N’ihi Gịnị Ka Nsogbu Ji Dị n’Inwe Obi Ike?
‘Ị̀ PỤRỤ ịtụkwasị onye ọ bụla obi n’ezie n’ụbọchị ndị a?’ Ị pụrụ ịnụwo ka ụfọdụ ndị nwere nkụda mmụọ jụrụ ajụjụ a. Ma ọ bụ ị pụrụ ọbụna ịjụwo ajụjụ ahụ n’onwe gị mgbe i nwere nsogbu n’ụzọ mmetụta uche n’ihi otu ihe mere ná ndụ gị.
N’ụzọ a na-apụghị ịgọpụ agọpụ, e nwere ịdị ụkọ zuru ụwa ọnụ nke obi ike n’ụlọ ọrụ dị iche iche nakwa ná mmadụ ndị ọzọ. Mgbe mgbe, ụkọ nke obi ike a na-ekwesị ekwesị. Ọ̀ dị onye ọ bụla na-atụ anya n’ezie ka ihe ka ọtụtụ ná ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị mezuo nkwa ha kwere tupu a tụliere ha aka? Nnyocha e mere na 1990 nke ụmụ akwụkwọ 1,000 na Germany gosiri na ọ bụ ezie na pasent 16.5 n’ime ha nwere obi ike na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị pụrụ ịgwọta nsogbu ụwa, okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ahụ nwere obi abụọ siri ike. Ihe ka ọtụtụ kwukwara na ha enweghị obi ike n’ikike nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ịgwọta nsogbu nakwa n’ọchịchọ ha ime otú ahụ.
Akwụkwọ akụkọ bụ́ Stuttgarter Nachrichten mere mkpesa, sị: “Ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu ná ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bu ọdịmma nke onwe ha n’uche, e mesịzie, ikekwerị, ọdịmma nke ndị tụliiri ha aka.” Ndị mmadụ ná mba ndị ọzọ na-ekwere. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The European kwuru banyere otu ala, sị: “Enweghị ntụkwasị obi nke ndị ntorobịa n’ebe ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ nwere ezi ihe mgbakwasị ụkwụ, ndị okenye ha nwekwara ya.” Ọ rịbara ama na ‘ndị na-atụli aka na-ewepụkarị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche n’ọchịchị.’ Akwụkwọ akụkọ ahụ gara n’ihu kwuo, sị: “Ịdị ụkọ nke obi ike na mmetụta nke ịbụ ndị a kwahapụrụ na-atụ onye ọ bụla na-anọ n’etiti ndị na-eto eto [n’ebe ahụ] n’anya.” Ma, ọ bụrụ na obi ike ọha na eze adịghị, ọchịchị onye kwuo uche ya pụrụ ịrụzu ihe dị nta. Onye bụbu president United States bụ́ John F. Kennedy kwuru n’otu mgbe, sị: “Ihe ndabere nke ọchịchị dị irè bụ obi ike ọha na eze.”
N’ihe banyere inwe obi ike n’ọgbọ ego, mgbanwe mberede nke ọnọdụ akụ̀ na ụba na atụmatụ ịba ọgaranya ngwa ngwa kụrụ afọ n’ala emewo ka ọtụtụ nwee obi abụọ. Mgbe ọnụ ngwá ahịa ụwa dara n’ụzọ a na-apụghị ịchịkwa achịkwa n’October 1997, otu magazin akụkọ kwuru banyere “enweghị obi ike dị egwu nakwa mgbe ụfọdụ nke ezi uche na-adịghị na ya” nakwa banyere “enweghị obi ike na-efe ka ọrịa.” O kwukwara na “obi ike kọrọ nnọọ ụkọ [n’otu mba Esia] nke na ịdị adị nke ọchịchị dị mgbe ahụ . . . yiri ihe a na-eyi egwu.” Ná nchịkọta, o kwuru ihe doro anya: “Ọnọdụ akụ̀ na ụba dị iche iche na-adabere n’obi ike.”
Okpukpe na-adakwa ada n’ịkpali obi ike. Akwụkwọ okpukpe Germany bụ́ Christ in der Gegenwart kwuru n’ụzọ dị mwute, sị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ obi ike ndị mmadụ nwere n’ebe Chọọchị dị nọgidere na-ada ada.” N’agbata 1986 na 1992, ọnụ ọgụgụ ndị Germany bụ́ ndị nwere obi ike nke ukwuu, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, n’ebe chọọchị dị dalatara site na pasent 40 ruo 33. N’ezie, n’ebe bụbu Ọwụwa Anyanwụ Germany, ọ dalatara gaa n’ihe dị ala karịa pasent 20. N’ụzọ dị iche, ndị na-enweghị obi ike n’ebe chọọchị dị rịrị elu site na pasent 56 ruo 66 n’ebe bụbu Ọdịda Anyanwụ Germany, nakwa ruo pasent 71 n’ebe bụbu Ọwụwa Anyanwụ Germany.
Ndalata n’obi ike apụtawo ìhè n’ebe ndị ọzọ ma e wezụga ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ego, na okpukpe—bụ́ idé atọ ji ọha mmadụ. Ihe atụ ọzọ bụ itinye iwu n’ọrụ. Ntụpọ ndị dị n’iwu na-achịkwa ime mpụ, ihe isi ike nke itinye iwu n’ọrụ n’ụzọ ziri ezi, na mkpebi ụlọikpe ndị a na-enyo enyo akwawo ntụkwasị obi ndị mmadụ aka nke ukwuu. Dị ka magazin bụ́ Time si kwuo, “nkụda mmụọ nke ụmụ amaala na ndị uwe ojii eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke enweghị obi ike n’ebe usoro ihe nke na-atọhapụ ndị omekome dị ize ndụ ugboro ugboro dị.” N’ihi ebubo banyere omume rụrụ arụ na mmekpọ ọnụ nke ndị uwe ojii, obi ike ọbụna n’ebe ndị uwe ojii nọ adalatawo nke ukwuu.
N’ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba nile, okwu udo ndị kụrụ afọ n’ala na nchịsa ngwá agha ndị a na-emezughị na-atụ aka n’enweghị obi ike. Bill Richardson, onye nnọchianya United States n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu, rụtụrụ aka n’ihe mkpọbi ụkwụ bụ́ isi e nwere n’inweta udo n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ, na-asị n’ụzọ dị mfe: “E nwere ụkọ obi ike.”
Ka ọ dịgodị n’ọnọdụ mmadụ na mmadụ, ọtụtụ ndị mmadụ enweghị obi ike ọbụna n’ebe ezi ndị ikwu na ezi ndị enyi nọ, bụ́ nnọọ ndị ndị mmadụ na-echigharịkwuru maka nghọta na nkasi obi mgbe ha nwere nsogbu. Ọ dị nnọọ ka ọnọdụ ahụ onye Hibru bụ́ Maịka onye amụma kọwara: “Unu ekwerela n’enyi, unu atụkwasịla enyi unu maara nke ọma obi: debe egbugbere ọnụ gị ghara ịgwa nwanyị na-edina n’obi gị okwu.”—Maịka 7:5.
Ihe Àmà nke Oge Ndị A
E hotara onye Germany bụ́ ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ bụ́ Arthur Fischer na nso nso a dị ka onye kwuru, sị: “Obi ike ná mmepe obodo nakwa n’ọdịnihu onwe onye mmadụ adalatawo n’ezie n’ụzọ dị ngwa n’akụkụ nile. Ndị na-eto eto nwere obi abụọ na ụlọ ọrụ ọha na eze pụrụ inyere ha aka. Obi ike ha adaala, ma ọ bụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n’okpukpe, ma ọ bụ n’òtù ọ bụla ọzọ.” Ọ bụghị ihe ijuanya na ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Ulrich Beck kwuru banyere “ọdịbendị nke inwe obi abụọ” n’ebe ọchịchị, ụlọ ọrụ, na ọkachamara ndị dịteworo aka dị.
N’ọdịbendị dị otú ahụ, ndị mmadụ na-achọ ikewapụ onwe ha, ịjụ ịbụisi nile, na ịdị ndụ dị ka ụkpụrụ onwe onye si dị, na-eme mkpebi n’anataghị ndụmọdụ ma ọ bụ nduzi site n’aka ndị ọzọ. Ụfọdụ na-aghọ ndị na-enyo mmadụ enyo n’ụzọ gabigara ókè, ma e leghị anya ọbụna ghọọ ndị na-adịghị echebara mmadụ echiche, mgbe ha na ndị ha chere na ha apụghị ịtụkwasị obi ọzọ na-emekọ ihe. Omume a na-akwalite ọnọdụ na-adịghị mma, dị ka nke a kọwara na Bible: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya.” (2 Timoti 3:1-5; Ilu 18:1) N’ezie, nsogbu dị n’inwe obi ike taa bụ ihe àmà nke oge ndị a, ihe àmà nke “mgbe ikpeazụ.”
N’ụwa nke nwere nsogbu n’inwe obi ike nke ndị dị ka ndị ahụ a kọwara n’elu jupụtakwara, a pụghị n’ezie ịnụru ụtọ ndụ n’isi. Ma ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na ihe ga-agbanwe? À pụrụ imeri nsogbu dị n’inwe obi ike nke taa? Ọ bụrụ otú ahụ, n’ụzọ dị aṅaa, ọ̀ bụkwa ole mgbe?