Ihe Mere Ụfọdụ Ji Na-agbanwe Okpukpe Ha
Nye ọtụtụ ndị, okpukpe bụ nanị ihe e ji amata ha. Ọ pụrụ ịkọwa ebe mmadụ na-agakarị na Sunday, ebe ọ lụrụ di ma ọ bụ nwunye, na ebe a ga-eli ya. Ma ọ naghị ekwu ụdị mmadụ ọ bụ ma ọ bụ ihe ọ maara ma kwere. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha e mere na-ekpughe na pasent 50 nke ndị sị na ha bụ ndị Kraịst amaghị onye ziri Ozizi Elu Ugwu ahụ. Leenụ, ọbụna onye ndú India ahụ a ma ama bụ́ Mohandas Gandhi, bụ́ onye Hindu, maara nke ahụ!
Ọ̀ BỤ ihe ijuanya na ndị mmadụ na-esi n’okpukpe kpafuo mgbe ọtụtụ n’ime ha maara ihe dị nta banyere okpukpe ha? Ee e, ọ bụghị. Otú ọ dị, ọ bụghịkwa ihe a na-apụghị izere ezere. Ọ na-ejukarị ndị nataworo enyemaka ịmụ banyere Bible anya ịhụ ókè ọ bawooro ha uru. Bible n’onwe ya na-asị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Aịsaịa 48:17.
Gịnị ka ndị ahụ a na-egbobeghị agụụ ime mmụọ ha kwesịrị ime? Ha ekwesịghị ịda mbà n’ijere Chineke ozi! Kama nke ahụ, ha kwesịrị ileba anya n’ime Bible ma hụ ihe Chineke n’onwe ya nyeworo ha.
Azịza Nye Ajụjụ Ndị Siri Ike
Mgbe ọ dị afọ asaa, Bernd hụrụ nne ya ka ọ na-anwụ.a N’oge ndụ ya ndị fọdụrụ dị ka nwata, o chere, sị, ‘Olee ebe nne m nọ? Gịnị mere m ga-eji tolite n’enweghị ya?’ Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma, Bernd bụ onye na-agachi chọọchị anya. N’inwe nchegbu banyere ịta ahụhụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, o nwere olileanya ịbụ onye ọrụ enyemaka ná mba ọzọ. Ma, ajụjụ ndị chọọchị ya na-enweghị azịza na-eju afọ maka ha nyere ya nsogbu.
E mesịa Bernd gwara otu nwa akwụkwọ ibe ya okwu, bụ́ onye bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Onye ntorobịa a gosiri Bernd site na Bible na nne ya amaghị ihe ọ bụla, na ọ nọ n’ụra ọnwụ. Bernd mụtara ọtụtụ amaokwu Bible ndị kọwara nke a, dị ka Eklisiastis 9:5: “Ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” Ya mere Bernd enweghị ihe mere ọ ga-eji chegbuo onwe ya ma nne ya ọ̀ na-ata ahụhụ n’ebe dị ka pọgatrị—ma ọ bụ n’ebe ka njọ. Ọ bụ ezie na a na-ezi ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi n’ihe ka n’ọtụtụ okpukpe, Bernd hụtara n’ime Bible na mkpụrụ obi mmadụ bụ nnọọ onye ahụ. Mgbe onye ahụ nwụrụ, mkpụrụ obi ahụ anwụọla. “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.”—Ezikiel 18:4.
Bernd mụtakwara banyere olileanya dị ebube maka ndị nwụrụ anwụ. Ọ gụrụ n’onwe ya n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndị Ozi: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Lee ụdị mkpalị o nwere ịchọpụta na mbilite n’ọnwụ a ga-ewere ọnọdụ n’elu ala ebe a, bụ́ nke Chineke ga-eweghachi ịbụ paradaịs!—Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4.
N’oge na-adịghị anya, e gboro mkpa ime mmụọ Bernd site n’ezigbo ihe ọmụma Bible. Bernd esighị n’okpukpe pụọ. Kama, ọ pụrụ na chọọchị nke na-apụghị igbo agụụ ya ma nabata ụdị ofufe nke dabesiiri ike na Bible. Ọ na-asị: “Nke ahụ bụ afọ 14 gara aga, ọ dịbeghịkwa mgbe m kwara ụta maka iwere nzọụkwụ ahụ. Ugbu a amaara m na Onye Okike adịghị akpata ntaramahụhụ. Setan bụ chi nke oge a, e kwesịkwara ịta ya ụta maka ọnọdụ ndị gbara anyị gburugburu. Ma n’isi nso Chineke ga-edozi ihe nile ụwa Setan mebiworo. Nne m kwa ga-alọghachi ná mbilite n’ọnwụ. Lee ihe ọṅụ nke ahụ ga-abụ!”
Dị ka o si daba, Bernd eruwo ihe mgbaru ọsọ ya nke ịrụ ọrụ ná mba ọzọ iji nyere ndị ọzọ aka. Ọ na-arụ ọrụ ná mba ọzọ na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Alaeze Chineke, bụ́ ihe ngwọta bụ́ ezie nye nhụsianya ha. Dị ka Bernd, ọtụtụ nde amụtawo na Chineke ga-akwụsị ntaramahụhụ mmadụ n’isi nso. Obi dị ha ụtọ ịchọpụta na e nwere okpukpe nke na-egbo mkpa ime mmụọ ha.—Matiu 5:3.
Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?
Ka mba ndị Ọdịda Anyanwụ na-adịghị eji okpukpe akpọrọ ihe karị, ọtụtụ na-ajụ, sị, ‘Gịnị bụ nzube nke ndụ?’ A ga-achọta azịza ya n’ime Bible, dị ka Michael chọpụtara. N’agbata afọ ndị 1970, Michael chọrọ isonye n’òtù na-eyi ọha egwu. O nwere nanị otu nzube ná ndụ—inweta ndị ahụ o lere anya dị ka ndị na-akpata ikpe na-ezighị ezi nke usoro ọchịchị ndị aka ji akụ̀. “Ahapụtụbeghị m ụlọ n’ejighị égbè m,” ka ọ na-ekwu. “Nzube m bụ igbu ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọchịchị aka ji akụ̀ ole ga-ekwe m omume. M gaara etinyeworị ndụ m maka nzube ahụ.”
Michael na-aga chọọchị, ma ọ dịghị onye nọ na chọọchị ya pụrụ ịkọwa ezi nzube nke ndụ. Ya mere mgbe Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya ma gosi ya azịza Bible nye ajụjụ ya nile, Michael gere ntị nke ọma. Ọ malitere ịga nzukọ maka ofufe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ya.
Ndị enyi Michael nwere ọchịchọ ịmata banyere mmasị ọhụrụ o nwere na Bible. “Bịanụ nzukọ na Sunday a,” ka Michael gbara ha ume ya. “Nọtụnụ ntakịrị. Ọ bụrụ na unu enweghị mmasị n’ihe unu na-anụ, laanụ.” Otú a ka o mere, mgbe minit 45 nke okwu dabeere na Bible gasịrị, ọtụtụ ndị enyi ya hapụrụ ụlọ nzukọ ahụ. Ma otu—Susan—nọgidere. Ihe nwa agbọghọ a nụrụ dọọrọ mmasị ya. Michael na Susan mesịrị lụọ, bụrụkwa ndị e mere baptism dị ka Ndịàmà Jehova. “Ugbu a amaara m ihe mere anyị ji nọrọ n’elu ala ebe a,” ka Michael na-ekwu. “Jehova kere anyị. Ezi nzube anyị ná ndụ bụ ịmara ya na ime ihe ọ na-achọ. Nke ahụ bụ ihe na-eweta ezi afọ ojuju!”
Ọtụtụ nde kwenyere n’echiche Michael. Ha na-eburu n’obi okwu Bible bụ́: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.
Ịnagide Nsogbu nke Ndụ
Anyị nile na-ahụ mmezu nke amụma ahụ a na-achọta na 2 Timoti 3:1: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ.” Ọ dịghị onye pụrụ ịgbanarị nsogbu nke ‘oge ndị a dị oké egwu.’ Ma Bible na-enyere anyị aka ịnagide ha.
Tụlee Steven na Olive, bụ́ di na nwunye. Mgbe ha malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ha, dịkwa ka ọtụtụ ndị ọzọ, nwere nsogbu alụmdi na nwunye. “Anyị na-ekewa,” ka Steven na-akọwa. “Anyị nwere ihe mgbaru ọsọ na mmasị ndị dịrịtara iche.” Gịnị nyeere ha aka ịnọkọta ọnụ? “Ndịàmà Jehova gosiri anyị ụzọ anyị pụrụ isi tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ anyị,” ka Steven gara n’ihu na-ekwu. “Na nke mbụ ya, anyị mụtara ihe achọghị ọdịmma onwe onye nanị na inwe nchebara echiche pụtara. Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ jikọtara anyị ọnụ. Ugbu a anyị na-anụ ụtọ alụmdi na nwunye obi ụtọ, nke sikwara ike.”
Mmekọrịta Chiri Anya n’Ebe Chineke Nọ
Dị ka otu njụta echiche pụrụ iche e mere na nso nso a na-egosi, pasent 96 nke ndị America kweere na Chineke, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a na-ekpegakwara ya ekpere. Ma, njụta echiche ọzọ gosiri na ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị na ụlọ nsọ dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị ala ugbu a n’ọkara otu narị afọ. Ihe dị ka pasent 58 nke ndị America sịrị na ha na-aga chọọchị otu ugbo ma ọ bụ ihe na-erughị otu ugbo n’ọnwa. N’ụzọ doro anya, okpukpe emebeghị ka ha bịaruo Chineke nso. Nsogbu a akwụsịghịkwa na United States.
Linda tolitere na Bavaria. Ọ bụ onye na-ekpe Katọlik ma na-ekpechi ekpere anya. N’otu mgbe ahụ, egwu ọdịnihu na-atụ ya. Ọ dịghị ihe ọ maara banyere nzube Chineke maka mmadụ. Mgbe ọ dị nanị afọ 14, Linda zutere Ndịàmà Jehova, ọ na-akọkwa, sị: “Ihe ha kwuru dị ụtọ, ya mere anatara m akwụkwọ abụọ e ji amụ Bible ma gụọ ha ozugbo.” Afọ abụọ ka e mesịrị, Linda malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. “Ihe nile m mụtara banyere Chineke site na Bible bụ nke ezi uche dị na ha,” ka ọ na-ekwu. Linda pụrụ na chọọchị ya ma bụrụ onye e mere baptism dị ka Onyeàmà Jehova mgbe ọ dị afọ 18.
Gịnị kwaliri Linda ịgbanwe okpukpe ya? Ọ kọwara, sị: “Chọọchị m nyeere m aka ịhụ na e nwere Chineke, amụtakwara m ikwere na ya. Ma ọ bụ onye na-enweghị mmetụta na onye nọpụụrụ onwe ya. Ọ bụghị nanị na Bible m mụrụ emewo ka nkwere m kweere na Chineke sie ike, kamakwa o nyeworo m aka ịmata ma hụ ya n’anya. Ugbu a enwere m mmekọrịta onwe onye dị oké ọnụ ahịa n’ebe Chineke nọ, bụ́ ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ihe ọ bụla ọzọ.”
Ezi Okpukpe Bara Uru!
Okpukpe gị ọ̀ na-enye gị nduzi ime mmụọ ma na-egosi gị ụzọ Bible pụrụ isi nyere gị aka ịnagide nsogbu nke ndụ? Ọ̀ na-akụzi olileanya Bible maka ọdịnihu? Ọ̀ na-eme ka i nwee mmekọrịta onwe onye, chiri anya n’ebe Onye Okike nọ, nke dabeere n’ezi ihe ọmụma nke Bible? Ma ọ dịghị eme otú ahụ, adala mbà. Kama ịgbahapụ okpukpe, chọọ ụdị ofufe nke dabesiiri ike na Bible. Mgbe ahụ ị ga-adị ka ndị ahụ e buru amụma banyere ha n’akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa, sị: “N’ihi nke a ka Onyenwe anyị Jehova ji kwuo otú a, sị, Lee, ndị ohu m ga-eri ihe . . . Ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ . . . Ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ . . . Ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma.”—Aịsaịa 65:13, 14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ ndị dị n’isiokwu a.
[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
Bible na-enyere anyị aka ịmata ma hụ Chineke n’anya