Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 12/15 p. 5-9
  • Ọmụmụ Jisọs—Akụkọ nke Bụ́ Ezie

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọmụmụ Jisọs—Akụkọ nke Bụ́ Ezie
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzube E Ji Dee Ha
  • Ọmụmụ Jisọs n’Ime Betlehem
  • Jehova Na-egosi Ndị Ji Obi Umeala Na-achọ Eziokwu Ihu Ọma
  • Nwa Nọ n’Ihe Ize Ndụ
  • Ọmụmụ Kraịst —Ihe Ọ Pụtara Nye Gị
  • Ihe Ndị A Na-amụta Site n’Ihe Ndekọ Banyere Ọmụmụ Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ndị Amamihe Atọ Hà Letara Nwa Ọhụrụ Bụ́ Jizọs n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Olee Ebe A Mụrụ Jizọs, Oleekwa Mgbe A Mụrụ Ya?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Ebee Ka O Si Bịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 12/15 p. 5-9

Ọmụmụ Jisọs—Akụkọ nke Bụ́ Ezie

CHEE banyere ihe omume a mazuru n’ebe nile n’akụkọ ihe mere eme nke mba gị. Ihe karịrị otu ọkọ akụkọ ihe mere eme dekọrọ ya nke ọma. Ugbu a, gịnị ma mmadụ gwa gị na ihe omume ahụ emetụghị eme ma ọlị, na ọ bụ nanị akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme? Ma ọ bụ, n’iweru okwu ahụ ụlọ, gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ azọrọ na ihe dị ukwuu n’ime ihe ezinụlọ gị gwaworo gị banyere ọmụmụ nna nna gị na oge ọ bụ nwata bụ ụgha? N’ọnọdụ abụọ ahụ, nanị echiche ahụ pụrụ ịkpasu gị iwe. N’ezie ị gaghị anakwere nzọrọ ndị dị otú ahụ n’ajụghị ase!

Ma, ndị nkatọ taa na-ewezụgakarị ihe ndekọ Oziọma banyere ọmụmụ Jisọs n’ụsọ, bụ́ nke Matiu na Luk dere. Ha na-ekwu na ihe ndekọ ndị a na-emegiderịta nnọọ onwe ha, na ha apụghịkwa ikwekọ nakwa na ha abụọ nwechara ụgha chara acha na akụkọ ndị a kọhiere akọhie. Nke ahụ ọ̀ pụrụ ịbụ eziokwu? Kama ịnakwere ebubo ndị dị otú ahụ, ka anyị nyochaa ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ n’onwe anyị. Ka anyị na-eme nke ahụ, ka anyị hụ ihe ha nwere ịkụziri anyị taa.

Nzube E Ji Dee Ha

Ná mmalite, ọ na-enye aka icheta nzube nke ihe ndekọ Bible ndị a. Ha abụghị akụkọ ndụ; ha bụ Oziọma. Ọdịiche ahụ dị mkpa. N’akụkọ ndụ, onye dere akwụkwọ pụrụ ideju ọtụtụ narị peji, na-agbalị igosi otú onye ọ na-ekwu banyere ya si ghọọ onye ahụ a maara nke ọma. N’ihi ya, ụfọdụ akụkọ ndụ na-eji ọtụtụ peji na-akọwazu nne na nna, ọmụmụ, na oge ndị ha na-akọ banyere ha bụ ụmụntakịrị. N’ebe Oziọma ndị ahụ dị, ọ dị iche. N’ime ihe ndekọ Oziọma anọ ndị ahụ, ọ bụ nanị nke Matiu na nke Luk kwuru banyere ọmụmụ na oge Jisọs bụ nwata. Otú ọ dị, nzube ha abụghị igosi otú Jisọs si topụta bụrụ onye ọ bụ. Cheta, ụmụazụ Jisọs ghọtara na ọ dịwo adị dị ka mmụọ e kere eke tupu ọ bịadị n’elu ala. (Jọn 8:23, 58) Ya mere Matiu na Luk ejighị oge Jisọs bụ nwata mee ihe iji kọwaa ụdị mmadụ ọ ghọrọ. Kama nke ahụ, ha kọrọ ihe omume ndị kwekọrọ ná nzube nke Oziọma ha.

Gịnịkwa bụ nzube mere ha ji dee ha? Ndị ikom abụọ ahụ nwere otu ozi—na Jisọs bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, ma ọ bụ Kraịst; na ọ nwụrụ n’ihi mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ; nakwa na a kpọlitere ya n’ọnwụ gaa n’eluigwe. Ma ndị edemede abụọ ahụ nwere nnọọ nzụlite ndị dị iche ma deekwa ihe maka ụdị ndị dị iche iche. Matiu, bụ́ onye ọna ụtụ, haziri ihe ndekọ ya maka ndị Juu karịsịa. Luk, bụ́ dibịa, degaara “Teọfilọs dị oké ebube”—bụ́ onye o nwere ike bụrụ na ọ nọtụ n’ọkwá dị elu—mgbe ahụzi, nye ndị ka ukwuu, bụ́ ndị Juu na ndị Jentaịl. (Luk 1:1-3) Onye edemede nke ọ bụla họọrọ ihe omume nke kasị mkpa na nke yikarịsịrị ka ọ ga-eme ka ndị o bu n’uche na-ede ya kpọmkwem kwenye. N’ihi ya, ihe ndekọ Matiu na-emesi amụma nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ike bụ́ ndị e mezuru n’isi Jisọs. Luk, n’aka nke ọzọ, na-agbaso ụzọ dị mfe e si akọ akụkọ ihe mere eme nke ndị na-ege ya ntị na-abụghị ndị Juu pụrụ ịghọtaworị.

N’ụzọ na-adịghị eju anya, ihe ndekọ ha dịgasị iche. Ma ha abụọ adịghị emegiderịta onwe ha, dị ka ndị nkatọ na-azọrọ. Ha na-emeju ibe ha, na-adabakọ nke ọma iji ghọọ ihe ndekọ ka zuo ezuo.

Ọmụmụ Jisọs n’Ime Betlehem

Ma Matiu ma Luk dekọrọ ọrụ ebube pụtara ìhè banyere ọmụmụ Jisọs—ọ bụ nwanyị na-amaghị nwoke mụrụ ya. Matiu na-egosi na ọrụ ebube a mezuru amụma e buru ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ site n’ọnụ Aịsaịa. (Aịsaịa 7:14; Matiu 1:22, 23) Luk na-akọwa na a mụrụ Jisọs na Betlehem n’ihi na ndebanye aha Siza guzobere manyere Josef na Meri ịga ebe ahụ. (Lee igbe dị na peji nke 7.) Na a mụrụ Jisọs na Betlehem bụ ihe dị ịrịba ama. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Maịka onye amụma ebuwo amụma na Mesaịa ga-esite n’obodo a yiri ka a maghị ya ama dị Jerusalem nso.—Maịka 5:2.

Abalị a mụrụ Jisọs aghọwo nke a ma ama dị ka ihe ndabere maka Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs. Otú ọ dị, akụkọ nke bụ́ eziokwu dị iche n’ebe nke ahụ a na-egosikarị dị. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Luk, bụ́ onye na-agwa anyị banyere ịgụ ọnụ ahụ nke kpọtara Josef na Meri n’ime Betlehem, na-agwakwa anyị banyere ọnụnọ ndị ọzụzụ atụrụ na ìgwè atụrụ ha nọrọ n’èzí n’abalị ahụ dị mkpa. Ọnọdụ abụọ a dị mkpa edugawo ọtụtụ ndị na-enyocha Bible ikwubi na a pụghị ịmụworị Jisọs na December. Ha na-ekwu na o yighị ka Siza ọ̀ ga-amanye ndị Juu ọ na-adịghị ara ahụ ha emewe ihe ike iji ụkwụ lawa obodo ha n’oge oyi na udummiri, bụ́ nke pụrụ ịkpasukwu ndị na-enupụ isi iwe. Dị ka ndị ọkà mmụta na-arịba ama, o yighịkwa ka ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha hà ga-anọwori n’èzí n’ihu igwe na-adịghị mma dị otú ahụ.—Luk 2:8-14.

Rịba ama na Jehova họọrọ ikwupụta ọmụmụ nke Ọkpara ya, ọ bụghị nye ndị gụrụ akwụkwọ ma ọ bụ ndị ndú okpukpe a ma ama nke oge ahụ, kama nye ndị ọrụ ike na-ebi n’èzí. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii yiri ka ha nwere mmekọrịta dị nta ha na ndị ọzụzụ atụrụ, bụ́ ndị atụmatụ ọrụ ha na-eme ka ha ghara idebezu ụfọdụ n’ime iwu ahụ e nyere n’ọnụ. Ma Chineke mesoro ndị ikom a dị umeala n’obi, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ụzọ nsọpụrụ dị ukwuu—ndị mmụọ ozi e zipụrụ gwara ha na a ka mụpụrụ nnọọ Mesaịa ahụ, bụ́ onye ndị Chineke nọworo na-eche ruo ọtụtụ puku afọ, n’ime Betlehem. Ọ bụ ndị ikom a, ọ bụghị “ndị eze atọ” a na-egosi mgbe mgbe n’Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs, bụ ndị letara Meri na Josef wee hụ nwa ọhụrụ a ka o dina n’ebe a na-etinye nri anụ ụlọ.—Luk 2:15-20.

Jehova Na-egosi Ndị Ji Obi Umeala Na-achọ Eziokwu Ihu Ọma

Chineke na-enwe ihu ọma n’ebe ndị nwere obi umeala nọ bụ́ ndị hụrụ ya n’anya ma nwee nnọọ mmasị n’ịhụ mmezu nke nzube ya. Nke a bụ isiokwu na-apụta ugboro ugboro n’ihe omume ndị gbara ọmụmụ Jisọs gburugburu. Mgbe, n’ihe dị ka otu ọnwa mgbe a mụsịrị nwa ahụ, Josef na Meri kutere ya n’ụlọ nsọ ná nrubeisi nye Iwu Mosis, ha ji “nduru abụọ, ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ,” chụọ àjà n’ebe ahụ. (Luk 2:22-24) N’ezie Iwu ahụ kwuru ka e weta otu atụrụ, ma o kwere ka a na-eme nhọrọ a na-adịghị oké ọnụ ma ọ bụrụ na onye ahụ dara ogbenye. (Levitikọs 12:1-8) Cheedị banyere ya. Jehova Chineke, bụ́ Ọkaaka nke eluigwe na ala, họọrọ, ọ bụghị ezinụlọ bara ọgaranya, kama nke dara ogbenye dị ka ebe a ga-azụlite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ọ hụrụ n’anya. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nke a kwesịrị ịbụ ihe ncheta doro anya na onyinye kasị mma ị pụrụ inye ụmụ gị—bụ́ nke dị nnọọ mma karịa akụ̀ na ụba nkịtị ma ọ bụ agụmakwụkwọ dị elu—bụ gburugburu ebe obibi na-etinye ihe ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ.

N’ụlọ nsọ ahụ, mmadụ abụọ ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, jirikwa obi umeala na-efe ofufe nwetara ihu ọma Jehova. Otu bụ Ana, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ nke gbara afọ 84 bụ́ onye “na-apụghị n’ụlọ Chineke.” (Luk 2:36, 37) Onye ọzọ bụ otu agadi nwoke kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ Simeon. Ha abụọ nwere aṅụrị n’ihe ùgwù Chineke nyere ha—tupu ha anwụọ, ịhụ onye ga-abụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Simeon buru amụma n’isi nwa ahụ. Ọ bụ amụma jupụtara n’olileanya ma nwetụ ihe iru újú. O buru amụma na nne a na-akatabeghị ahụ, bụ́ Meri, ga-eru oké újú n’otu ụbọchị banyere nwa ya ọ hụrụ n’anya.—Luk 2:25-35.

Nwa Nọ n’Ihe Ize Ndụ

Amụma Simeon bụ ihe ncheta dị mwute na nwatakịrị a na-adịghị ihe o mere ga-abụ onye a ga-akpọ asị. Ọbụna mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ, ịkpọasị a ebiriworị ọkụ. Ihe ndekọ Matiu kọzuru otú nke a si dị otú ahụ. Ọtụtụ ọnwa agafewo, Josef, Meri, na Jisọs bizi ugbu a n’otu ụlọ dị na Betlehem. Ọtụtụ ndị ala ọzọ ha na-atụghị anya ha bịara leta ha. N’agbanyeghị ihe Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ na-egosi, Matiu akapịghị ọnụ mmadụ ole ndị ikom a bịaranụ dị, ọ kpọghịkwa ha “ndị amamihe,” n’ihe odide Grik mbụ ya ma ya fọdụzie “ndị eze atọ.” Ọ na-eji okwu Grik bụ́ maʹgoi eme ihe, bụ́ nke pụtara “ndị na-agụ kpakpando.” Nanị nke a kwesịrị ịtụpenye onye na-agụ ya azụ̀ na ajọ ihe nọ n’ọrụ n’ebe a, n’ihi na ịgụ kpakpando bụ nkà nke Okwu Chineke na-akatọ, bụrụkwa nke ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ji nlezianya zere.—Deuterọnọmi 18:10-12; Aịsaịa 47:13, 14.

Ndị a na-agụ kpakpando agbasowo otu kpakpando site n’ebe ọwụwa anyanwụ, ha jikwa onyinye ndị ha ga-enye “Onye a mụrụ ịbụ Eze ndị Juu.” (Matiu 2:2) Ma kpakpando ahụ edugaghị ha na Betlehem. O duuru ha gaa Jerusalem ma gakwuru Herọd Onye Ukwu. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla n’ụwa nke nwere ụdị ihe onwunwe na ike ahụ iji merụọ Jisọs ahụ na-eto eto ahụ. Nwoke ahụ nwere oké ọchịchọ, nke na-egbukwa mmadụ egbuwo ọtụtụ ndị ezinụlọ nke aka ya bụ́ ndị o lere anya dị ka ihe iyi egwu.a N’ịbụ onye nwere nchegbu n’ọnụnụ ọ nụrụ banyere ọmụmụ nke onye ga-abụ “Eze ndị Juu” n’ọdịnihu, o zigara ndị ahụ na-agụ kpakpando ịchọpụta Onye ahụ n’ime Betlehem. Ka ha na-aga, otu ihe dị ịtụnanya mere. “Kpakpando” ahụ nke dugara ha na Jerusalem yiri ka ọ malitere ịga aga!—Matiu 2:1-9.

Ugbu a, ma nke a ọ̀ bụ ìhè dị n’igwe n’ezie ma ọ bụ nanị ọhụụ, anyị amaghị. Ma anyị maara na “kpakpando” a esiteghị n’aka Chineke. N’ịbụ ihe ọjọọ a haziri ahazi, o duuru ndị a na-ekpere arụsị gakwuru Jisọs kpọmkwem—nwa dị mfe imerụ ahụ, na-apụghịkwa ichebe onwe ya, bụ́ onye nanị ọkwa nkà dara ogbenye na nwunye ya na-echebe. Ndị ahụ na-agụ kpakpando, bụ́ ndị na-amaghị na Herọd aghọgbuwo ha, yiri ka ha gaara alaghachi ịkọrọ eze ahụ na-achọ ịbọ ọ́bọ̀, na-eduga ná mbibi nke nwatakịrị ahụ. Ma Chineke tinyere aka site ná nrọ ma zilaga ha n’ebe obibi ha site n’ụzọ ọzọ. Mgbe ahụ “kpakpando” ahụ, aghaghị ịbụwo aka ọrụ nke onye iro Chineke bụ́ Setan, bụ́ onye ga-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji merụọ Mesaịa ahụ ahụ. Lee ihe na-emegide ibe ya ọ bụ na a na-egosi “kpakpando” ahụ na ndị ahụ na-agụ kpakpando n’Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs dị ka ndị ozi nke Chineke!—Matiu 2:9-12.

Ma, Setan ezughị ike. Onye o ji arụ ọrụ n’okwu ahụ, bụ́ Eze Herọd, nyere iwu ka e gbuo ụmụ ọhụrụ nile na-erubeghị afọ abụọ nọ na Betlehem. Ma Setan apụghị imeri n’ọgụ ya na Jehova na-alụ. Matiu rịbara ama na eri oge Chineke ebuworị ụzọ hụ ọbụna ogbugbu obi ịta mmiri a e gburu ụmụaka na-adịghị ihe ha mere. Jehova mere ka atụmatụ Setan kụọ afọ n’ala ọzọ, na-adọ Josef aka ná ntị site n’aka otu mmụọ ozi ịgbaga n’Ijipt maka nchebe. Matiu na-akọ na ka oge ụfọdụ gasịrị, Josef na obere ezinụlọ ya kwapụrụ ọzọ, n’ikpeazụ kwa ha birizie na Nazaret, bụ́ ebe Jisọs na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị ọ tọrọ nọ tolite.—Matiu 2:13-23; 13:55, 56.

Ọmụmụ Kraịst —Ihe Ọ Pụtara Nye Gị

Ị̀ na-ahụ onwe gị ịbụ onye nchịkọta a dị mkpirikpi nke ihe omume ndị gbara ọmụmụ na oge Jisọs bụ nwata gburugburu na-eju anya n’ụzọ ụfọdụ? Ọ na-eju ọtụtụ anya. Ọ na-eju ha anya ịhụ na ihe ndekọ ndị ahụ nwere nkwekọ ma zie nnọọ ezi, n’agbanyeghị ihe ndị dị iche ụfọdụ ndị na-ekwu n’ezoghị ọnụ. Ọ na-eju ha anya ịmara na e buru amụma banyere ihe omume ụfọdụ ọtụtụ narị afọ tupu ha emee. Ọ na-ejukwa ha anya na ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’Oziọma ndị ahụ dị iche n’ụzọ dị ịrịba ama n’ebe ihe ndị a na-egosikarị n’akụkọ Ọmụmụ Jisọs na ngosipụta nke ọmụmụ ndị ahụ dị.

Otú ọ dị, ma eleghị anya nke kasị eju anya bụ na ihe dị ukwuu n’ememe Krismas a na-emekarị na-ahapụ ihe ndị dị mkpa nke akụkọ Oziọma ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, a na-eche echiche dị nta banyere Nna Jisọs—ọ bụghị Josef, kama Jehova Chineke. Cheedị banyere mmetụta o nwere mgbe ọ na-enyefe Ọkpara ọ hụrụ n’anya n’aka Josef na Meri ka ha zụlite ya ma gboo mkpa ya. Cheedị oké ihe mgbu Nna nke eluigwe ahụ na-aghaghị inwe n’ikwe ka Ọkpara ya tolite n’ụwa nke otu eze jupụtara n’ịkpọasị ga-eme atụmatụ maka ogbugbu ya ọbụna mgbe ọ bụ nanị nwata! Ọ bụ ịhụnanya miri emi n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ kwaliri Jehova ịchụ àjà a.—Jọn 3:16.

Ememe Krismas na-agụpụkarị ezigbo Jisọs ahụ. Leenụ, e nweghị ihe ndekọ ọ bụla na ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ụbọchị ọmụmụ ya; ọ dịghịkwa ihe ngosi ọ bụla na ụmụazụ ya mere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ ya.

Ọ bụghị ọmụmụ Jisọs kama ọ bụ ọnwụ ya—na ihe ọ pụtara bụ́ nke na-eme ihe akụkọ—ka o nyere ụmụazụ ya iwu icheta. (Luk 22:19, 20) Ee e, ọ bụghị dị ka nwa ọhụrụ na-apụghị ichebe onwe ya nọ n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ ka Jisọs chọrọ ka e jiri cheta ya, n’ihi na ọ bụtụghị ihe dị otú ahụ ugbu a. Ihe karịrị afọ 60 mgbe e gbusịrị ya, Jisọs kpugheere Jọn onyeozi onwe ya n’ọhụụ dị ka Eze dị ike ji ịnyịnya na-aga agha. (Mkpughe 19:11-16) Ọ bụ n’ọrụ ahụ, dị ka Onye Ọchịchị nke Alaeze eluigwe Chineke, ka ọ dị anyị mkpa ịmara Jisọs taa, n’ihi na ọ bụ Eze nke ga-agbanwe ụwa.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ezie, Siza Ọgọstọs kwuru na ọ dị nchebe karị ịbụ ezì Herọd karịa ịbụ nwa Herọd.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Luk Ò Dehiere Ihe?

OLEE otú Jisọs, bụ́ onye tolitere na Nazaret, bụrụkwa onye a maara nke ọma dị ka onye Nazaret, ga-esi bụrụ onye a mụrụ na Betlehem, ihe dị ka kilomita 150 site na Nazaret? Luk na-akọwa, sị: “Ma o ruo na mgbe ahụ [tupu ọmụmụ Jisọs], iwu si n’ebe Siza Ọgọstọs nọ pụta na a ga-ede aha mmadụ nile bi n’elu ụwa dum mmadụ bi n’akwụkwọ. Nke a bụ odide aha mbụ e dere mgbe Kwiriniọs bụ onye na-achị Siria. Mmadụ nile wee gaa ka e dee aha ha n’akwụkwọ, onye ọ bụla ọ gaa obodo nke aka ya.”​—⁠Luk 1:1; 2:​1-⁠3.

Ndị nkatọ na-ekwukarị na akụkụ okwu a bụ nkwugheri ma ọ bụ, nke ka njọ, ụgha. Ha na-ekwusi ike na ịgụ ọnụ a na ịchị achị nke Kwiriniọs weere ọnọdụ n’afọ 6 ma ọ bụ 7 O.A. Ọ bụrụ na ha ziri ezi, nke a ga-eme ka e nwewe obi abụọ siri ike banyere ihe ndekọ Luk, n’ihi na ihe àmà na-egosi na a mụrụ Jisọs n’afọ 2 T.O.A. Ma ndị nkatọ a na-eleghara eziokwu abụọ bụ́ isi anya. Nke mbụ, Luk na-anabata na e nwere ihe karịrị otu ịgụ ọnụ​—⁠rịba ama na o zoro aka ‘n’odide aha mbụ.’ Ọ maara nke ọma banyere odide aha ọzọ, bụ́ nke e mere mgbe e mesịrị. (Ọrụ 5:37) Ịgụ ọnụ nke ọzọ a bụkwa ya ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kọwara, nke e mere n’afọ 6 O.A. Nke abụọ, ịchị achị nke Kwiriniọs adịghị amanye anyị ịsị na a mụrụ Jisọs n’ụbọchị ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe àmà na-egosi na Kwiriniọs chịrị ugboro abụọ. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta maara na oge ọchịchị ya nke mbụ dabara n’ihe dị ka 2 T.O.A.

Ụfọdụ ndị nkatọ na-ekwu na Luk chepụtara ịgụ ọnụ ahụ echepụta iji wepụta ihe mere a ga-eji amụ Jisọs na Betlehem, wee si otú ahụ na-emezu amụma Maịka 5:⁠2. Nchepụta echiche a na-eme ka Luk bụrụ onye kpachaara anya agha ụgha, ọ dịghịkwa onye nkatọ ọ bụla pụrụ ijikọta ebubo dị otú ahụ na ọkọ akụkọ ihe mere eme ahụ na-elezi anya bụ́ onye dere Oziọma ahụ na akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi.

Ihe ọzọ ọ na-adịghị onye nkatọ pụrụ ịkọwa: Ịgụ ọnụ ahụ mezuru otu amụma! Na narị afọ nke isii T.O.A., Daniel buru amụma banyere onye ọchịchị bụ́ onye ga “na-eme ka onye nke na-achị n’ihe ike gabiga n’ịma mma alaeze ahụ.” Nke a ọ̀ na-emetụta Ọgọstọs na iwu o nyere ka a gụọ ndị mmadụ ọnụ n’Israel? Amụma ahụ gara n’ihu ikwu na “a ga-etipịa” Mesaịa ahụ, ma ọ bụ “onye ndú nke ọgbụgba ndụ” n’oge ọchịchị nke onye nọchiri ọnọdụ onye ọchịchị a. ‘E tipịara’ Jisọs n’ezie, gbuo ya, n’oge ọchịchị nke onye nọchiri ọnọdụ Ọgọstọs, bụ́ Taịbiriọs.​—⁠Daniel 11:​20-⁠22.

[Foto]

Siza Ọgọstọs (27 T.O.A.–14 O.A.)

Taịbiriọs Siza (14-37 O.A.)

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Musée de Normandie, Caen, France

Foto e sere site n’ikike British Museum

[Foto dị na peeji nke 8]

Mmụọ ozi Jehova họọrọ ịgwa ndị ọzụzụ atụrụ dị obi umeala ozi ọma banyere ọmụmụ Kraịst

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya