Iji “Olileanya Siri Ike” Na-echere
“Olileanya siri ike nke ihe nile e kere eke na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike.”—NDỊ ROM 8:19.
1. Myirịta dị aṅaa dị n’etiti ọnọdụ ndị Kraịst taa na nke ndị Kraịst narị afọ mbụ?
ỌNỌDỤ ezi ndị Kraịst taa yiri nke ndị Kraịst narị afọ mbụ. Otu amụma nyeere ndị ohu Jehova nke ụbọchị ndị ahụ aka ịmata mgbe Mesaịa ga-apụta. (Daniel 9:24-26) Otu amụma ahụ kwuru banyere mbibi Jerusalem kama o nweghị ihe ndị ga-eme ka ndị Kraịst mara mgbe a ga-ebibi obodo ahụ tupu o mee. (Daniel 9:26b, 27) N’otu aka ahụ, otu amụma nke sitere n’aka Chineke mere ka ndị mmụta Bible nke narị afọ nke 19 nọrọ n’atụmanya. Site n’ijikọta “oge asaa” nke Daniel 4:25 na “oge nke ndị Jentaịl,” ha tụrụ anya na Kraịst ga-anata ike Alaeze na 1914. (Luk 21:24, King James Version; Ezikiel 21:25-27) Ọ bụ ezie na akwụkwọ Daniel nwere ọtụtụ amụma, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị a nke na-eme ka ndị mmụta Bible nke oge a nwee ike ịgbakọta kpọmkwem mgbe a ga-ebibi usoro ihe Setan dum. (Daniel 2:31-44; 8:23-25; 11:36, 44, 45) Otú ọ dị, nke a ga-eme n’isi nso, n’ihi na anyị na-ebi na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a.”—Daniel 12:4.a
Ịnọ na Nche n’Oge Ọnụnọ Kraịst
2, 3. (a) Gịnị mejupụtara ihe akaebe bụ́ isi nke na-egosi na anyị na-ebi n’oge ọnụnọ Kraịst n’ike eze? (b) Gịnị na-egosi na ndị Kraịst ga-anọ na nche n’oge ọnụnọ Jisọs Kraịst?
2 N’eziokwu, otu amụma mere ka ndị Kraịst nọrọ na-atụ anya tupu e nyefee Kraịst ike Alaeze na 1914. Ma “ihe ịrịba ama” ahụ Kraịst nyere banyere ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ usoro ihe a nwere ihe omume dị iche iche. A ga-ahụkwa ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a mgbe ọnụnọ ya malitesịworo. Ihe omume ndị dị otú ahụ—agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, ịba ụba nke mmebi iwu, mkpagbu nke ndị Kraịst, na nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma Alaeze ahụ—bụ ihe akaebe bụ́ isi na anyị na-ebi ugbu a n’oge ọnụnọ Kraịst n’ike eze.—Matiu 24:3-14; Luk 21:10, 11.
3 Ma, nzube nile nke ndụmọdụ ikpeazụ Jisọs nye ndị na-eso ụzọ ya bụ: “Lezienụ anya, mụrụnụ anya, . . . na-echenụ nche.” (Mak 13:33, 37; Luk 21:36) Iji nlezianya gụọ ihe ndị gbara agbamume a nke ịnọ na nche gburugburu na-egosi na Kraịst adịghị ekwu n’ụzọ bụ́ isi banyere ichesi nche ike maka ihe ịrịba ama nke mmalite ọnụnọ ya. Kama nke ahụ, ọ na-enye ezi ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-eche nche n’oge ọnụnọ ya. Banyere gịnị ka ezi ndị Kraịst ga-anọgide na-eche nche?
4. Nzube dị aṅaa ka ihe ịrịba ama ahụ Jisọs nyere ga-emezu?
4 Jisọs buru amụma ukwu ya iji zaa ajụjụ bụ́: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ [ihe omume ndị na-eduga ná mbibi nke usoro ihe ndị Juu], gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matthew 24:3 NW) Ihe ịrịba ama ahụ e buru n’amụma ga-eme ka a mata ọ bụghị nanị ọnụnọ Kraịst kamakwa ihe omume ndị na-eduga n’ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a.
5. Olee otú Jisọs si gosi na ọ bụ ezie na ọ nọ ya n’ụzọ ime mmụọ, ọ ka ‘ga-abịa’?
5 Jisọs gosiri na n’oge “ọnụnọ” ya (Grik, pa·rou·siʹa) ọ ga-abịa n’ike na ebube. Banyere “ọbịbịa” dị otú ahụ (nke e gosiri n’ụdị nke okwu Grik bụ́ erʹkho·mai), o kwuru, sị: “Mgbe ahụ ka ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube. . . . Ma site n’ahụ osisi fig mụtanụ ilu ya: mgbe ọ bụla alaka ya dịwara nro ugbu a, putekwa akwụkwọ ndụ ya, unu maara na okpomọkụ dị nso; otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a nile, maranụ na Ọ [Kraịst] nọ nso, n’ọnụ ụzọ. . . . Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. . . . Unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche iche.)—Matiu 24:30, 32, 33, 42, 44.
N’ihi Gịnị Ka Jisọs Kraịst Ga-eji Bịa?
6. Olee otú mbibi “Babilọn Ukwu ahụ” ga-esi bịa?
6 Ọ bụ ezie na ọ nọ dị ka Eze kemgbe 1914, Jisọs Kraịst aghaghị ikpe usoro ihe dị iche iche na ụmụ mmadụ ikpe tupu o mee ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ndị ọ ga-ahụta dị ka ndị na-emebi iwu. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 5:10.) N’isi nso Jehova ga-etinye ya n’uche ndị ọchịchị ibibi “Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:4, 5, 16, 17) Pọl onyeozi kwuru kpọmkwem na Jisọs Kraịst ga-ebibi “onye ahụ na-emebi iwu”—ndị ụkọchukwu Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke “Babilọn Ukwu ahụ.” Pọl dere, sị: “A ga-ekpughekwa onye ahụ na-emebi iwu, onye Onyenwe anyị Jisọs ga-ewere iku ume nke si n’ọnụ Ya pụta gbuo, werekwa ngosi nke [ọnụnọ, NW] Ya mee ka ọ ghara ịdị irè.”—2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 8.
7. Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ikpe dị aṅaa ka ọ ga-ekpe?
7 N’isi nso, Kraịst ga-ekpe ndị nke mba nile ikpe ná ndabere nke otú ha si mesoo ụmụnna ya ndị ka nọ n’ụwa. Anyị na-agụ, sị: “Ma mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: Ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu: Ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri Ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe. . . . Eze ahụ ga-azakwa, sị [ndị bụ atụrụ], N’ezie asị m unu, Ka ọ hà bụ́ otú unu si mee ya nye otu n’ime ụmụnna m ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta, Mụ ka unu mere ya nye. . . . [Ndị bụ ewu] ga-apụ jee baa [ná mbibi, NW] ebighị ebi: ma ndị ezi omume ga-aba ná ndụ ebighị ebi.”—Matiu 25:31-46.
8. Olee otú Pọl si kọwaa ọbịbịa Kraịst ga-abịa ime ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke?
8 Dị ka e gosiri n’ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ, Jisọs na-eme ihe ikpeazụ e kpere n’ikpe n’isi ndị nile na-adịghị asọpụrụ Chineke. Pọl mesiri ndị kwere ekwe ibe ya na-ata ahụhụ obi ike banyere “ahụ efe, anyị na unu, n’ime mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, Ya na ndị mmụọ ozi nke ike Ya, n’ime ọkụ na-ere ere, na-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs: bụ́ mmadụ ndị ga-ahụ ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, bụ́ mbibi ebighị ebi nke sitere n’ihu Onyenwe anyị, sitekwa n’ebube nke ike Ya, mgbe ọ bụla Ọ ga-abịa ka e wee nye Ya otuto n’ime ndị nsọ Ya.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:7-10) Ebe anyị nwere ihe omume ndị a na-akpali akpali n’ihu anyị, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe okwukwe ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eche nche maka ọbịbịa Kraịst?
Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-echere Mkpughe Kraịst
9, 10. N’ihi gịnị ka ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa ji na-echesi mkpughe nke Jisọs Kraịst ike?
9 “Mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe” agaghị abụ nanị iji weta mbibi n’ahụ ndị ajọ omume kamakwa iji kwụghachi ndị ezi omume ụgwọ. Ihe fọdụrụ n’ụmụnna Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị ka nọ n’ụwa ka pụrụ ịta ahụhụ tupu mkpughe Kraịst, ma ha na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya eluigwe ha dị ebube. Nye ndị Kraịst e tere mmanụ, Pita onyeozi dere, sị: “Ebe unu nwekọrọ ahụhụ nke Kraịst, na-aṅụrịnụ ọṅụ; ka unu wee werekwa obi na-atọ ụtọ nke ukwuu ṅụrịa n’ime mkpughe nke ebube Ya.”—1 Pita 4:13.
10 Ndị e tere mmanụ kpebisiri ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe Kraịst ‘ga-eme ka ha zukọta n’ebe Ọ nọ’ ka “nnwapụta” nke okwukwe ha ‘wee bụrụ nke a hụrụ na ọ na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ n’ime mkpughe nke Jisọs Kraịst.’ (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1; 1 Pita 1:7) Banyere ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị otú ahụ e ji mmụọ nsọ mụta, a pụrụ ịsị: “E mere ka àmà nke Kraịst guzosie ike n’ime unu: nke mere na ọ dịghị onyinye amara fọdụrụ nke unu na-enweghị; unu na-echekwa mkpughe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 1:6, 7.
11. Ka ha na-echere mkpughe nke Jisọs Kraịst, gịnị ka ndị Kraịst e tere mmanụ na-eme?
11 Ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na-enwe mmetụta nke Pọl nwere, bụ́ onye dere, sị: “Ana m agụ na ahụhụ nile nke oge dị ugbu a ekwesịghị ka e kwute ha ma e lee ebube ahụ anya, bụ́ nke a gaje ikpughe n’ebe anyị nọ.” (Ndị Rom 8:18) Ọ dịghị mkpa iji ngụkọ oge kwagide okwukwe ha. Ha ji ọrụ n’aka n’ozi Jehova, na-esetịpụ ihe nlereanya magburu onwe ya maka ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ. (Jọn 10:16) Ndị a e tere mmanụ maara na ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a dị nso, ha na-aṅakwa ntị n’agbamume Pita bụ́: “Keenụ ihe okike a n’úkwù nke uche unu, nweekwanụ anya udo, lezuokwanụ anya okè n’amara nke a na-ewetara unu n’ime mkpughe nke Jisọs Kraịst.”—1 Pita 1:13.
“Olileanya Siri Ike nke Ihe Nile E Kere Eke”
12, 13. Olee otú ihe e kere eke bụ́ mmadụ si bụrụ ndị ‘e doro n’okpuru ihe efu,’ gịnịkwa na-agụsi atụrụ ọzọ ahụ ike?
12 Atụrụ ọzọ ahụ hà nwekwara ihe ha ga-eji maka ya na-ebi n’olileanya siri ike? N’ezie ha nwere. Mgbe o kwusịrị banyere olileanya dị ebube nke ndị ahụ Jehova nabatara dị ka “ụmụ ndị ikom” ya e ji mmụọ nsọ mụta na “ndị ha na Kraịst na-ekekọ” n’Alaeze eluigwe, Pọl kwuru, sị: “Olileanya siri ike nke ihe nile e kere eke na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike. N’ihi na e doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu, ọ bụghị na ọ chọrọ ya, kama n’ihi Onye ahụ Nke doro ya n’okpuru ya n’olileanya; n’ihi na a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:14-21; 2 Timoti 2:10-12.
13 Site ná mmehie Adam, ụmụ ya nile bụ ndị ‘e doro n’okpuru ihe efu,’ n’ịbụ ndị a mụrụ n’agbụ mmehie na ọnwụ. Ha abụrụwo ndị na-enweghị ike ịgbapụta onwe ha n’agbụ dị otú ahụ. (Abụ Ọma 49:7; Ndị Rom 5:12, 21) Oo, leenụ ka o si agụsi atụrụ ọzọ ahụ agụụ ike ịbụ ndị ‘e mere ka ha pụọ n’ịbụ ohu nke mmebi’! Ma tupu nke ahụ emee, ihe ụfọdụ aghaghị ime dị ka oge na ụbọchị Jehova si dị.
14. Gịnị ka “mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke” ga-agụnye, oleekwa otú nke a ga-esi mee ka ihe a kpọrọ mmadụ bụrụ ndị e mere ka ha “pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi”?
14 A ga-ebu ụzọ ‘kpughee’ ihe fọdụrụ ‘n’ụmụ ndị ikom Chineke’ ahụ e tere mmanụ. Gịnị ka nke a ga-agụnye? N’oge nke Chineke, ọ ga-edo atụrụ ọzọ ahụ anya na ‘a kasịwo ndị ahụ e tere mmanụ akara,’ meekwa ka ha nọrọ n’ebube iso Kraịst chịa. (Mkpughe 7:2-4) A ‘ga-ekpughekwa’ “ụmụ ndị ikom Chineke” ahụ e si n’ọnwụ kpọlite mgbe ha ga-eso Kraịst kere òkè n’ibibi ajọ usoro ihe Setan. (Mkpughe 2:26, 27; 19:14, 15) Mgbe ahụ, n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, a ‘ga-ekpughekwu’ ha dị ka usoro ndị nchụàjà maka ikesa abamuru nke àjà mgbapụta Jisọs nye “ihe e kere eke” bụ́ mmadụ. Nke a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ bụrụ ndị ‘e mere ka ha pụọ n’ịbụ ohu mmebi,’ n’ikpeazụ baakwa n’ime “inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:21; Mkpughe 20:5; 22:1, 2) N’ịbụ ndị nwere ụdị olileanya ahụ dị ebube, ọ̀ bụ ihe ijuanya na atụrụ ọzọ ahụ ji “olileanya siri ike” “na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike”?—Ndị Rom 8:19.
Ndidi Jehova Pụtara Nzọpụta
15. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ichezọ ma ọlị n’ihe banyere ndebe oge Jehova maka ihe omume?
15 Jehova bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge. Ndebe oge ya maka ihe omume ga-ezu okè. Ọ pụrụ ịbụ na ihe adịghị eyicha ka ha na-eme n’ụzọ anyị si tụọ anya ha. Otú ọ dị, anyị pụrụ inwe okwukwe zuru ezu na nkwa nile nke Chineke ga-emezu. (Joshua 23:14) Ọ pụrụ ịdị na-ekwe ka ihe na-aga n’ihu ogologo oge karịa otú ọtụtụ tụrụ anya ya. Ma ka anyị gbalịa ịghọta ụzọ ya ma sọpụrụ amamihe ya. Pọl dere, sị: “A! omimi nke akụ̀ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke! lee otú a na-enweghị ike ịchọpụta ikpe Ya nile, otú a na-enweghịkwa ike ịtụpụta ụzọ Ya nile! N’ihi na ònye maara uche Onyenwe anyị? ma ọ bụ ònye pụtara ịbụ onye Ya na ya na-agba ìzù?”—Ndị Rom 11:33, 34.
16. Olee ndị nwere ike irite uru site na ndidi Jehova?
16 Pita dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ebe unu na-ele anya ihe ndị a [mbibi nke “eluigwe” na “ụwa” ochie na ndochi a ga-eji “eluigwe ọhụrụ” na “ụwa ọhụrụ” nke Chineke kwere ná nkwa dochie ha], na-anụnụ ọkụ n’obi ka e wee hụ unu n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu Ya [n’ikpeazụ, NW]. Na-agụkwanụ ogologo ntachi obi Onyenwe anyị na ọ bụ nzọpụta.” N’ihi ndidi Jehova, a na-enye ọtụtụ nde ndị ọzọ ohere ịbụ ndị a zọpụtara ‘n’ụbọchị Jehova,’ nke ga-abịa mgbe a na-atụghị anya ya “dị ka onye ohi.” (2 Pita 3:9-15) Ndidi Ya na-enyekwa onye ọ bụla n’ime anyị ohere ‘iwere egwu na ịma jijiji rụpụta nzọpụta nke onwe anyị.’ (Ndị Filipaị 2:12) Jisọs sịrị na anyị aghaghị ‘ize onwe anyị’ ma ‘mụrụ anya’ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị a nwapụtara ma nwee ike “iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ” mgbe ọ ga-abịa maka ikpe ikpe.—Luk 21:34-36; Matiu 25:31-33.
Nọgide Were Ntachi Obi Na-echere
17. Okwu ndị dị aṅaa nke Pọl onyeozi ka anyị kwesịrị iburu n’obi?
17 Pọl gbara ụmụnna ime mmụọ ya ume ka ha na-ele anya, ọ bụghị n’ihe “a na-ahụ anya, kama ihe a na-adịghị ahụ anya.” (2 Ndị Kọrint 4:16-18) Ọ chọghị ka ihe ọ bụla kpuchie echiche ha banyere ụgwọ ọrụ eluigwe ahụ e debere n’ihu ha. Ma ànyị bụ ndị Kraịst e tere mmanụ ma ọ bụ soro n’atụrụ ọzọ ahụ, ka anyị na-eburu olileanya ahụ dị ebube nke e debere n’ihu anyị n’uche ma ghara ịda mbà. Ka anyị jiri ‘ntachi obi na-echere,’ na-egosi na “anyị onwe anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi; kama anyị dị n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.”—Ndị Rom 8:25; Ndị Hibru 10:39.
18. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji were obi ike hapụ oge na ụbọchị n’aka Jehova?
18 Anyị pụrụ iji obi ike hapụ oge na ụbọchị n’aka Jehova. Mmezu nke amụma ya ‘agaghị anọ ọdụ’ dị ka ndokwa oge ya si dị. (Habakuk 2:3) Ka ọ dị ugbu a, agbamume Pọl nyere Timoti na-abakwuru anyị uru. Ọ sịrị: “Ana m agwasi gị ike n’ihu Chineke na Kraịst Jisọs, Onye gaje ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, ewerekwa m ngosi Ya na alaeze Ya sị gị; kwusaa okwu Ya; tụkwasị uche n’ọrụ gị n’oge kwesịrị, ma ọ bụ n’oge na-ekwesịghị . . . Rụọ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma, jezuo ozi gị.”—2 Timoti 4:1-5.
19. Gịnị ka oge ya ka dịịrị ndị Jehova ime, n’ihi gịnịkwa?
19 Ọtụtụ ndụ nọ n’ihe ize ndụ—nke anyị na nke ndị agbata obi anyị. Pọl dere, sị: “Rịba onwe gị na ozizi gị ama. Na-anọgide n’ihe ndị a; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.” (1 Timoti 4:16) Oge fọdụụrụ ajọ usoro ihe a dị nnọọ mkpirikpi. Ka anyị ji olileanya siri ike na-echere ihe omume na-akpali akpali ndị dị anyị n’ihu, ka anyị mara nke ọma na ọ ka bụkwa oge na ụbọchị Jehova ka ndị ya kwusaa ozi ọma nke Alaeze ahụ. A ghaghị ịrụ ọrụ ahụ otú ga-eju ya afọ. “Mgbe ahụ,” dị ka Jisọs kwuru, “ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isi nke 10 na 11 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ná Ntụleghachi
◻ Banyere ngụkọ oge, olee otú ọnọdụ anyị si yie nke ndị Kraịst narị afọ mbụ?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-aghaghị iji ‘nọrọ na nche,’ ọbụna n’oge ọnụnọ Kraịst?
◻ N’ihi gịnị ka ihe e kere eke bụ́ mmadụ ji na-echesi “mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke” ike?
◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji were obi ike hapụ oge na ụbọchị n’aka Jehova?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndị Kraịst aghaghị ịmụrụ anya n’atụmanya nke ọbịbịa Kraịst
[Foto dị na peeji nke 18]
Ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ ji ọrụ n’aka n’ozi Jehova, ọ bụghị ime ka okwukwe ha dabere ná ngụkọ oge