Eze nke Nwere Akụ̀ na Ụba na Amamihe
Ì chere na akụ̀ na ụba ga-eme gị obi ụtọ? Ọ bụrụ na mmadụ enye gị ùkwù ego buru ibu, ị́ gaghị enwe aṅụrị? Ikekwe ị ga-enwe. E leghị anya ị pụrụ iche echiche ụzọ ị ga-esi jiri ya mee ihe.
N’EZIE, e nwere ọtụtụ ihe a ga-azụta iji mee ka ndụ na-enyekwu ntụsara ahụ ma na-enye ọṅụ karị. Ego pụkwara ịbụ “ndo” pụọ ná nsogbu ndị a na-atụghị anya ha, dị ka ọrịa ma ọ bụ enweghị ọrụ.—Eklisiastis 7:12.
Ma gịnị bụ njikọ dị n’etiti ego na obi ụtọ? Ị̀ na-eche, dị ka ọtụtụ ndị na-eche, na obi ụtọ bụ ihe na-esi n’akụ̀ na ụba apụta? Ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a pụrụ isi ike n’ihi na ọ dị mfe ịtụ ego n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ma ọ bụ ịgụ ya ọnụ, ma a pụghị ime obi ụtọ otú a. Ị pụghị ịtụkwasị obi ụtọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma mara ịdị arọ ya.
Ọzọkwa, ụfọdụ ndị ọgaranya yiri ka obi ọ dị ha ụtọ, ebe ndị ọzọ na-ahụsi anya. Otú ahụ ka ọ dị ndị ogbenye. Ka o sina dị, ihe ka n’ọtụtụ ụmụ mmadụ—ọbụna ndị bawororịị ọgaranya—kwere na inwekwu ego ga-ewetakwuru ha obi ụtọ.
Otu onye dere banyere ihe ndị dị otú ahụ bụ Eze Solomọn nke Israel oge ochie. O so ná ndị ikom bakarịsịrị ọgaranya dịtụworo ndụ. Ị pụrụ ịgụ banyere nkọwa nke oké akụ̀ na ụba ya n’isi nke 10 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Eze nke Mbụ. Dị ka ihe atụ, rịba ama na amaokwu nke 14 na-asị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ ọlaedo nke bịakwutere Solomọn n’otu afọ dị [narị talent ọlaedo isii na iri isii na isii].” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọnụ ọgụgụ ahụ hà ka tọn ọlaedo 25. Taa, ọlaedo há otú ahụ ga-akarị $200,000,000 nke U.S.!
Ma, ọ bụghị nanị na Solomọn bara ọgaranya; Chineke ji amamihe gọzie ya. Bible na-akọ, sị: “Eze, bụ́ Solomọn, we dị ukwuu karịa eze nile nke ụwa n’akụ̀ na n’amamihe. Ụwa nile wee na-achọ ihu Solomọn, ịnụ amamihe ya, nke Chineke tinyere n’obi ya.” (1 Ndị Eze 10:23, 24) Anyị onwe anyị kwa pụrụ irite uru n’amamihe Solomọn, ebe ihe ndị o dere mejupụtara akụkụ nke ihe ndekọ Bible. Ka anyị hụ ihe o nwere ikwu banyere njikọ dị n’etiti akụ̀ na ụba na obi ụtọ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
E si na Die Heilige Schrift - Übersetzt von Dr. Joseph Franz von Allioli. Druck und Verlag von Eduard Hallberger, Stuttgart, bipụtaghachi ya.