Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/1 p. 30-31
  • Jisọs Wepụtara Oge Soro Ụmụntakịrị Nọkọọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jisọs Wepụtara Oge Soro Ụmụntakịrị Nọkọọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jisọs Anabata Ụmụntakịrị
  • Ihe Mmụta Maka Anyị
  • Ì Nwere “Uche nke Kraịst”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ụmụ Anyị—ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta n’Aka Ụmụaka?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/1 p. 30-31

Ha Mere Uche Jehova

Jisọs Wepụtara Oge Soro Ụmụntakịrị Nọkọọ

IJE ozi Jisọs nke were afọ atọ na ọkara na-abịaru njedebe ya. N’oge na-adịghị anya ọ ga-abanye Jerusalem, nwụọkwa ọnwụ na-egbu mgbu. Ọ maara ihe dị n’ihu ya nke ọma, n’ihi na ọ gwawo ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A na-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka mmadụ, ha ga-egbukwa Ya.”—Mak 9:31.

N’ezie, Jisọs ga-achọ iji ụbọchị nke ọ bụla, hour nke ọ bụla, ntakịrị oge nke ọ bụla fọdụrụnụ mee ihe kasị baa uru. Ndị na-eso ụzọ ya ka nwere mkpa nke nlebara anya. Jisọs hụrụ na ha ka nwere mkpa nke ndụmọdụ siri ike banyere ịdị umeala n’obi na ihe ize ndụ dị mgbe nile nke ịsụ ngọngọ. (Mak 9:35-37, 42-48) Ha nwekwara mkpa nke ntụziaka banyere alụmdi na nwunye, ịgba alụkwaghịm, na alụghị di ma ọ bụ nwunye. (Matiu 19:3-12) N’ịmata na ya ga-anwụ n’oge na-adịghị anya, obi abụọ adịghị ya na Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu n’ụzọ dị nkenke na n’echiche nke ịdị ngwa. Oge bụ ihe dị oké mkpa—eziokwu nke mere ka ihe ọzọ Jisọs mere dị ịrịba ama karị.

Jisọs Anabata Ụmụntakịrị

Ihe ndekọ Bible na-ekwu, sị: “Ha wee kutara Ya ụmụntakịrị, ka O wee metụ ha aka.” Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha kwupụtara enweghị mmasị ha ozugbo. Ikekwe ha chere na Jisọs dị oké mkpa ma ọ bụ na o ji ọrụ n’aka nke ukwuu ichegbu onwe ya banyere ụmụntakịrị. Cheedị echiche ihe ijuanya ọ ga-abụrụ ndị na-eso ụzọ ya mgbe ahụ, mgbe Jisọs wesara ha iwe nke ukwuu! “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m,” ka ọ gwara ha. “Unu egbochila ha: n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú a.” Mgbe ahụ Jisọs gbakwụnyere, sị: “N’ezie asị m unu, Onye ọ bụla nke na-agaghị anara alaeze Chineke dị ka nwatakịrị, ọ gaghị aba n’ime ya ma ọlị.”—Mak 10:13-15.

Jisọs hụrụ àgwà ọma n’ime ụmụntakịrị. Ha na-achọkarị ịmata ihe ma na-atụkwasịkarị mmadụ obi. Ha ga-anakwere okwu ndị nne na nna ha, ọbụnakwa gbachitere ha n’ihu ụmụntakịrị ndị ọzọ. Ọdịdị ịnabata ihe, ịdị njikere ịmụta ihe ha kwesịrị ka ndị nile chọrọ ịbanye n’Alaeze Chineke ṅọmie ya. Dị ka Jisọs kwuru, “alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú a.”—Tụlee Matiu 18:1-5.

Ma Jisọs ejighị ụmụntakịrị ndị a na-eme nanị ihe atụ. Ihe ndekọ ahụ mere ka o doo anya na Jisọs nwere ezigbo mmasị ịnọ n’etiti ha. Mak na-akọ na Jisọs “wee kuru [ụmụntakịrị ahụ] n’aka ya, bikwasị ha aka Ya abụọ, wee gọzie ha nke ọma.” (Mak 10:16) Ọ bụ nanị ihe ndekọ nke Mak na-agụnye akụkụ na-ekpo ọkụ nke akụkọ ahụ na Jisọs ‘kuuru ụmụntakịrị ahụ n’aka ya.’a Jisọs si otú a mee ihe karịrị ihe ndị ahụ toruworo ogo mmadụ tụrụ anya ya, bụ́ ndị kpọtaara Jisọs ụmụntakịrị ndị a ka o wee nwee ike “metụ” ha aka.

Gịnị ka Jisọs ‘ibikwasị ụmụntakịrị ahụ aka ya abụọ’ pụtara? Ebe a atụghị aro ememe okpukpe, dị ka ime baptism. Ọ bụ ezie na n’oge ụfọdụ, ibikwasị aka pụtara ịhọpụta mmadụ, n’oge ndị ọzọ ọ pụtara nanị inye ngozi. (Jenesis 48:14; Ọrụ 6:6) Ya mere ọ pụrụ ịbụ na Jisọs anọwo nanị na-enye ụmụntakịrị ahụ ngọzi.

Ka o sina dị, Mak na-eji okwu siri ike karị maka “ngọzi” (ka·teu·lo·geʹo) mee ihe, na-enye echiche ikike dị ukwuu. Nke a na-enye echiche na Jisọs gọziri ụmụntakịrị ahụ nke ukwuu, n’ụzọ dị nro, na n’ụzọ na-ekpo ọkụ. N’ụzọ doro anya, o leghị ụmụntakịrị anya dị ka ibu aro na-eri oge.

Ihe Mmụta Maka Anyị

Ụzọ Jisọs si emeso ma ụmụntakịrị ma ndị toruworo ogo mmadụ abụghị nke na-emenye ụjọ ma ọ bụ na-ewetu n’ala. “Ọ ga-abụrịrị na ntakịrị ihe na-eme ya ịmụmụ ọnụ ọchị, chịakwa ọchị n’ọṅụ,” ka otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu. Ka a sịkwa ihe mere ndị nọ n’afọ ndụ nile ji nwee ahụ iru ala mgbe ha na ya nọ. N’icheghachi echiche n’ihe nlereanya Jisọs, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ bụ onye ndị ọzọ pụrụ ịbịa nso?’ ‘Ò yiri ka m na-eji ọrụ n’aka nke ukwuu nke na ihe omume na nchegbu ndị ọzọ adịghị agbasa m?’ Ịzụlite ezi mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ ga-akpali anyị inyefe onwe anyị, dị ka Jisọs mere. Ndị ọzọ ga-ahụ ezigbo mmasị anyị nwere, ọ ga-adọtakwa ha n’ebe anyị nọ.—Ilu 11:25.

Dị ka ihe ndekọ Mak na-egosi, isoro ụmụntakịrị nọrọ tọrọ Jisọs ụtọ. O doro anya na o wepụtara oge iji kirie ha ka ha na-egwuri egwu, n’ihi na o zoro aka n’egwuregwu ha n’otu n’ime ihe atụ ya. (Matiu 11:16-19) Ikekwe ụfọdụ n’ime ụmụntakịrị ndị ahụ Jisọs gọziri dị ntakịrị gabiga ókè nke na ha aghọtaghị onye ọ bụ na ihe ọ kụziri. Ma nke a emeghị ya ka o chee na ya na-egbu oge ya. O wepụtara oge soro ụmụntakịrị nọkọọ n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Ikekwe ọtụtụ n’ime ụmụntakịrị ndị ahụ Jisọs zutere n’oge ije ozi ya mesịrị bụrụ ndị a kpaliri imeghachi omume nye ịhụnanya ya site n’ịghọ ndị na-eso ụzọ ya.

Ọ bụrụ na Jisọs wepụtara oge soro ụmụntakịrị nọkọọ n’izu ndị ikpeazụ dị oké mkpa ná ndụ ya, n’ezie anyị pụrụ iwepụta oge site n’usoro ihe omume anyị ohere na-adịghị na ya iji soro ha nọkọọ. Karịsịa anyị kwesịrị iburu ndị nwere mkpa pụrụ iche n’uche, dị ka ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ na-enweghị nna. N’ezie, ụmụntakịrị nile na-eme nke ọma mgbe e lebaara ha anya, ọ bụkwa ọchịchọ Jehova ka anyị na-egosi ha ịhụnanya ma na-enyere ha aka nile anyị pụrụ inye.—Abụ Ọma 10:14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Otu nsụgharị sịrị na Jisọs “makụrụ ha.” Ọzọ sịrị na o “kuuru ha n’ogwe aka ya.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya