Ndụ M Dị Ka Onye Ekpenta—Nke Ọṅụ na nke A Gọziri n’Ụzọ Ime Mmụọ
DỊ KA ISAIAH ADAGBONA SI KỌỌ
Etolitere m n’Akure, Nigeria. Ezinụlọ m kọrọ ji, unere, akpụ, na koko. Nna m achọghị ka m jee akwụkwọ. Ọ gwara m, sị: “Ị bụ onye ọrụ ubi. Ọ dịghị mgbe onye ọ bụla ga-asị gị gụọ ji.”
MA, ACHỌRỌ m ịmụta ịgụ ihe. N’oge mgbede, ana m eguzo ma gee ntị na window nke ụlọ ebe otu onye nkụzi na-akụziri ụmụaka ụfọdụ ihe n’ebe obibi. Nke ahụ bụ na 1940 mgbe m dị ihe dị ka afọ 12. Mgbe nna nke ụmụaka ahụ ga-ahụ m, ọ na-eti mkpu ma chụpụ m. Ma anọgidere m na-abịaghachi. Mgbe ụfọdụ onye nkụzi ahụ adịghị abịa, m ga-amịbakwa wee soro ụmụaka ahụ lee akwụkwọ ha. Mgbe ụfọdụ ha na-ekwe ka m gbaziri akwụkwọ ha. Otú ahụ ka m si mụta ịgụ ihe.
Esonye M Ndị Chineke
Ka oge na-aga enwetara m Bible ma na-agụchi ya anya tupu m lakpuo ụra. Otu mgbede agụrụ m Matiu isi nke 10, nke na-egosi na ndị mmadụ ga-akpọ ndị na-eso ụzọ Jisọs asị ma kpagbuo ha.
Echetara m na Ndịàmà Jehova abịawo n’ụlọ m, e wee mesoo ha n’ụzọ ọjọọ. O metụrụ m n’ahụ na ndị a pụrụ ịbụ ndị ahụ Jisọs kwuru okwu banyere ha. N’oge ọzọ Ndịàmà ahụ bịara, anatara m ha otu magazin. Ka m malitere iso ha enwe mkpakọrịta, aghọrọ m onye a na-akwa emo. Ma, ka ndị mmadụ na-emekwu mgbalị ịkụda m obi, otú ahụ ka m na-ekwenyesi ike ma na-enwe ọṅụ karị na achọtawo m ezi okpukpe ahụ.
Ihe tọrọ m ụtọ n’ezie banyere Ndịàmà bụ na, n’adịghị ka ìgwè okpukpe ndị ọzọ n’ógbè m, ha agwakọtaghị ofufe ha n’omenala na n’ọdịnala nke okpukpe ndị ọgọ mmụọ nke ógbè m. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na ezinụlọ m na-eje chọọchị Anglịkan, nna m debere ihu arụsị nke chi ndị Yoruba bụ́ Ogun.
Mgbe ọnwụ nna m gasịrị, ọ bụ m gaara eketa ihu arụsị ahụ. Achọghị m ya, ebe m maara na Bible katọrọ ikpere arụsị. Enwere m ọganihu n’ụzọ ime mmụọ site n’enyemaka Jehova, na December 1954 kwa, e mere m baptism.
Ekpenta Adakwasị M
Ná mmalite afọ ahụ, achọpụtara m na ụkwụ m na-aza aza, ọ dịghịkwa enwe mmetụta. Ọ bụrụ na m azọkwasị ụkwụ n’icheku ọkụ, ọ dịghị afụ m ụfụ. Ka oge ụfọdụ gasịrị, ọnyá na-acha ọbara ọbara pụtara n’egedege ihu na n’egbugbere ọnụ m. Ma mụ ma ndị ezinụlọ m amaghị ihe bụ nsogbu, anyị chere na ọ bụ ụ́gwọ̀. Ejere m na nke ndị dibịa mkpọrọgwụ 12 na-achọ ọgwụgwọ. N’ikpeazụ otu onye n’ime ha gwara anyị na ọ bụ ekpenta.
Lee ihe na-awụ akpata oyi nke ahụ bụ! Uche ezughị m ike, ehighịkwa m ụra nke ọma. Arọrọ m nrọ ọjọọ. Ma ihe ọmụma m nke eziokwu Bible na ndabere n’ebe Jehova nọ nyeere m aka iji obi ike legara ọdịnihu anya.
Ndị mmadụ gwara nne m na ọ bụrụ na m ejekwuru dibịa arụsị ije chụọ àjà, na ahụ ga-adị m mma. Ajụrụ m ije, ebe m maara na omume dị otú ahụ ga-ewute Jehova. N’ịmata na ekpebisiwo m ike n’okwu ahụ, ndị enyi nne m tụrụ aro ka o were mkpụrụ ọjị ma detụ ya n’egedege ihu m. Mgbe ahụ ọ pụrụ inye dibịa arụsị mkpụrụ ọjị ahụ iji ya chụọ àjà maka m. Achọghị m ikere òkè na nke ahụ, m wee gwa ya otú ahụ. N’ikpeazụ, ọ kwụsịrị mgbalị ya ime ka m tinye aka n’okpukpe ndị ọgọ mmụọ.
Ka ọ na-erule oge m jere ụlọ ọgwụ, ekpenta ahụ eriwo m ahụ. Ọnyá ejupụtawo ahụ m nile. N’ụlọ ọgwụ, ha nyere m ọgwụ, nwayọọ nwayọọ akpụkpọ ahụ m dịghachikwara otú o kwesịrị.
Ha Chere na Mụ Anwụọla
Ma nsogbu m akwụsịbeghị. Ọrịa bara n’ụkwụ aka nri m nke ọjọọ ya, n’afọ 1962 kwa a ghaghị igbupụ ya. Mgbe ịwa ahụ ahụ gasịrị, e nwere nsogbu ahụ ike ndị ọzọ. Ndị dọkịta atụghị anya na m ga-adị ndụ. Otu onye ọcha bụ́ ụkọchukwu onye ozi ala ọzọ bịara ido ụka ikpeazụ. Ike gwụrụ m nnọọ ikwu okwu, ma otu nọọsụ gwara ya na m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.
Ụkọchukwu ahụ gwara m, sị: “Ị̀ chọrọ ịgbanwe wee ghọọ onye Katọlik ka i wee nwee ike ije eluigwe?” Nke ahụ mere m ka m chịa ọchị n’obi m. Ekpekuru m Jehova ekpere maka ume iji zaghachi. Ná mgbalị dị ukwuu ejisiri m ike sị, “Ee e!” Ụkọchukwu ahụ tụgharịrị wee pụọ.
Ọnọdụ m kara njọ ruo mgbe ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ chere na mụ anwụọla. Ha jiri ibé ákwà kpuchie m ihu. Otú ọ dị, ha ebubaghị m n’ebe ichekwa ozu ebe ọ bụ na dọkịta ma ọ bụ nọọsụ aghaghị ibu ụzọ nwapụta na m nwụrụ anwụ. Ọ dịghị dọkịta nọ n’ọrụ, ndị nọọsụ nile ejewokwa otu nnọkọ oriri. Ya mere ha hapụrụ m n’ọnụ ụlọ ndị ọrịa ruo mgbe chi foro. Mgbe dọkịta gagharịrị gburugburu n’ụtụtụ sochirinụ, ọ dịghị onye bịara n’àkwà m n’ihi na a ka kpuchiri m ákwà ma chee na m nwụrụ anwụ. N’ikpeazụ, otu onye chọpụtara na “ozu” ahụ a sachiri ákwà na-emegharị ahụ!
Agbakere m, na December 1963 kwa ha bugara m n’Ogige Ụlọ Ọgwụ Ekpenta n’Abeokuta dị ná ndịda ebe ọdịda anyanwụ Nigeria. Ebiwo m n’ebe ahụ eri mgbe ahụ.
Mmegide Nye Ime Nkwusa M
E nwere ihe dị ka ndị ekpenta 400 n’ogige ahụ mgbe m rutere, nanị m bụkwa Onyeàmà. Edegaara m Society akwụkwọ, ha zaghachikwara ozugbo site n’ịtụziri Ọgbakọ Akomoje ka ha kpọtụrụ m. Ya mere ọ dịghị mgbe mmekọrịta mụ na ụmụnna kwụsịrị.
Ngwa ngwa m rutere n’ogige ahụ, amalitere m ime nkwusa. Pastọ nọ n’ebe ahụ enweghị obi ụtọ banyere nke ahụ, o wee kpee m n’aka onye na-elekọta ọdịmma ndị mmadụ bụ́ onye ogige ahụ dị n’aka. Onye ahụ na-elekọta ọdịmma ndị mmadụ bụ nwoke metụworo agadi si Germany. Ọ gwara m na mụ enweghị ikike ịkụzi Bible n’ihi na mụ ejeghị akwụkwọ ma ọ bụ nwee asambodo ime otú ahụ; ebe ọ bụ na mụ erughị eru, ná m ga-akụziri ndị mmadụ ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ bụrụ na m sie ọnwụ, a pụrụ ịchụpụ m n’ogige ahụ ma jụ inye m ọgwụ. O kweghị ka m kwuo okwu ọ bụla ná nzaghachi.
Ọzọ o nyere ntụzi na ọ dịghị onye kwesịrị iso m mụọ Bible. N’ihi ya, ndị gosiworo mmasị kwụsịrị ịbịakwute m.
Ewegaara m Jehova okwu ahụ n’ekpere, na-arịọ maka amamihe na ntụziaka. Na Sunday sochiri ya, ejere m chọọchị Baptist dị n’ogige ahụ, ọ bụ ezie na ekereghị m òkè n’ihe omume okpukpe ahụ. E nwere oge ka ụka ahụ na-aga n’ihu mgbe ndị bịaranụ pụrụ ịjụ ajụjụ. Eweliri m aka m wee jụọ, sị: “Ọ bụrụ na ndị ezi omume nile ga-eje eluigwe, ndị ajọ omume nile ejeekwa ebe ọzọ, n’ihi gịnị ka Aịsaịa 45:18 jiri sị na Chineke mere ụwa ka e wee biri n’ime ya?”
E nwere oké ntamu n’etiti ọgbakọ ahụ. N’ikpeazụ, pastọ ahụ bụ́ onye ozi ala ọzọ sịrị na anyị apụghị ịmata ụzọ nile nke Chineke. N’ihi nke ahụ, azara m ajụjụ m site n’ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị gosiri na 144,000 ga-eje eluigwe, na ndị ajọ omume ga-ala n’iyi, nakwa na ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:10, 11; Mkpughe 14:1, 4.
Onye ọ bụla kụrụ aka iji gosi ekele maka azịza ahụ. Mgbe ahụ pastọ ahụ sịrị: “Kụọnụ aka ọzọ n’ihi na nwoke a maara Bible n’ezie.” Mgbe ụka ahụ gasịrị, ụfọdụ bịakwutere m wee sị: “Ị maara ihe karịa pastọ ahụ!”
Nrụgide Ịchụpụ M Agaa n’Ihu
Nke ahụ belatara nnọọ mkpagbu ahụ, ndị mmadụ sonyeghachikwara m iji mụọ Bible. Otú ọ dị, a nọgidere na-enwe ndị mmegide bụ́ ndị rụgidere onye ahụ na-elekọta ọdịmma ndị mmadụ ịchụpụ m. Ihe dị ka otu ọnwa mgbe ụka chọọchị ahụ gasịrị, ọ kpọrọ m wee sị: “N’ihi gịnị ka i ji nọgide na-eme nkwusa? Ná mba m, ndị mmadụ enweghị mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, ọ bụkwa otu ihe ahụ n’ebe a. N’ihi gịnị ka i ji akpatara m nsogbu? Ị́ maghị na m pụrụ ịchụpụ gị?”
Azaghachiri m: “Papa, ana m akwanyere gị ùgwù n’ihi ụzọ ihe atọ. Nke mbụ, n’ihi na ị tọrọ m, Bible na-asịkwa na anyị kwesịrị ịkwanyere isi awọ ùgwù. Ihe nke abụọ mere m ji akwanyere gị ùgwù bụ na ị hapụrụ mba gị iji nyere anyị aka n’ebe a. Ihe nke atọ bụ na i nwere obiọma, na-emesapụ aka, ma na-enyere ndị nọ n’ahụhụ aka. Ma n’ikike dị aṅaa ka i chere na ị pụrụ ịchụpụ m? President mba a adịghị achụpụ Ndịàmà Jehova. Eze ọdịnala ógbè a adịghị achụpụ anyị. Ọ bụrụgodị na ị chụpụ m n’ogige a, Jehova ka ga-elekọta m.”
Ọ dịbeghị mgbe m gwara ya okwu otú ahụ n’ezoghị ọnụ, apụkwara m ịhụ na o ruru ya n’ahụ. Ọ pụrụ n’ekwughị okwu ọ bụla. E mesịa, mgbe mmadụ mere mkpesa banyere m, ọ zara ná nkụda mmụọ, sị: “Agaghị m etinye onwe m n’okwu a ọzọ. Ọ bụrụ na ime nkwusa ya adịghị gị mma, gị na ya kparịta ya!”
Klas Ịmụ Ịgụ na Ide
Mmegide nye ime nkwusa m gara n’ihu site n’aka ndị ahụ na-aga chọọchị Baptist n’ogige ahụ. Mgbe ahụ otu echiche batara m n’uche. Ejekwuuru m onye ahụ na-elekọta ọdịmma ndị mmadụ wee jụọ ya ma m pụrụ iguzobe klas ịmụ ịgụ na ide. Mgbe ọ jụrụ m ego ole m chọrọ ka a na-akwụ m, ekwuru m na m ga-akụzi n’efu.
Ha wepụtara otu ọnụ ụlọ klas, bọọdụ ide ihe na chọọkụ, ya mere amalitere m ịkụziri ụfọdụ ndị bi ebe ahụ ịgụ ihe. Anyị na-amụ ihe kwa ụbọchị. Na minit 30 mbụ, aga m akụzi ịgụ ihe, e mesịa aga m akọ ma kọwaa otu akụkọ sitere na Bible. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị ga-agụpụta ihe ndekọ ahụ site na Bible.
Otu nwa akwụkwọ bụ nwanyị aha ya bụ Nimota. O nwere mmasị miri emi n’ihe ime mmụọ, ọ ga-ajụkwa ajụjụ ndị metụtara okpukpe ma na chọọchị ma n’ụlọ okpukpe ndị alakụba. O nwetaghị azịza nye ajụjụ ya n’ebe ndị ahụ, ya mere ọ na-abịa jụọ m. N’ikpeazụ, ọ raara ndụ ya nye Jehova, e wee mee ya baptism. Na 1966 anyị lụrụ.
Ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ anyị taa mụtara ịgụ ihe na ide ihe site na klas ịmụ ịgụ na ide ahụ. Enweghị m amamihe ịtụ aro maka klas ahụ. N’ezie ngọzi Jehova pụtara ìhè. Ọ dịghị onye nwara ịkwụsị m ime nkwusa ka nke ahụ gasịrị.
Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ogige Ahụ
Ka ọ na-erule oge mụ na Nimota lụrụ, anyị mmadụ anọ na-ezukọchi anya ịmụkọta Ụlọ Nche ọnụ. Ruo ihe dị ka otu afọ, anyị zukọrọ n’ọnụ ụlọ ebe a na-asacha ọnyá ekpenta. Mgbe ahụ onye ahụ na-elekọta ọdịmma ndị mmadụ, nke ghọworo enyi m ka ọ dị ugbu a, gwara m, sị: “Ọ dịghị mma ka unu na-efe Chineke unu n’ọnụ ụlọ ebe a na-agwọ ọrịa.”
Ọ sịrị na anyị pụrụ inwe nzukọ n’ụlọ ọrụ onye ọkwa nkà tọgbọ chakoo. Ka oge na-aga, a gbanwere ụlọ ọrụ ahụ gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Na 1992, site n’enyemaka ụmụnna ndị bi n’ime obodo, anyị rụchara ya. Dị ka ị pụrụ ịhụ site na foto dị na peji nke 24, ụlọ nzukọ anyị bụ ihe owuwu dị mma—e tere simenti ma tee ágbá, nweekwa ala a wụrụ kọnkịrị na elu ụlọ siri ike.
Ime Nkwusa Nye Ndị Na-arịa Ekpenta
Ruo afọ 33 ókèala m anọwo na-abụ ogige ndị ekpenta. Gịnị ka ọ dị ka ya ime nkwusa nye ndị ekpenta? N’ebe a n’Africa, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ kwere na ihe nile na-esite n’aka Chineke. Ya mere mgbe ekpenta rịara ha, ha na-ekwere na o nwere ụzọ o si bụrụ Chineke kpatara ya. Ụfọdụ na-enwe ịda mbà n’obi miri emi banyere ọnọdụ ha. Ndị ọzọ na-ewe iwe ma na-asị: “Agwala anyị banyere Chineke nke na-ahụ n’anya ma na-eme ebere. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, ọrịa a ga-ala!” Mgbe ahụ anyị na-agụ ma tụgharịa uche na Jemes 1:13, nke na-asị: ‘Chineke adịghị ewere ihe ọjọọ anwa onye ọ bụla.’ E mesịa anyị na-akọwa ihe mere Jehova ji ekwe ka ọrịa na-adakwasị ndị mmadụ, anyị na-arụtụkwa aka ná nkwa ya nke paradaịs elu ala ebe ọ na-adịghị onye ga-arịa ọrịa.—Aịsaịa 33:24.
Ọtụtụ anabatawo ozi ọma ahụ. Kemgbe m bịara n’ogige a, Jehova ejiriwo m nyere ihe karịrị mmadụ 30 aka ruo nraranye na baptism, ha nile bụ ndị ekpenta. Ọtụtụ alaghachiwo n’ebe obibi ha ka a gwọtasịrị ha, ole na ole anwụwokwa. Ugbu a anyị nwere ndị nkwusa Alaeze 18, ihe dịkwa ka mmadụ 25 na-abịachi ọmụmụ ihe anya. Abụọ n’ime anyị na-eje ozi dị ka ndị okenye, anyị nwekwara otu ohu na-eje ozi na otu onye ọsụ ụzọ oge nile. Lee otú m si enwe obi ụtọ ịhụ ọtụtụ ugbu a ka ha na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’ogige a! Mgbe m bịara ebe a, atụrụ m ụjọ na m ga-anọ nanị m, ma Jehova agọziwo m n’ụzọ dị ebube.
Ọṅụ nke Ijere Ụmụnna M Ozi
Aṅụrụ m ọgwụ maka ekpenta malite na 1960 ruo ihe dị ka afọ ise gara aga. Ugbu a a gwọtachawo m, dịkwa ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ a. Ekpenta ahụ hapụrụ akara ya—otu ụkwụ m malite n’ikpere gbadaa efunahụwo m, apụghịkwa m ịgbatịpụ aka m—ma ọrịa ahụ alaala.
Ebe ọ bụ na a gwọtawo m, ụfọdụ ajụwo ihe mere na mụ ahapụghị ogige ahụ ma laghachi n’ụlọ. E nwere ọtụtụ ihe mere m ji nọrọ, ma nke bụ isi bụ na m chọrọ ịnọgide na-enyere ụmụnna m aka n’ebe a. Ọṅụ nke ilekọta atụrụ Jehova karịrị ihe ọ bụla ezinụlọ m pụrụ inye m ma ọ bụrụ na m laghachikwuru ha.
Enwere m nnọọ ekele na m matara Jehova tupu m chọpụta na m nwere ekpenta. Ma ọ bụghị otú ahụ, m nwere ike igbuwo onwe m. E nwewo ọtụtụ ihe isi ike na nsogbu n’ime afọ ndị a, ma ọ bụghị ọgwụ kwagidere m—ọ bụ Jehova. Mgbe m na-atụgharị uche n’ihe ndị gara aga, ana m enwe ọṅụ; mgbe m na-echekwa banyere ọdịnihu n’okpuru Alaeze Chineke, ana m enwe ọṅụ ọbụna karị.
[Igbe dị na peeji nke 25]
Akwụkwọ Ihe Ọmụma Banyere Ekpenta
Gịnị Ka Ọ Bụ?
Ekpenta nke oge a bụ ọrịa nke nje bacillus nke Armauer Hansen chọpụtara na 1873 na-akpata. N’ịnabata nchọpụta ya, ndị dọkịta na-ezokwa aka n’ekpenta dị ka Hansen’s disease.
Nje bacillus na-emebi akwara ozi, ọkpụkpụ, anya, na akụkụ ahụ ụfọdụ. A dịkwaghị enwe mmetụta, mgbe mgbe n’aka na n’ụkwụ. Ma ọ dịghị ihe e mere ya, ọrịa ahụ pụrụ ịkpata oké nribisị nke ihu nakwa aka na ụkwụ. Ọ dịghị egbukarị egbu.
Ò Nwere Ọgwụgwọ?
Ndị na-arịa ụdị ekpenta ndị na-adịghị akpa ike na-agbake n’anataghị ụdị ọgwụgwọ ọ bụla. A pụrụ iji ọgwụ gwọta ndị dị njọ karị.
Ọgwụ mbụ na-alụso ekpenta ọgụ, nke e wepụtara n’afọ ndị 1950, rụrụ ọrụ nwayọọ nwayọọ ma ghọwanye nke na-adịghị irè n’ihi na nje bacillus ekpenta malitere iguzogide ya. E mepụtara ọgwụ ndị ọhụrụ, malitekwa ná mbido afọ ndị 1980, Usoro Ọgwụgwọ Site n’Ọtụtụ Ọgwụ (MDT) ghọrọ ọgwụgwọ a na-anakwere gburugburu ụwa. A na-ejikọ ọgwụ atọ ọnụ n’ọgwụgwọ a—Dapsone, Rifampicin, na Clofazimine. Ọ bụ ezie na MDT na-egbu nje bacillus ahụ, ọ dịghị edozi ihe ndị mebiwororị.
MDT dị nnọọ irè n’ịgwọ ọrịa ahụ. N’ihi ya, ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ekpenta jiri ike daa site na nde 12 na 1985 ruo ihe dị ka nde 1.3 ka ọ na-erule ọkara 1996.
Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ọ Na-efe Efe?
Ekpenta adịghị efe ngwa ngwa; ihe ka ukwuu ná ndị mmadụ nwere usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ ndị siri nnọọ ike iguzogide ya. Mgbe ọ bịara, ọ na-abụkarị ndị bi ebe ha na ndị bu ya na-emekọrịtachi ihe anya ruo ogologo oge ka ọ na-eme otú ahụ.
Ndị dọkịta amaghị n’ụzọ e ji n’aka otú nje bacillus si abanye n’ahụ mmadụ, ma ha chere na ọ na-eme otú ahụ site n’akpụkpọ ahụ ma ọ bụ n’imi.
Atụmanya Ndị Dị n’Ihu
A na-elekwasị ekpenta anya maka “mkpochapụ dị ka nsogbu ahụ ike ọha mmadụ” ka ọ na-erule afọ 2000. Nke a na-apụta na ọnụ ọgụgụ ndị nwere ekpenta n’ógbè ọ bụla agaghị akarị 1 n’ime mmadụ 10,000. N’okpuru Alaeze Chineke a ga-ewepụ ya kpam kpam.—Aịsaịa 33:24.
Ebe ndị e si nweta ha: Òtù Ahụ Ike Ụwa; Njikọ Mba Nile nke Òtù Ndị Na-alụso Ekpenta Ọgụ; na Manson’s Tropical Diseases, Mbipụta nke 1996.
[Igbe dị na peeji nke 27]
Ekpenta nke Oge A na nke Oge Bible Hà Bụ Otu?
Akwụkwọ ọgụgụ ahụ ike taa na-akọwa ekpenta n’ụzọ ịkpọ ihe aha; aha sayensị a na-akpọ nje na-akpata ya bụ Mycobacterium leprae. N’eziokwu, Bible abụghị akwụkwọ ọgụgụ sayensị. Okwu Hibru na Grik ndị a sụgharịrị ịbụ “ekpenta” n’ọtụtụ nsụgharị Bible sara mbara nke ukwuu karị n’ihe ọ pụtara. Dị ka ihe atụ, ekpenta nke Bible na-ewepụta mgbaàmà ndị a na-ahụ anya ọ bụghị nanị na mmadụ kamakwa n’ákwà na n’ụlọ, ihe nje bacillus na-adịghị eme.—Levitikọs 13:2, 47; 14:34.
Ọzọkwa, mgbaàmà ndị a na-ahụ na mmadụ bụ́ ndị e ji amata ekpenta taa adịghị ekwekọ kpọmkwem ná nkọwa nke ekpenta n’oge Bible. Ụfọdụ na-atụ aro na nkọwa ahụ pụrụ ịbụ n’ihi eziokwu ahụ bụ na otú ọrịa si eme na-agbanwe ka oge na-agafe. Ndị ọzọ kwere na ekpenta e zoro aka na ya na Bible na-akọwa usoro ọrịa dị iche iche, bụ́ nke pụrụ ịgụnye ma ọ bụ ghara ịgụnye ọrịa M. leprae na-akpata.
Theological Dictionary of the New Testament na-ekwu na ma okwu Grik ma nke Hibru a na-asụgharịkarị ịbụ ekpenta “na-ezo aka n’otu ọrịa ahụ, ma ọ bụ ìgwè ọrịa . . . A pụrụ ịrụ ụka ma ọrịa a ọ̀ bụ ihe anyị na-akpọ ekpenta ugbu a. Ma ụzọ ịkpọ ihe aha ndị ahụ ike si akọwa ọrịa ahụ adịghị emetụta ụzọ anyị si ele akụkọ banyere ọgwụgwọ [Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gwọrọ ndị ekpenta] anya.”
[Foto dị na peeji nke 24]
Ọgbakọ ahụ n’èzí Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ogige ndị ekpenta ahụ
[Foto dị na peeji nke 26]
Isaiah Adagbona na nwunye ya, bụ́ Nimota