Ị̀ Mụ Anya Banyere Oge Anyị?
ỊMỤ anya banyere ihe ize ndụ pụrụ ịnapụta mmadụ n’aka ọnwụ. A pụrụ iji ihe mere n’àgwàetiti abụọ ndị nwere ugwu na-agbawa agbawa maa atụ.
Ugwu Pelée, bụ́ ugwu mgbawa kasị weta ọnwụ nke narị afọ nke 20, gbawara na May 8, 1902, n’àgwàetiti Caribbean nke Martinique. O gburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 30,000 ndị bi na Saint Pierre, bụ́ obodo ukwu nke dị n’ala ala ugwu mgbawa ahụ.
Na June 1991, Ugwu Pinatubo gbawara n’ihe bụ ma eleghị anya mgbawa kasị ukwuu nke narị afọ a. O mere n’otu ógbè Philippines nke mmadụ bijupụtara ma kpata ọnwụ nke ihe dị ka mmadụ 900. Otú ọ dị, na nke ugbu a ihe abụọ nyere aka ịzọpụta ọtụtụ puku ndụ: (1) ịmụ anya banyere ihe ize ndụ ahụ na (2) ịdị njikere ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ịdọ aka ná ntị.
Ime Ihe Kwesịrị Ekwesị Zọpụtara Ọtụtụ Ndụ
Ugwu Pinatubo adịwo jụụ ruo ọtụtụ narị afọ mgbe n’April 1991, ọ malitere igosigasị ihe ịrịba ama nke mgbawa na-abịanụ. Uzu ọkụ na sulfur dioxide malitere isi n’ọnụ ọnụ ugwu ahụ apụta. Ndị bi n’ógbè ahụ nwere mmetụta dị iche iche nke ala ịma jijiji, nkume ọkụ kpụkọtara ọnụ bụ́ nke na-agba àmà ihe ọjọọ malitekwara isi n’ugwu ahụ apụta. Ndị ọkà mmụta sayensị si n’Ụlọ Ọrụ nke Ihe Ọmụmụ Ugwu Mgbawa na Ala Ịma Jijiji nke Philippines nọ na nche nke ukwuu, ka oge na-agakwa ha mere ka ndị isi kwenye na ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịkpọpụ mmadụ 35,000 ndị bi n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta ndị dị nso.
N’ụzọ kwere nghọta, ọ dịghị amasị ndị mmadụ isi n’ebe obibi ha gbapụ n’enweghị ihe kpatara ya, ma e ji ihe nkiri vidio nke gosiri ihe ize ndụ nke mgbawa ugwu n’ụzọ doro anya merie enweghị mmasị. Ọpụpụ ahụ e mere n’ìgwè bụ n’oge ya. Ụbọchị abụọ mgbe nke a gasịrị, otu mgbawa kpụ ọkụ n’ọnụ kpobanyere ntụ dị kubik kilomita asatọ na mbara ikuku. Ájá dị mmiri mmiri na-eru eru, ma ọ bụ ụmụ irighiri ihe ndị si n’ugwu mgbawa pụta, mesịrị gbuo ọtụtụ narị mmadụ. Otú ọ dị, ma eleghị anya e chebere ọtụtụ puku, n’ihi na e mewo ka ndị ahụ mụrụ anya banyere ihe ize ndụ ahụ, ha emewokwa ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ịdọ aka ná ntị.
Mgbapụ Pụọ ná Mbibi nke Mmadụ Wetara
Na narị afọ mbụ nke Oge Anyị, ndị Kraịst bi na Jerusalem aghaghịkwa ikpebi ma hà kwesịrị ịgbahapụ ebe obibi ha. Mgbapụ site n’obodo ukwu ahụ na 66 O.A. chebere ha pụọ ná mbibi nke dakwasịrị ndị ọzọ bi n’ime ya na ọtụtụ puku ndị Juu bịaworo Jerusalem maka Ememe Ngabiga nke 70 O.A. Ihe karịrị otu nde mmadụ nọ n’ime obodo ukwu ahụ e ji mgbidi gbaa gburugburu maka Ememe Ngabiga ahụ mgbe ndị agha Rom nọchiri ụzọ ọ bụla ha pụrụ isi gbapụ. Ụnwụ nri, ndọrọ ndọrọ ike ọchịchị, na mwakpo n’esepụghị aka nke ndị Rom kpatara ọnwụ nke ihe karịrị otu nde mmadụ.
Mbibi ahụ nke wetara nnupụisi ndị Juu megide ndị Rom ná njedebe abụghị nke a na-amaghị ọkwa ya tupu o mee. Ọtụtụ iri afọ tupu mgbe ahụ, Jisọs Kraịst ebuworị amụma na ndị agha ga-anọchibido Jerusalem. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu; ndị nọkwa n’etiti ya, ka ha si n’ime ya wezụga onwe ha; ndị nọkwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ịba n’ime ya.” (Luk 21:20, 21) Ntụziaka ndị ahụ doro anya, ụmụazụ Jisọs werekwaara ha dị ka ihe dị mkpa.
Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke anọ bụ́ Eusebius nke Sizaria na-akọ na ndị Kraịst nọ na Judia nile mere ihe kwekọrọ n’ịdọ aka ná ntị Jisọs. Mgbe ndị Rom gbahapụrụ nnọchibido mbụ ha nọchibidoro Jerusalem na 66 O.A., ọtụtụ ndị Kraịst bụ́ ndị Juu gara biri n’obodo Jentaịl nke Pella, n’ógbè Rom bụ́ Perea. Site n’ịmụrụ anya banyere oge ha na site n’ime ihe kwekọrọ n’ịdọ aka ná ntị Jisọs, ha gbanahụrụ ihe a kọwaworo dị ka “otu n’ime mwakpo ndị kasị dị egwu n’akụkọ ihe mere eme nile.”
Taa, ịnọ na nche yiri nke ahụ dị mkpa. Otú ahụ ka ime ihe kpọmkwem dịkwa. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe kpatara ya.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Godo-Foto, West Stock