Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 10/15 p. 19-24
  • Jerusalem nke Kwekọrọ n’Aha Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jerusalem nke Kwekọrọ n’Aha Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụbọchị Mgbakọ Dị Ebube
  • Mgbakọta Ọzọ nke Na-enye Ọṅụ
  • Anyị Ekwesịghị Ileghara Ụlọ Chineke Anya
  • Nraranye nke Na-enye Ọṅụ
  • Ihe Na-akpata Ọṅụ Ebighị Ebi
  • Jerusalem—Ọ̀ Dị ‘n’Elu Isi Ọṅụ Gị’?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehemaịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Mgbidi Jeruselem
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Mgbidi Jeruselem
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 10/15 p. 19-24

Jerusalem nke Kwekọrọ n’Aha Ya

‘Tegharịanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke: n’ihi na, lee, M na-eke Jerusalem ịbụ ihe ntegharị egwú ọṅụ.’—AỊSAỊA 65:18.

1. Gịnị ka Ezra chere banyere obodo Chineke họpụtara ahọpụta?

DỊ KA onye ji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, onye nchụàjà bụ́ onye Juu bụ́ Ezra ji njikọ ahụ dịbu n’etiti Jerusalem na ofufe dị ọcha nke Jehova kpọrọ ihe. (Deuterọnọmi 12:5; Ezra 7:27) E kpughere ịhụnanya ya maka obodo Chineke n’akụkụ Bible ndị ahụ e nyere ya ike mmụọ nsọ ide—Ihe E Mere nke Mbụ na nke Abụọ na Ezra. N’ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme ndị a, a na-achọta aha ahụ bụ́ Jerusalem n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ihe karịrị ugboro 800 ọ pụtara na Bible dum.

2. Olee otú Ezra si dekọọ aha ahụ bụ́ Jerusalem mgbe ụfọdụ, gịnịkwa ka nke a pụtara?

2 N’asụsụ Hibru e ji dee Bible, a pụrụ ịghọta “Jerusalem” ịbụ nke dị n’ụdị asụsụ Hibru a na-akpọ ihe gbara mkpị. A na-ejikarị ihe gbara mkpị eme ihe maka ihe ndị gbara abụọ, dị ka anya, ntị, aka, na ụkwụ. N’ụdị a gbara mkpị, a pụrụ ile aha ahụ bụ́ Jerusalem anya dị ka okwu amụma nke udo ndị Chineke ga-enwe n’echiche abụọ—n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ nkịtị. Akwụkwọ Nsọ ekpugheghị ma Ezra ọ̀ ghọtara nke a n’ụzọ zuru ezu. Otú ọ dị, dị ka onye nchụàjà, o mere ihe kasị mma ọ pụrụ ime iji nyere ndị Juu aka inwe udo n’ebe Chineke nọ. Ọ rụsikwara ọrụ ike n’ezie ka Jerusalem wee bie ndụ kwekọrọ n’ihe aha ya pụtara, ya bụ́, “Onwunwe [ma ọ bụ, Ntọala] nke Udo Gbara Mkpị.”—Ezra 7:6.

3. Afọ ole gafere tupu a kọọrọ anyị ọzọ banyere ọrụ Ezra, ọ bụkwa n’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka anyị hụrụ ya?

3 Bible ekwughị ebe Ezra nọ n’ime afọ 12 ahụ gaferenụ n’agbata mgbe ọ bịara Jerusalem na mgbe Nehemaịa bịarutere n’obodo ahụ. Ọnọdụ ime mmụọ dị njọ nke mba ahụ n’oge ahụ na-atụ aro na Ezra anọghị ya. Ma, anyị na-ahụ Ezra ka ọ na-eje ozi ọzọ dị ka onye nchụàjà na-ekwesị ntụkwasị obi na Jerusalem kpọmkwem mgbe e wughachisịrị mgbidi obodo ahụ.

Ụbọchị Mgbakọ Dị Ebube

4. Gịnị dị ịrịba ama banyere ụbọchị mbụ nke ọnwa asaa nke Israel?

4 E wughachiri nnọọ mgbidi Jerusalem n’oge maka ọnwa ememe ahụ dị mkpa bụ́ Tishri, bụ́ ọnwa nke asaa na kalenda okpukpe Israel. Ụbọchị mbụ nke ọnwa Tishri bụ ememe ọnwa ọhụrụ pụrụ iche nke a na-akpọ Ememe Ịfụ Opì. N’ụbọchị ahụ, ndị nchụàjà na-afụ opì ka a na-achụrụ Jehova àjà. (Ọnụ Ọgụgụ 10:10; 29:1) Ụbọchị a kwadebere ụmụ Israel maka Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ n’ụbọchị nke 10 nke ọnwa Tishri nakwa Ememe nke Nchịkọta Ihe na-enye ọṅụ site n’ụbọchị nke 15 ruo 21 nke otu ọnwa ahụ.

5. (a) Olee otú Ezra na Nehemaịa si were “ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa” mee ihe n’ụzọ bara uru? (b) Gịnị mere ụmụ Israel ji bee ákwá?

5 ‘N’ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa,’ “ndị ahụ nile” gbakọtara, o yikarịrị ka ọ bụ Nehemaịa na Ezra gbara ha ume ime otú ahụ. A gụnyere ndị ikom, ndị inyom, na “onye ọ bụla nke na-aghọta ịnụ ihe.” N’ihi ya, ụmụaka nọ ya, ha gekwara ntị ka Ezra guzo n’elu ikpo okwu ma na-agụ Iwu ahụ “site n’ìhè ụtụtụ ruo etiti ehihie.” (Nehemaịa 8:1-4) Na mgbe ndị a ga-akwụsịtụ, ndị Livaị nyeere ndị mmadụ aka ịghọta ihe a na-agụ. Nke a kpaliri ụmụ Israel ịgba anya mmiri ka ha ghọtara otú ha na ndị nna ha ochie bụruru ndị na-erubeghịrị Iwu Chineke isi.—Nehemaịa 8:5-9.

6, 7. Gịnị ka ndị Kraịst pụrụ ịmụta site n’ihe Nehemaịa mere iji mee ka ndị Juu kwụsị ibe ákwá?

6 Ma nke a abụghị oge maka ibe ákwá iru újú. Ọ bụ ememe, ndị ahụ ka wughachichakwara nnọọ mgbidi Jerusalem. Ya mere, Nehemaịa nyeere ha aka inwe ọnọdụ uche ziri ezi site n’ịsị: “Jeerenụ onwe unu, rie ihe mara abụba, ṅụọ ihe ọṅụṅụ dị ụtọ, were òkè zigara ndị ọ na-adịghị ihe e doziwooro ha: n’ihi na nsọ ka ụbọchị taa dịịrị Onyenwe anyị: ihe ewutekwala unu, n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ike unu.” Ná nrubeisi, “ndị ahụ nile wee jee iri ihe, na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na iziga òkè, na ime ka oké ọṅụ dị, n’ihi na ha ghọtara okwu nile nke e mere ka ha mara.”—Nehemaịa 8:10-12.

7 Ndị Chineke taa pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ihe ndekọ a. Ndị nwere ihe ùgwù nke ikere òkè n’ihe omume ná nzukọ na ná mgbakọ dị iche iche kwesịrị iburu ihe ahụ dị n’elu n’uche. Tụkwasị n’inye ndụmọdụ na-agbazi agbazi bụ́ nke na-adị mkpa mgbe ụfọdụ, oge dị otú ahụ na-eme ka uru na ngọzi ndị na-esite n’iru ihe ndị Chineke chọrọ pụta ìhè. A na-enye ịja mma maka ọrụ ọma ndị a rụrụ, a na-enyekwa agbamume iji tachie obi. Ha kwesịrị iji ọṅụ nke obi si ná mgbakọta ndị dị otú ahụ laa n’ihi ntụziaka na-ewuli elu ha nataworo site n’Okwu Chineke.—Ndị Hibru 10:24, 25.

Mgbakọta Ọzọ nke Na-enye Ọṅụ

8, 9. Nzukọ pụrụ iche dị aṅaa weere ọnọdụ n’ụbọchị nke abụọ nke ọnwa nke asaa, gịnị ka ọ rụpụtaara ndị Chineke?

8 N’ụbọchị nke abụọ nke ọnwa ahụ pụrụ iche, “a chịkọtara ndị isi ụlọ nke ndị bụ́ nna nke ndị ahụ nile, na ndị nchụàjà, na ndị Livaị, n’ebe Ezra, bụ́ odeakwụkwọ, nọ, ọbụna inwe uche banyere okwu nile nke iwu ahụ.” (Nehemaịa 8:13) Ezra ruru eru nke ọma iduzi nzukọ a, ebe ọ bụ na ‘o doziwo obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya, na izi ụkpụrụ Ya na ikpe Ya n’Israel.’ (Ezra 7:10) Obi abụọ adịghị ya na nzukọ a mere ka ebe ndị ọ dị ndị Chineke mkpa ikwekọ n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’ụzọ chikwuru anya pụta ìhè. Nke chọrọ nlebara anya ozugbo bụ mkpa ọ dị ime nkwadebe ndị kwesịrị ekwesị iji mee Ememe Ụlọ Ntu nke na-abịanụ.

9 E mere ememe a nke were otu izu n’ụzọ ziri ezi, mmadụ nile ahụ ana-ebi n’ụlọ ntu na-adịru nwa oge ndị e ji alaka na akwụkwọ osisi dị iche iche wuo. Ndị ahụ wukwasịrị ụlọ ntu ndị a n’elu ụlọ ha, n’ogige ha, n’ogige ụlọ nsọ ahụ, na n’ámá ndị dị na Jerusalem. (Nehemaịa 8:15, 16) Lee ohere mara mma nke a bụ ịkpọkọta ndị ahụ ma gụọrọ ha ihe site n’Iwu Chineke! (Tụlee Deuterọnọmi 31:10-13.) E mere nke a kwa ụbọchị, “site n’ụbọchị mbụ ruo ụbọchị ikpeazụ” nke ememe ahụ, na-akpata “oké ọṅụ dị ukwuu” n’ebe ndị Chineke nọ.—Nehemaịa 8:17, 18.

Anyị Ekwesịghị Ileghara Ụlọ Chineke Anya

10. Gịnị mere e ji mee ndokwa maka mgbakọta pụrụ iche n’ụbọchị nke 24 nke ọnwa nke asaa?

10 E nwere oge na ebe kwesịrị ekwesị maka idozi amaghị eme ndị siri ike dị n’etiti ndị Chineke. N’ụzọ doro anya, n’ịghọta na nke a bụ ụdị oge dị otú ahụ, Ezra na Nehemaịa mere ndokwa maka ụbọchị ibu ọnụ n’ụbọchị nke 24 nke ọnwa Tishri. Ọzọ, a gụrụ Iwu Chineke, ndị ahụ kwupụtakwara mmehie ha. Mgbe ahụ, ndị Livaị tụleghachiri mmeso obi ebere ndị Chineke mesoro ndị ya na-eme isi ike, kwuo okwu otuto ndị mara mma nye Jehova, ma guzobe “ọgbụgba ndụ kwesịrị ntụkwasị obi” bụ́ nke a nwapụtara ịbụ eziokwu site n’akara nke ndị isi, ndị Livaị, na ndị nchụàjà kara ya.—Nehemaịa 9:1-38.

11. Olee “ọgbụgba ndụ kwesịrị ntụkwasị obi” nke ndị Juu kwere nkwa ikwekọ na ya?

11 Ndị ahụ n’ozuzu ha ṅụrụ iyi ime ihe dị ‘n’ọgbụgba ndụ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ e dere ede. Ha ‘ga-ejegharị n’iwu Chineke.’ Ha kwekwara ịghara isoro “ndị dị iche iche nke ala ahụ” banye ná njikọ alụmdi na nwunye. (Nehemaịa 10:28-30) Ọzọkwa, ndị Juu kwere nkwa n’onwe ha idebe Ụbọchị Izu Ike, inye onyinye ego kwa afọ iji kwadoo ofufe dị ọcha, iweta nkụ maka ebe ịchụàjà, inye nwa e buru ụzọ mụọ n’anụ ụlọ ha maka ịchụàjà, na iweta mkpụrụ mbụ nke ala ha n’ụlọ nri ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ. N’ụzọ doro anya, ha kpebisiri ike ‘ịghara ịhapụ ụlọ Chineke ha.’—Nehemaịa 10:32-39.

12. Gịnị ka elegharaghị ụlọ Chineke anya gụnyere taa?

12 Taa, ndị Jehova aghaghị ịkpachara anya ka ha ghara ileghara ihe ùgwù ha nke ‘ife ofufe’ n’ogige nke nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova anya. (Mkpughe 7:15) Nke a na-agụnye ekpere sitere n’obi mgbe nile maka ọganihu nke ofufe Jehova. Ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ekpere ndị dị otú ahụ na-achọ nkwadebe maka nzukọ ndị Kraịst na ikere òkè na ha, ikere òkè ná ndokwa maka ikwusa ozi ọma, na inyere ndị nwere mmasị aka site n’ịgaghachi nakwa, ọ bụrụ na o kwee mee, iduziri ha ọmụmụ Bible. Ọtụtụ ndị na-achọghị ileghara ụlọ Chineke anya na-enye onyinye ego maka ọrụ nkwusa na nlekọta nke ebe ndị a na-efe ezi ofufe. Anyị pụkwara ịkwado owuwu nke ebe nzukọ ndị a chọrọ ngwa ngwa tinyekwara idebe ha ọcha. Otu ụzọ dị mkpa isi gosi ịhụnanya maka ụlọ ime mmụọ nke Chineke bụ ime ka e nwee udo n’etiti ndị kwere ekwe ibe anyị na inyere onye ọ bụla nke nwere mkpa enyemaka ihe onwunwe ma ọ bụ nke ime mmụọ aka.—Matiu 24:14; 28:19, 20; Ndị Hibru 13:15, 16.

Nraranye nke Na-enye Ọṅụ

13. Okwu dị aṅaa chọrọ ime ihe ngwa ngwa chọrọ ka e lebara ya anya tupu e nwee ike ịrara mgbidi Jerusalem nye, ezi ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka ọtụtụ setịpụrụ?

13 “Ọgbụgba ndụ [ahụ] kwesịrị ntụkwasị obi” a kara akara n’ụbọchị Nehemaịa kwadebere ndị Chineke nke oge ochie maka ụbọchị nraranye nke mgbidi Jerusalem. Ma okwu ọzọ chọrọ ime ihe ngwa ngwa ka chọkwara ka e lebara ya anya. Ebe mgbidi ukwu nke nwere ọnụ ụzọ ama 12 gbara ya gburugburu ugbu a, Jerusalem chọrọ ka mmadụ bakwuo ụba na ya. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ụmụ Israel bi ebe ahụ, “obodo ahụ sara mbara n’aka abụọ, dịkwa ukwuu: ma ndị [mmadụ] dị ole na ole n’etiti ya.” (Nehemaịa 7:4) Iji dozie nsogbu a, ndị ala ahụ ‘fere nzà, ime ka otu onye n’ime mmadụ iri bata ibi na Jerusalem, bụ́ obodo nsọ.’ Njikere ha dị ịzaghachi ná ndokwa a kpaliri ndị mmadụ ịgọzi “ndị ikom ahụ nile ndị were afọ ofufo nye onwe ha ibi na Jerusalem.” (Nehemaịa 11:1, 2) Lee ezi ihe nlereanya ọ bụ nye ndị na-efe ezi ofufe taa bụ́ ndị ọnọdụ ha kwere ka ha gaa ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka enyemaka ndị Kraịst tozuru okè!

14. Gịnị mere n’ụbọchị a raara mgbidi Jerusalem nye?

14 N’oge na-adịghị anya nkwadebe ndị dị mkpa malitere maka oké ụbọchị nke ịrara mgbidi Jerusalem nye. E mere ka ndị na-eti egwú na ndị na-abụ abụ si n’obodo ndị gbara Juda gburugburu gbakọta. A chịkọtara ndị a n’òtù ukwe abụọ buru ibu na-enye ekele, ndị kwụ n’ahịrị ga na-eso nke ọ bụla n’ime ha n’azụ. (Nehemaịa 12:27-31, 36, 38) Ndị òtù ukwe na ndị ahụ kwụrụ n’ahịrị malitere n’otu ebe ná mgbidi kasị dị anya site n’ụlọ nsọ ahụ, ma eleghị anya site n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu, ma zọrọ ije na-aga n’ụzọ dị iche ruo mgbe ha zutere onwe ha n’ụlọ Chineke. “Ha wee chụọ àjà ukwu n’ụbọchị ahụ, wee ṅụrịa; n’ihi na Chineke mere ka ha ṅụrịa ọṅụ ukwu; ọzọkwa, ndị inyom ha na ụmụntakịrị ha ṅụrịrị: e wee nụ ọṅụ Jerusalem ruo ebe dị anya.”—Nehemaịa 12:43.

15. Gịnị mere nraranye nke mgbidi Jerusalem na-ejighị bụrụ ihe na-akpata ọṅụ na-adịgide adịgide?

15 Bible ekwughị ụbọchị e mere ememe ọṅụ a. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ, ma ọ bụghị akụkụ kasị akpali akpali, ná mweghachi Jerusalem. N’ezie, ọ dị mkpa ịrụ ọrụ ihe owuwu dị ukwuu n’ime obodo ahụ. Ka oge na-aga, ụmụ amaala Jerusalem tụfuru nguzo ime mmụọ ha mara mma. Dị ka ihe atụ, mgbe Nehemaịa bịara n’obodo ahụ nke ugboro abụọ, ọ hụtara na a na-eleghara ụlọ Chineke anya ọzọ nakwa na ụmụ Israel alụwakwala ndị inyom na-ekpere arụsị ọzọ. (Nehemaịa 13:6-11, 15, 23) Ihe onye amụma bụ́ Malakaị dere gosiri na ọnọdụ ọjọọ ndị a dịrị n’ezie. (Malakaị 1:6-8; 2:11; 3:8) Ya mere nraranye nke mgbidi Jerusalem abụghị ihe na-akpata ọṅụ na-adịgide adịgide.

Ihe Na-akpata Ọṅụ Ebighị Ebi

16. Olee ihe omume ikpeazụ ndị Chineke na-atụ anya ha?

16 Taa, ndị Jehova na-atụsi anya ike maka oge mgbe Chineke ga-emeri ndị iro ya nile. Nke a ga-eji mbibi “Babilọn Ukwu ahụ” malite—bụ́ obodo ihe atụ nke gụnyere ụdị nile nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:2, 8) Mbibi nke okpukpe ụgha ga-aka akara akụkụ mbụ nke mkpagbu ukwu ahụ na-abịanụ. (Matiu 24:21, 22) Ihe omume dị mkpa n’ezie nọkwa anyị n’ihu—alụmdi na nwunye eluigwe nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nwunye ọhụrụ ya nke ụmụ amaala 144,000 nke “Jerusalem ọhụrụ.” (Mkpughe 19:7; 21:2) Anyị apụghị ikwu kpọmkwem mgbe njikọ ikpeazụ ahụ ga-ezu, ma ọ ga-abụ ihe omume na-enye ọṅụ n’ezie.—Lee Ụlọ Nche nke August 15, 1990, peji nke 30-31.

17. Gịnị ka anyị maara banyere mwucha nke Jerusalem Ọhụrụ?

17 Anyị maara na mwucha nke Jerusalem Ọhụrụ dị ezi nso. (Matiu 24:3, 7-14; Mkpughe 12:12) N’adịghị ka obodo Jerusalem nke elu ala, ọ dịghị mgbe ọ ga-abụ ihe na-akpata mmechuihu. Nke a bụ n’ihi na ụmụ amaala ya nile bụ ụmụazụ Jisọs Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, e lere ule, ma nụchaa. Mgbe ha kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, onye ọ bụla n’ime ha ga-anwapụtaworị ịbụ onye na-eguzosi ike n’ihe ruo mgbe ebighị ebi nye Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova Chineke. Nke ahụ nwere ihe dị ịrịba ama ọ pụtara maka ihe fọdụrụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ—ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ!

18. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ‘nwee obi ụtọ ma tegharịa egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi’?

18 Tụlee ihe ga-eme mgbe Jerusalem Ọhụrụ ga-eche ihu ya n’ebe ụmụ mmadụ ndị na-egosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs nọ. “Lee,” ka Jọn onyeozi dere. “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:2-4) Ọzọkwa, Chineke ga-eji ndokwa a nke yiri obodo mee ka ihe a kpọrọ mmadụ ruo n’izu okè mmadụ. (Mkpughe 22:1, 2) Lee ihe magburu onwe ya ndị a bụ iji ‘nwee obi ụtọ ma tegharịakwa egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihe Chineke na-eke ugbu a’!—Aịsaịa 65:18.

19. Gịnị bụ paradaịs ime mmụọ nke a chịbataworo ndị Kraịst n’ime ya?

19 Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa ka ụmụ mmadụ nwere nchegharị chere ruo mgbe ahụ iji nweta enyemaka site n’aka Chineke. N’afọ 1919, Jehova malitere ịchịkọta ndị òtù ikpeazụ nke 144,000 n’ime paradaịs ime mmụọ, bụ́ ebe mkpụrụ nke mmụọ Chineke—dị ka ịhụnanya, ọṅụ, na udo—jupụtara. (Ndị Galetia 5:22, 23) Akụkụ pụtara ìhè nke paradaịs ime mmụọ a abụrụwo okwukwe nke ndị e tere mmanụ bi na ya, bụ́ ndị nọworo na-amịpụta mkpụrụ n’ụzọ dị ebube n’ibute ụzọ n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Matiu 21:43; 24:14) N’ihi ya, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde “atụrụ ọzọ” isi, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala, abụrụwokwa ndị e kwere ka ha bata na paradaịs ime mmụọ ahụ ma na-anụ ụtọ ọrụ na-amịpụta mkpụrụ. (Jọn 10:16) Ha eruwo eru maka nke a site n’ịrara onwe ha nye Jehova Chineke ná ndabere nke okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Mkpakọrịta ha na ndị gaje ịbụ ndị òtù nke Jerusalem Ọhụrụ abụrụwo ihe ngọzi n’ezie. Ya mere, site n’ụzọ o si emeso ndị Kraịst e tere mmanụ ihe, Jehova atọwo ntọala siri ike maka “ụwa ọhụrụ”—ọha mmadụ nke ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị ga-eketa ógbè elu ala nke Alaeze eluigwe ahụ.—Aịsaịa 65:17; 2 Pita 3:13.

20. Olee otú Jerusalem Ọhụrụ ga-esi kwekọọ n’ihe aha ya pụtara?

20 Ọnọdụ udo nke ndị Jehova na-anụ ụtọ ya ugbu a n’ime paradaịs ime mmụọ ha ga-adị n’ime paradaịs nkịtị n’elu ala n’isi nso. Nke ahụ ga-eme mgbe Jerusalem Ọhụrụ ga-esi n’eluigwe rịdata ịgọzi ihe a kpọrọ mmadụ. N’ụzọ gbara mkpị, ndị Chineke ga-enwe ọnọdụ udo ahụ e kwere nkwa ya n’Aịsaịa 65:21-25. Dị ka ndị na-efe Jehova n’ịdị n’otu n’ime paradaịs ime mmụọ ahụ, ndị ahụ e tere mmanụ bụ́ ndị ka ga-ewere ọnọdụ ha na Jerusalem Ọhụrụ nke eluigwe na ndị nke “atụrụ ọzọ” ahụ nọ ugbu a na-enweta udo nke Chineke na-enye. Udo dị otú ahụ ga-adịrịkwa banye n’ime Paradaịs nkịtị, mgbe ‘a ga-eme ihe Chineke na-achọ n’elu ala, ọbụna dị ka e si eme ya n’eluigwe.’ (Matiu 6:10) Ee, obodo eluigwe dị ebube nke Chineke ga-eme ihe kwekọrọ n’aha ahụ bụ́ Jerusalem dị ka ‘Ntọala siri ike nke Udo Gbara Mkpị.’ Ruo mgbe nile ebighị ebi, ọ ga-eguzo dị ka ihe ịja mma nye Onye Okike Ukwu ya, bụ́ Jehova Chineke, na Eze Na-alụ ya, bụ́ Jisọs Kraịst.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị ka a rụzuru mgbe Nehemaịa kpọkọtara ndị ahụ na Jerusalem?

◻ Gịnị ka ndị Juu oge ochie na-aghaghị ime ka ha wee ghara ileghara ụlọ Chineke anya, gịnịkwa ka a na-agwa anyị ka anyị mee?

◻ Olee otú iweta ọṅụ na udo na-adịgide adịgide si metụta “Jerusalem”?

[Map dị na peeji 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ JERUSALEM

Ọnụ ọgụgụ na-anọchite anya ịdị elu nke oge a na mita

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ AZỤ̀

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ OBODO OCHIE

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ EFRAIM

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ NKE NKUKU

Mgbidi Dị Obosara

Ámá

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ NDAGWURUGWU

OBODO NKE ABỤỌ

Mgbidi Mbụ nke Ebe Ugwu

OBODO DEVID

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ EBE IKPOFU AHỊHỊA

Ndagwurugwu Nwa Hinọm

Ụlọ Ukwu

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ ATỤRỤ

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ NDI NCHE

Ógbè Ụlọ Nsọ

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ HAMIFKAD

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ ỊNYỊNYA

OFEL

Ámá

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ MMIRI

Mmiri Iyi Gaịhọn

ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ ISI IYI

Ubi Eze A Gbara Ogige

En-rogel

Ndagwurugwu (Etiti) Tyropoeon

Mmiri Iyi Kidron

740

730

730

750

770

770

750

730

710

690

670

620

640

660

680

700

720

740

730

710

690

670

O yikarịrị ka ọ bụ ebe a ka mgbidi Jerusalem ruru n’oge e bibiri obodo ahụ nakwa mgbe Nehemaịa duziri mwughachi nke mgbidi ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya