Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 6/1 p. 5-7
  • Jiri Ndidi Chere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Ndidi Chere
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chee Echiche Nke Ọma
  • Chineke Anọghị Ọdụ
  • Omume Dị Ike Karịa Okwu Ọnụ
  • Ihe E Bu Ụzọ Mara
  • “Debe Onwe Unu n’Ịhụnanya Chineke”
  • Na-ele Anya Ụbọchị Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ka Anyị Jisie Okwukwe Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 6/1 p. 5-7

Jiri Ndidi Chere

ONYE ọzụzụ atụrụ ahụ nke tiri mkpu ugboro ugboro sị “Lee anụ ọhịa wolf!” mgbe ọ na-enweghị anụ ọhịa wolf na-abịa chọpụtara na a ṅaghị ntị ná mkpu o mesịrị tie maka enyemaka. N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ na-eleghara ịdị nso nke ụbọchị Jehova anya n’ihi na ha anụwo ọtụtụ ịdọ aka ná ntị ndị mesịrị bụrụ mgbaàmà ụgha. Eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ adịghị aghọta ịdọ aka ná ntị nke bụ ezigbo ya, mgbe ahụ ṅaakwa ntị na ya bụ ihe onye iro ukwu Chineke, bụ́ Setan, “mmụọ ozi nke ìhè” ụgha ahụ na-eji eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.—2 Ndị Kọrint 11:14.

Mmụọ nke onwe onye iju ya afọ ga-adị ize ndụ ọbụna nye ndị jewooro Jehova ozi ruo oge ụfọdụ. N’ihi gịnị? Tụlee ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Pita onyeozi na narị afọ mbụ.

Chee Echiche Nke Ọma

Akwụkwọ ozi nke abụọ Pita dere n’ike mmụọ nsọ bụ ihe ncheta nye ndị Kraịst oge mbụ, ọ bụkwa nye anyị n’otu aka ahụ. “Ndị m hụrụ n’anya,” ka ọ na-ede, “nke a bụ akwụkwọ ozi nke abụọ nke m na-edegara unu ugbu a; ma n’ime ha abụọ ka m na-akpali uche unu dị ọcha n’ichetara unu.” (2 Pita 3:1) Olee ihe ndabere Pita nwere maka nchegbu a? Pita na-eme ka ọ pụta ìhè na e nwere ndị ọchị bụ́ ndị ịchị ọchị ha na-emebi echiche nke ịdị ngwa a chọrọ maka oge ndị ohu Chineke bi n’ime ya. Ugbu a bụ oge ịkpachara anya maka ịghọ onye ndị ọchị ghọgburu. Pita si otú a na-agba ndị na-agụ akwụkwọ ya ume ka ha “cheta okwu nke ndị amụma dị nsọ buru ụzọ kwuo.” (2 Pita 3:2; Ọrụ 3:22, 23) Gịnị ka ndị amụma kwuworo?

Ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi akpọtụwo uche ọtụtụ mgbe n’ụzọ ikpe Chineke siri weta mmebi iwu ná njedebe. Pita na-echetara ndị na-agụ akwụkwọ ya banyere Iju Mmiri ụbọchị Noa nke Chineke jiri mee ihe dị ka ụzọ isi tinye aka mgbe ụwa jupụtara n’ajọ omume. Oké Iju Mmiri ahụ wetara nnọọ ụwa nke oge ahụ ná njedebe. Ma Chineke chebere Noa na ezinụlọ ya tinyere ụdị dị iche iche nke ihe dị ndụ e kere eke “n’ime anụ ahụ nile” n’ime otu ụgbọ. Akụkọ mgbe ochie zuru ụwa ọnụ na-agba akaebe nye ịbụ eziokwu nke ihe ndekọ Bible ahụ.a—Jenesis 6:19; 2 Pita 3:5, 6.

Pita kpọrọ ntinye aka Chineke ahụ ‘otu ihe nke na-eme ụfọdụ ndị nchefu.’ Mgbe ahụ ndị ọchị nke ụbọchị ahụ rabara ndị ọzọ n’omume nke onwe onye iju ya afọ. Otú ọ dị, anyị agaghị echefu mgbe ọ bụla ihe ndị Jehova meworo. Pita na-agwa anyị, sị: “Eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ site n’otu okwu ahụ, ebe a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:7) Ee, Chineke ga-etinye aka ọzọ.

Chineke Anọghị Ọdụ

Ọtụtụ puku afọ agabigaworị. Gịnị mere Chineke jiri chere ogologo oge otú a ịgwọta nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ? Ọzọ, Pita na-elekwasị anya n’eziokwu ọzọ. Ọ na-asị: “Unu ekwela ka otu ihe a mee unu nchefu, ndị m hụrụ n’anya, na otu ụbọchi dị ka [otu puku afọ] n’anya Onyenwe anyị, [otu puku afọ] dịkwa ka otu ụbọchị.” (2 Pita 3:8) Ụzọ Jehova si ele oge anya dị iche na nke anyị. Nye Chineke nke na-adịru ebighị ebi, ogologo oge site n’okike Adam ruo ugbu a erughịdị otu izu. Ma ihe ọ sọrọ ya bụrụ ụzọ anyị si ele oge anya, otu puku afọ ọ bụla na ụbọchị ọ bụla nke na-agafe na-ewetakwu anyị nso ná mmezu nke nzube Jehova.

“A gbaa ite akịdị gburugburu ọ dị ka ọ gaghị eghe eghe” bụ ilu na-apụta na ịnọ nnọọ na-echere otu ihe omume na-eyi ka ọ na-egbu oge imezu. Otú ọ dị, Pita na-atụ aro ịnọ “na-ele anya [mbịarute, NW] nke ụbọchị ahụ nke Chineke, na-emekwa ka ọ bịa ngwa ngwa.” (2 Pita 3:12, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Olee otú anyị pụrụ isi zụlite àgwà nke ga-eme ka anyị mụrụ anya banyere ịdị nso nke ntinye aka Chineke?

Omume Dị Ike Karịa Okwu Ọnụ

Pita na-elekwasị anya n’ibi obi na omume. Ọ na-ezo aka “n’ibi obi nsọ nile” nakwa ná “nsọpụrụ Chineke nile.” (2 Pita 3:11) Gịnị ka ndị a gụnyere?

Ezi ohu Chineke na-eme omume n’ụzọ na-amasị Ya. Okwukwe nke ezi onye dị otú ahụ na-efe ofufe na-apụta ìhè n’àgwà ya. Nke a na-edo ya iche pụọ ná ndị na-ekwu nanị banyere ikwere na Chineke na nkwa ya. Ikekwe ị hụtawo na nkwusa ihu ọha nke Ndịàmà Jehova na-edo ha iche dị ka ndị dị iche. Ha na-akpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji dọrọ uche gaa ná nkwa Chineke ndị e dere n’ime Bible. Ma ha na-agbakwa àmà banyere olileanya na nkwenkwe ha n’ebe ọ bụla ha zutere ndị mmadụ.

Onyeàmà nke na-anọgide na-ekwusa okwukwe ya nye ndị ọzọ na-ewusi ma na-emekwa ka nkweta ya sie ike. Okwu na-eme ka mmetụta dịkwuo omimi, n’otu oge ahụkwa na-eweta ọṅụ ime obi na afọ ojuju. Mgbe anyị na-akpọsa ozi ọma nke Alaeze Chineke, anyị na-emekwa ka obi tọọ Jehova ụtọ. Anyị ma na ọ ‘bụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ anyị na ịhụnanya ahụ anyị gosiri n’ebe aha Ya dị,’ dị ka onyeozi ibe Pita bụ́ Pọl na-ekwu.—Ndị Hibru 6:10; Ndị Rom 10:9, 10.

Gịnị ka ibute mgbasa nke ozi ọma Alaeze ahụ ụzọ na-arụpụta n’oge ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a? Ọtụtụ narị puku ụmụ mmadụ nwere ezi obi na-amụta ụzọ ha pụrụ isi nwee mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova nọ, iji rite uru site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ ma chọta ezi obi ụtọ n’atụmanya nke ndụ agwụghị agwụ n’elu ụwa paradaịs.

Ihe E Bu Ụzọ Mara

Ọ bụ ezie na anyị matara site na Bible na Jehova Chineke ga-etinye aka mgbe oge ya ruru, ọ dị anyị mkpa ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị nke Pita na-enyekwu. “Ebe unu buru ụzọ mara ihe ndị a, na-echenụ onwe unu nche ka a ghara iwere njehie nke ndị na-emebi iwu bupụ unu, unu wee si ná nguzosi ike nke aka unu dapụ.”—2 Pita 3:17.

Jehova bu ụzọ mara n’ezie na ụfọdụ ndị na-enweghị okwukwe siri ike pụrụ inwe nkụda aka n’ihi ihe yiri ka ọ bụ igbu oge nke ntinye aka Chineke. Ọ makwaara na mmetụta nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke pụrụ imerụ ezi ndị ohu ya ma ọ bụ, ọ dịkarịa ala, mebie nkweta ha na ido nsọ nke aha Chineke dị nso. Lee ọdachi ọ ga-abụ ịkwụsị iguzosi ike n’ụbọchị ikpeazụ ndị a!

Ugbu a abụghị oge inwe obi abụọ ma ọ bụ mgbagwoju anya banyere ihe Jehova ga-eme. (Ndị Hibru 12:1) Kama, ugbu a bụ oge ito eto n’obi ekele maka ihe ndidi Jehova wetaworo—atụmanya nke nzọpụta nye ọtụtụ nde ndị ghọworo akụkụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ zuru ụwa ọnụ ma na-ele anya ịlanarị mkpagbu ukwu ahụ na-abịanụ. (Mkpughe 7:9, 14) Pita na-agba ume, sị: “Na-abanụ ụba n’amara na ọmụma nke Onyenwe anyị, bụ́ onye nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst. Ọ bụ Ya ka otuto dịịrị ma ugbu a ma ruo ụbọchị nke mgbe ebighị ebi.”—2 Pita 3:18.

“Debe Onwe Unu n’Ịhụnanya Chineke”

Iji ọrụ n’aka n’ime nkwusa Alaeze na ijechi nzukọ ndị Kraịst anya maka ofufe na ọmụmụ nke Okwu Chineke na-enye anyị nchebe. Otú a, anyị agaghị enwe ohere iji na-enwebiga nchegbu ókè banyere ọnọdụ na-adịwanye njọ n’ajọ usoro ihe nke taa. Egwu na nchegbu kwesịrị inwe ọnọdụ dị nta ná ndụ ezi ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrint 15:58) Ka anyị na-arụsikwu ọrụ ike n’ijere Jehova ozi, otú ahụ ka oge na-agafe ngwa ngwa karị.

Jud, onye dịrị ndụ n’oge Pita, bụrụkwa onye otu nne ji ya na Jisọs, na-agba anyị ume, sị: “Unu onwe unu, ndị m hụrụ n’anya, n’iwuli onwe unu elu dị ka ụlọ n’elu okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ, n’ikpekwa ekpere n’ime Mmụọ Nsọ, debe onwe unu n’ịhụnanya Chineke, na-eche ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ruo ndụ ebighị ebi.” (Jud 20, 21) Rịba ama ịdị mkpa nke àgwà ziri ezi nke a na-azụlite site n’ịnọgidesi ike n’ekpere. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Jud na-agbakwụnyezi, sị: “Na-emekwaranụ ụfọdụ ebere bụ́ ndị nwere obi abụọ; na-azọpụtakwanụ ụfọdụ, na-agụpụta ha n’ọkụ; ma werenụ egwu meere ụfọdụ ebere; na-akpọ ọbụna uwe anụ ahụ nyeworo ntụpọ asị.” (Jud 22, 23) Lee mkpa ọ dị iwusi ibe anyị ike n’oge ndị a siri ike! Leekwa mkpa ọ dị ịghara ịdaba n’ọnwụnwa, na-eji ‘ụbọchị nzọpụta’ a gbatịkwuworo emere ihe ngọpụ maka “agụụ ịkwa iko,” nke jupụtara nnọọ ugbu a n’ime ụwa nke taa rụrụ arụ n’omume.—Jud 4; 2 Ndị Kọrint 6:1, 2.

Site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ ịhụnanya nke Pita, Pọl na Jud na site n’ịdị uchu na iji ọrụ n’aka n’ozi Chineke, ị pụrụ iji ndidi chere ntinye aka Jehova. Ma ị̀ ga-eme otú a?

Alala azụ ịkpọtụrụ Ndịàmà nọ n’ógbè gị maka enyemaka iji mee ka okwukwe gị siwanye ike ná nkwa ndụ ebighị ebi nke Onye Okike kwere. Mụta ihe a chọrọ iji ruo eruo ikere òkè n’ọrụ ịgba àmà a zuru ụwa ọnụ nke a na-agaghị emeghachi bụ́ nke a ga-agbasị ná mkpagbu ukwu ahụ na-abịaru nso. (Mak 13:10) Mgbe ahụ ị ga-enwe atụmanya nke ibi n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Jehova na-ekwe ná nkwa. (2 Pita 3:13) Ṅaa ntị n’ihe ncheta ya! Jiri ndidi chere! Dị uchu!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Biko lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, peji nke 116, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 7]

Mụta ugbu a banyere nkwa Paradaịs nke Chineke kwere

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]

Wolf: Anụmanụ/Jim Harter/Dover Publications, Inc.; onye ọzụzụ atụrụ na-eto eto: Ụmụaka: A Pictorial Archive from Nineteenth-Century Sources/Grafton/Dover Publications, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya