Ì Nwere Okwukwe Dị Ka Nke Abraham?
“Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?”—LUK 18:8.
1. N’ihi gịnị ka o ji esi ike mmadụ ịnọgide na-eme ka okwukwe ya sie ike taa?
Ọ DỊGHỊ mfe mmadụ ịnọgide na-eme ka okwukwe ya sie ike taa. Ụwa na-arụgide ndị Kraịst nke ukwuu iji dọpụ uche ha n’ihe ime mmụọ. (Luk 21:34; 1 Jọn 2:15, 16) Ọtụtụ aghaghị ịgba mgba iji nọgide na-adị ndụ n’agbanyeghị agha, ọdachi, ọrịa, ma ọ bụ agụụ. (Luk 21:10, 11) N’ọtụtụ mba, e nwere omume siri ike nke ejighị okpukpe akpọrọ ihe, a na-elekwa ndị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwukwe ha anya dị ka ndị na-enweghị uche, ọbụna dị ka ndị na-anụbiga ọkụ n’obi ókè. Ọzọkwa, a na-akpagbu ọtụtụ ndị Kraịst n’ihi okwukwe ha. (Matiu 24:9) Ajụjụ Jisọs, nke ọ jụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, kwesịrị ekwesị n’ezie: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?”—Luk 18:8.
2. (a) N’ihi gịnị ka okwukwe siri ike ji dị onye Kraịst mkpa? (b) Ihe nlereanya onye banyere okwukwe ka ọ ga-adị mma ka anyị tụlee?
2 Otú ọ dị, eziokwu dị na ya bụ na ọ dị mkpa inwe okwukwe siri ike ma ọ bụrụ na anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ugbu a ma nweta ndụ ebighị ebi ahụ e kwere nkwa ya n’ọdịnihu. N’ihota okwu Jehova gwara Habakuk, Pọl onyeozi dere, sị: “Onye eziomume nke m ga-esite n’okwukwe dị ndụ: Ọ bụrụkwa na ọ ga-ewezụga onwe ya, ihe ya adịghị mkpụrụ obi m ezi mma. . . . A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Ndị Hibru 10:38–11:6; Habakuk 2:4) Pọl gwara Timoti, sị: “Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike, jide ndụ ebighi ebi aka, nke a kpọrọ gị ka ị nata ya.” (1 Timoti 6:12) Mgbe ahụ, olee otú ọ pụrụ isi kwe omume inwe okwukwe a na-apụghị imebi emebi? N’ịtụle ajụjụ ahụ, ọ ga-adị mma ka anyị lega anya na nwoke nke biri ndụ n’ihe dị ka afọ 4,000 gara aga, ma bụrụ onye a ka na-akwanyere okwukwe ya ùgwù nke ukwuu n’okpukpe atọ ndị bụ́ isi—Alakụba, okpukpe ndị Juu, na Iso Ụzọ Kraịst. Nwoke ahụ bụ Abraham. Gịnị mere okwukwe ya jiri dị ịrịba ama nke ukwuu? Ànyị pụrụ iṅomi ya taa?
Irubere Nduzi Chineke Isi
3, 4. N’ihi gịnị ka Tira ji chịrị ezinụlọ ya site na Ua jee Heran?
3 A na-akpọtụ aha Abraham (onye a kpọrọ Abram na mbụ) nke mbụ ya ná mmalite Bible. Na Jenesis 11:26, anyị na-agụ: “Tira . . . , mụọ Abram, na Nehoa, na Heran.” Tira na ezinụlọ ya biri na Ua nke ndị Kaldea, obodo bara ọgaranya dị n’ebe ndịda Mesọpotemia. Otú ọ dị, ha anọgideghị n’ebe ahụ. “Tira wee chịrị Abram, bụ́ nwa ya nwoke, na Lot, bụ́ nwa nwoke nke Heran, ya bụ nwa nwa ya, na Seraị [Sera], bụ́ nwunye nwa ya, bụ́ nwunye Abram nwa ya nwoke; ha na ha wee si na Ua nke ndị Kaldea pụọ, ije ala Kenean; ha bịaruo Heran, biri n’ebe ahụ.” (Jenesis 11:31) Nwanne Abraham nke nwoke bụ́ Nehoa chịrịkwaara ezinụlọ ya jee Heran. (Jenesis 24:10, 15; 28:1, 2; 29:4) Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka Tira ji chịrị ezinụlọ ya pụọ na Ua bara ọgaranya wee jee Heran dị anya?
4 Ihe dị ka afọ 2,000 mgbe oge Abraham gasịrị, nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Stifen, kọwara nkwapụ a pụrụ iche nke ezinụlọ Tira kwapụrụ mgbe ọ na-ekwu okwu n’ihu Sanhedrin ndị Juu. Ọ sịrị: “Chineke nke ebube mere ka nna anyị Abraham hụ Ya anya, mgbe ọ nọ na Mesọpotemia, mgbe ọ ka-ebighị na Heran, O wee sị ya, Si n’ala gị na n’etiti ikwu gị pụọ, bịa n’ala ahụ nke M ga-egosi gị. Mgbe ahụ o siri n’ala ndị Kaldea pụta, wee biri na Heran.” (Ọrụ 7:2-4) Tira mere ihe kwekọrọ n’uche Jehova maka Abraham mgbe ọ chịịrị ezinụlọ nke aka ya jee Heran.
5. Olee ebe Abraham gara mgbe nna ya nwụsịrị? N’ihi gịnị?
5 Ezinụlọ Tira mere obodo ha kwabatara ọhụrụ ebe obibi ha. Mgbe Abraham kwuru banyere “ala m,” ka ọtụtụ afọ gasịrị, ọ bụ ógbè Heran ka o bu n’obi, ọ bụghị Ua. (Jenesis 24:4) Ka ọ sina dị, Heran agajeghị ịbụ ebe obibi na-adịgide adịgide nke Abraham. Dị ka Stifen si kwuo, “Mgbe nna [Abraham] nwụrụ, Chineke wee mee ka o site n’ebe ahụ bịa biri n’ala nke a, nke unu onwe unu bi n’ime ya ugbu a.” (Ọrụ 7:4) N’irube isi ná nduzi Jehova, Abraham, bụ́ onye Lọt sonyeere, gafere Yufretis banye n’ala Kenean.a
6. Nkwa dị aṅaa ka Jehova kwere Abraham?
6 N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka Abraham kwaga Kenean? Ihe kpatara ya metụtara nzube Chineke maka nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Jehova agwawo Abraham, sị: “Si n’ala gị, sikwa n’ụmụnna gị, sikwa n’ụlọ nna gị, jee nke gị ruo ala ahụ nke M ga-eme ka ị hụ ya anya: M ga-emekwa gị ka ị ghọọ mba ukwu; M ga-agọzikwa gị, mee ka aha gị dị ukwuu; gị bụrụkwa ngọzi: M ga-agọzikwa ndị na-agọzi gị, ọ bụkwa onye na-akọcha gị ka M ga-abụ ọnụ: a ga-agọzikwa agbụrụ nile nke ụwa n’ime gị.” (Jenesis 12:1-3) Abraham ga-abụ nna nke mba ukwu nke Jehova ga-echebe, nke ga-enwetakwa ala Kenean. Lee nkwa magburu onwe ya ọ bụ! Ma Abraham aghaghị ime oké mgbanwe ná ndụ ya iji keta ala ahụ.
7. Mgbanwe ndị dị aṅaa ka Abraham na-aghaghị ịdị njikere ime iji keta nkwa Jehova?
7 Mgbe Abraham hapụrụ Ua, ọ hapụrụ obodo bara ọgaranya nakwa ikekwe ndị ikwu nna ya—bụ́ ebe ndị e si enweta nchebe ndị dị mkpa n’oge ndị nna ochie ahụ. Mgbe ọ hapụrụ Heran, o kewapụrụ onwe ya iche n’ebe ezinụlọ nke nna ya nọ, gụnyere ezinụlọ nke nwanne ya nwoke bụ́ Nehoa, wee kwaga n’ala ọ na-amaghị. Na Kenean ọ chọrọghị nchebe gaa biri n’ime otu obodo ukwu. N’ihi gịnị? Ntakịrị oge Abraham banyesịrị n’ala ahụ, Jehova gwara ya, sị: “Jegharịa n’ala nke a n’ogologo ya na n’obosara ya; n’ihi na gị ka M ga-enye ya.” (Jenesis 13:17) Abraham gbaworo afọ 75 na nwunye ya gbara afọ 65, bụ́ Sera, gbasoro ntụziaka ndị a. “Okwukwe ka o ji biri dị ka ọbịa n’ala nke e kwere ya rịị ná nkwa, dị ka ala na-abụghị nke aka ya, ebe o biri n’ụlọikwuu.”—Ndị Hibru 11:9; Jenesis 12:4.
Okwukwe Dị Ka nke Abraham Taa
8. N’ihi ihe nlereanya Abraham na nke ndị àmà oge ochie ndị ọzọ, gịnị ka anyị kwesịrị ịzụlite?
8 A kpọkọtara Abraham na ezinụlọ ya ‘n’oké igwe ndị àmà [biri ndụ tupu oge ndị Kraịst]’ bụ́ ndị a kpọrọ aha ná Ndị Hibru isi nke 11. N’ihi okwukwe nke ndị ohu Chineke mbụ a, Pọl na-agba ndị Kraịst ume ‘ịtụpụ ibu nile ọ bụla, ya na mmehie [enweghị okwukwe] ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu.’ (Ndị Hibru 12:1) Ee, enweghị okwukwe pụrụ ‘ịrapara anyị n’ahụ nke ukwuu.’ Ma, n’oge Pọl na nke anyị, ezi ndị Kraịst enwewo ike ịzụlite okwukwe siri ike a pụrụ iji tụnyere nke Abraham na ndị ọzọ dịrị ndụ n’oge ochie. N’ikwu banyere onwe ya na ndị Kraist ibe ya, Pọl na-ekwu, sị: “Anyị onwe anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi; kama anyị dị n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.”—Ndị Hibru 10:39.
9, 10. Olee ihe àmà e nwere na ọtụtụ ndị taa nwere okwukwe dị ka nke Abraham?
9 N’eziokwu, ụwa agbanweela site n’ihe ọ bụ n’oge Abraham. Ka o sina dị, anyị ka na-ejere otu “Chineke nke Abraham” ahụ ozi, ọ dịghịkwa agbanwe agbanwe. (Ọrụ 3:13; Malakaị 3:6) Jehova kwesịrị ka e fee ya ofufe taa dị nnọọ ka o kwesịrị n’oge Abraham. (Mkpughe 4:11) Ọtụtụ na-arara onwe ha dum nye Jehova nakwa, dị ka Abraham, mee mgbanwe ọ bụla dị mkpa ná ndụ ha iji mee uche Chineke. N’afọ gara aga, mmadụ 316,092 nyere ihe àmà ihu ọha nke nraranye ha site n’ikwe ka e mee ha baptism n’ime mmiri “n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.”—Matiu 28:19.
10 Ọ dịghị ihe ka ukwuu ná ndị Kraịst ọhụrụ a mkpa ime njem gaa ná mba ọzọ ndị dị anya iji mezuo nraranye ha. Otú ọ dị, n’ụzọ ime mmụọ ọtụtụ n’ime ha mere njem dị nnọọ anya. Dị ka ihe atụ, na Mauritius, Elsie bụbu nwanyị mgbaasị. Onye ọ bụla tụrụ ya egwu. Otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche mere ndokwa iduziri nwa Elsie nke nwanyị ọmụmụ Bible, nke a meghekwaara Elsie ụzọ ‘isi n’ọchịchịrị chigharịa baa n’ìhè.’ (Ọrụ 26:18) N’ihi mmasị nwa ya nwanyị nwere, Elsie nakweere ịmụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. E duziiri ya ihe ugboro atọ n’izu n’ihi na ọ chọrọ agbamume mgbe nile. Ihe omume anwansi ya ewetaraghị ya obi ụtọ, o nwekwara ọtụtụ nsogbu onwe onye. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, o nwere ike jezuo ogologo njem ahụ site n’ife ndị mmụọ ọjọọ gaa n’ezi ofufe. Mgbe ndị mmadụ bịara ka ọ rụọrọ ha ọrụ, ọ ga-akọwara ha na ọ bụ nanị Jehova pụrụ ichebe ha pụọ n’ajọ ihe. Elsie bụ Onyeàmà e mere baptism ugbu a, mmadụ 14 sitere n’ezinụlọ ya na ndị enyi ya anakwerewokwa eziokwu.
11. Mgbanwe ndị dị aṅaa ka ndị raara onwe ha nye Jehova dị njikere ime?
11 Ọ dịghị ihe ka ukwuu ná ndị raara onwe ha nye ijere Chineke ozi n’afọ gara aga mkpa ime oké mgbanwe dị otú ahụ. Ma a gbanwere ha nile site n’ịbụ ndị nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ gaa n’ịbụ ndị dị ndụ n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Efesọs 2:1) Ọ bụ ezie na ha ka nọ n’ụwa n’anụ ahụ, ha abụghịzi akụkụ ya. (Jọn 17:15, 16) Dị ka ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ‘ala ha dị n’eluigwe,’ ha dị ka “ndị ọbịa na ndị nọ dị ka ọbịa.” (Ndị Filipaị 3:20; 1 Pita 2:11) Ha mere ka ndụ ha kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke, nke ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi ha nọ kwaliri karịsịa. (Matiu 22:37-39) Ha adịghị achụso ihe mgbaru ọsọ ihe onwunwe nke ga-abara nanị onwe ha uru ma ọ bụ chee na ọ dị ha mkpa imezu ọchịchọ onwe ha n’ụwa a. Kama nke ahụ, ha na-elekwasị anya ha ‘n’eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa, nke ezi omume bi n’ime ha.’—2 Pita 3:13; 2 Ndị Kọrint 4:18.
12. Ọrụ dị aṅaa a kọrọ akụkọ ya n’afọ gara aga na-enye ihe àmà na Jisọs ahụwo “okwukwe n’elu ụwa” n’ọnụnọ ya?
12 Mgbe Abraham kwagara Kenean, nanị ya na ezinụlọ ya nọ n’ebe ahụ ma nwee nanị Jehova ịkwado na ichebe ha. Otú ọ dị, ndị Kraịst 316,092 a e mere baptism ọhụrụ anọghị nanị ha ma ọlị. N’eziokwu, Jehova ji mmụọ ya na-akwado ma na-echebe ha, dị ka o meere Abraham. (Ilu 18:10) Otú ọ dị, tụkwasị na nke a, Jehova na-esite n’aka “mba” zuru ụwa nile, nwere ume, nke bara ụba karịa mba ụfọdụ nke ụwa taa, na-akwado ha. (Aịsaịa 66:8) N’afọ gara aga, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ụmụ amaala mba ahụ nke dị 5,888,650 nyere ihe àmà nke okwukwe ha siri ike site n’ịgwa ndị agbata obi ha okwu banyere nkwa Chineke. (Mak 13:10) Ha tinyere awa dị nnọọ ukwuu bụ́ 1,186,666,708 n’ọrụ a, na-achọ ndị nwere mmasị. N’ihi ya, e duziiri mmadụ 4,302,852 ọzọ chọrọ ịzụlite okwukwe ọmụmụ Bible. Dị ka ihe na-egosipụtakwu ịnụ ọkụ n’obi ha, mmadụ 698,781 ná “mba” a keere òkè n’ọrụ ọsụ ụzọ, nke oge nile ma ọ bụ n’otu ọnwa ma ọ bụ karịa. (Ihe ndekọ zuru ezu banyere ọrụ Ndịàmà Jehova n’afọ gara aga dị na peji nke 12 ruo 15.) Ihe ndekọ a dị ịrịba àmà bụ ezi azịza pụtara ìhè nye ajụjụ Jisọs bụ́, “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa”?
Ikwesị Ntụkwasị Obi n’Agbanyeghị Ule
13, 14. Kọwaa ụfọdụ n’ime nsogbu ndị Abraham na ezinụlọ ya zutere na Kenean.
13 Ihe siiri Abraham na ezinụlọ ya ike ọtụtụ mgbe na Kenean. Ọ dịkarịa ala n’otu oge, e nwere oké ụnwụ nri nke mere ka o si na Kenean pụọ jee Ijipt. Ọzọkwa, ma onye ọchịchị Ijipt ma onye ọchịchị Gera (na nso nso Gaza) nwara ịkpọrọ nwunye Abraham, bụ́ Sera, ka ọ bụrụ nke ha. (Jenesis 12:10-20; 20:1-18) E nwekwara esemokwu n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Abraham na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt, nke a kpatakwara ezinụlọ abụọ ahụ ikewa. N’achọghị ọdịmma onwe ya nanị, Abraham nyere Lọt ohere ibu ụzọ họrọ ala, Lọt họrọkwaara ibi Gburugburu Ala Jọdan, nke dị ka Iden n’ime nri nke ọma na ịma mma ya.—Jenesis 13:5-13.
14 Mgbe e mesịrị, agha nke dara n’etiti eze Ilam dị anya na ndị òtù ya na ndị eze obodo ise dị na Ndagwurugwu Sidim metụtara Lọt. Ndị eze ahụ si ala ọzọ meriri ndị eze obodo ahụ ma kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata, gụnyere Lọt na ihe onwunwe ya. Mgbe Abraham nụrụ ihe meworonụ, ọ chụsoro ndị eze ahụ si ala ọzọ n’atụghị egwu ma nwee ike kpọtaghachi Lọt na ezinụlọ ya, nakwa ihe onwunwe nke ndị eze obodo ahụ. (Jenesis 14:1-16) Otú ọ dị, nke ahụ abụghị ahụmahụ kasị njọ Lọt nwere na Kenean. N’ihi ihe ụfọdụ, ọ gara biri na Sọdọm, n’agbanyeghị omume rụrụ arụ nke e ji mara obodo ahụ.b (2 Pita 2:6-8) Mgbe ndị mmụọ ozi abụọ dọrọ ya aka ná ntị na a ga-ebibi obodo ahụ, Lọt kpọọrọ nwunye ya na ụmụ ya ndị nwanyị abụọ gbapụ. Otú ọ dị, nwunye Lọt leghaara ntụziaka a kapịrị ọnụ nke ndị mmụọ ozi ahụ anya, n’ihi ya kwa ọ ghọrọ onye e liri n’ime nnu. Lọt dara nnọọ ruo n’ókè nke ya na ụmụ ya ndị nwanyị abụọ ibi n’ọgba na Zoa ruo nwa oge. (Jenesis 19:1-30) Ihe ndị a merenụ aghaghị igbuworị Abraham mgbu n’obi nke ukwuu, karịsịa ebe ọ bụ na Lọt abịawo Kenean dị ka onye so n’ezinụlọ Abraham.
15. N’agbanyeghị nsogbu ndị Abraham chere ihu mgbe o bi n’ụlọikwuu n’ala ọzọ, echiche ndị dị aṅaa na-ezighị ezi ka ihe àmà na-egosi na o zeere?
15 Ọ̀ dị mgbe Abraham chere na ya na Lọt gaara esoro ndị ikwu nna ya nọrọ ná nchebe nke Ua ma ọ bụ soro nwanne ya nwoke bụ́ Nehoa nọrọ na Heran? Ọ̀ dị mgbe ọ dị ya ka ọ gaara ebiri n’obodo mgbidi gbara gburugburu kama ibi n’ụlọikwuu? Ò nwere obi abụọ, ikekwe, banyere amamihe dị n’àjà ọ chụrụ site n’ịbụ onye na-awagharị n’ala ọzọ? N’ikwu banyere Abraham na ezinụlọ ya, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na ọ bụ ezie na ha na-echeta ala ahụ nke ha si n’ime ya pụta, ha ga-enweworị ohere ịlaghachi.” (Ndị Hibru 11:15) Ma, ha alaghachighị. N’ịbụ ndị ihe isi ike ndị ahụ na-akụdaghị obi, ha nọgidere ebe Jehova chọrọ ka ha nọrọ.
Ntachi Obi Taa
16, 17. (a) Nsogbu ndị dị aṅaa ka ndị Kraist na-eche ihu taa? (b) Olee àgwà ziri ezi ndị Kraịst nwere? N’ihi gịnị?
16 A na-ahụ ntachi obi dị otú ahụ n’ebe ndị Kraịst nọ taa. Ọ bụ ezie na ijere Chineke ozi na-enye ha oké ọṅụ, ndụ adịghịrị ndị Kraịst mfe na mgbe ikpeazụ ndị a. Ọ bụ ezie na ha bi na paradaịs ime mmụọ, ha na-enwe ihe nrụgide nke ọnọdụ akụ̀ na ụba dị ka ndị agbata obi ha na-enwe. (Aịsaịa 11:6-9) Ọtụtụ abụrụwo ndị aka ha dị ọcha e gburu n’agha nke mba dị iche iche, ọtụtụ ndị abụrụwo ogbenye ọnụ ntụ n’ihi ihe na-esighị ha n’aka. Ọzọkwa, ha na-atachi obi ná nsogbu nke ịbụ ndị nọpụrụ iche a kpọro asị. Ha na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ọtụtụ ala n’agbanyeghị enweghị mmasị dị ukwuu. Ha na-enweta mwakpo aghụghọ nke ndị ‘na-eji ụkpụrụ akpụzi mmegbu,’ ‘na-amakwa ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ ikpe.’ (Abụ Ọma 94:20, 21) Ọbụna n’ala ebe ndị a na-adịghị awakpo ndị Kraịst nakwa ebe ụfọdụ na-aja ha mma n’ihi ụkpụrụ ha ndị dị elu, ha na-amụ anya banyere ịdị iche n’ebe ụmụ akwụkwọ na ndị ọrụ ibe ha nọ—na-adị ka Abraham, onye biri n’ụlọikwuu ebe ihe ka ná ndị mmadụ gbara ya gburugburu bi n’obodo ukwu dị iche iche. Ee, ọ dịghị mfe ibi n’ụwa ma ‘ghara ịbụ akụkụ’ ya.—Jọn 17:14.
17 Mgbe ahụ, ànyị na-akwa ụta n’ihi nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke? Ọ̀ na-adị anyị ka ya bụrụ na anyị abụgideworị akụkụ nke ụwa, na-adị ka onye ọ bụla ọzọ? Ànyị na-akwa ụta maka àjà ndị anyị chụworo n’ozi Jehova? Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị! Kama ileghachi anya azụ ná mmasị, anyị na-aghọta na ihe ọ bụla anyị pụrụ ịchụworị n’àjà erughị ihe ọ bụla ma e jiri ya tụnyere ngozi ndị anyị na-enweta ugbu a na ndị anyị gaje inweta n’ọdịnihu. (Luk 9:62; Ndị Filipaị 3:8) E wezụga nke a, ndị nọ n’ụwa hà nwere obi ụtọ? Eziokwu dị na ya bụ na ọtụtụ n’ime ha na-achọ inweta azịza ndị anyị nwetawororịị. Ha na-ahụju anya n’ihi agbasoghị nduzi ndị e nwetara n’aka Chineke site na Bible bụ́ ndị anyị na-agbaso. (Abụ Ọma 119:105) Ọ na-agụsikwa ọtụtụ n’ime ha agụụ ike inwe ụdị mkpakọrịta ndị Kraịst na-eme obi ụtọ nke anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na-enwe.—Abụ Ọma 133:1; Ndị Kọlọsi 3:14.
18. Mgbe ndị Kraịst gosiri obi ike dị ka nke Abraham, gịnị ga-emesịa si na ya pụta?
18 N’eziokwu, mgbe ụfọdụ anyị aghaghị inwe obi ike dị ka Abraham nwere mgbe ọ chụsoro ndị dọọrọ Lọt n’agha. Ma mgbe anyị nwere, Jehova na-agọzi ihe si na ya apụta. Dị ka ihe atụ, ịkpọasị agbanyewo mkpọrọgwụ siri ike na Northern Ireland n’ihi ime ihe ike nke ịrọ òtù, ọ na-ewekwa obi ike iji nọpụ iche. Ma ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi agbasowo okwu Jehova gwara Joshua bụ́: “Dị ike, nweekwa ume; amala jijiji, atụkwala ụjọ: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke gị, nọnyeere gị n’ebe ọ bụla ị na-eje.” (Joshua 1:9; Abụ Ọma 27:14) Eri ọtụtụ afọ, nguzo atụghị egwu ha emewo ka a na-akwanyere ha ùgwù, taa kwa ha pụrụ ime nkwusa ha n’ógbè nile nke ala ahụ n’enweghị ihe mgbochi.
19. Olee ebe ndị Kraịst nwere obi ụtọ ịnọ, oleekwa ihe ha ji obi ike na-atụ anya ya mgbe ha na-agbaso nduzi Jehova?
19 Ọ dịghị anyị mkpa ma ọlị inwe obi abụọ na n’agbanyeghị ọnọdụ anyị na-eche ihu, ọ bụrụ na anyị gbasoo nduzi Jehova, ihe ikpeazụ ga-esi na ya pụta ga-enye ya otuto ma wetara anyị abamuru na-adịte anya. N’agbanyeghị ihe ịma aka na ịchụ àjà dị iche iche, ọ dịghị ebe ọzọ anyị ga-anọ karịa n’ozi Jehova, soro ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst na-akpakọrịta ma were obi ike na-elega anya n’ọdịnihu ebighị ebi nke Chineke kweworo ná nkwa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a O yikarịrị ka Abraham ọ kpọọrọ nwa nwanne ya bụ́ Lọt dị ka nwa, mgbe nna Lọt, bụ́ nwanne Abraham nke nwoke nwụrụ.—Jenesis 11:27, 28; 12:5.
b Ụfọdụ atụwo aro na mgbe Lọt ghọsịrị otu akụkụ nke ihe ndị eze anọ ahụ kwatara n’agha, ọ gara biri n’obodo ukwu iji nwetakwuo nchebe.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka okwukwe siri ike ji dị mkpa?
◻ Olee otú Abraham si gosi na ya nwere okwukwe siri ike?
◻ Olee otú nraranye na mgbanwe dị iche iche mmadụ mere ná ndụ ya si aga ụkwụ na ụkwụ?
◻ N’ihi gịnị ka anyị ji enwe obi ụtọ ife Chineke n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla anyị pụrụ iche ihu?
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Abraham dị njikere ime nnukwu mgbanwe ná ndụ ya iji keta nkwa ahụ
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Ihe àmà na-egosi na Jisọs ahụwo “okwukwe n’elu ụwa” n’ọnụnọ ya