Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 6/1 p. 28-31
  • A Kwagidere M Gabiga Ọnwụnwa Ndị Dị Egwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Kwagidere M Gabiga Ọnwụnwa Ndị Dị Egwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Juu
  • Mmalite nke Ọnwụnwa
  • Ọnwụnwa M nke Kasị Njọ
  • Oge Ahụ Efe
  • Ịnọgide Na-adị Ndụ n’Auschwitz
  • Ịnọgide Na-adị Ndụ n’Ogige Ndị Ọzọ
  • Ntọhapụ na Ndụ Mgbe nke Ahụ Gasịrị
  • Jehova Nyeere Anyị Aka Ịlanahụ Ọchịchị Aka Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • A Mara M Ikpe Ugboro Abụọ Ịrụ Ọrụ Ahụhụ Ruo Afọ 25
    Teta!—2006
  • Nchegbu M Bụ́ Isi—Ịnọgide Na-eguzosi Ike n’Ihe
    Teta!—2000
  • Amụtara M Ịdabere na Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 6/1 p. 28-31

A Kwagidere M Gabiga Ọnwụnwa Ndị Dị Egwu

DỊ KA ÉVA JOSEFSSON SI KỌỌ

Otu ìgwè nta nke anyị so na ya zukọtara n’ógbè Újpest nke Budapest, Hungary, maka nzukọ dị nkenke tupu anyị agawa ozi ndị Kraịst. Ọ bụ na 1939, nwa oge tupu mmalite nke Agha Ụwa nke Abụọ, a machibidokwara ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova iwu na Hungary. N’oge ahụ a na-ejidekarị ndị keere òkè n’ịkụzi Bible n’ihu ọha.

EBE ọ bụ nke mbụ m na-ekere òkè n’ọrụ a, aghaghị m iyiwo onye nwetụrụ nchegbu na onye ihu ya na-agbachapụghị agbachapụ. Otu nwanna nwoke bụ́ onye Kraịst tọrọ m lere m anya ma sị: “Éva, i kwesịghị ịtụ ụjọ ma ọlị. Ijere Jehova ozi bụ ihe ùgwù kasị ukwuu mmadụ pụrụ inwe.” Okwu obiọma ndị ahụ, na-enyekwa ume nyere aka ịkwagide m gabiga ọtụtụ ọnwụnwa dị egwu.

Onye Juu

Abụ m nwa mbụ n’ime ụmụ ise nke otu ezinụlọ ndị Juu. Okpukpe ndị Juu ejughị mama m afọ, ọ malitekwara inyocha okpukpe ndị ọzọ. Otú a ka o si zute Erzsébet Slézinger, nwanyị ọzọ bụ́ onye Juu nke nọkwa na-achọ eziokwu nke Bible. Erzsébet mere ka mama m mata Ndịàmà Jehova, n’ihi ya kwa, aghọkwara m onye nwere mmasị n’ụzọ dị omimi n’ozizi Bible. N’oge na-adịghị anya amalitere m isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe m mụtaworo.

Mgbe m gbara afọ 18 n’oge okpomọkụ nke afọ 1941, m gosipụtara nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke site na baptism n’Osimiri Danube. E mere mama m baptism n’otu oge ahụ, ma papa m esonyeghị n’okwukwe ndị Kraịst anyị nwetara ọhụrụ. N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị m baptism, emere m atụmatụ ịsụ ụzọ, ya bụ, ikere òkè n’ozi oge nile. Ọ dị m mkpa ịzụta ịnyịnya ígwè, ya mere amalitere m ịrụ ọrụ n’ụlọ ime nchọpụta nke otu nnukwu ụlọ ọrụ na-emepụta ákwà.

Mmalite nke Ọnwụnwa

Ndị Nazi ewegharawo Hungary, ụlọ ọrụ mmepụta ihe ebe m na-arụ ọrụ abanyewokwa n’okpuru nlekọta ndị Germany. Otu ụbọchị a kpọrọ ndị ọrụ nile ka ha bịa n’ihu ndị isi ọrụ iji ṅụọ iyi nkwado nye ndị Nazi. A gwara anyị na emeghị nke a ga-arụpụta ihe ọjọọ. N’oge ememe ahụ ebe a chọrọ ka anyị too Hitler, m guzooro ọtọ n’ụzọ nkwanye ùgwù ma ghara ime ihe ahụ a chọrọ ka e mee. A kpọbatara m n’ọfịs kpọmkwem n’ụbọchị ahụ, nye m ụgwọ ọnwa m, chụọkwa m. Ebe ọrụ dị ụkọ, echere m ihe ga-eme atụmatụ m ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Otú ọ dị, n’echi ya, enwetara m ọrụ ọhụrụ a na-akwụ ọbụna ụgwọ ọnwa ka mma.

Ugbu a m pụrụ imezu ọchịchọ m ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Enwere m ọtụtụ ndị mụ na ha rụkọrọ ọrụ ọsụ ụzọ, nke ikpeazụ m bụkwa Juliska Asztalos. Anyị jiri nanị Bible anyị mee ihe n’ozi, n’enweghị akwụkwọ anyị ga-enyefe. Mgbe anyị chọtara ndị nwere mmasị, anyị na-eme nletaghachi ma gbazinye ha akwụkwọ.

Ugboro ugboro, mụ na Juliska aghaghị ịgbanwe ókèala ebe anyị na-arụ. Nke a bụ n’ihi na onye ụkọchukwu, ọ nụhaala na anyị na-eleta ‘atụrụ ya,’ na-ama ọkwa na chọọchị na ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova bịa na nke ha, ha aghaghị ịkọrọ ya ma ọ bụ ndị uwe ojii. Mgbe ndị nwere omume enyi gwara anyị banyere ịma ọkwa dị otú ahụ, anyị na-akwaga n’ókèala ọzọ.

Otu ụbọchị mụ na Juliska gara leta otu nwa okoro gosiri mmasị. Anyị yiri oge maka nletaghachi iji gbazinye ya ihe ọ ga-agụ. Ma mgbe anyị gaghachiri, ndị uwe ojii nọ n’ebe ahụ, e jidere anyị ma kpọrọ anyị gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị na Dunavecse. E jiriwo nwa okoro ahụ mee ihe dị ka ihe nrata iji jide anyị. Mgbe anyị rutere n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ahụ, anyị hụrụ onye ụkọchukwu n’ebe ahụ ma mara na aka ya dịkwa na ya.

Ọnwụnwa M nke Kasị Njọ

N’ebe ahụ n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, a kpụchapụrụ agịrị isi m nile, aghaghịkwa m ịgbara ọtọ guzoro n’ihu ihe dị ka ndị uwe ojii iri na abụọ. Ha gbara m ajụjụ ọnụ, na-achọ ịmata onye bụ onye ndú anyị na Hungary. Akọwara m na anyị enweghị onye ndú ọzọ ma e wezụga Jisọs Kraịst. Mgbe ahụ ha jiri mkpara ha tie m eti eti, ma arapụtaghị m ụmụnna m ndị Kraịst.

Mgbe nke ahụ gasịrị, ha kekọtara ụkwụ m abụọ, chịliekwa aka m abụọ elu ma kekọtakwa ha. Mgbe ahụ, otu otu, ha dinara m n’ike, ha nile ma e wezụga otu onye uwe ojii. E kesiri m nnọọ ike nke na m ka nwere apa n’aka m abụọ afọ atọ mgbe nke ahụ gasịrị. E mekpọrọ m nnọọ ọnụ nke na e debere m n’ụlọ ime ala izu abụọ ruo mgbe mmerụ ahụ m ndị kasị dị njọ latụrụ.

Oge Ahụ Efe

Mgbe e mesịrị a kpọgara m n’ụlọ mkpọrọ dị na Nagykanizsa, bụ́ ebe e nwere ọtụtụ Ndịàmà Jehova. Afọ abụọ na-enyetụ obi ụtọ sochiri n’agbanyeghị mkpọrọ a tụrụ anyị. Anyị na-enwe nzukọ anyị nile na nzuzo, anyị mekwara ihe n’ụzọ yitewere otú ọgbakọ si eme. Anyị nwekwara ọtụtụ ohere maka ịgba àmà mberede. Ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ a ka m zutere Olga Slézinger, onye nne ji ya na Erzsébet Slézinger, bụ́ nwanyị ahụ nke mere ka mụ na mama m mara eziokwu nke Bible.

Ka ọ na-erule 1944 ndị Nazi nọ na Hungary ekpebiwo igbuchapụ ndị Juu bi na Hungary, ọbụna dị ka ha nọworo na-egbu ha nke nta nke nta n’ebe ndị ọzọ ha na-achị. Otu ụbọchị ha chọọrọ mụ na Olga bịa. A tụkpuru anyị n’ime ụgbọ okporo ígwè e ji ebu ehi, mgbe njem siri nnọọ ike gabiga Czechoslovakia gasịkwara, anyị ruru ebe anyị na-eje n’ebe ndịda Poland—ogige ọnwụ Auschwitz.

Ịnọgide Na-adị Ndụ n’Auschwitz

Ọ na-adị m ka ọ dịghị ihe ga-eme m ma mụ na Olga nọrọ. Ọ pụrụ ịdị na-eme ihe ọchị ọbụna n’ọnọdụ ndị siri ike. Mgbe anyị rutere n’Auschwitz, a kpọgara anyị n’ihu Dr. Mengele ahụ na-akpa arụ, onye ọrụ ya bụ ikewapụta ndị bịarutere ọhụrụ na-agaghị arụli ọrụ n’ebe ndị siri ike nọ. A na-akpọga ndị na-agaghị arụli ọrụ n’ime ụlọ ebe e ji gas egbu mmadụ. Mgbe o ruuru anyị, Mengele jụrụ Olga, “Ị̀ dị afọ ole?”

N’atụghị ụjọ, n’ịtabikwa anya n’ụzọ na-atọ ọchị, ọ zara, “20.” N’eziokwu ọ dị afọ ndụ ahụ ugboro abụọ. Ma Mengele chịrị ọchị, kwekwa ka ọ gaa n’akụkụ aka nri ma si otú a dịrị ndụ.

E denyere akara n’uwe ndị mkpọrọ nile nọ n’Auschwitz—ndị Juu nwere Kpakpando David, Ndịàmà Jehova nwekwara purple triangle. Mgbe ha chọrọ ịdụnye Kpakpando David n’uwe anyị, anyị kọwara na anyị bụ Ndịàmà Jehova ma chọọ purple triangle. Nke a abụghị n’ihi na ndị Juu anyị bụ na-eme anyị ihere, kama anyị bụzi Ndịàmà Jehova ugbu a. Ha nwara ịmanye anyị ịnakwere akara ndị Juu ahụ site n’ịgba anyị ụkwụ na iti anyị ihe. Ma anyị guzosiri ike ruo mgbe ha nabatara anyị dị ka Ndịàmà Jehova.

Ka oge na-aga, m zutere nwanne m nwanyị bụ́ Elvira, bụ́ onye m ji afọ atọ tọọ. A kpọgawo ezinụlọ anyị nile dị mmadụ asaa n’Auschwitz. Nanị mụ na Elvira ka a nwapụtara dị ka ndị ga-arụli ọrụ. Papa anyị, mama anyị, na ụmụnne anyị atọ nwụrụ n’ime ụlọ ndị ahụ e ji gas egbu mmadụ. Elvira abụghị Onyeàmà mgbe ahụ, anyị anọghịkwa n’otu akụkụ nke ogige ahụ. Ọ lanarịrị, kwaga na United States, ghọọ Onyeàmà na Pittsburgh, Pennsylvania, ma mesịa nwụọ n’ebe ahụ na 1973.

Ịnọgide Na-adị Ndụ n’Ogige Ndị Ọzọ

N’oge oyi nke 1944 ruo 1945, ndị Germany kpebiri isi na Auschwitz pụọ, ebe ọ bụ na ndị Russia na-abịaru nso. Ya mere a kpọfere anyị na Bergen-Belsen dị n’akụkụ ebe ugwu Germany. N’oge na-adịghị anya anyị rutesịrị, a kpọgara mụ na Olga na Braunschweig. N’ebe a ihe anyị kwesịrị ime bụ inye aka kpochaa ihe mgbe ndị agha Jikọrọ Aka tụsịrị bọmbụ aghara aghara. Mụ na Olga tụlere okwu ahụ. Ebe ọ bụ na anyị ejighị n’aka ma ịrụ ọrụ a ọ̀ ga-emebi nnọpụiche anyị, anyị abụọ kpebiri ịghara ikere òkè na ya.

Mkpebi anyị kpalitere nsogbu dị ukwuu. E jiri ụtarị akpụkpọ pịa anyị ihe wee kpụgakwa anyị n’ihu ndị agha ga-agbagbu anyị. E nyere anyị otu minit iji cheghachi echiche n’okwu ahụ, a gwakwara anyị na ọ bụrụ na anyị agbanweghị obi anyị, a ga-agbagbu anyị. Anyị kwuru na anyị achọghị oge ọ bụla iji chee ya n’ihi na anyị emewo mkpebi. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ọchịagha ogige ahụ anọghị ya, ọ bụkwa nanị ya nwere ikike inye iwu ka e gbuo mmadụ, aghaghị icherekwu tupu e gbuo anyị.

Ka ọ dịgodị, a manyere anyị iguzoro n’èzí ogige ahụ ụbọchị ahụ dum. Ndị soja abụọ bu égbè, bụ́ ndị a na-agbanwe hour abụọ ọ bụla, nọ na-eche anyị nche. E nyeghị anyị nri ọ bụla, oyi tụsikwara anyị ike, ebe ọ bụ February. Otu izu nke mmeso a gafere, ma ọchịagha ahụ abịaghị. Ya mere e tinyere anyị n’azụ gwongworo, n’ijukwa anyị anya, anyị chọtara onwe anyị ọzọ na Bergen-Belsen.

N’oge ahụ mụ na Olga nọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya. Ihe ka ọtụtụ n’agịrị isi m adapụsịala, enwekwara m oké ahụ ọkụ. Ọ na-esiri m oké ike inwe ike ịrụtụ ọrụ. Ofe akwụkwọ nri dị mmiri mmiri na iberibe bred a na-enye kwa ụbọchị adịghị ezu. Ma ọ dị mkpa na anyị ga-arụ ọrụ n’ihi na a na-egbu ndị na-apụghị ịrụ ọrụ. Ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Germany mụ na ha so na-arụ ọrụ na kichin nyeere m aka izurutụ ike. Mgbe ndị nche na-eme nnyocha na-abịa, ụmụnna nwanyị ahụ ga-agwa m, ka m wee nwee ike iguzo n’akụkụ table e ji na-arụ ọrụ, na-eyi onye na-arụsi ọrụ ike.

Otu ụbọchị Olga enweghị nnọọ ume o ji aga ebe ọ na-arụ ọrụ, mgbe nke ahụ gasịkwara anyị ahụghịkwa ya ọzọ. Enyi m nwere obi ike anọkwaghị ya, bụ́ onye nyewooro m nnọọ aka n’ime ọnwa ndị ahụ siri ike n’ogige ndị ahụ. Dị ka onye e tere mmanụ na-eso ụzọ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ọ ghaghị ịnataworị nkwụghachi ụgwọ eluigwe ya ozugbo.—Mkpughe 14:13.

Ntọhapụ na Ndụ Mgbe nke Ahụ Gasịrị

Mgbe agha ahụ biri na May 1945, ntọhapụ eruokwa, ike gwụchasịrị m nke na apụghị m ịṅụrị ọṅụ na e gwepịawo yoke nke ndị mmegbu ahụ n’ikpeazụ; apụghịkwa m isoro ahịrị ụgbọ ndị na-ebuga ndị a tọhapụrụ ná mba ndị dị njikere ịnabata ha. Anọ m n’ụlọ ọgwụ ruo ọnwa atọ iji nwetaghachi ume. Mgbe nke ahụ gasịrị a kpọgara m na Sweden, bụ́ ebe ghọrọ ebe obibi ọhụrụ m. Ozugbo, m kpọtụụrụ ụmụnna m ndị Kraịst, ka oge na-agakwa m weere akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke ozi ubi.

Na 1949, alụrụ m Lennart Josefsson, bụ́ onye jeworo ozi ruo ọtụtụ afọ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova. A tụwokwa ya mkpọrọ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ n’ihi ijigide okwukwe ya. Anyị malitekọrọ ndụ anyị ọnụ dị ka ndị ọsụ ụzọ na September 1, 1949, e kenyekwara anyị ọrụ ije ozi n’obodo Borås. N’afọ ndị mbụ anyị nọrọ n’ebe ahụ, anyị duziri ọmụmụ Bible iri nke ndị nwere mmasị n’ụzọ chiri anya kwa izu. Anyị nwere ọṅụ nke ịhụ ọgbakọ dị na Borås ka o ruru atọ n’ime afọ itoolu, ugbu a kwa e nwere ise.

Enweghị m ike ịnọgide na-asụ ụzọ ruo ogologo oge n’ihi na 1950 anyị mụrụ nwa nwanyị, afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịkwara, anyị mụrụ nwa nwoke. Ya mere enwere m ihe ùgwù na-enye obi ụtọ nke ịkụziri ụmụ anyị eziokwu ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ezi nwanna nwoke ahụ na Hungary kụziiri m mgbe m dị nanị afọ 16, ya bụ́: “Ijere Jehova ozi bụ ihe ùgwù kasị ukwuu mmadụ pụrụ inwe.”

N’ileghachi anya azụ ná ndụ m, m na-aghọta na ahụwo m eziokwu nke ihe Jemes onye na-eso ụzọ dere mgbe ọ na-echetara anyị ntachi obi Job: “Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nwekwa obi ebere.” (Jemes 5:11) Ọ bụ ezie na enwetakwara m ọnwụnwa ndị dị egwu, e jiwo ụmụ abụọ, di na nwunye ha, na ụmụ ụmụ isii—bụcha ndị na-efe Jehova ofufe, gọzie m n’ụba. E wezụga nke ahụ, enwere m ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ime mmụọ, ndị ụfọdụ n’ime ha na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ na ndị ozi ala ọzọ. Ugbu a olileanya m bụ́ isi bụ izute ndị m hụrụ n’anya nọ n’ụra ọnwụ na ịmakụ ha mgbe ha ga-esi n’ili ncheta ha bilite.—Jọn 5:28, 29.

[Foto dị na peeji nke 31]

N’ozi na Sweden mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị

[Foto dị na peeji nke 31]

Mụ na di m

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya