Ihe Nganga Na-efu—Olee Otú Ọ Haruru?
Ọ̀ DỊWO mgbe i so onye kpachapụrụ nnọọ anya chọọ iwetu gị ala mekọọ ihe? Ikekwe manịja, ọga, onye nlekọta, ma ọ bụ ọbụna onye ikwu gị nke ledara gị anya ma jiri oké nlelị mesoo gị ihe? Olee mmetụta i nwere banyere onye ahụ? Àgwà ya ọ̀ masịrị gị? Ọ dịghị ma ọlị! N’ihi gịnị? N’ihi na nganga na-etinye ihe mgbochi, na-abịanyụkwa nkwurịta okwu.
Nganga na-eme ka mmadụ na-eleda onye ọ bụla ọzọ anya, ka ya onwe ya wee yie onye ka mma mgbe nile. Ọ na-esi ike ka onye nwere àgwà dị otú ahụ kwuo okwu ọma banyere ndị ọzọ. Mgbe nile ọ na-ekwu okwu ụfọdụ na-adịghị mma—“ee, nke ahụ pụrụ ịbụ eziokwu, ma na o nwere nsogbu ma ọ bụ ntụpọ a.”
N’akwụkwọ bụ́ Thoughts of Gold in Words of Silver, a kọwara nganga dị ka “omume ọjọọ nke na-aga n’ihu ná mmeri. Ọ na-emebi mmadụ, na-eme ka e nwee mmasị dị nnọọ nta n’ebe onye ahụ nọ.” Ọ̀ bụ ihe ijuanya na ọ dịghị onye ahụ na-eru ala ma ya na onye nganga nọrọ? N’ezie, ihe nganga na-efu na-abụkarị enweghị ezi ndị enyi. “N’ụzọ dị iche,” ka otu akwụkwọ ahụ gara n’ihu ikwu, “ndị mmadụ na-ahụ ndị dị umeala n’obi n’anya—ọ bụghị ndị dị umeala n’obi ma jiri ya akpa nganga, kama ndị dị umeala n’obi n’ezie.” N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Bible na-ekwu, sị: “Nganga mmadụ na-akpatara ya mweda n’ala, onye dị obi umeala ga-enweta nsọpụrụ.”—Ilu 29:23, The Jerusalem Bible.
Otú ọ dị, n’ụzọ dị mkpa karịa ọbụbụenyi ma ọ bụ nsọpụrụ sitere n’aka mmadụ, olee otú nganga si emetụta mmekọrịta mmadụ na Chineke? Olee otú Chineke si ele ndị nganga, ndị okomoko, na ndị mpako anya? Nganga ma ọ bụ ịdị umeala n’obi—hà gbasara ya?
Ihe Mmụta Banyere Ịdị Umeala n’Obi
Onye ahụ ji ike mmụọ nsọ dee Ilu na-ekwu, sị: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga. Ọ dị mma inwe mmụọ dị ala n’etiti ndị e wedara n’ala, karịa isoro ndị mpako kesaa ihe a kwatara n’agha.” (Ilu 16:18, 19) E gosipụtara amamihe dị n’okwu ndị ahụ nke ọma n’ihe banyere ọchịagha Siria bụ́ Neaman, onye dịrị ndụ n’oge onye amụma Israel bụ́ Elaịsha.
Neaman bụ onye ekpenta. Ka ọ na-achọ ọgwụgwọ, o mere njem gaa Sameria na-eche na ya ga-esoro Elaịsha kwurịta okwu. Kama nke ahụ, onye amụma ahụ zipụrụ onye na-ejere ya ozi, na-enye ya ntụziaka ka Neaman saa ahụ ugbo asaa n’Osimiri Jọdan. Neaman were iwe ná mmeso na ndụmọdụ ahụ. N’ihi gịnị ka onye amụma ahụ na-apụghị ịpụta ma gwa ya okwu n’onwe ya kama izite onye na-ejere ya ozi? N’eziekwa, osimiri ọ bụla dị na Siria dị mma dị ka Jọdan! Nganga bụ nsogbu ya. Gịnị si na ya pụta? N’ụzọ obi ụtọ nye ya, ndụmọdụ amamihe dị na ya karị meriri. “O wee rịdaa, sụnye onwe ya n’ime Jọdan ugbo asaa, dị ka okwu onye nke Chineke si dị: anụ ahụ ya wee laghachi dị ka anụ ahụ nwa okoro nta, o wee dị ọcha.”—2 Ndị Eze 5:14.
Mgbe ụfọdụ a na-enweta abamuru dị ukwuu site nnọọ ná ntakịrị ịdị umeala n’obi.
Ihe Mpako Na-efu
Otú ọ dị, ihe nganga na-efu anyị pụrụ ibu nnọọ ibu karịa nanị abamuru ụfọdụ ifunahụ anyị. E nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ọzọ nke ịdị nganga nke a pụrụ ịghọta site n’okwu Bekee bụ́ “hubris,” nke a kọwara dị ka “nganga gabigara ókè ma ọ bụ obi ike onwe onye nke na-akpata ntaramahụhụ mgbe mgbe.” (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) Okwu a gbanyere mkpọrọgwụ kpọmkwem na Grik, dịkwa ka ọkà mmụta bụ́ onye Gris bụ́ William Barclay si kwuo, “hubris bụ nganga na obi ọjọọ a gwakọtara ọnụ . . . , nlelị mpako nke na-eme ka [mmadụ] na-eweda mmadụ ibe ya ala.”
E nwere ihe atụ doro anya nke ụdị nganga a gabigara ókè n’ime Bible. Ọ bụ ihe banyere Hanun, bụ́ eze Amọn. Insight on the Scriptures na-akọwa, sị: “N’ihi ebere ịhụnanya Nehash mewooro ya, Devid zigara ndị ozi ịkasị Hanun obi maka ọnwụ nna ya. Ma Hanun, n’ịbụ onye ndị isi ya mere ka o kwenye na nke a bụ nanị aghụghọ nke Devid iji ledoo obodo ahụ, kparịrị ndị ozi Devid site n’ịkpụpụ nkera nke afụ ọnụ ha na ibipụ uwe mwụda ha ruo n’otule ha ma zilagazie ha.”a Banyere ihe omume a, Barclay na-ekwu, sị: “Mmeso ahụ bụ hubris. Ọ bụcha mkparị, iwe, mweda n’ala ihu ọha e jikọtara ọnụ.”—2 Samuel 10:1-5.
Ee, onye nganga nwere ike inwe àgwà hubris, nke ịkparị ndị ọzọ, nke iweda ha ala. Ọ na-enwe ọṅụ ịkpasu mmadụ iwe n’ụzọ enweghị mmetụta na obi ịta mmiri ma na-enwezi ọṅụ ná ntakasị ahụ na mmechuihu nke onye nke ọzọ. Ma imebi ùgwù onwe onye nke mmadụ bụ mma ihu abụọ. Ọ na-akpata enyi mmadụ ịhapụ ya, o yikarịkwara ka ọ na-eme ka e nwee onye iro.
Olee otú onye ọ bụla bụ́ ezi onye Kraịst pụrụ isi na-egosipụta ụdị nganga a na-emerụ ahụ, ebe ọ bụ na Onyenwe ya nyere iwu na ‘o kwesịrị ịhụ onye agbata obi ya n’anya dị ka onwe ya’? (Matiu 7:12; 22:39) O megidere nnọọ ihe nile Chineke na Kraịst kwadoro. N’ihi nke a, Barclay na-ekwu okwu ahụ dị mkpa, sị: “Hubris bụ nganga nke na-eme ka mmadụ leghara Chineke anya.” Ọ bụ nganga nke na-asị: “Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” (Abụ Ọma 14:1) Ma ọ bụ dị ka e si kwuo ya n’Abụ Ọma 10:4: “Onye na-emebi iwu, ka imi ya si dị elu, na-asị, Ọ dịghị ajụjụ Ọ ga-ajụ. Nzube ya nile na-asị, Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” Nganga, ma ọ bụ mpako dị otú ahụ, abụghị nanị na ọ na-ekewapụ mmadụ n’ebe ndị enyi na ndị ikwu nọ, kamakwa n’ebe Chineke nọ. Lee nnọọ ihe ọ na-efu!
Ekwela Ka Nganga Bibie Gị
Nganga pụrụ inwe ọtụtụ akụkụ—nganga nke na-esite n’ịhụ mba n’anya, n’ịkpa ókè agbụrụ, ịkpa ókè n’ihi ọkwá, n’agụmakwụkwọ, akụ̀ na ụba, ùgwù, na ike. N’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, nganga pụrụ ịbata n’ụzọ dị mfe ma bibie ụdị mmadụ ị bụ.
Ọtụtụ ndị na-eyi ndị dị umeala n’obi mgbe ha na ndị ka ha elu ma ọ bụ ndị ọgbọ ha na-emekọ ihe. Ma gịnị na-eme mgbe onye ahụ yiri onye dị umeala n’obi nwetara ọkwá? Na mberede, ọ na-aghọ onye ọchịchị nchịgbu nke na-eme ka ndụ bụrụ ihe nhụsianya nye ndị o chere na ọ ka elu! Nke a pụrụ ime ụfọdụ ndị mgbe ha yikwasịrị yunifọm ma ọ bụ baajị nke na-egosi ike. Ọbụna ndị ọrụ gọọmenti pụrụ ịdị nganga ná mmeso ndị ha na-emeso ọha na eze, na-eche na ọha na eze ga na-ejere ha ozi, ọ bụghị ha ijere ọha na eze ozi. Nganga pụrụ ime ka ị dị aka ike, ghara inwe mmetụta; ịdị umeala n’obi pụrụ ime ka i nwee obiọma.
Jisọs gaara adịworị nganga ma nwee obi ọjọọ n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ. Ọ bụ nwoke zuru okè, Ọkpara Chineke, nke so ụmụazụ na-ezughị okè, ndị na-eme ihe n’echezighị echiche, na-eme ihe n’ike n’ike, na-emekọ ihe. Ma, òkù dị aṅaa ka ọ kpọrọ ndị gere ntị? “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.
Ànyị na-agbalị ịgbaso ihe nlereanya Jisọs mgbe nile? Ka ànyị na-ahụta onwe anyị ịbụ ndị nwere obi ọjọọ, ndị na-adịghị ekwe ekwe, ndị ọchịchị nchịgbu, ndị na-adịghị eme ebere, ndị nganga? Dị ka Jisọs, gbalịa ime ka a na-ezuru ike, ọ bụghị imegbu emegbu. Guzogide mmetụta na-ebibi ebibi nke nganga.
N’ihi ihe ndị a tụleworo, nganga nile hà dị njọ?
Ùgwù Onwe Onye Megide Ibuli Onwe Onye Elu
Nganga bụkwa “ùgwù onwe onye ezi uche dị na ya ma ọ bụ nke ziri ezi.” (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) Ùgwù onwe onye pụtara ịkwanyere onwe gị ùgwù. Ọ pụtara na ihe ndị ọzọ na-eche banyere gị na-agbasa gị. Ị na-eche banyere ọdịdị gị na àgwà e ji mara gị. Ilu ndị Spain ahụ bụ eziokwu, “Gwa m ndị gị na ha na-eso, m ga-agwakwa gị onye ị bụ.” Ọ bụrụ na ị họrọ iso ndị ruru unyi, ndị umengwụ, ndị a na-azụghị azụ, na ndị na-ekwu okwu rere ure na-akpakọ, mgbe ahụ ị ga-adị ka ha. Ị ga-amụrụ àgwà ha, dịkwa ka ha, ị gaghị enwe ùgwù onwe onye.
Otú ọ dị, e nwere akụkụ nke ọzọ—nganga nke na-eduga n’ibuli onwe onye elu ma ọ bụ n’ihe efu. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nke oge Jisọs dị nganga n’ihi ọdịnala ha na ọdịdị ha nke iji okpukpe kpọrọ ihe n’ụzọ gabigara ókè. Jisọs dọrọ aka ná ntị banyere ha, sị: “Ọrụ ha nile ka ha na-arụ ka mmadụ wee kirie ha: n’ihi na ha na-eme ka phylactery nile ha dị obosara, meekwa ka ọnụ ọnụ uwe ha dị ukwuu [iji yie ndị dị nsọ karị], ha na-ahụkwa isi ọnọdụ nile n’oriri nile unu n’anya, na isi oche nile n’ụlọ nzukọ unu, na ekele n’ọmà ahịa nile unu, na ka mmadụ na-akpọ ha, Rabaị.”—Matiu 23:5-7.
Mgbe ahụ, nganga kwesịrị ekwesị bụ àgwà ziri ezi. Chetakwa na Jehova na-ahụ obi, ọ bụghị nanị ihe e mepụtara ìhè. (1 Samuel 16:7; Jeremaịa 17:10) Ịbụ onye ezi omume n’anya onwe onye abụghị ezi omume Chineke. Otú ọ dị, ajụjụ dị ugbu a bụ, Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ezi ịdị umeala n’obi ma zere ịta oké ahụhụ nke nganga na-akpata?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ntakịrị ịdị umeala n’obi wetaara Neaman abamuru dị ukwuu