Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 5/1 p. 30-31
  • E Nyere Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Job Ụgwọ Ọrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Nyere Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Job Ụgwọ Ọrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ntọhapụ na Mweghachi
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • Jehova Na-anabata Ekpere Anyị Kpere Maka Ndị Ọzọ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Job Tachiri Obi—Anyị Pụkwara!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ihe Mmụta n’Ụzọ E Si Edozi Nsogbu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Job Toro Aha Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 5/1 p. 30-31

Ha Mere Uche Jehova

E Nyere Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Job Ụgwọ Ọrụ

JOB bụ nwoke nwere ọmịiko, ọnụ na-ekwuchitere ndị inyom di ha nwụrụ, ụmụ mgbei, na ndị e wedara n’ala. (Job 29:12-17; 31:16-21) Mgbe ahụ, na mberede, ọ dabara n’oké nsogbu, akụ̀ na ụba ya, ụmụ ya, na ahụ ike ya funahụrụ ya. N’ụzọ dị mwute, nwoke a a ma ama bụworo onye nkwado nke ndị a na-emegbu emegbu nwetara enyemaka dị nta n’oge ọ nọ ná mkpa. Ọbụna nwunye ya gwara ya ka ọ “gbakụta Chineke azụ, nwụọ.” “Ndị enyi” ya kwa bụ́ Elifaz, Bildad, na Zofa enyeghị ya nkasi obi. Kama, ha nyere echiche na Job emehiewo n’ihi ya kwa ihe mgbu ya kwesịrị ya.—Job 2:9; 4:7, 8; 8:5, 6; 11:13-15.

N’agbanyeghị oké nhụjuanya, Job nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi. N’ihi nke a, Jehova mesịrị meere Job ebere, gọziekwa ya. Ihe ndekọ nke otú o si mee nke ahụ na-emesi ndị ohu Chineke nile na-eguzosi ike n’ezi ihe obi ike na n’isi nso a ga-enye ha ụgwọ ọrụ.

Ntọhapụ na Mweghachi

Nke mbụ, Jehova baara Elifaz, Bildad, na Zofa mba. N’ịgwa Elifaz okwu, onye ihe àmà na-egosi na ọ bụ ya kasị mee okenye, ọ sịrị: “Iwe m dị ọkụ megide gị, megidekwa ndị enyi gị abụọ: n’ihi na unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m, dị ka ohu m, bụ́ Job, kwuworo. Ma ugbu a, chịrịnụ n’onwe unu oké ehi asaa na ebulu asaa, jekwuru ohu m, bụ́ Job, sureere onwe unu àjà nsure ọkụ; Job, bụ́ ohu m, ga-ekpekwa ekpere banyere unu.” (Job 42:7, 8) Cheedị nnọọ ihe nke a pụtara!

Jehova chọrọ àjà buru nnọọ ibu n’aka Elifaz, Bildad, na Zofa, ikekwe iji gosi ha ókè mmehie ha dịruru ná njọ. N’ezie, ma hà ma ụma ma ọ bụ na ha amaghị ụma, ha ekwuluwo Chineke site n’ịsị na ọ ‘naghị atụkwasị ndị ohu ya obi’ nakwa na ọ gbasaghị ya ma Job ọ na-ekwesị ntụkwasị obi ma ọ bụ na ọ dịghị ekwesị. Ọbụna Elifaz sịrị na n’anya Chineke Job abaghị uru karịa nla! (Job 4:18, 19; 22:2, 3) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji kwuo, sị: “Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m”!

Ma o jedebeghị n’ebe ahụ. Elifaz, Bildad, na Zofa mehiekwara megide Job n’onwe ya site n’ịgwa ya na ọ kpataara onwe ya nsogbu. Ebubo ha na-enweghị isi, nke enwetụghị ọmịiko wetaara Job obi ilu na ịda mbà n’obi, na-eme ka o tie mkpu, sị: “Ruo olee mgbe [ka] unu ga-eme ka mkpụrụ obi m ruo újú? Ruo olee mgbe [ka] unu ga-ewere okwu zọpịa m?” (Job 10:1; 19:2) Cheedị ihere dị ndị ikom atọ a n’ihu ugbu a ha na-aghaghị iche àjà n’ihu Job maka mmehie ha!

Ma Job aṅụrịghị ọṅụ ná mweda n’ala ha. N’ezie, Jehova chọrọ ka o kpechitere ndị na ebo ya ebubo ekpere. Job mere nnọọ dị ka a tụziiri ya, a gọzikwara ya n’ihi nke a. Nke mbụ, Jehova gwọrọ ọrịa ya na-atụ ụjọ. E mesịa, ụmụnne Job ndị ikom, ndị inyom, na ndị bụbu ndị enyi ya bịara ịkasi ya obi, “wee nye ya, nwoke ọ bụla otu iberibe ego, na nwoke ọ bụla otu mgbaaka ọlaedo.”a Ọzọkwa, Job “wee nwee ewu na atụrụ [puku iri na anọ] na camel [puku isii], na nne ịnyịnya ibu [otu puku].”b Ihe àmà na-egosi na Job na nwunye ya dịghachiri ná mma. Ka oge na-aga, e ji ụmụ ndị ikom asaa na ndị inyom atọ gọzie Job, ọ dịkwa ndụ hụ ọgbọ anọ nke ụmụ ụmụ ya.—Job 42:10-17.

Ihe Mmụta Nye Anyị

Job setipụrụ ihe nlereanya pụtara ìhè nye ndị ohu Chineke nke oge a. O “zuru okè, ziekwa ezi,” nwoke Jehova ji obi ụtọ kpọọ “ohu m.” (Job 1:8; 42:7, 8) Otú ọ dị, nke a apụtaghị na Job zuru okè. N’otu mgbe n’oge ule ya, o chere n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ bụ Chineke na-akpata ọdachi ya. Ọbụna ọ katọrọ ụzọ Chineke si emeso mmadụ ihe. (Job 27:2; 30:20, 21) O kwupụtakwara ezi omume nke onwe ya karịa nke Chineke. (Job 32:2) Ma Job jụrụ ịgbakụta Onye Okike azụ, o jikwa obi umeala nara mgbazi olu sitere n’aka Chineke. ‘M gosiwo ihe nke m na-adịghị aghọta,’ ka o kwetara. “M na-ajụ onwe m ajụ, wee chegharịa n’elu ájá na ntụ.”—Job 42:3, 6.

Mgbe anyị nọ n’okpuru ule anyị pụkwara ịdị na-eche echiche, na-ekwu okwu, ma ọ bụ na-eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. (Tụlee Eklisiastis 7:7.) Otú o sina dị, ọ bụrụ na ịhụnanya anyị maka Chineke miri emi, anyị agaghị enupụ isi megide ya ma ọ bụ nwee obi ilu n’ihi na o kwere ka anyị nwee ihe isi ike. Kama nke ahụ, anyị ga-ejigide iguzosi ike n’ezi ihe anyị ma si otú ahụ nweta ngọzi dị ukwuu n’ikpeazụ. Ọbụ abụ ahụ kwuru banyere Jehova, sị: “N’ebe onye ebere nọ Ị ga-egosi Onwe gị onye ebere.”—Abụ Ọma 18:25.

Tupu e weghachi ahụ ike Job, Jehova chọrọ ka o kpee ekpere n’isi ndị mehiere ya. Lee ihe nlereanya ọma ọ bụ nye anyị! Jehova na-achọ ka anyị gbaghara ndị mehiere anyị tupu e nwee ike ịgbaghara mmehie nke anyị onwe anyị. (Matiu 6:12; Ndị Efesọs 4:32) Ọ bụrụ na anyị adịghị njikere ịgbaghara ndị ọzọ mgbe e nwere ezi ihe mere a ga-eji mee otú ahụ, ànyị ga-ezi ezi ịtụ anya ka Jehova meere anyị ebere?—Matiu 18:21-35.

Anyị nile na-eche ule ihu site n’oge ruo n’oge. (2 Timoti 3:12) Ma, dị ka Job anyị pụrụ iguzosi ike n’ezi ihe. Site n’ime otú ahụ, anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Jemes dere, sị: “Lee, anyị na-akpọ ha ndị ngọzi dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi: unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị zubere, na Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.”—Jemes 5:11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A pụghị ịchọpụta ọnụ ego “otu iberibe ego” (Hibru, qesi·tahʹ). Ma ‘otu narị iberibe ego’ zụtara otu ala buturu ibu n’ụbọchị Jekọb. (Joshua 24:32) N’ihi ya, “otu iberibe ego” sitere n’aka onye ọbịa ọ bụla yikarịrị ka ọ bụ onyinye dị ukwuu.

b Ma eleghị anya, e kwuru na ịnyịnya ibu ahụ bụ nne n’ihi uru ha dị ka ndị na-amụ ụmụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya