Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 1/15 p. 15-20
  • Chịlie Aka Nke Iguzosi Ike N’ihe Elu n’Ekpere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chịlie Aka Nke Iguzosi Ike N’ihe Elu n’Ekpere
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Buru Ụzọ Chebara Ekpere Echiche
  • Jiri Nsọpụrụ Gakwuru Chineke
  • Jiri Mmụọ Obi Umeala Na-ekpe Ekpere
  • Na-ekpe Ekpere Site n’Obi
  • Cheta Ekele na Otuto
  • Ya Adịla Mgbe Ihere Ga-eme Gị Ikpe Ekpere
  • Nweta Nkasị Obi Site n’Ekpere
  • Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe Na-anọgidesi Ike n’Ekpere
  • Gịnị Ka Ekpere Gị Na-egosi Banyere Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Kwesị Ịdị Na-ekpe Ekpere n’Akwụsịghị Akwụsị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Otú Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 1/15 p. 15-20

Chịlie Aka Nke Iguzosi Ike N’ihe Elu n’Ekpere

“Ezubere m ka ndị ikom na-ekpe ekpere n’ebe nile ọ bụla, na-achịli aka [nke iguzosi ike n’ihe, NW] elu, n’eweghị iwe, n’arụghịkwa ụka.”—1 TIMOTI 2:8.

1, 2. (a) Olee otú 1 Timoti 2:8 si emetụta ekpere nke metụtara ndị Jehova? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle ugbu a?

JEHOVA na-atụ anya ka ndị ya na-eguzosi ike n’ihe nye ya, nyekwa ibe ha. Pọl onyeozi jikọtara iguzosi ike n’ihe na ekpere mgbe o dere, sị: “Ezubere m ka ndị ikom na-ekpe ekpere n’ebe nile ọ bụla, na-achịli aka [nke iguzosi ike n’ihe, NW] elu, n’eweghị iwe, n’arụghịkwa ụka.” (1 Timoti 2:8) Ihe àmà na-egosi na Pọl na-ezo aka n’ekpere ihu ọha “n’ebe nile ọ bụla” ndị Kraịst zukọrọ. Olee ndị ga-edu ndị Chineke n’ekpere ná nzukọ ọgbakọ? Ọ bụ nanị ndị ikom dị nsọ, bụ́ ndị ezi omume, ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị ji nlezianya na-arụrụ Chineke ọrụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. (Eklisiastis 12:13, 14) Ha aghaghị ịdị ọcha n’ụzọ ime mmụọ na n’omume, ma bụrụ ndị raara onwe ha nye Jehova Chineke n’ụzọ ajụjụ na-adịghị na ya.

2 Ndị okenye ọgbakọ karịsịa kwesịrị ‘ịchịli aka nke iguzosi ike n’ihe elu n’ekpere.’ Ekpere ndị sitere n’ala ala obi ha na-ekpe site na Jisọs Kraịst na-egosi iguzosi ike n’ihe nye Chineke, na-enyekwara ha aka izere arụmụka na ntiwapụ nke iwe. N’ezie, nwoke ọ bụla nwere ihe ùgwù nke idu ọgbakọ ndị Kraịst n’ekpere ihu ọha kwesịrị iwepụ onwe ya n’iwe, obi ilu, na eguzosighị ike n’ihe n’ebe Jehova na nzukọ ya nọ. (Jemes 1:19, 20) Olee ụkpụrụ nduzi ndị ọzọ dabeere na Bible e nwere maka ndị nwere ihe ùgwù nke idu ndị ọzọ n’ekpere ihu ọha? Oleekwa ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ndị anyị kwesịrị itinye n’ọrụ n’ekpere onwe onye na nke ezinụlọ anyị?

Buru Ụzọ Chebara Ekpere Echiche

3, 4. (a) N’ihi gịnị ka ọ ga-eji baa uru ibu ụzọ chebara ekpere ihu ọha echiche? (b) Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-egosi banyere otú ekpere ga-aha n’ogologo?

3 Ọ bụrụ na a gwawo anyị ka anyị kpee ekpere n’ihu ọha, o yiri ka ma ọ dịghị ihe ọzọ anyị ga-enwe ike ibu ụzọ chebatụrụ ekpere anyị echiche. Ime nke a pụrụ inyere anyị aka ikwuzu ihe ndị dị mkpa kwesịrị ekwesị n’ekpeghị ogologo ekpere, na-enweghị isi. N’ezie, anyị pụkwara ikpepụta ekpere onwe onye anyị ekpepụta. Ha pụrụ ịharu ókè ọ bụla n’ogologo. Jisọs ji otu abalị nile kpee ekpere tupu ọ họpụta ndị ozi 12 ya. Otú ọ dị, mgbe o guzobere Ememe Ncheta ọnwụ ya, ihe àmà na-egosi na ekpere o kpere n’elu achịcha na mmanya ahụ dị mkpirikpi. (Mak 14:22-24; Luk 6:12-16) Anyị makwa na Chineke nabatachara ọbụna ekpere dị mkpirikpi ndị Jisọs kpere.

4 Ka e were ya na anyị nwere ihe ùgwù nke idu ezinụlọ n’ekpere tupu e rie ihe. Ekpere dị otú ahụ pụrụ ịdịtụ mkpirikpi—ma ihe ọ bụla e kwuru kwesịrị ịgụnye okwu ekele maka nri ahụ. Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere n’ihu ọha tupu ma ọ bụ ná mmechi nzukọ ndị Kraịst, ọ dịghị anyị mkpa ikpe ogologo ekpere nke na-emetụtazu ọtụtụ ihe. Jisọs katọrọ ndị odeakwụkwọ bụ́ ndị ‘na-ekpe ogologo ekpere ka mmadụ wee hụ ha anya.’ (Luk 20:46, 47) Ọ dịghị mgbe onye na-asọpụrụ Chineke ga-achọ ime otú ahụ. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ekpere dịtụ ogologo pụrụ ikwesị ekwesị. Dị ka ihe atụ, onye okenye a họpụtara ikpe ekpere ikpeazụ ná mgbakọ kwesịrị ibu ụzọ chebara ya echiche, ọ pụkwara ịchọ ịkpọtụ ọtụtụ ihe aha. Ma, ọbụna ekpere dị otú ahụ ekwesịghị ịdị ogologo gabiga ókè.

Jiri Nsọpụrụ Gakwuru Chineke

5. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-ekpe ekpere n’ihu ọha? (b) N’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-ekpe ekpere n’ụzọ dị ùgwù na nsọpụrụ?

5 Mgbe anyị na-ekpe ekpere n’ihu ọha anyị kwesịrị icheta na ọ bụghị ụmụ mmadụ ka anyị na-agwa okwu. Kama nke ahụ, anyị bụ ndị e kere eke na-emehie emehie, bụ́ ndị na-arịọ Eze Onyenwe anyị Jehova arịrịọ. (Abụ Ọma 8:3-5, 9; 73:28) Ya mere, anyị kwesịrị igosipụta egwu nsọpụrụ nke imejọ ya site n’ihe anyị na-ekwu na otú anyị si ekwu ya. (Ilu 1:7) Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Ma mụ onwe m, n’ụba nke ebere Gị ka m ga-aba n’ụlọ Gị: m ga-akpọ isi ala n’ebe ụlọukwu nsọ Gị dị n’egwu Gị.” (Abụ Ọma 5:7) Ọ bụrụ na anyị nwere àgwà dị otú ahụ, olee otú anyị ga-esi kwuo okwu mgbe a gwara anyị kpee ekpere n’ihu ọha ná nzukọ nke Ndịàmà Jehova? Ọ bụrụ na anyị na-agwa eze bụ́ mmadụ okwu, anyị ga-eji nsọpụrụ na ùgwù mee nke ahụ. Ọ̀ bụ na ekpere anyị ekwesịghị ịdị ùgwù na nsọpụrụ ọbụna karị, ebe ọ bụ na anyị na-ekpegara Jehova, bụ́ “Eze nke mba nile,” ekpere? (Mkpughe 15:3) Ya mere mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị ga-ezere okwu ndị dị ka, “Ị̀ bọọla chi? Jehova,” “Anyị na-ezitere gị ịhụnanya anyị,” ma ọ bụ, “Nọdụ nke ọma.” Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst, adịghị mgbe ọ gwara Nna ya nke eluigwe okwu n’ụzọ dị otú ahụ.

6. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị ‘bịaruru ocheeze amara’?

6 Pọl kwuru, sị: “Ka anyị were nkwuwa okwu bịaruo ocheeze amara.” (Ndị Hibru 4:16) Anyị pụrụ iji “nkwuwa okwu” gakwuru Jehova n’agbanyeghị ọnọdụ mmehie anyị n’ihi okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. (Ọrụ 10:42, 43; 20:20, 21) Ma, “nkwuwa okwu” dị otú ahụ apụtaghị na anyị na Chineke na-akọ akụkọ; anyị ekwesịghịkwa ịgwa ya okwu mkparị. Ọ bụrụ na ekpere ihu ọha anyị ga-atọ Jehova ụtọ, a ghaghị iji nsọpụrụ na ùgwù kwesịrị ekwesị kpee ha, ọ ga-abụkwa ihe na-ekwesịghị ekwesị iji ha maa ọkwa, nye ndị mmadụ ndụmọdụ, ma ọ bụ gbazie ndị na-ege ntị olu.

Jiri Mmụọ Obi Umeala Na-ekpe Ekpere

7. Olee otú Solomọn si gosipụta ịdị umeala n’obi mgbe ọ na-ekpe ekpere ná nraranye nke ụlọ nsọ Jehova?

7 Ma ànyị na-ekpe ekpere n’ihu ọha ma ọ bụ nanị anyị, otu ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ dị mkpa anyị ga-eburu n’uche bụ na anyị kwesịrị igosipụta àgwà obi umeala n’ekpere anyị. (2 Ihe E Mere 7:13, 14) Eze Solomọn gosipụtara ịdị umeala n’obi n’ekpere ihu ọha o kpere ná nraranye nke ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem. Solomọn ka wuchara nnọọ otu n’ime ụlọ ndị kasị dị ebube e wutụrụla n’ụwa. Ma, o ji obi umeala kpee ekpere, sị: “Ọ̀ bụ ezie na Chineke ga-ebi n’elu ụwa? lee, eluigwe na eluigwe nke eluigwe agaghị anagide Gị; ụlọ a nke m wuworo, ọ̀ ga-esikwa aṅaa ruo ịnagide Gị?”—1 Ndị Eze 8:27.

8. Olee ụzọ ụfọdụ e si egosi ịdị umeala n’obi n’ekpere ihu ọha?

8 Dị ka Solomọn, anyị kwesịrị inwe obi umeala mgbe anyị na-edu ndị ọzọ n’ekpere ihu ọha. Ọ bụ ezie na anyị kwesịrị izere ikwu okwu n’ụzọ ime nsọ nsọ, anyị pụrụ igosi ịdị umeala n’obi site n’ụda olu anyị. Ekpere e ji obi umeala na-ekpe adịghị abụ nke e kpere n’ụzọ mpako ma ọ bụ nke e ji adọrọ uche ndị mmadụ. Ha adịghị adọrọ uche gaa n’ebe onye na-ekpe ya nọ, kama n’ebe Onye a na-ekpegara ya nọ. (Matiu 6:5) Anyị na-egosikwa ịdị umeala n’obi site n’ihe anyị na-ekwu n’ekpere. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi umeala kpee ekpere, olu anyị agaghị adị ka anyị na-amanye Chineke imere anyị ihe ụfọdụ n’ụzọ anyị si chọọ. Kama nke ahụ, anyị ga-arịọ Jehova ka o mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche nsọ ya. Ọbụ abụ ahụ gosiri ihe nlereanya nke àgwà kwesịrị ekwesị mgbe ọ rịọrọ, sị: “Biko, Jehova, zọpụta, biko: biko Jehova, mee ka ihe na-agara anyị nke ọma, biko.”—Abụ Ọma 118:25; Luk 18:9-14.

Na-ekpe Ekpere Site n’Obi

9. Olee ọmarịcha ndụmọdụ Jisọs nyere nke a na-achọta na Matiu 6:7, oleekwa otú a pụrụ isi tinye ya n’ọrụ?

9 Ọ bụrụ na ekpere ihu ọha ma ọ bụ nke onwe onye anyị ga-atọ Jehova ụtọ, ha aghaghị isite n’obi. N’ihi ya, anyị agaghị nanị adị na-ekpeghachi otu usoro ekpere ugboro ugboro n’echeghị echiche banyere ihe anyị na-ekwu. N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs dụrụ ọdụ, sị: “Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu, dị ka ndị mba ọzọ na-eme: n’ihi na ha [ji ihie ụzọ] na-eche na a ga-anụ olu ha n’ọtụtụ okwu ha na-ekwu.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jisọs sirị: “Unu atagherila ọnụ; unu ekwula okwu nkwukwasị efu.”—Matiu 6:7; ntụaka ala ala peji nke NW.

10. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji kwesị ekwesị ikpe ekpere banyere otu ihe ruo ihe karịrị otu ugbo?

10 N’ezie, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ikpe ekpere ugboro ugboro banyere otu ihe. Nke ahụ agaghị adị njọ n’ihi na Jisọs gbara ume, sị: “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu. (Matiu 7:7, NW) Ikekwe e nwere mkpa maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ n’ihi na Jehova na-eme ka ọrụ nkwusa ahụ na-aga nke ọma n’ógbè anyị. (Aịsaịa 60:22) Ọ ga-ekwesị ekwesị ịnọgide na-akpọtụ mkpa nke a aha mgbe anyị na-ekpe ekpere onwe onye ma ọ bụ mgbe anyị na-ekpe ekpere ihu ọha ná nzukọ nke ndị Jehova. Ime otú ahụ agaghị apụta na anyị ‘na-ekwu okwu nkwukwasị efu.’

Cheta Ekele na Otuto

11. Olee otú Ndị Filipaị 4:6, 7 si emetụta ekpere onwe onye na nke ihu ọha?

11 Ọtụtụ mmadụ na-ekpe ekpere nanị iji rịọ ihe, ma ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova Chineke nọ kwesịrị ịkpali anyị inye ya ekele na otuto ma n’ekpere onwe onye ma na nke ihu ọha. “Unu echegbula onwe n’ihe ọ bụla,” ka Pọl dere, “kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ee, tụkwasị n’arịrịọ, anyị kwesịrị ikele Jehova maka ngọzi ime mmụọ na nke anụ ahụ. (Ilu 10:22) Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Chụọrọ Chineke ekele dị ka àjà; kwụghachikwa Onye kachasị ihe nile elu nkwa nile i kwere.” (Abụ Ọma 50:14) Ekpere Devid ji gụọ uri olu ụtọ gụnyekwara okwu ndị a na-emetụ n’ahụ: “M ga-eji abụ too aha Chineke, m ga-ejikwa ekele mee ka Ọ dị ukwuu.” (Abụ Ọma 69:30) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime otu ihe ahụ n’ekpere ihu ọha na nke onwe anyị?

12. Olee otú Abụ Ọma 100:4, 5 si emezu taa, banyere gịnịkwa ka anyị pụziri ikele Chineke ma too ya?

12 Banyere Chineke, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Werenụ ekele baa n’ọnụ ụzọ ámá Ya nile, werenụ otuto baa n’ogige Ya nile: keleenụ Ya, gọziekwanụ aha Ya. N’ihi na Jehova dị mma; ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị; ruo ọgbọ nile ka ikwesị ntụkwasị obi Ya dịkwa.” (Abụ Ọma 100:4, 5) Taa, ndị nke mba nile na-abanye n’ogige nke ebe nsọ Jehova, anyị pụkwara inye ya otuto na ekele maka nke a. Ị̀ na-egosipụta obi ekele nye Chineke maka Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè gị ma na-egosi ekele i nwere site n’isoro ndị hụrụ ya n’anya na-ezukọ n’ebe ahụ mgbe nile? Mgbe ị nọ n’ebe ahụ, ị̀ na-eji obi gị na-eweli olu gị n’ịbụ abụ otuto na ekele nye Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya?

Ya Adịla Mgbe Ihere Ga-eme Gị Ikpe Ekpere

13. Ihe atụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa na-egosi na anyị kwesịrị ịrịọ Jehova arịrịọ ọbụna ma ọ bụrụ na anyị nwere mmetụta ịbụ ndị na-erughị eru n’ihi obi amamikpe?

13 Ọ bụrụgodị na anyị nwere mmetụta nke ịbụ ndị na-erughị eru n’ihi obi amamikpe, anyị kwesịrị iji arịrịọ sitere n’ezi obi chigharịkwuru Chineke. Mgbe ndị Juu mehiere site n’ịlụrụ ndị nwunye si ala ọzọ, Ezra gburu ikpere n’ala, gbasaara Chineke ọbụ aka ya nke iguzosi ike n’ihe, ma jiri obi umeala kpee ekpere, sị: “Chineke m, ihere na-eme m, ihu m nwugharịkwara n’ihi ihere, iweliri Gị ihu m elu, Chineke m: n’ihi na ajọ omume anyị bara ụba karịa isi anyị elu, ikpe ọmụma anyị aghọwokwa ihe ukwu ruo eluigwe. Site n’ụbọchị nna anyị ha anyị onwe anyị anọwo n’ikpe ọmụma ukwu ruo taa . . . Ma mgbe ihe nile a gasịrị, nke na-abịakwasị anyị n’ihi omume ọjọọ nile anyị, na n’ihi ikpe ọmụma ukwu anyị, n’ihi na Gị onwe gị, bụ́ Chineke anyị, egbochiwo ahụhụ mmehie anyị, ka ọ ghara ịdị elu ka ajọ omume anyị, I wee nye anyị ndị mgbapụ dị otú a, ànyị ga-alaghachikwa mebie ihe nile I nyere n’iwu, wee ghọọ ọgọ ndị ahụ ndị na-eme ihe arụ ndị a? Ị́ gaghị ewesa anyị iwe, ruo mgbe e mere ka anyị gwụsịa, ndị fọdụrụ ma ọ bụ ndị mgbapụ wee ghara ịdị? Jehova, bụ́ Chineke Israel, onye ezi omume ka Ị bụ; n’ihi na anyị fọdụrụ ịbụ ndị mgbapụ, dị ka o si dị taa: lee, anyị nọ n’ihu Gị n’ikpe ọmụma anyị; n’ihi na ọ dịghị onye iguzo n’ihu Gị n’ihi nke a.”—Ezra 9:1-15; Deuterọnọmi 7:3, 4.

14. Dị ka e gosipụtara n’ụbọchị Ezra, gịnị ka a chọrọ iji nweta mgbaghara Chineke?

14 Iji nweta mgbaghara Chineke, ịkwa ụta na “mkpụrụ kwesịrị nchegharị” aghaghị isonyere imere ya nkwupụta. (Luk 3:8; Job 42:1-6; Aịsaịa 66:2) N’ụbọchị Ezra, ihe sonyeere àgwà nchegharị bụ mgbalị imezi mmejọ ahụ site n’ịchụlaga ndị nwunye ahụ si ala ọzọ. (Ezra 10:44; tụlee 2 Ndị Kọrint 7:8-13.) Ọ bụrụ na anyị na-achọ mgbaghara Chineke maka mmehie dị oké njọ, ka anyị jiri ekpere obi umeala mee nkwupụta ma mịa mkpụrụ kwesịrị nchegharị. Mmụọ nchegharị na ọchịchọ imezi mmejọ ahụ ga-akpalikwa anyị ịchọ enyemaka ime mmụọ nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye.—Jemes 5:13-15.

Nweta Nkasị Obi Site n’Ekpere

15. Olee otú ahụmahụ Hana si egosi na anyị pụrụ ịchọta nkasi obi n’ekpere?

15 Mgbe obi anyị nọ n’ihe mgbu n’ihi ihe ụfọdụ, anyị pụrụ ịchọta nkasi obi n’ekpere. (Abụ Ọma 51:17; Ilu 15:13) Hana na-eguzosi ike n’ihe chọtara. O biri ndụ mgbe ezinụlọ ukwu na-ewu ewu n’Israel, ma ọ mụtaghị ụmụ. Di ya, bụ́ Elkena, nwere ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom site n’aka nwunye ya nke ọzọ, bụ́ Penina, bụ́ onye tara Hana ụta maka ịbụ nwanyị aga. Hana kpesiri ekpere ike ma kwee nkwa na ọ bụrụ na e jiri nwa nwoke gọzie ya, na ‘ya ga-enye ya Jehova ụbọchị ndụ ya nile.’ N’ịbụ onye ekpere ya na okwu Ịlaị bụ́ Onyeisi Nchụàjà gwara ya kasiri obi, Hana “agbarụghịkwa [ihu] n’ihi ya ọzọ.” Ọ mụrụ nwa nwoke bụ́ onye ọ kpọrọ Samuel. Mgbe e mesịrị, o nyefere ya maka ije ozi n’ebe nsọ Jehova. (1 Samuel 1:9-28) N’inwe obi ekele maka obiọma Chineke n’ebe ọ nọ, o kpere ekpere ekele—nke toro Jehova dị ka onye na-enweghị oyiri. (1 Samuel 2:1-10) Dị ka Hana, anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’ekpere, na-enwe obi ike na Chineke na-aza arịrịọ nile kwekọrọ n’uche ya. Mgbe anyị gwara ya obi anyị, ka ‘ihu anyị ghara ịgbarụkwa ọzọ,’ n’ihi na ọ ga-ewepụ ibu arọ anyị ma ọ bụ nyere anyị aka ịnagide ya.—Abụ Ọma 55:22.

16. Dị ka e mere ihe atụ ya n’ihe banyere Jekọb, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji kpee ekpere mgbe anyị na-atụ egwu ma ọ bụ na-enwe nchegbu?

16 Ọ bụrụ na otu ọnọdụ akpata egwu, ihe mgbu nke obi, ma ọ bụ nchegbu, ka anyị ahapụla ichigharịkwuru Chineke maka nkasi obi n’ekpere. (Abụ Ọma 55:1-4) Egwu tụrụ Jekọb mgbe ọ na-aga izute nwanne ya nwoke ya na ya na-adịghịzi ná mma, bụ́ Isọ. Ma, Jekọb kpere ekpere, sị: “Chineke nke nna m Abraham, na Chineke nke nna m Aịsak, Jehova, Nke na-asị m, Laghachi n’ala gị, laghachikwuru ụmụnna gị, M ga-emekwa gị mma: ekwesịghị m ebere nile, na eziokwu nile, nke I mewooro ohu Gị; n’ihi na mkpanaka m ka m weere gabiga Jọdan nke a; ma ugbu a aghọwo m ọmụma ụlọikwuu abụọ. Biko, napụta m n’aka nwanne m, n’aka Isọ: n’ihi na mụ onwe m na-atụ egwu ya, ma eleghị anya ọ ga-abịa, tigbuo m, tigbuokwa nne tinyere ụmụ ya. Ma Gị onwe gị sịrị, Aghaghị m ime gị mma, M ga-emekwa mkpụrụ gị ka ọ dị ka ájá nke oké osimiri, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ n’ihi ọtụtụ ọ dị.” (Jenesis 32:9-12) Isọ egbughị Jekọb na ìgwè ndị ya na ha so. N’ihi ya Jehova ‘mere Jekọb mma’ n’oge ahụ.

17. N’ikwekọ n’Abụ Ọma 119:52, olee otú ekpere pụrụ isi wetara anyị nkasi obi mgbe a nwara anyị ọnwụnwa n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ?

17 N’oge anyị na-arịọ arịrịọ, a pụrụ ịkasi anyị obi site n’icheta ihe ndị e kwuru n’Okwu Chineke. N’abụ ọma nke kasị too ogologo—ekpere mara mma nke a gụrụ n’egwú—ọ pụrụ ịbụworị Nwa Eze bụ́ Hezekaịa bụrụ, sị: “Echetawo m ikpe Gị nile site na mgbe ebighị ebi, Jehova, wee kasie onwe m obi.” (Abụ Ọma 119:52) N’ekpere obi umeala anyị kpere mgbe a nwara anyị ọnwụnwa n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, anyị pụrụ icheta ụkpụrụ ma ọ bụ iwu Bible nke pụrụ inyere anyị aka ịchụso ụzọ nke na-eweta mmesi obi ike na-akasi obi na anyị na-eme ihe na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ.

Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe Na-anọgidesi Ike n’Ekpere

18. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ‘ndị nile na-eguzosi ike n’ihe ga-ekpegara Chineke ekpere’?

18 Ndị nile na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke ‘ga-anọgidesi ike n’ekpere.’ (Ndị Rom 12:12) N’Abụ Ọma nke 32, bụ́ nke e dekọrọ ikekwe mgbe Devid sosịrị Bat-sheba mehie, ọ kọwara oké ihe mgbu ya maka ịghara ịchọ mgbaghara nakwa ahụ efe nke nchegharị na nkwupụta nye Chineke wetaara ya. Mgbe ahụ Devid bụrụ, sị: “N’ihi nke a [n’ihi na mgbaghara Jehova dị adị nye ndị chegharịrị n’ezie] ka [ndị nile na-eguzosi ike n’ihe, NW] kpeere Gị na mgbe a ga-eji chọta Gị.”—Abụ Ọma 32:6.

19. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chịlie aka nke iguzosi ike n’ihe elu n’ekpere?

19 Ọ bụrụ na anyị ji mmekọrịta anyị na Jehova Chineke kpọrọ ihe, anyị ga-ekpe ekpere maka ebere ya ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs. N’okwukwe, anyị pụrụ iji nkwuwa okwu bịaruo ocheeze nke amara iji nweta ebere na enyemaka bịara n’oge ya. (Ndị Hibru 4:16) Ma e nwere ọtụtụ ihe mere e ji ekpe ekpere! Ya mere, ka anyị ‘na-ekpe ekpere n’ewepụghị aka’—na-ejikarị okwu otuto na ekele ndị sitere n’ala ala obi nye Chineke. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Ehihie na abalị, ka anyị na-eweli aka nke iguzosi ike n’ihe elu n’ekpere.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Uru dị aṅaa ka ọ bara bụ́ ibu ụzọ chebara ekpere ihu ọha echiche?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-ekpe ekpere n’ụzọ dị ùgwù na nsọpụrụ?

◻ Mmụọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị igosipụta mgbe anyị na-ekpe ekpere?

◻ Mgbe anyị na-ekpe ekpere, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji cheta ekele na otuto?

◻ Olee otú Bible si egosi na anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’ekpere?

[Foto dị na peeji nke 17]

Eze Solomọn gosipụtara ịdị umeala n’obi n’ekpere ihu ọha o kpere ná nraranye nke ụlọ nsọ Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Dị ka Hana, ị pụrụ inweta nkasi obi site n’ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya