Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Iji Ohere Ọ Bụla Eme Ihe
A MAARA Ndịàmà Jehova n’ụwa nile maka ọrụ nkụzi Bible ha. Ma ha na-eduzikwa usoro ihe omume ndị na-ewetara ọha na eze abamuru ndị ọzọ. A nabatawo ije ozi ihu ọha a nke ọma, dị ka ahụmahụ ndị na-esonụ sitere n’Ecuador na-egosi.
◻ Ndị na-elekọta otu nnukwu ụlọ ọrụ na-emepụta ugegbe chọrọ ịhaziri ndị na-arụrụ ha ọrụ ihe ọmụmụ banyere ụkpụrụ ezinụlọ. Onye ntụzi nke ndị ọrụ kpọrọ ụfọdụ ndị ụkọchukwu Katọlik ka ha kere òkè ma o nwetaghị nzaghachi. Otu ụkọchukwu gwara ya na ọ bụ nnọọ ndị ụkọchukwu ole na ole ruru eru ikwu okwu banyere isiokwu ahụ nke na o yiri ka ọ dịghị onye ga-abịa. Mgbe ọ nụrụ nke a, otu Onyeàmà e were n’ọrụ n’ebe ahụ mere ndokwa ka otu nwanna onye na-ejekarị ozi n’ógbè azụmahịa bịa leta ụlọ mmepụta ihe ahụ.
Kpọmkwem n’echi ya, Onyeàmà ahụ bịakwutere onye ntụzi nke ndị ọrụ ahụ ma gwa ya ka ha na ya nwee usoro ọmụmụ ihe. E depụtara isiokwu ndị sitere ná mbipụta dị iche iche nke Watch Tower Society. Ọ masịrị onye ntụzi ahụ. Ọ họọrọ isiokwu atọ maka nkwurịta okwu—mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ụkpụrụ omume n’ọrụ, na ụkpụrụ omume n’ezinụlọ. Mgbe ahụ e mere ndokwa isoro ndị ọrụ nile tụlee ihe ọmụma ahụ.
E kere ndị ọrụ ahụ n’ìgwè asaa nke nwere mmadụ 30 ná nke ọ bụla, ụmụnna nwoke atọ ruru eru enyefezie ha ihe ọmụma ahụ. Gịnị bụ ihe ndị ọ rụpụtara? Ụfọdụ ndị ọrụ sịrị ka a bịa kpọtụrụ ha n’ebe obibi ha, e tinyekwara ihe ndị e ji amụ Bible dị 216. Ọ masịrị ndị na-elekọta ụlọ ọrụ ahụ nke ukwuu nke na ha jụrụ ma Ndịàmà ahụ hà pụrụ ịkwado usoro okwu ọzọ.
◻ N’oge na-adịbeghị anya, Ecuador nyere iwu nke na-ekwe ka a kụzie ihe banyere okpukpe n’ụlọ akwụkwọ. Otu nwanna nwanyị onye ozi ala ọzọ kpọtụụrụ otu nwanyị bụ onye isi nke otu ụlọ akwụkwọ praịmarị ma jụọ banyere otú iwu ọhụrụ ahụ si aga. Onye isi ahụ kọwara na e mere mgbalị ịmalite usoro ihe omume n’ofufe Meri ma o mechaghị nwee isi. Mgbe nwanna nwanyị ahụ kwuru na ụdị ofufe dị otú ahụ pụrụ inye ụmụaka ndị na-abụghị ndị Katọlik nsogbu, onye isi ahụ kwetara. “N’aka nke ọzọ,” ka onye ozi ala ọzọ ahụ sịrị, “anyị nwere usoro ihe omume maka ịkụzi ụkpụrụ ọma site na Bible nke na-adịghị arụgide mmadụ ịnakwere otu okpukpe kpọmkwem.” Onye isi ahụ zaghachiri sị: “Olee mgbe ị pụrụ ịbịa? Nwanne echi?” Mgbe onye ozi ala ọzọ ahụ gosisịrị ya akwụkwọ bụ́ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti, e kpebiri na ha ga-atụle isiakwụkwọ bụ́ “Ngọzi Nadiri Ndi Nadi n’Udo.”
Mgbe ọ laghachiri, onye ozi ala ọzọ ahụ jiri hour atọ leta ọnụ ụlọ klas asaa dị iche iche ka onye isi ahụ na-eso ya na-egekwa ntị. Mgbe e nwesịrị nnọkọ n’etiti ya na ndị klas nke ise, otu n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ sịrị: “Nwaada, biko hụ na i letara ndị klas nke isii. Ha na-anwa mgbe nile iti anyị ihe na ịmalite ọgụ!” Otu onye nkụzi kwuru, sị: “Ime ihe ike bụ nnọọ otu isiokwu dị mkpa. Anyị chọkwuru oge iji kparịta ihe a.”
E mere ndokwa maka ime nletaghachi n’ụlọ akwụkwọ ahụ iji kwurịta isiokwu ndị dị ka nrubeisi na ịgha ụgha. Ka ọ dị ugbu a, ihe ndị ọ rụpụtara dị nnọọ mma. Ugbu a mgbe nwanna nwanyị ahụ bụ́ onye ozi ala ọzọ na-aga n’okporo ámá, ụmụaka ahụ na-agbakwute ya ikele ya na ịjụ ajụjụ ndị sitere na Bible. Ndị ọzọ na-eji obi ụtọ kọwaara ndị mụrụ ha onye ọ bụ. Tụkwasị na nke a, a maliteworo abụọ n’ime ụmụ akwụkwọ ndị ahụ ọmụmụ Bible ebe obibi.