụ ahịa gbara unu; unu aghọla ndị ohu mmadụ.”—1 Ndị Kọrint 7:23.

Ịmụta Ịbara Onwe Anyị Uru

18. Olee mgbe onye gaje ịbụ Onyeàmà na-eru eru maka baptism?

18 Tupu mmadụ enwee ike iru eru ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ ghaghị iru ihe ndị Akwụkwọ Nsọ chọrọ. Ndị okenye na-akpachapụ anya n’ikpebi ma onye gaje ịbụ Onyeàmà ọ̀ ghọtawo n’ezie ihe nraranye ndị Kraịst gụnyere. Ọ̀ chọrọ n’ezie ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova? Ọ̀ dị njikere ibi ndụ kwekọrọ n’ihe nke a gụnyere? Ma ọ bụghi otú ahụ, o rughị eru maka baptism.

19. N’ihi gịnị ka a na-ejighị nwee ihe ọ bụla ga-eme ka a katọọ onye kpebiri ịghọ onye na-ejere Chineke ozi raara onwe ya nye?

19 Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmadụ eruo ihe ndị a nile a chọrọ, n’ihi gịnị ka a ga-eji katọọ ya maka iji obi ya mee mkpebi onwe onye ikwe ka Chineke na Okwu Ya e dere n’ike mmụọ nsọ nwee mmetụta n’ahụ ya? Ọ̀ bụ ihe a na-adịghị anakwerecha ikwe ka Chineke karịa mmadụ nwee mmetụta n’ahụ mmadụ? Ka nke a ọ̀ bara uru dị nta karị? Ndịàmà Jehova echeghị otú ahụ. Ha ji obi ha nile na-ekweta n’okwu Chineke nke Aịsaịa deturu: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”—Aịsaịa 48:17.

20. N’echiche ndị dị aṅaa ka eziokwu Bible na-atọpụ ndị mmadụ?

20 Eziokwu Bible na-atọpụ ndị mmadụ pụọ n’ikwere n’ozizi okpukpe ụgha, dị ka mmekpa ahụ ebighị ebi n’ime hel na-ere ọkụ. (Eklisiastis 9:5, 10) Kama nke ahụ, ọ na-eme ka obi ha jupụta n’ekele maka ezi olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ—mbilite n’ọnwụ nke e mere ka o kwe omume ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. (Matiu 20:28; Ọrụ 24:15; Ndị Rom 6:23) Eziokwu Bible na-atọpụ ndị mmadụ pụọ n’obi nkoropụ nke ịdabere ná nkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị a na-adịghị emezu. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka obi ha jupụta n’ọṅụ n’ịmara na Alaeze Jehova anọworị na-achị n’eluigwe, ọ ga-achịkwa n’elu ụwa nile n’isi nso. Eziokwu Bible na-atọpụ ndị mmadụ pụọ n’omume ndị, ọ bụ ezie na ha na-amasị anụ ahụ dara ada, adịghị asọpụrụ Chineke, na-emebikwa ihe nke ukwuu n’ụdị nke mmekọrịta ndị e mebiri emebi, ọrịa, na nnwụchu ọnwụ. Ná nkenke, ịbụ onye na-ejere Chineke ozi bara uru nke ukwuu karịa ịbụ ohu mmadụ. N’ezie, nrara nye Chineke na-ekwe nkwa abamuru ‘n’oge a . . . na ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.’—Mak 10:29, 30.

21. Olee otú Ndịàmà Jehova si ele nrara nye Chineke anya, gịnịkwa bụ ọchịchọ ha?

21 Ndịàmà Jehova taa aghọghị akụkụ nke mba raara onwe ha nye site n’ọmụmụ dị ka ụmụ Israel oge ochie. Ndịàmà bụ akụkụ nke ọgbakọ nke ndị Kraịst raara onwe ha nye. Onyeàmà nke ọ bụla e mere baptism aghọwo nke ahụ site n’iji nnwere onwe ime nhọrọ mee ihe n’ime nraranye. N’ezie, nye Ndịàmà Jehova, nraranye na-arụpụta mmekọrịta onwe onye na-ekpo ọkụ e nwere n’ebe Chineke nọ nke iji obi nile na-ejere ya ozi na-aka akara. Ha ji obi ha nile na-achọ ịnọgide na-enwe mmekọrịta a na-enye ọṅụ, na-ejigidesi nnwere onwe nke Jisọs Kraịst ji n’ihi ya mee ka ha pụọ n’ohu ike ruo ebighị ebi.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka Chineke ji na-eleghị mmadụ anya n’ihu n’ịhọrọ Israel ịbụ “ihe nke aka” ya?

◻ N’ihi gịnị ka ị ga-eji asị na nraranye ndị Kraịst agụnyeghị ịtụfu nnwere onwe?

◻ Gịnị bụgasị uru nke nrara nye Jehova Chineke?

◻ N’ihi gịnị ka o ji ka mma ịbụ onye na-ejere Jehova ozi karịa ịbụ ohu mmadụ?

[Foto dị na peeji nke 15]

N’Israel oge ochie, nrara nye Chineke bụ ihe dabeere n’ọmụmụ

[Foto dị na peeji nke 16]

Nraranye ndị Kraịst bụ ihe dabeere ná nhọrọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya