Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/15 p. 28-30
  • Usuu Ndị Agha Hà Ga-adị Anyị Mkpa Mgbe Nile?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usuu Ndị Agha Hà Ga-adị Anyị Mkpa Mgbe Nile?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọchịchọ Maka “Onye Uwe Ojii” Ụwa Nile
  • “Jehova nke Usuu Nile nke Ndị Agha”
  • Usuu Ndị Agha Chineke Amalite Ọgụ
  • Cheedị Banyere Ụwa Agha Na-adịghị
  • “Agha nke Oké Ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” nke Dị Nso
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Idozi Ihe Iseokwu Eluigwe Na Ala Ahụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • “Hụkwanụ Eziokwu na Udo n’Anya”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/15 p. 28-30

Usuu Ndị Agha Hà Ga-adị Anyị Mkpa Mgbe Nile?

USUU ndị agha erikpọwo akụkụ dị ukwuu nke ihe ụmụ mmadụ nwere ma bibie ihe dị ukwuu n’obi ụtọ mmadụ. N’ihi ya ụfọdụ ndị echewo, sị ‘Ihe a kpọrọ mmadụ ọ̀ pụrụ imekata nweta ụdị ịnọ ná ntụkwasị obi ụwa nke ga-enye ohere maka ikposasị usuu ndị agha?’ Ugbu a ngwá agha na-ebibi ihe n’ìgwè meworo ka mkpochapụ nke ndụ nile kwe omume, ajụjụ ahụ na-aghọ nke chọrọ ime ihe ozugbo. Ruo ókè hà aṅaa ka ezi uche dị na ya ile anya maka ụwa usuu ndị agha na-anọghị?

Ọtụtụ ihe meworo n’oge gara aga na-anwapụta na mgbe ezi mmekọrịta mba na mba mere ka e nwee nchekwube, ọ pụrụ iduga n’ịchịsatụ ngwá agha. Ọbụbụenyi a na-akpaghịrị ókè n’agbata Canada na United States, dị ka ihe atụ, emewo ka ókèala ha dị kilomita 5,000 bụrụ nke usuu ndị agha na-adịghị eche nche ruo ihe karịrị otu narị afọ na ọkara. Norway na Sweden enwewo nkwekọrịta yiri nke ahụ, dị ka ọtụtụ mba ndị ọzọ nwekwara. Nkwekọrịta n’etiti mba nile ọ̀ pụrụ iweta ụwa usuu ndị agha na-adịghị? N’ihi ụjọ nile nke Agha Ụwa Mbụ, a nakweere echiche ahụ n’ebe nile n’ụzọ na-enweghị atụ.

Mgbe e mere udo na 1918, otu n’ime nzube nke nkwekọrịta udo Versailles ahụ bụ “ime ka mmalite nke mbelata ngwá agha nke mba nile n’akụkụ nile kwe omume.” N’afọ ndị sochiri, imegide agha wuwere ewu. Ụfọdụ ndị mmegide agha wepụtara echiche bụ na agha bụ ihe kasị njọ pụrụ ịdakwasị mba, n’ihi ya bụrụkwa ihe ka mmeri njọ. Ndị na-ekwenyeghị n’imegide agha jụrụ, na-ekwu na ruo ọtụtụ narị afọ, ndị Juu n’ọtụtụ ebe eguzogidechaghị ndị mwakpo, ma ajọ mgbalị ikpochapụ ha dịgidere. Ndị Africa nwere ohere dị nta iguzogide ndị kpọtara ha na kọntinent ndị dị n’America dị ka ndị ohu, ma n’agbanyeghị nke ahụ e mesoro ha mmeso obi ọjọọ ruo ọtụtụ narị afọ.

Otú ọ dị, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ, ọtụtụ ndị mmegide agha kwubiri na mba dị iche iche nwere mkpa nchebe. Ya mere mgbe e hiwere òtù Mba Ndị Dị n’Otu ka Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, e kwusichaghị okwu ike banyere nchịsa ngwá agha kama mmekọrịta nke mba na mba iji gbochie mwakpo. Ndị òtù ya nwere olileanya na nchebe e si otú a weta ga-enye mba nile obi ike ịchịsa ngwá agha.

Nsogbu ọzọ pụtawanyere ìhè. Ọtụtụ mgbe, mgbalị ndị otu mba na-eme iji chebe onwe ya na-eme ka agbata obi ya chee na ya anọghị ná nchebe. Ajọ ihe a na-akpata nke ka njọ dubara n’asọmpi mkpụpụta ngwá agha. Ma n’oge na-adịbeghị nnọọ anya, mmekọrịta ka mma n’etiti mba ndị bụ dike ewusiwo olileanya nke nchịsa ngwá agha ike. Ma, eri mgbe ahụ, Agha Gulf na nsogbu ndị dị n’ebe bụbu Yugoslavia etikpọsịwo olileanya ọtụtụ ndị nwere maka nchịsa ngwá agha. Ihe dị ka afọ ise gara aga, magazin Time kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na agha nzuzo ahụ ebiwo, ụwa aghọwanyewo ebe dị ize ndụ, kama ibelata ebelata.”

Ọchịchọ Maka “Onye Uwe Ojii” Ụwa Nile

Ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-eme na-ekwubi na ihe a kpọrọ mmadụ nwere mkpa maka otu ikike ụwa nke nwere usuu ndị agha ike ya ruru ichebe onye ọ bụla. Ebe ma òtù Mba Ndị Dị n’Otu ma ndị kasị n’ike agha n’ụwa na-adịghị nke nwere ike ime nke a, ụfọdụ na-eche na e nwere olileanya dị nta maka ọdịnihu. Ma ọ bụrụ na ị nakweere Bible dị ka Okwu Chineke, ị pụrụ ichewo ma Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ọ̀ ga-egbo mkpa a chọrọ ime ihe ozugbo.

Onye Bible na-akpọ “Chineke nke ịhụnanya na udo” ọ̀ ga-eji ike agha hụ na e nwere ikpe ziri ezi? Ọ bụrụ otú ahụ, olee usuu ndị agha nke ọ bụ? Ọtụtụ n’usuu ndị agha nke taa na-azọrọ inwe nkwado Chineke, ma hà na-eme uche Chineke n’ezie? Ka Chineke ò nwere ụzọ ọzọ isi tinye aka ma weta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi?—2 Ndị Kọrint 13:11.

Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile mere ihe maka nnupụisi mbụ site n’ịchụpụ Adam na Iv n’Iden na iziga ndị cherub igbochi nlọghachi ha. Ọ makwara ọkwa nzube ya ibibi nnupụisi nile megide ọbụbụeze ya. (Jenesis 3:15) Nke ahụ ọ̀ pụrụ ịgụnye Chineke iji usuu ndị agha mee ihe?

Bible na-akọ banyere oge dị iche iche mgbe Chineke jiri usuu ndị agha mezuo ikpe ya. Dị ka ihe atụ, alaeze ndị dị n’ala Kenean sooro anụ ọhịa na-enwe mmekọahụ, na-achụ ụmụaka n’àjà, ma buo agha obi ọjọọ. Chineke kpebiri ka e bibie ha kpam kpam ma jiri usuu ndị agha Joshua mezuo amamikpe ahụ. (Deuterọnọmi 7:1, 2) N’otu aka ahụ, usuu ndị agha Eze Devid mezuru ikpe Chineke megide ndị Filistia dị ka ihe atụ nke otú Chineke ga-esi bibie ihe ọjọọ nile n’ụbọchị ikpe ikpeazụ ya.

Ihe ndị ahụ mere na-ezi ihe. Jehova gosipụtara na ya pụrụ iji usuu ndị agha nye ndị mmadụ nchebe. N’ezie, Jehova nwere ụdị usuu ndị agha pụrụ iche nke ga-ahụ maka nnupụisi nke zuru eluigwe na ala megide ịchịisi ya.

“Jehova nke Usuu Nile nke Ndị Agha”

Bible ji okwu bụ́ “Jehova nke usuu nile nke ndị agha” mee ihe ihe karịrị ugboro 250. Okwu ahụ na-ezokarị aka n’ọkwá Chineke dị ka ọchịagha nke usuu bara ụba nke ndị mmụọ ozi. N’otu oge Mikaịa onye amụma gwara Eze Ehab na Eze Jehoshafat, sị: “Ahụrụ m Jehova ka Ọ na-anọkwasị n’ocheeze Ya, na usuu ndị agha nke eluigwe nile ka ha na-eguzo n’akụkụ Ya n’aka nri Ya na n’aka ekpe Ya.” (1 Ndị Eze 22:19) A na-ekwu banyere usuu ndị agha nke ndị mmụọ ozi n’ebe a. Jehova jiri usuu ndị agha a chebe ndị ya. Mgbe a gbara obodo Dọtan gburugburu, obi furu onye na-ejere Elaịsha ozi. Ma, iji mee ka obi sie ya ike, Chineke nyere ya ọhụụ dị ebube nke usuu ndị agha ya nke ndị mmụọ e kere eke. “Jehova wee saghee anya nwa okorobịa ahụ; o wee hụ: ma, lee, ugwu ahụ jupụtara n’ịnyịnya na ụgbọala ọkụ.”—2 Ndị Eze 6:15-17.

Ihe ndị dị otú ahụ merenụ hà na-apụta na Chineke na-akwado usuu ndị agha taa? Ụfọdụ usuu ndị agha nke Krisendọm pụrụ ịzọrọ ịbụ usuu ndị agha Chineke. Ọtụtụ agwawo ndị ụkọchukwu ka ha gọzie ha. Ma usuu ndị agha Krisendọm na-alụsokarị ibe ha ọgụ, megide ndị kwere ekwe ibe ha. Agha ụwa abụọ nke narị afọ a malitere n’etiti usuu ndị agha na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst. Nke a apụghị ịbụ ọrụ Chineke. (1 Jọn 4:20) Ọ bụ ezie na ìgwè ndị agha dị otú ahụ pụrụ ịzọrọ na ha na-alụ ọgụ maka udo, Jisọs ọ̀ gwara ụmụazụ ya ka ha hazie usuu ndị agha dị otú ahụ ná mgbalị iji gbochie mkpaghasị udo n’ụwa?

A kpaghasịrị udo n’ụzọ dị ukwuu mgbe otu ajọ òtù ndị agha jidere Jisọs n’ogige ebe ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrịị na-ekpe ekpere. Otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya gburu otu nwoke so n’ìgwè ahụ mma. Jisọs jiri oge ahụ kọwaa otu ụkpụrụ dị mkpa. Ọ sịrị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya: n’ihi na mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha. Ma ọ bụ ị̀ na-eche na apụghị m ịrịọ Nna m, Ọ ga-ezitekwara m ọbụna ugbu a karị legiọn iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi?” Jisọs nwere usuu ndị agha bara ụba ọ pụrụ iji mee ihe, ma e denyeghị aha Pita dị ka otu n’ime ndị soja ahụ, e nweghịkwa mmadụ ọ bụla ọzọ e denyere aha ya. Kama nke ahụ, a kpọwo Pita na ụmụazụ Jisọs ndị ọzọ ịbụ “ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” (Matiu 4:19; 26:47-53) Hour ole na ole n’ihu, Jisọs mere ka ọnọdụ ahụ doo Paịlet anya. Ọ sịrị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a: ọ bụrụ na alaeze m sitere n’ụwa nke a, ndị na-ejere m ozi ga-alụ ọgụ, ka a ghara ịrara m nye n’aka ndị Juu: ma ugbu a alaeze m esighị n’ebe a pụta.” (Jọn 18:36) N’adịghị ka alaeze Devid nke e hiwere n’elu ụwa, Alaeze nke Chineke nyeworo Jisọs dị n’eluigwe, ọ ga-ewetakwa udo n’ụwa.

Usuu Ndị Agha Chineke Amalite Ọgụ

Usuu ndị agha Chineke ga-akpa ike n’isi nso. N’ịkọwa ọgụ na-abịanụ, Mkpughe na-akpọ Jisọs “Okwu Chineke.” Anyị na-agụ, sị: “Usuu nile nke ndị agha ndị dị n’eluigwe wee soo Ya n’elu ịnyịnya ọcha, na-eyi ezi ákwà ọcha, nke dị ọcha na-enwukwa enwu. Mma agha dị nkọ na-esikwa n’ọnụ Ya pụta, ka O wee were ya tigbuo mba nile.” Bible na-ekwu na ọgụ a ga-eweta ngwụsị nke “ndị eze ụwa, na usuu nile nke ndị agha ha.” Maka ndị ọzọ jụrụ igosipụta nguzosi ike n’ihe ha nye Chineke, amụma ahụ na-agbakwụnye: “E wee were mma agha nke Onye ahụ na-anọkwasị n’ịnyịnya ahụ . . . gbuo ndị fọdụrụ.” A ga-ewepụ ọbụna Setan bụ́ Ekwensu n’ọrụ. Nke a n’ezie ga-eme ka e nwee ụwa nke udo nke usuu ndị agha na-anọghị.—Mkpughe 19:11-21; 20:1-3.

Cheedị Banyere Ụwa Agha Na-adịghị

Ị̀ pụrụ ịhụ n’uche gị ụwa nke nọ ná nchebe nke na usuu ndị agha adịghị mkpa? Otu abụ ọma Bible na-asị: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova, Onye doworo ihe ijuanya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.”—Abụ Ọma 46:8, 9.

Lee ahụ efe nke a ga-abụ! Cheedị banyere ihe òtù ụmụ mmadụ a tọhapụrụ n’ikpeazụ pụọ n’ajọ ibu arọ nke ịkwụ ụgwọ maka usuu ndị agha na ihe agha ha ga-enwe ike imezu! Ndị mmadụ ga-etinye ume ha dum n’imeziwanye ọnọdụ ibi ndụ nke onye ọ bụla, n’ihichasị ụwa na ịkụghachi ihe ọkụkụ na ya. A ga-enwe ohere ndị ọhụrụ imepụta ihe ndị ga-abara ihe a kpọrọ mmadụ uru n’ezie.

Nkwa a ga-enwe mmezu zuru ụwa nile: “A gaghị anụkwa ihe ike ọzọ n’ala gị, a gaghị anụ mbibi na ntipịa n’ókèala gị nile.” (Aịsaịa 60:18) Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọtụtụ nde ndị gbara ọsọ ndụ obi na-alọ mmiri ga-esi n’ihu agha na-enupụ, bụrụ ndị a manyere ịhapụ ụlọ ha na ala ha ịga biri n’ogige nke nhụsianya. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ndị mmadụ ga-eru újú n’ihi ndị a hụrụ n’anya e gburu ma ọ bụ nye nkwarụ n’ọgụ mba na mba. Eze Jehova nke eluigwe ga-eme ka e nwee udo ụwa na-adịgide adịgide. “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị.”—Abụ Ọma 72:7, 14.

Ndụ n’etiti ndị mụtaworo ọ bụghị ịkpọ asị kama iṅomi ụzọ ịhụnanya Chineke ọbụna ga-akakwa ụtọ. Okwu Chineke na-ebu amụma, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” Olee ihe ọ ga-adị ka ya ibi n’etiti ndị maara Jehova ma hụ ya n’anya? Otu akwụkwọ ahụ na-ebu amụma, sị: “Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe nke ga-esi n’ofufe ezi omume ahụ pụta bụkwa ịnọ jụụ na ntụkwasị obi ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.”—Aịsaịa 11:9; 32:17, 18.

Ndị e wukwasịrị okwukwe ha n’elu ihe ọmụma Bible na-aghọta na usuu ndị agha Chineke dị njikere ikpochapụ ndị iro nile nke udo n’ụwa. Ihe ọmụma a na-enye ha obi ike ime ihe Bible na-ekwu ga-eme “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” Ya bụ: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:2-4.

Ndị si n’ọtụtụ mba bụ́ ndị ghọwororị Ndịàmà Jehova adịlarịị mbụ na-ezere ‘ịmụta agha.’ Ha etinyewo obi ike ha ná nchebe nke usuu ndị agha eluigwe nke Chineke. Site n’isoro ha mụọ Bible, gị onwe gị kwa pụrụ iwulite obi ike yiri nke ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]

Foto U.S. National Archives

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya