Ọdịbendị Obodo na Ụkpụrụ Ndị Kraịst Hà Kwekọrọ?
E KENYERE Stephen, bụ́ Onyeàmà si n’Ebe Ugwu Europe ọrụ dị ka onye ozi ala ọzọ n’otu mba Africa. Ka ya na otu nwanna nwoke nọ n’ógbè ahụ na-akpagharị n’obodo, ọ kụjara mgbe nwanna nwoke ahụ jidere aka ya.
Echiche nke ya na nwoke ọzọ ijide aka ka ha na-agbada n’okporo ámá ndị mmadụ jupụtara na-awụ Stephen akpata oyi. N’ọdịbendị nke ya omenala dị otú ahụ na-enye echiche nke ndina ụdị onwe. (Ndị Rom 1:27) Ka o sina dị, nye nwanna nwoke onye Africa ahụ, ijide aka bụ nnọọ ngosipụta nke ọbụbụenyi. Ịjụ njide aka ahụ ga-apụta ịjụ ọbụbụenyi ahụ.
N’ihi gịnị ka ndịrịta iche n’ọdịbendị kwesịrị iji chegbuo anyị? Nke mbụ bụ n’ihi na ndị Jehova nwere ọchịchọ siri ike ịrụzu ọrụ Chineke nyere ha ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Matiu 28:19) Iji rụzuo ọrụ a, ụfọdụ akwarawo gaa ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị ozi. Iji nwee ihe ịga nke ọma na gburugburu ebe obibi ọhụrụ ha, ha ga-aghọtarịrị ma kwekọọ n’ọdịbendị dị iche iche ndị ha na-ezute. Mgbe ahụ ha na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ibe ha ga-enwe ike ịrụkọ ọrụ n’otu, ka ha na-adịkwa irè karị n’ozi ihu ọha.
Ọzọkwa, n’ime ụwa a nke nọ n’ọgba aghara, ọtụtụ ndị esiwo n’ala ha bụ́ ebe e nwere nsogbu gbapụ n’ihi ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ọnọdụ akụ̀ na ụba, ha ebiriwokwa ná mba ndị ọzọ. Ya mere anyị pụrụ ịhụ n’ezie na ka anyị na-ekwusara ndị agbata obi ọhụrụ a ozi ọma, anyị na-eche omenala ndị ọhụrụ ihu. (Matiu 22:39) Mkpughe mbụ e kpughere anyị nye ụzọ ndị dị iche pụrụ ịkpata mgbagwoju anya banyere omenala ndị ọhụrụ.
Ebe Ndị A Kapịrị Ọnụ
E jikọtara ọdịbendị n’ime usoro ihe omume nke ọha mmadụ. Ya mere, lee ihe uru na-adịghị na ya ọ ga-abụ, bụ́ ịbụbiga “onye ezi omume ókè” ma na-enyocha ọdịbendị nta ọ bụla iji kpebie ma ò kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible!—Eklisiastis 7:16.
N’aka nke ọzọ, ọ dị mkpa ịmata omenala obodo ndị na-emebi ụkpụrụ Chineke n’ụzọ doro anya. Otú ọ dị, n’ozuzu ya, nke ahụ esighị ike ime ebe ọ bụ na Okwu Chineke dị ya “iji mee ka uche mmadụ guzozie.” (2 Timoti 3:16) Dị ka ihe atụ, inwe ọtụtụ nwunye bụ omenala n’ala ụfọdụ, ma nye ezi ndị Kraịst, ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ bụ ka nwoke nwee nanị otu nwunye dị ndụ.—Jenesis 2:24; 1 Timoti 3:2.
N’otu aka ahụ, ezi onye Kraịst agaghị anabata ụfọdụ omenala olili ozu ndị a tụpụtara iji chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ma ọ bụ ndị dabeere na nkwenkwe ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Ndị ụfọdụ na-esurere ndị nwụrụ anwụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ma ọ bụ na-ekpere ha ekpere iji chụpụ ndị ajọ mmụọ. Ndị ọzọ na-amụ anya abalị ma ọ bụ ọbụna na-eme ememe akwamozu n’ebumnuche nke inyere onye ahụ nwụrụ anwụ aka ịkwadebe maka ndụ ‘n’ụwa ọzọ.’ Otú ọ dị, Bible na-akụzi na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ ‘dịghị ama ihe ọ bụla,’ n’ihi ya kwa ọ pụghị imere onye ọ bụla ihe ọma ma ọ bụ merụọ onye ọ bụla ahụ.—Eklisiastis 9:5; Abụ Ọma 146:4.
N’ezie, e nwere ọtụtụ omenala ndị ha na Okwu Chineke kwekọrọ. Lee ihe na-enye ume ọhụrụ ọ bụ mgbe anyị zutere omenala ebe mmụọ nke ile ọbịa ka na-aga n’ihu, ebe omenala chọrọ ka e kelee ọbụna onye ọbịa ekele na-ekpo ọkụ nakwa na, mgbe ọ dị mkpa, ka a kpọọ ya òkù ịbụ ọbịa! Mgbe i nwetara mmeso dị otú ahụ n’aka ndị ọ bụ omenala ha, à dịghị akwali gị ịgbaso ihe nlereanya a? Ọ bụrụ na a na-akwali gị, o doro anya na ọ ga-emeziwanye àgwà ndị Kraịst gị.—Ndị Hibru 13:1, 2.
Ònye n’ime anyị na-enwe mmasị ịbụ onye nọgidere na-eche mmadụ? N’ala ụfọdụ nke a adịghị emekarị n’ihi na a na-ele ịbịa n’oge anya dị ka ihe dị mkpa. Bible na-agwa anyị na Jehova bụ Chineke nke dị n’usoro. (1 Ndị Kọrint 14:33) N’ihi ya, o setịpụwo otu “ụbọchị na oge hour” iji kwụsị mmebi iwu, ọ na-emesikwa anyị obi ike na ihe omume a ‘agaghị anọ ọdụ.’ (Matiu 24:36; Habakuk 2:3) Omenala ndị na-akwalite ịbịa n’oge ezi uche dị na ya na-enyere anyị aka ịdị n’usoro na igosi ezi nkwanye ùgwù maka ndị ọzọ na oge ha, bụ́ nke ya na ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ kwekọrọ n’ezie.—1 Ndị Kọrint 14:40; Ndị Filipaị 2:4.
Gịnị Banyere Omenala Ndị Na-adịghị Emerụ Ahụ?
Ọ bụ ezie na omenala ụfọdụ na ụzọ ibi ndụ nke ndị Kraịst kwekọrọ n’ụzọ doro anya, ya na ndị ọzọ ekwekọghị. Ma gịnị banyere omenala ndị ahụ a na-apụghị ikwu na ha dị mma ma ọ bụ na ha dị njọ? Ọtụtụ omenala adịghị emerụ ahụ, omume anyị n’ebe ha nọ pụkwara igosipụta ezi nguzozi ime mmuọ anyị.
Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ ụzọ e si ekele ekele—ikwe n’aka, ihulata isi, isutụ ọnụ, ma ọ bụ ọbụna ibi ọmà. N’otu aka ahụ, e nwere ọtụtụ omenala dịgasị iche na-achịkwa omume a na-eme mgbe a na-eri ihe. N’ala ụfọdụ ndị mmadụ na-erikọ nri n’otu efere. Ná mba ụfọdụ ibi nkọ bụ ụzọ ikele ekele a na-anabata—ọbụna ọ dị mma—ebe a na-adịghị anabata ya n’ebe ndị ọzọ, a ga-agụkwa ya dị ka oké àgwà ọjọọ.
Kama ịnọ na-ekpebi nke masịrị gị ma ọ bụ nke na-amasịghị gị n’ime omenala ndị a na-adịghị emerụ ahụ, tinye uche n’inwe omume kwesịrị ekwesị n’ebe ha dị. Ndụmọdụ oge ya na-adịghị agafe agafe si na Bible na-atụ aro ka anyị ghara ime ‘ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala ka anyị gụrịta ibe anyị ná ndị ka anyị onwe anyị mma.’ (Ndị Filipaị 2:3) N’otu aka ahụ, Eleanor Boykin, n’akwụkwọ ya bụ́ This Way, Please—A Book of Manners, na-asị: “Obi dị mma bụ ihe mbụ dị gị mkpa.”
Ime ihe n’ụzọ obi umeala a ga-egbochi anyị ileda omenala nke ndị ọzọ anya. Anyị ga-enwe mmetụta ịbụ ndị a kwaliri ime mgbalị ibute ụzọ ma mụta otú ndị ọzọ si ebi ndụ, kere òkè n’omenala ha ma detụ nri ha ọnụ kama ịla azụ ma ọ bụ na-enyo ihe ọ bụla yiri ka ọ dị iche enyo. Site n’inwe obi ghere oghe na ịdị njikere ịnwale ụzọ ndị ọhụrụ, anyị na-akwanyere ndị na-ele anyị ọbịa ma ọ bụ ndị agbata obi bụ́ ndị anyị nọ n’ala ha, ùgwù. Anyị na-eritekwa uru n’onwe anyị ka anyị na-eme ka obi anyị na ihe ọmụma anyị “dị obodobo.”—2 Ndị Kọrint 6:13.
Ọ Bụrụ na Omenala ahụ Na-egbochi Ọganihu Ime Mmụọ
Gịnị ma ọ bụrụ na anyị echee omenala ndị na-emegideghị Akwụkwọ Nsọ n’onwe ha ihu, ma ha adịghị akwalite ọganihu ime mmụọ? Dị ka ihe atụ, n’ala ụfọdụ, ndị mmadụ pụrụ inwe nnọọ àgwà nke iyigharị ihe. Ụzọ a dị mfe e si emeso ndụ pụrụ ibelata nchekasị, ma o yiri ka ọ ga-eme ka o siere anyị ike ‘ijezu’ ozi anyị.—2 Timoti 4:5.
Olee otú anyị pụrụ isi gbaa ndị ọzọ ume izere iyigharị ihe ndị dị mkpa ruo “echi”? Cheta na “obi dị mma bụ ihe mbụ dị gị mkpa.” N’ịbụ ndị ịhụnanya na-akwali, anyị pụrụ isetịpụ ihe nlereanya ma jirizie obiọma kọwaa abamuru nke ịghara ịhapụ ihe e kwesịrị ime taa ruo echi. (Eklisiastis 11:4) N’otu oge ahụ, anyị aghaghị ịkpachara anya ịghara iji nanị n’ihi ịrụpụta ihe leghara ntụkwasị obi na obi ike e nwekọrọ ọnụ anya. Ọ bụrụ na ndị ọzọ anaraghị aro anyị ozugbo, anyị ekwesịghị ime dị ka anyị bụ ndị nwe ha ma ọ bụ wesara ha iwe. Ịhụnanya ga-ebuterịrị ịdị irè ụzọ mgbe nile.—1 Pita 4:8; 5:3.
Iburu n’Uche Nhọrọ Ndị Obodo
Ọ dị anyị mkpa ijide n’aka na aro ọ bụla anyị tụrụ bụ nke bara uru, na-abụghịkwa nanị mgbalị ịmanye ha ịnakwere nhọrọ onwe onye anyị. Dị ka ihe atụ, ụdị ejiji dịgasị nnọọ iche. N’ọtụtụ ógbè ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị nwoke na-ekwusa ozi ọma ịkpọ taị, ma n’ụfọdụ mba ndị dị n’ebe okpomọkụ, a pụrụ ile ya anya dị ka ịgbasobiga ụkpụrụ ókè. Iburu n’uche nhọrọ ndị obodo banyere uwe kwesịrị ekwesị maka onye achụmnta ego bụ́ onye ya na ọha na eze na-emekọ ihe ga-abụkarị ihe nduzi na-enye aka. “Uche zuru okè” dị mkpa mgbe anyị na-atụle okwu chọrọ mkpachara anya banyere uwe.—1 Timoti 2:9, 10.
Gịnị ma ọ bụrụ na otu omenala amasịghị anyị? È kwesịrị ịjụ ya ozugbo? Ọ bụchaghị otú ahụ. Omenala nke ndị ikom ijiderịta aka, bụ́ nke e hotara na mbụ, bụ ihe a na-anabata n’ụzọ zuru ezu n’ógbè Africa ahụ kpọmkwem. Mgbe onye ozi ala ọzọ ahụ hụrụ na ndị ikom ndị ọzọ jidere aka na-ejegharị, o nwekwuru ahụ iru ala.
Pọl onyeozi, n’oge njem ozi ala ọzọ ya sara mbara, letara ọgbakọ dị iche iche ndị ndị nọ na ha nwere nzụlite dị iche iche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na e nwere ndịrịta iche nke ọdịbendị mgbe mgbe. N’ihi ya, Pọl onyeozi mere mgbanwe iji kwekọọ n’omenala ọ bụla pụrụ ikwe ya mee ka ọ na-arapagidesi ike n’ụkpụrụ Bible. “Aghọwo m ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ,” ka o kwuru, “ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ.”—1 Ndị Kọrint 9:22, 23; Ọrụ 16:3.
Ajụjụ ụfọdụ bara uru pụrụ inyere anyị aka ikpebi otú anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ebe omenala ndị ọhụrụ dị. Site na anyị ịnakwere otu omenala—ma ọ bụ ịjụ ime otú ahụ—echiche dị aṅaa ka anyị na-enye ndị na-ekiri anyị? Hà ga-abụ ndị a dọọrọ mmasị ha gaa n’ozi Alaeze ahụ n’ihi na ha pụrụ ịhụ na anyị na-agbalị ịnakwere ọdịbendị ha? N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị anakwere otu omenala obodo, à pụrụ “ịta ije ozi anyị ụta”?—2 Ndị Kọrint 6:3.
Ọ bụrụ na anyị achọọ ịghọ “ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ,” ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịgbanwe echiche ụfọdụ ndị gbamiworo mgbọrọgwụ n’ime anyị banyere ihe kwesịrị ekwesị na ihe na-ekwesịghị ekwesị. Mgbe mgbe ụzọ “ziri ezi” na nke “na-ezighị ezi” isi mee ihe na-adabere nanị n’ebe anyị bi. N’ihi ya, n’otu mba njide aka n’etiti ndị ikom bụ ngosipụta nke ọbụbụenyi, ebe ọ bụ na n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ ọ ga-adọpụ uche n’ozi Alaeze ahụ n’ezie.
Otú ọ dị, e nwere omenala ndị ọzọ a na-anabata n’ógbè dị iche iche, ndị pụkwara ọbụna ikwesi ekwesi nye ndị Kraịst; ma anyị aghaghị ịkpachara anya.
Kpachara Anya Banyere Ịgafe Ókè!
Jisọs Kraịst kwuru na ọ bụ ezie na a pụghị iwepụ ndị na-eso ụzọ ya n’ụwa, ha aghaghị ịnọgide bụrụ ndị ‘na-esiteghị n’ụwa.’ (Jọn 17:15, 16) Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ọ dịghị adị mfe ịchọpụta ọdịiche dị n’etiti ihe bụ akụkụ bụ́ isi nke ụwa Setan na ihe bụ nanị omenala. Dị ka ihe atụ, egwú na ịgba egwú jupụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ omenala nile, ọ bụ ezie na n’ala ụfọdụ ha na-adị mkpa karị.
Anyị pụrụ ime mkpebi ngwa ngwa—na-adaberekarị ná nzụlite anyị karịa n’ezi echiche dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Alex, bụ́ nwanna nwoke bụ́ onye Germany, natara ọrụ ịga Spain. N’ebe mbụ o bi, ịgba egwú adịchaghị ewu ewu, ma na Spain ọ bụ akụkụ nke ọdịbendị ha. Mgbe mbụ ọ hụrụ otu nwanna nwoke na nwanna nwanyị ka ha na-agba egwú obodo a na-agbasi ike, o juru ya anya. Ịgba egwú a ọ̀ bụ nke na-ezighị ezi ka ọ bụ ikekwe nke ụwa? Ọ bụrụ na ya anabata omenala a ọ̀ ga-abụ iweda ụkpụrụ ndị Kraịst ya ala? Alex mụtara na ọ bụ ezie na egwú na ịgba egwú ahụ dị iche, e nweghị ihe mere ọ ga-eji were ya na ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Spain na-eweda ụkpụrụ ndị Kraịst ala. Mgbagwoju anya ya bụ n’ihi ndịrịta iche n’ọdịbendị.
Otú ọ dị, Emilio, bụ́ nwanna nwoke nke egwú ọdịnala ndị Spain na-amasị, matara na ihe ize ndụ dị na ya. “Ana m ahụ na ọtụtụ ụdị nke ịgba egwú na-achọ ka nwoke na nwanyị bịaruo nnọọ onwe ha nso,” ka ọ na-akọwa. “Dị ka onye na-alụbeghị nwanyị, ana m aghọta na nke a pụrụ imetụta mmetụta nke, ma ọ dịkarịa ala, otu n’ime mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ iji ịgba egwú mee ihe dị ka ihe ngọpụ iji gosi onye i nwere mmasị n’ebe ọ nọ mmetụta ịhụnanya. Ịhụ na egwú ahụ dị mma nakwa na e belatara mmetụ ahụ ruo n’ókè dị nnọọ nta pụrụ ịbụ ihe nchebe. Ka o sina dị, aghaghị m ikweta na mgbe ìgwè ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị na-eto eto na-alụbeghị dị ma ọ bụ nwunye na-aga ịgbakọ egwú ọnụ, ọ na-esi oké ike ịnọgide na-enwe ọnọdụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ọchịchị Chineke.”
N’ezie, anyị agaghị achọ iji ọdịbendị anyị mee ihe dị ka ihe ngọpụ maka imikpu onwe anyị n’ime àgwà nke ụwa. Ịbụ abụ na ịgba egwú nwere ọnọdụ n’ọdịbendị nke ụmụ Israel, mgbe a tọhapụkwara ụmụ Israel pụọ n’aka Ijipt n’Osimiri Uhie, ememe ha gụnyere ma abụ ma ịgba egwú. (Ọpụpụ 15:1, 20) Otú ọ dị, ụdị egwú na ịgba egwú ha kpọmkwem dị iche site na nke ndị na-ekpere arụsị gbara ha gburugburu.
Ọ dị mwute na ka ha na-eche ka Mosis lọghachi site n’Ugwu Saịnaị, ụmụ Israel enweghịzi ndidi, ha kpụọ nwa ehi ọlaedo, mgbe ha risịkwara nri ma ṅụsịa ihe ọṅụṅụ ha “wee bilie igwu egwú.” (Ọpụpụ 32:1-6) Mgbe Mosis na Joshua nụrụ ụda ịgụ egwú ha, o sogburu ha ozugbo. (Ọpụpụ 32:17, 18) Ụmụ Israel agafeela “ókè” ahụ, ugbu a kwa ụdị ịgụ na ịgba egwú ha yiri nke ndị na-ekpere arụsị gbara ha gburugburu.
N’otu aka ahụ taa, egwú na ịgba egwú pụrụ ịbụ nke a na-anabata n’ozuzu ha n’ógbè anyị, o nwekwara ike ọ gaghị emejọ akọ na uche ndị ọzọ. Ma ọ bụrụ na a gbalatatụ ìhè ọkụ, e tinye ọkụ ndị na-amụke amụke, ma ọ bụ a kpọọ egwú nwere ụda dị iche, ihe a na-anabata na mbụ pụrụ ugbu a igosipụta mmụọ nke ụwa. “Ọ bụ nanị ọdịbendị anyị,” ka anyị pụrụ ịrụ n’ụka. Erọn jiri ngọpụ yiri nke ahụ mee ihe mgbe ọ nakweere ụdị ntụrụndụ na ofufe dị iche iche nke ndị na-ekpere arụsị, na-akọwahie ha dị ka ‘ememe a ga-emere Jehova.’ Ngọpụ a na-erijughị afọ enweghị ihe ndabere. Leenụ, ọbụna e lere àgwà ha anya dị ka “ihe ntakwu n’etiti ndị na-ebili imegide ha.”—Ọpụpụ 32:5, 25.
Ọdịbendị Nwere Ọnọdụ Ya
Omenala ndị dị nnọọ iche pụrụ ibu ụzọ wụọ anyị akpata oyi ma ọ bụchaghị ha nile ka a na-adịghị anabata. N’ịbụ ndị “a nwaworo nghọta ha,” anyị pụrụ ikpebi omenala ndị kwekọrọ na ndị na-ekwekọghị n’ụkpụrụ ndị Kraịst. (Ndị Hibru 5:14) Mgbe anyị na-egosipụta obi dị mma jupụtara n’ịhụnanya maka mmadụ ibe anyị, anyị ga-emeghachi omume n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe anyị chere omenala ndị na-adịghị emerụ ahụ ihu.
Ka anyị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze ahụ n’ógbè anyị ma ọ bụ n’obodo ọzọ, ile ọdịbendị dị iche iche anya n’ụzọ guzoziri eguzozi ga-eme ka o kwe anyị omume ịghọ “ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ.” Ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na anyị ga-ahụ na ka anyị na-anabata ọdịbendị dị iche iche, ọ ga-atụnye ụtụ n’ime ka anyị nwee ndụ nwere nzube, nke na-akpali mmasị, ma na-adọrọ adọrọ.
[Foto dị na peeji nke 20]
A pụrụ ikele ekele ndị Kraịst n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ọtụtụ ụzọ
[Foto dị na peeji nke 23]
Inwe echiche guzoziri eguzozi banyere ọdịbendị dị iche iche pụrụ iduga ná ndụ nwere nzube, na-akpali mmasị