Isoro Chineke Na-ejegharị—Nzọụkwụ Ndị Mbụ
“Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso.”—JEMES 4:8.
1, 2. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na ọ bụ oké ihe ùgwù ijere Jehova ozi?
NWOKE ahụ atawo ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ ruo ọtụtụ afọ. E mesịa a kpọrọ ya ịbịa n’ihu onye na-achị ala ahụ. Ihe gara ngwa ngwa. Na mberede, onye mkpọrọ ahụ chọtara onwe ya dị ka onye na-ejere eze kasị ike n’ụwa mgbe ahụ ozi. E debere onye ahụ bụbu onye mkpọrọ n’ọnọdụ oké ibu ọrụ na nsọpụrụ dị nnọọ ịrịba ama. Josef—nwoke ahụ e keburu agbụ n’ụkwụ—sooro eze na-ejegharị ugbu a!—Jenesis 41:14, 39-43; Abụ Ọma 105:17, 18.
2 Taa, ụmụ mmadụ nwere ohere ijere otu onye dị nnọọ ukwuu karịa Fero nke Ijipt ozi. Onye Kasị Elu n’eluigwe na ala na-akpọ anyị nile òkù ijere ya ozi. Lee ihe ùgwù na-akpali egwu ọ bụ ime otú ahụ na iwulite mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova, bụ́ Chineke pụrụ ime ihe nile nọ! N’Akwụkwọ Nsọ, e jikọrọ ya na ike na ebube nakwa ịdị jụụ, ịma mma, na ịdị ụtọ. (Ezikiel 1:26-28; Mkpughe 4:1-3) Ịhụnanya jupụtara n’ihe nile ọ na-eme. (1 Jọn 4:8) Ọ dịghị agha ụgha mgbe ọ bụla. (Ọnụ Ọgụgụ 23:19) Ọ dịghịkwa mgbe Jehova na-emechu ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya ihu. (Abụ Ọma 18:25) Site n’ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume ya, anyị pụrụ ibi ndụ obi ụtọ na nke nwere nzube ugbu a, na-enwe olileanya ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ọ dịghị onye ọchịchị bụ́ mmadụ nke na-enye ihe ọ bụla a pụrụ ijitụ tụnyere ngọzi na ihe ùgwù ndị dị otú ahụ.
3. N’ụzọ dị aṅaa ka Noa “na Chineke yikọrọ na-ejegharị”?
3 Ogologo oge gara aga, nna ochie ahụ bụ́ Noa kpebisiri ike ibi ndụ kwekọrọ n’uche na nzube Chineke. Banyere ya, Bible na-asị: “Noa bụ onye ezi omume, onye zuru okè n’ọgbọ ya nile: Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” (Jenesis 6:9) Otú ọ dị, Noa na Jehova ayịkọghị na-ejegharị n’ụzọ nkịtị, ebe ọ bụ na ọ dịbedịghị onye “hụworo Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Kama nke ahụ, Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị n’echiche nke na o mere ihe Chineke gwara ya mee. N’ihi na Noa raara ndụ ya nye ime uche Jehova, o nwere mmekọrịta na-ekpo ọkụ, nke chiri anya n’ebe Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile nọ. Dị ka Noa, ọtụtụ nde taa “na Chineke yịkọrọ na-ejegharị” site n’ibi ndụ kwekọrọ na ndụmọdụ na ntụziaka Jehova. Olee otú mmadụ si amalite ụzọ ndụ dị otú ahụ?
Ezi Ihe Ọmụma Dị Oké Mkpa
4. Olee otú Jehova si ezi ndị ya ihe?
4 Iji soro Jehova na-ejegharị, anyị aghaghị ibu ụzọ mara ya. Onye amụma bụ́ Aịsaịa buru amụma, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile: n’ihi na Zaịọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jerusalem pụta.” (Aịsaịa 2:2, 3) Ee, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-ezi ndị nile na-achọ ijegharị n’ụzọ ya ihe. Jehova enyewo Okwu ya, bụ́ Bible, ọ na-enyekwara anyị aka ịghọta ya. Otu ụzọ o si eme nke a bụ site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Jehova na-eji “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” na-enye ntụziaka ime mmụọ site ná mbipụta ndị dabeere na Bible, nzukọ ndị Kraịst, na ndokwa ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Chineke na-enyekwara ndị ya aka ịghọta Okwu ya site ná mmụọ nsọ ya.—1 Ndị Kọrint 2:10-16.
5. N’ihi gịnị ka eziokwu Akwụkwọ Nsọ ji dị nnọọ oké ọnụ ahịa?
5 Ọ bụ ezie na anyị adịghị akwụ ụgwọ maka eziokwu Bible, ọ dị oké ọnụ ahịa. Ka anyị na-amụ Okwu Chineke, anyị na-amụta banyere Chineke n’onwe ya—aha ya, ụdị onye ọ bụ, nzube ya, na ụzọ o si emeso ụmụ mmadụ ihe. Anyị na-amụtakwa azịza ndị na-atọhapụ atọhapụ nye ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ ná ndụ: N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a? N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị? Gịnị ka ọdịnihu ga-abụ? N’ihi gịnị ka anyị ji aka nká, na-anwụkwa anwụ? À na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị? Ọzọkwa, anyị na-amụta ihe bụ uche Chineke banyere anyị, ya bụ, otú anyị kwesịrị isi na-ejegharị iji na-eme ihe na-atọ ya ụtọ n’ụzọ zuru ezu. Anyị na-amụta na ihe ndị ọ chọrọ n’aka anyị bụ ndị ezi uche dị na ha bụrụkwa ndị bara uru n’ụzọ magburu onwe ha mgbe anyị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ha. Anyị apụghị ịghọta ihe ndị dị otú ahụ ma ọlị ma a sị na ntụziaka Chineke adịghị.
6. Ụzọ dị aṅaa ka ezi ihe ọmụma Bible na-enyere anyị aka ịgbaso?
6 Eziokwu Bible dị ike ma na-akwali anyị ime mgbanwe ná ndụ anyị. (Ndị Hibru 4:12) Tupu anyị enweta ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ, anyị pụrụ ijegharị nanị “n’ụzọ oge nke ụwa nke a.” (Ndị Efesọs 2:2) Ma ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke na-emepere anyị ụzọ dị iche ka anyị wee nwee ike ‘ijegharị n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile.’ (Ndị Kọlọsi 1:10) Lee ihe ọṅụ ọ bụ iwere nzọụkwụ ndị mbụ anyị n’isoro Jehova na-ejegharị, bụ́ Onye kasị dị ebube n’eluigwe na ala dum!—Luk 11:28.
Nzọụkwụ Abụọ Ndị Dị Mkpa—Nraranye na Baptism
7. Ka anyị na-amụ Okwu Chineke, eziokwu dị aṅaa banyere idu ndú mmadụ na-apụta ìhè?
7 Mgbe anyị na-etolite ná nghọta anyị nke Bible, anyị na-amalite iji ìhè ime mmụọ nke Okwu Chineke na-enyocha ihe omume ụmụ mmadụ na ndụ anyị. Otu eziokwu dị mkpa na-esi otú a apụta ìhè. Onye amụma bụ́ Jeremaịa kwupụtara eziokwu ahụ ogologo oge gara aga, wee dee, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Nduzi Chineke dị ụmụ mmadụ—anyị nile—mkpa.
8. (a) Gịnị na-akwali ndị mmadụ ịrara onwe ha nye Chineke? (b) Gịnị bụ nraranye ndị Kraịst?
8 Ịghọta eziokwu a dị mkpa na-akpali anyị ịchọ nduzi site n’ebe Jehova nọ. Ịhụnanya maka Chineke na-akwalikwa anyị ịrara ndụ anyị nye ya. Ịrara onwe anyị nye Chineke pụtara ịgakwuru ya n’ekpere ma na-ekwesi ya nkwa ike iji ndụ anyị jeere ya ozi na ijegharị n’ụzọ ya n’ikwesị ntụkwasị obi. N’ime nke a, anyị na-agbaso ihe nlereanya Jisọs, bụ́ onye ji mkpebisi ike chee onwe ya n’ihu Jehova ime uche ya.—Ndị Hibru 10:7.
9. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ n’otu n’otu ji arara ndụ ha nye Jehova?
9 Ọ dịghị mgbe Jehova Chineke na-arụgide ma ọ bụ na-amanye onye ọ bụla ịrara onwe ya nye ya. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 9:7.) Ọzọkwa, Chineke adịghị atụ anya n’aka onye ọ bụla ịrara ndụ ya nye Ya n’ihi mkpali ụfọdụ na-adịghị adịte anya. Tupu e mee mmadụ baptism, ọ ghaghị ịbụworị onye na-eso ụzọ, nke ahụ na-achọkwa mgbalị siri ike iji nweta ihe ọmụma. (Matiu 28:19, 20) Pọl rịọrọ ndị e mewororịị baptism ka ha ‘chee ahụ ha n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ, nke bụ́ ikpe ekpere ha dị ka uche si dị.’ (Ndị Rom 12:1) Ọ bụ site n’igosipụta ike nke uche yiri nke ahụ ka anyị ji arara onwe anyị nye Jehova Chineke. Mgbe anyị mụtasịrị ihe ọ gụnyere ma jiri nlezianya tụgharịa uche n’okwu ahụ, anyị na-eji ọchịchọ obi anyị na ọṅụ arara ndụ anyị nye Chineke.—Abụ Ọma 110:3.
10. Olee njikọ nraranye na baptism nwere?
10 Mgbe anyị gakwusịịrị Chineke n’ekpere n’onwe anyị iji kwupụta mkpebisi ike anyị ijegharị n’ụzọ ya, anyị na-ewere nzọụkwụ na-esote ya. Anyị na-eme ka a mara nraranye anyị n’ihu ọha site na baptism ime mmiri anyị. Nke a bụ nkwupụta ihu ọha na anyị ekwewo nkwa ime uche Chineke. Ná mmalite nke ozi elu ala Jisọs, Jọn mere ya baptism, wee si otú a na-esetịpụrụ anyị ihe nlereanya. (Matiu 3:13-17) Mgbe e mesịrị, Jisọs nyere ụmụazụ ya ọrụ ime ndị na-eso ụzọ na ime ha baptism. Ya mere, nraranye na baptism bụ nzọụkwụ ndị dị oké mkpa nye onye ọ bụla nke chọrọ iso Jehova na-ejegharị.
11, 12. (a) Olee otú a pụrụ isi were baptism tụnyere agbamakwụkwọ? (b) Myirịta dị aṅaa ka a pụrụ ịhụ n’etiti mmekọrịta anyị nwere n’ebe Jehova nọ na nke ahụ dị n’etiti di na nwunye?
11 Ịghọ onye na-eso ụzọ Jịsọs Kraịst nke raara onwe ya nye, e mere baptism yitụrụ ịbanye n’ọlụlụ. N’ọtụtụ ala, nzọụkwụ dị iche iche na-ebute ụzọ tupu ụbọchị agbamakwụkwọ. Nwoke na nwanyị na-ezute, mara onwe ha, hụrịtakwa onwe ha n’anya. Ihe na-esochi bụ nkwa ọlụlụ. Agbamakwụkwọ na-eme ka ọha na eze mara ihe e kpebiworo na nzuzo—ịbanye n’ọlụlụ ma bikọzie ọnụ dị ka di na nwunye. Ọ bụ agbamakwụkwọ ahụ na-aka mmalite nke mmekọrịta ahụ pụrụ iche akara n’ihu ọha. Ụbọchị ahụ na-aka mmalite alụmdi na nwunye ahụ akara. Ná ntụnyere, baptism na-aka mmalite nke ndụ isoro Jehova na-ejegharị ná mmekọrịta a raara nye, akara.
12 Tụlee ihe ọzọ yiri nke ahụ. Mgbe ụbọchị agbamakwụkwọ ha gasịrị, ịhụnanya dị n’etiti di na nwunye kwesịrị imiwanye emi ma tozuo okè. Iji nọgide na-abịarukwu onwe ha nso, ma di ma nwunye ahụ aghaghị ịgbalịsi ike n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị ijigide ma mee ka mmekọrịta alụmdi na nwunye ha sikwuo ike. Ọ bụ ezie na anyị na Chineke adịghị abanye n’alụmdi na nwunye, mgbe e mesịrị anyị baptism, anyị aghaghị ịrụ ọrụ iji nọgide na-enwe mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova nọ. Ọ na-ahụ ma na-aghọta mgbalị ndị anyị na-eme iji mee uche ya, ọ na-abịarukwa anyị nso. “Bịaruonụ Chineke nso,” ka Jemes onye na-eso ụzọ dere, “Ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jemes 4:8.
Ijegharị na Nzọụkwụ Jisọs
13. N’isoro Chineke na-ejegharị, ihe nlereanya ònye ka anyị kwesịrị ịgbaso?
13 Iji soro Jehova na-ejegharị, anyị aghaghị ikwekọ n’ihe nlereanya Jisọs Kraịst setịpụrụ. Pita onyeozi dere, sị: “A kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.” (1 Pita 2:21) Ebe ọ bụ na Jisọs zuru okè ma anyị ezughị okè, anyị apụghị ịgbaso ihe nlereanya o setịpụrụ n’ụzọ na-enweghị ntụpọ. Otú o sina dị, Jehova na-atụ anya n’aka anyị ime ike anyị nile. Ka anyị tụlee akụkụ ise nke ndụ na ije ozi Jisọs nke ndị Kraịst raara onwe ha nye kwesịrị ịgbalịsi ike iṅomi.
14. Gịnị ka ịmara Okwu Chineke gụnyere?
14 Jisọs nwere ihe ọmụma ziri ezi ma zuo ezuo nke Okwu Chineke. N’oge ozi ya, Jisọs hotara ihe site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ọtụtụ mgbe. (Luk 4:4, 8) N’ezie, ndị ndú okpukpe ọjọọ nke oge ahụ hotakwara ihe site n’Akwụkwọ Nsọ. (Matiu 22:23, 24) Ihe dị iche bụ na Jisọs ghọtara ihe ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ pụtara, o tinyekwara ha n’ọrụ ná ndụ ya. Ọ bụghị nanị ihe e dere n’Iwu ahụ ka ọ maara kamakwa ọ maara nzube ya. Ka anyị na-agbaso ihe nlereanya Kraịst, anyị onwe anyị kwa kwesịrị ịgbalịsi ike ịghọta Okwu Chineke, na-aghọta echiche, ma ọ bụ nzube ya. Site n’ime otú ahụ, anyị pụrụ ịghọ ndị ọrụ Chineke nwapụtara, ndị nwere ike ‘ikwuzi okwu nke eziokwu ahụ.’—2 Timoti 2:15.
15. Olee otú Jisọs si setịpụ ihe nlereanya n’ikwu okwu banyere Chineke?
15 Kraịst Jisọs gwara ndị ọzọ okwu banyere Nna ya nke eluigwe. Jisọs edebeghịrị onwe ya ihe ọmụma ya nke Okwu Chineke. Ọbụna ndị iro ya kpọrọ ya “Onye ozizi,” n’ihi na ebe ọ bụla ọ gara, ọ gwara ndị ọzọ banyere Jehova na nzube Ya. (Matiu 12:38) Jisọs mere nkwusa n’ihu ọha n’ógbè ụlọ nsọ ahụ, n’ụlọ nzukọ, n’obodo ukwu, na n’ime ime obodo. (Mak 1:39; Luk 8:1; Jọn 18:20) O ji ọmịiko na obiọma kụzie ihe, na-egosi ịhụnanya maka ndị ahụ o nyeere aka. (Matiu 4:23) Ndị na-agbaso ihe nlereanya Jisọs na-achọtakwa ọtụtụ ebe na ụzọ isi kụziere ndị ọzọ banyere Jehova Chineke na nzube ya ndị dị ebube.
16. Olee ókè mmekọrịta Jisọs nwere n’ebe ndị ya na ha na-efekọ Jehova chiruru n’anya?
16 Jisọs nwere nkekọ chiri anya n’ebe ndị ọzọ fere Jehova nọ. Ka Jisọs nọ na-agwa ìgwè mmadụ okwu n’otu oge, nne ya na ụmụnne ya nwoke bụ́ ndị na-ekweghị ekwe bịara ịgwa ya okwu. Ihe ndekọ Bible ahụ na-asị: “Otu onye wee sị Ya, Lee, nne Gị na ụmụnne Gị na-eguzo n’èzí, na-achọ ịgwa Gị okwu. Ma Ọ zara, sị onye gwara Ya, Ònye bụ nne m? olee ndị bụkwa ụmụnne m? O wee setịpụ aka Ya n’ebe ndị na-eso ụzọ Ya nọ, sị, Lee, nne m na ụmụnne m! N’ihi na onye ọ bụla nke ga-eme ihe Nna m Nke bi n’eluigwe na-achọ, onye ahụ bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.” (Matiu 12:47-50) Nke a apụtaghị na Jisọs jụrụ ezinụlọ ya, n’ihi na ihe ndị mesịrị mee na-egosi na o meghị otú ahụ. (Jọn 19:25-27) Ma, ihe ndekọ a na-emesi ịhụnanya Jisọs nwere maka ndị kwere ekwe ibe ya ike. N’otu aka ahụ taa, ndị so Chineke na-ejegharị na-achọ mkpakọrịta nke ndị ohu Jehova ndị ọzọ, na-ewulitekwa ịhụnanya dị ukwuu n’ebe ha nọ.—1 Pita 4:8.
17. Gịnị ka Jisọs chere banyere ime uche Nna ya nke eluigwe, oleekwa otú nke ahụ kwesịrị isi emetụta anyị?
17 Site n’ime uche Chineke, Jisọs gosiri ịhụnanya maka Nna ya nke eluigwe. Jisọs rubeere Jehova isi n’ihe nile. Ọ sịrị: “Ihe oriri m bụ ka M na-eme ihe Onye zitere m na-achọ, ka M rụzuokwa ọrụ Ya.” (Jọn 4:34) Kraịst kwukwara, sị: “Mụ onwe m na-eme ihe na-atọ [Chineke] ụtọ mgbe nile.” (Jọn 8:29) Jisọs hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya nke ukwuu nke na “O wedakwara Onwe ya, wee bụrụ Onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ [n’elu osisi ịta ahụhụ, NW].” (Ndị Filipaị 2:8) N’aka nke ya, Jehova gọziri Jisọs, na-ebugo ya n’ọnọdụ ịbụisi na nsọpụrụ nke na-esote nke Jehova n’onwe ya. (Ndị Filipaị 2:9-11) Dị ka Jisọs, anyị na-egosi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ site n’idebe ihe ndị o nyere n’iwu na site n’ime uche ya.—1 Jọn 5:3.
18. N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si setịpụ ihe nlereanya n’okwu banyere ekpere?
18 Jisọs bụ nwoke na-ekpe ekpere. O kpere ekpere n’oge baptism ya. (Luk 3:21) Tupu ọ họpụta ndị ozi 12 ya, o ji abalị ahụ dum kpee ekpere. (Luk 6:12, 13) Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere. (Luk 11:1-4) N’abalị ahụ tupu ọnwụ ya, o kpere ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya, sorokwa ha kpee ekpere. (John 17:1-26) Ekpere bụ akụkụ dị mkpa nke ndụ Jisọs, ọbụna dị ka o kwesịrị ịdị ná ndụ anyị, ebe anyị bụ ụmụazụ ya. Lee ihe ùgwù ọ bụ ịgwa Eze Eluigwe na Ala okwu n’ekpere! Ọzọkwa, Jehova na-aza ekpere, n’ihi na Jọn dere, sị: “Nkwuwa okwu ahụ nke anyị nwere n’ebe Ọ nọ bụ nke a, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ Ya si dị, Ọ na-anụ olu anyị: ọ bụrụkwa na anyị matara na Ọ na-anụ olu anyị n’ihe ọ bụla anyị na-arịọ, anyị matara na anyị nwere ihe arịrịọ ahụ anyị rịọworo n’aka Ya.”—1 Jọn 5:14, 15.
19. (a) Àgwà Jisọs ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị iṅomi? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị si erite uru site n’ịmụ banyere ndụ na ije ozi Jisọs?
19 E nwere ọtụtụ ihe a ga-amụta site n’inyocha ndụ na ije ozi elu ala Jisọs Kraịst n’ụzọ chiri anya! Tụgharịa uche n’àgwà ndị o gosipụtara: ịhụnanya, ọmịiko, obiọma, ume, nguzozi, ezi uche, ịdị umeala n’obi, obi ike, na achọghị ọdịmma onwe onye nanị. Ka anyị na-amụkwu banyere Jisọs, otú ahụ ka ọchịchọ anyị ịbụ ụmụazụ ya na-ekwesị ntụkwasị obi na-adịkwu ukwuu. Ihe ọmụma banyere Jisọs na-adọtakwu anyị nsọ n’ebe Jehova nọ. E kwuwerị, Jisọs bụ ngosipụta zuru okè nke Nna ya nke eluigwe. Ya na Jehova kpachiri nnọọ anya nke na ọ pụrụ ikwu, sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.”—Jọn 14:9.
Tụkwasị Chineke Obi Ịkwagide Gị
20. Olee otú anyị pụrụ isi nweta obi ike n’isoro Jehova na-ejegharị?
20 Mgbe ụmụaka ka na-amụ ije, ụkwụ ha anaghị esi ike n’ala. Olee otú ha si amụta iji obi ike na-eje ije? Ọ bụ nanị site n’ịdị na-emeghachi ya na ịnọgidesi ike. Ndị so Jehova na-ejegharị na-agbalịsi ike iji nzọụkwụ obi ike na nke na-aga n’ihu na-eje ije. Nke a kwa na-achọ oge na ịnọgidesi ike. Pọl kọwapụtara mkpa nke ịnọgidesi ike n’isoro Chineke na-ejegharị mgbe o dere, sị: “Ya mere nke fọdụrụ, ụmụnna anyị, anyị na-ekpere unu, na-arịọkwa unu n’ime Onyenwe anyị Jisọs, ka, dị ka unu natara n’aka anyị otú unu na-aghaghị ijegharị na ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, ọbụna dị ka unu na-ejegharị,—ka unu na-ababiga ókè nke ukwuu karị.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:1.
21. Ka anyị so Jehova na-ejegharị, ngọzi ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta?
21 Ọ bụrụ na anyị raara onwe anyị nye Chineke kpam kpam, ọ ga-enyere anyị aka ịnọgide soro ya na-ejegharị. (Aịsaịa 40:29-31) Ọ dịghị ihe ọ bụla ụwa a pụrụ inye nke a pụrụ iji tụnyere ngọzi ndị ọ na-enye ndị na-ejegharị n’ụzọ ya. Ọ bụ ‘Onye na-ezi anyị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka anyị zọọ ije n’ụzọ anyị ga-ejeso. A sịkwa nnọọ na anyị aṅaa ntị n’ihe nile O nyere n’iwu, udo anyị ga-adị ka osimiri, ezi omume anyị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.’ (Aịsaịa 48:17, 18) Site n’ịnakwere ọkpụkpọ òkù isoro Chineke na-ejegharị nakwa site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-eme otú ahụ, anyị pụrụ inwe udo n’ebe ọ nọ ruo mgbe ebighị ebi.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ùgwù isoro ezi Chineke ahụ na-ejegharị?
◻ N’ihi gịnị ka ọmụmụ ihe, nraranye, na baptism ji bụrụ nzọụkwụ ndị mbụ n’isoro Jehova na-ejegharị?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo nzọụkwụ Jisọs?
◻ Olee otú anyị si mara na Jehova ga-akwagide anyị ka anyị so ya na-ejegharị?
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Ọmụmụ ihe, nraranye, na baptism bụ nzọụkwụ ndị mbụ n’isoro Chineke na-ejegharị