“Nne Ukwu Nwere Isi Ojii Nke Ọzara Siria”
Ọ NA-EJI oji, eze ya dị ọcha dị ka pearl, anya ya dị oji ma na-egbuke egbuke. Ọ gụrụ akwụkwọ nke ọma, bụrụkwa onye ọkà mmụta asụsụ maara nke a na-akọ. A sịrị na eze nwanyị a bụ́ dike maara ihe karịa Cleopatra, ikekwe ọ makwara mma dị ka ya. N’ihi na o nwere anyaike iguzogide ike ụwa na-achị achị nke oge ya, ọ rụzuru ọrụ amụma n’otu ihe omume Akwụkwọ Nsọ kọrọ. Ogologo oge mgbe ọ nwụsịrị, ndị edemede toro ya, ndị na-ese ihe osise sere ya n’ụzọ a chọkwuru mma. Otu onye na-ede uri nke narị afọ nke 19 kọwara ya dị ka “nne ukwu nwere isi ojii nke ọzara Siria.” Nwanyị a a jara mma nke ukwuu bụ Zenobia—eze nwanyị nke obodo Palmyra nke Siria.
Olee otú Zenobia si bụrụ onye a ma ama? Gịnị bụ ọnọdụ ọchịchị dugara ya n’ịbanye n’ọchịchị? Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere àgwà ya? Ọrụ amụma dịkwa aṅaa ka eze nwanyị a rụzuru? Buru ụzọ tụlee akụkụ ụwa ebe ihe omume a mere.
Otu Obodo nke Dị n’Ụsọ Otu Ọzara
Obodo Zenobia, bụ́ Palmyra, dị ihe dị ka kilomita 210 n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Damaskọs, n’ụsọ ebe ugwu nke Ọzara Siria bụ́ ebe ugwu Anti-Lebanon kpọdara na ndagwurugwu. Obodo ahịhịa ndụ a dị ihe dị ka n’agbata Osimiri Mediterranean n’ebe ọdịda anyanwụ na Osimiri Yufretis n’ebe ọwụwa anyanwụ. Eze Solomọn pụrụ ịmarawo ya dị ka Tadmoa, bụ́ ebe dị mkpa nye ọdịmma alaeze ya n’ihi ihe abụọ: dị ka ogige ndị agha maka nchebe nke ókèala ebe ugwu na dị ka ebe dị mkpa e si eru ọtụtụ obodo ndị ụlọ ndị a na-ebugharị ebugharị jupụtara na ha. Ya mere, Solomọn ‘wuru Tadmoa n’ọzara.’—2 Ihe E Mere 8:4.
Akụkọ ihe mere eme nke otu puku afọ mgbe ọchịchị Eze Solomọn gasịrị ekwughị ihe ọ bụla banyere Tadmoa. Ọ bụrụ na ya ịbụ nke a kpọrọ Palmyra ziri ezi, ya ịbụ nke a ma ama bidoro mgbe Siria ghọrọ ógbè ogige ndị agha nke Alaeze Ukwu Rom na 64 T.O.A. “Palmyra dị Rom mkpa n’akụkụ abụọ, akụ̀ na ụba na ndị agha,” ka Richard Stoneman na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ Palmyra and Its Empire—Zenobia’s Revolt Against Rome. Ebe ọ bụ na obodo a nkwụ jupụtara na ya dị n’otu ụzọ bụ́ isi e si eme njem azụmahịa bụ́ nke jikọrọ Rom na Mesọpotemia na Ebe Ọwụwa Anyanwụ, na ya ka akụ̀ na ụba azụmahịa nke ụwa oge ochie si gafere—ihe ndị na-eme ka nri tọọ ụtọ ndị sitere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ India, ákwà silk ndị sitere China, na ngwá ahịa ndị ọzọ ndị sitere Peasia, Mesọpotemia Ebe Ndịda, na ala dị iche iche nke Mediterranean. Rom dabeere ná ntụbata nke ngwá ahịa ndị a.
N’ụzọ agha, ógbè Siria jere ozi dị ka ógbè dị n’agbata ike ọchịchị abụọ ahụ na-amarịta aka bụ́ Rom na Peasia. Osimiri Yufretis kewapụrụ Rom n’ebe ndị agbata obi ya nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nọ n’afọ 250 mbụ nke Oge Anyị. Palmyra dị nnọọ n’ofe ọzara ahụ, n’ebe ọdịda anyanwụ nke obodo Dura-Europos dị n’ógbè Yufretis. N’ịghọta ịdị oké mkpa nke ebe ọ dị, eze ukwu Rom ndị dị ka Hadrian na Valerian letara Palmyra. Hadrian tinyere ihe n’ihe owuwu ya ndị magburu onwe ha ma nye ọtụtụ onyinye afọ ofufo. Valerian kwụghachiri otu onye Palmyra a ma ama nke aha ya bụ Odaenathus—di Zenobia—ụgwọ ọrụ site n’ibuli ya elu, na 258 O.A., gaa n’ọkwá onye majie ukwu nke Rom n’ihi na o mewo mkpọsa n’ụzọ gara nke ọma megide Peasia, gbasapụkwa ókèala nke Alaeze Ukwu Rom baa na Mesọpotemia. Zenobia keere òkè dị mkpa ná mbanye di ya banyere n’ọchịchị. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Edward Gibbon dere, sị: “A sịrị na ihe ịga nke ọma Odenathus nwere bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’ihi amamihe na obi ike ya [Zenobia] nke na-enweghị atụ.”
Ka ọ dị mgbe ahụ, Eze Sapor nke Peasia kpebiri ịma ịkasị ike nke Rom aka ma gosipụta ịchịisi ya n’ógbè nile bụbu nke Peasia. N’ịbụ onye nwere usuu ndị agha siri ike, ọ zọọrọ ije gaa n’ebe ọdịda anyanwụ, weghara ogige ndị agha Rom ndị dị n’obodo Nisibis na Carrhae (Heran), wee gaa n’ihu ibibi ebe ugwu Siria na Silisia. Eze Ukwu bụ́ Valerian bịara n’onwe ya idu usuu ndị agha ya megide ndị ahụ na-eme mwakpo ma ndị Peasia meriri ya, jidekwa ya.
Odaenathus lere ya anya dị ka ezi oge izigara eze Peasia onyinye ndị dị oké ọnụ na ozi udo. Eze Sapor ji mpako nye iwu ka a tụba onyinye ndị ahụ na Yufretis ma kwuo ka Odaenathus pụta n’ihu ya n’ọnọdụ nke onye e ji eji na-arịọ arịrịọ. Ná nzaghachi, ndị Palmyra kpọkọtara usuu nke ndị na-awagharị n’ọzara na ihe fọdụrụ n’usuu ndị agha Rom ma malite ịwakpo ndị Peasia ahụ na-alaghachi azụ ugbu a. Usuu ndị agha Sapor—ndị ike ime njem agha gwụrụ nakwa ndị ihe ha kwatara n’agha na-anyịgbu—nwere nchebe dị nta megide usoro agha otiri gbaa ọsọ nke ndị dike ọzara ahụ, a manyekwara ha iri mbọ mbọ.
N’ịghọta na o meriwo Sapor, nwa Valerian, bụ́kwa onye nọchiri ya, bụ́ Gallienus, nyere Odaenathus utu aha bụ́ corrector totius Orientis (gọvanọ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ nile). Ka oge na-aga, Odaenathus nyere onwe ya utu aha bụ́ “eze kachasị ndị eze nile.”
Zenobia Achọọ Ikepụta Alaeze Ukwu
Na 267 O.A., n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ọchịchị ya, e gburu Odaenathus na onye nketa ya, e chere na ọ bụ site n’aka nwa nwanne ya bụ́ onye na-achọ mmegwara. Zenobia weghaara ọkwá di ya, ebe ọ bụ na nwa ya nwoke dị nnọọ obere. N’ịbụ onye mara mma, onye nwere oké ọchịchọ, onye ruru eru dị ka onye ọchịchị, onye iso di ya nwụrụ anwụ achụ nta nkwado mara ahụ, nakwa onye ọtụtụ asụsụ na-aga were were n’ọnụ, o nwetara nkwanye ùgwù na nkwado nke ndị ọ na-achị—nke na-abụghị obere ihe n’etiti ndị Bedouin. Zenobia hụrụ ịmụ ihe n’anya, o jikwa ndị nwere ọgụgụ isi gbaa onwe ya gburugburu. Otu n’ime ndị ndụmọdụ ya bụ onye ọkà ihe ọmụma na ọkà n’ikwu okwu bụ́ Cassius Longinus—onye a sịrị na ọ bụwo “ụlọ nchekwa ihe ọmụma.” Onye edemede bụ́ Stoneman na-ekwu, sị: “N’ime afọ ise mgbe Odenathus nwụsịrị . . . Zenobia ewerewo ọnọdụ n’uche ndị ya dị ka nne ukwu nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ.”
N’otu akụkụ nke ebe Zenobia na-achị ka Peasia dị, bụ́ nke ya na di ya meworo ka ọ gharakwa ịdị ike, n’akụkụ nke ọzọkwa ka Rom na-ada ada dị. Banyere ọnọdụ dị n’Alaeze Ukwu Rom n’oge ahụ, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ J. M. Roberts na-ekwu, sị: “Narị afọ nke atọ bụ . . . oge dị oké egwu nye Rom n’ókèala ya ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ, ebe n’ụlọ, oge ọhụrụ nke agha obodo na nnọchi ndị e seere okwu amaliteworị. Ndị eze ukwu 22 (ma e wezụga ndị na-eme ka ha bụ eze ukwu) bịara ma laa.” Nne ukwu Siria ahụ, n’aka nke ọzọ, bụ eze nwanyị kwụsiri nnọọ ike n’ógbè ya. “N’ịchịkwa alaeze ukwu abụọ hà nhata [Peasia na Rom],” ka Stoneman na-ekwu, “ọ pụrụ ịchọ ikepụta nke atọ nke ga-achị ha abụọ.”
Ohere maka Zenobia ịgbasapụ ike ọchịchị ya bịara na 269 O.A., mgbe onye na-eme ka ọ bụ eze ukwu nke na-emegide ịchịisi ndị Rom pụtara n’Ijipt. Usuu ndị agha Zenobia zọọrọ ije ngwa ngwa baa n’Ijipt, tigbuo onye ahụ na-enupụ isi, ma weghara mba ahụ. N’ịkpọ onwe ya eze nwanyị Ijipt, ọ kpụrụ ego n’aha ya. Alaeze ya gbasapụrụ ugbu a site n’Osimiri Naịl ruo Osimiri Yufretis. N’oge a ná ndụ ya, ọ bịara nọrọ n’ọnọdụ “eze Ndịda” nke e kwuru okwu banyere ya n’amụma Bible nke Daniel, ebe ọ bụ na alaeze ya na-achị n’ebe dị na ndịda nke obodo Daniel mgbe ahụ. (Daniel 11:25, 26) O merikwara ihe ka ọtụtụ n’Asia Minor.
Zenobia mere ka isi obodo ya bụ́ Palmyra, sikwuo ike ma ka mma, ruo n’ókè nke na ya na obodo ukwu ndị nke ógbè ndị Rom hatawara. E mere atụmatụ na mmadụ ndị bi na ya ruru ihe karịrị 150,000. Ihe owuwu ọha na eze, ụlọ nsọ, ubi, idé, na ihe ndị a kpụrụ akpụ magburu onwe ha jupụtara obodo ahụ, nke e ji mgbidi ndị a sịrị na ha dị kilomita 21 n’ịdị okirikiri gbachigide. Ị̀bà ndị e ji idé ndị Kọrint e doro n’usoro, ndị karịrị mita 15 n’ịdị elu, rụọ—ndị dị ihe dị ka 1,500—kwụrụ n’usoro n’okporo ámá bụ́ isi. Ihe oyiyi na ihe ọkpụkpụ nke ndị dike na ndị bara ọgaranya e ritere ihe n’aka ha jupụtara n’obodo ahụ. Na 271 O.A., Zenobia guzobere ihe oyiyi abụọ nke ya onwe ya na di ya nwụrụ anwụ. N’ụsọ ọzara ahụ, Palmyra gbukere dị ka ọla.
Ụlọ nsọ nke Anyanwụ bụ otu n’ime ihe owuwu kasị mma dị na Palmyra, obi abụọ adịghịkwa ya na ọ chịkwara ihe omume okpukpe n’obodo ahụ. Ma eleghị anya, Zenobia fekwara chi e jikọrọ ya na chi anyanwụ. Otú ọ dị, Siria nke narị afọ nke atọ bụ obodo nwere ọtụtụ okpukpe. N’ebe Zenobia na-achị, e nwere ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst, ndị Juu, ndị na-agụ kpakpando, na ndị na-efe anyanwụ na ọnwa. Gịnị bụ omume ya n’ebe ụzọ dị iche iche nke ofufe dị n’ógbè ya dị? Onye edemede bụ́ Stoneman na-ekwu, sị: “Onye ọchịchị maara ihe agaghị eleghara omenala ọ bụla nke yiri ka o kwesịrị ekwesị nye ndị ya anya. . . . E nwere olileanya . . . na e wekọtawo chi dị iche iche n’akụkụ Palmyra.” Ihe àmà na-egosi na Zenobia kwere ka okpukpe ọ bụla dịrị. Ma “è wekọtawo chi dị iche iche n’akụkụ Palmyra” n’ezie? Gịnị na-echere Palmyra na ‘onye ọchịchị ya maara ihe’?
Otu Eze Ukwu ‘Akpọtee Obi Ya’ Imegide Zenobia
N’afọ 270 O.A., Aurelian ghọrọ eze ukwu nke Rom. Usuu ndị agha ya wakporo ma nye ndị na-emepeghị anya nke ebe ugwu ahụhụ n’ụzọ gara nke ọma. Na 271 O.A.—n’ịbụ onye na-anọchizi anya “eze Ugwu” nke amụma Daniel—Aurelian ‘kpọtere ike ya na obi ya imegide eze Ndịda,’ nke Zenobia na-anọchite anya ya. (Daniel 11:25a) Aurelian zigara ụfọdụ n’ime usuu ndị agha ya n’Ijipt kpọmkwem ma duru usuu ndị agha ya bụ́ isi gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ site n’Asia Minor.
Eze ndịda—usoro na-achị achị nke Zenobia bụ onyeisi ya—‘kpaliri onwe ya’ ibu agha megide Aurelian ‘na-achịrị oké usuu ndị agha nke dị ike nke ukwuu’ n’okpuru ndị ọchịagha abụọ, bụ́ Zabdas na Zabbai. (Daniel 11:25b) Ma Aurelian weghaara Ijipt ma ziga usuu ndị agha baa n’Asia Minor na Siria. E meriri Zenobia n’Emesa (ebe bụ́ Homs ugbu a), ọ laghachikwara Palmyra.
Mgbe Aurelian ji usuu ndị agha gbaa Palmyra gburugburu, Zenobia, n’inwe olileanya inweta enyemaka, gbagawara Peasia ya na nwa ya nwoke, nanị ịbụ ndị ndị Rom jidere n’Osimiri Yufretis. Ndị Palmyra nyefere obodo ha na 272 O.A. Aurelian mesoro ndị bi n’ime ya n’ụzọ obiọma, chịkọrọ ọtụtụ ihe ndị a kwatara n’agha, gụnyere arụsị dị n’Ụlọ Nsọ nke Anyanwụ, ma lawa Rom. Eze ukwu Rom ahụ egbughị Zenobia, na-eme ya ka ọ bụrụ ihe ndọrọ bụ́ isi ná njegharị mmeri ya n’ime Rom na 274 O.A. Ọ dịrị ndụ ya fọdụrụ dị ka nwanyị nọ na di na Rom.
E Bibie Obodo Ọzara Ahụ
Ọnwa ole na ole mgbe Aurelian weghaara Palmyra, ndị Palmyra gbukpọrọ usuu ndị agha Rom ahụ ọ hapụrụ. Mgbe akụkọ banyere nnupụisi a ruru Aurelian ntị, o nyere iwu ozugbo ka ndị soja ya gaghachi, ugbu a kwa, ha bọrọ ọ́bọ̀ dị egwu n’ebe ndị ahụ nọ. E duuru ndị gbanahụrụ ogbugbu afọ ịta mmiri ahụ gaa n’ịgba ohu. A kwakọọrọ ihe dị n’obodo ahụ na-anya isi ma bibie ya n’ụzọ a na-apụghị imekwata emekwata. E si otú ahụ weghachi obodo ukwu ahụ na-ekwo ekwo gaa n’ọnọdụ mbụ ya—“Tadmoa n’ọzara.”
Mgbe Zenobia guzogidere Rom, ya na Eze Ukwu bụ́ Aurelian mezuru òkè ha dị ka “eze Ndịda” na “eze Ugwu,” na-emezu n’amaghị ama, akụkụ nke otu amụma nke onye amụma Jehova dekọrọ n’ụzọ zuru ezu n’ihe dị ka afọ 800 tupu mgbe ahụ. (Daniel, isi nke 11) N’ihi àgwà ya dị ịrịba ama, Zenobia dọọrọ mmasị ọtụtụ ndị. Otú ọ dị, nke kasị dị ịrịba ama bụ òkè o keere n’ịnọchite anya usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị e buru ụzọ kwuo banyere ya n’amụma Daniel. Ịchịisi ya akarịghị afọ ise. Palmyra, bụ́ isi obodo nke alaeze Zenobia, abụghị ihe ọzọ karịa obodo nta taa. Ọbụna Alaeze Ukwu Rom ahụ dị ike apụwo n’anya kemgbe ma nọrọ n’okpuru alaeze ndị nke oge a. Gịnị ga-abụ ọdịnihu nke ọchịchị ndị a? Ọdịnihu ha a kara aka bụkwa nke mmezu e ji n’aka nke amụma Bible na-achịkwa.—Daniel 2:44.
[Igbe dị na peeji nke 29]
Ihe Nketa Zenobia Hapụrụ
Mgbe ọ laghachiri Rom n’oge o merisịrị Zenobia, bụ́ eze nwanyị Palmyra, Eze Ukwu bụ́ Aurelian wuuru anyanwụ otu ụlọ nsọ. N’ime ya o debere ihe oyiyi nke chi anyanwụ ahụ o welatara site n’obodo Zenobia. N’ikwu banyere ihe ndị mekwurunụ, magazin bụ́ History Today na-ekwu, sị: “Ihe kasị adịte aka nke ihe nile Aurelian mere bụ ma eleghị anya nhiwe nke ememe a na-eme kwa afọ nke anyanwụ na AD 274, bụ́ nke a na-eme n’etiti oge oyi, December 25. Mgbe alaeze ukwu ahụ ghọrọ nke ndị Kraịst, e bufere ụbọchị ọmụmụ Kraịst gaa n’ụbọchị a iji mee ka okpukpe ọhụrụ ahụ bụrụ nke ndị ahụ na-anụ ụtọ ememe ndị nke mgbe ochie nabatakwuru. Ọ bụ echiche na-eju anya, na ọ ga-abụ kpam kpam n’ihi Eze Nwanyị Ukwu Zenobia ka . . . [ndị mmadụ] ji eme ememe Krismas anyị.”
[Map/Foto dị na peeji nke 28, 29]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
OSIMIRI MEDITERRANEAN
SIRIA
Antiọk
Emesa (Homs)
PALMYRA
Damaskọs
MESỌPOTEMIA
Yufretis
Carrhae (Heran)
Nisibis
Dura-Europos
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Map: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.
Ị̀bà: Michael Nicholson/Corbis
[Foto dị na peeji nke 29]
Mkpụrụ ego ndị Rom nke o nwere ike bụrụ na ọ na-egosi Aurelian
[Foto dị na peeji nke 30]
Ụlọ Nsọ anyanwụ dị na Palmyra
[Ebe E Si Nweta Foto]
The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck
[Foto dị na peeji nke 31]
Eze Nwanyị Zenobia ka ọ na-agwa ndị soja ya okwu
[Ebe E Si Nweta Foto]
Giovanni Battista Tiepolo, Eze Nwanyị Zenobia Ka Ọ Na-agwa Ndị Soja Ya Okwu, Samuel H. Kress Collection, Photograph © Board of Trustees, National Gallery of Art, Washington
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 28]
Nkọwa zuru ezu nke: Giovanni Battista Tiepolo, Eze Nwanyị Zenobia Ka Ọ Na-agwa Ndị Soja Ya Okwu, Samuel H. Kress Collection, Photograph © Board of Trustees, National Gallery of Art, Washington