Ọkpụite Ukwu Ahụ Na Ọrụ ya
“[Bụrụ] ihe e mere ka ọ bụrụ ihe nsọpụrụ, . . . ihe e doziworo iji rụọ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 TIMOTI 2:21.
1, 2. (a) Olee otú okike Chineke kere nwoke na nwanyị si bụrụ ọrụ dị ịrịba ama? (b) N’ihi nzube dị aṅaa ka Ọkpụite Ukwu ahụ ji kee Adam na Iv?
JEHOVA bụ Ọkpụite Ukwu ahụ. Otu ọrụ nkà nke ihe o kere bụ nna anyị mbụ, bụ́ Adam. Bible na-agwa anyị, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ,” ya bụ́, “ihe e kere eke na-eku ume.” (Jenesis 2:7, ntụaka ala ala peji nke NW) Ihe mbụ ahụ e kere eke bụ́ mmadụ, zuru okè, a kpụrụ ya nnọọ n’onyinyo Chineke, bụ́ otu ihe àmà nke amamihe na ịhụnanya Ya maka ezi omume na ikpe ziri ezi.
2 N’iji ihe sitere n’ọgịrịga Adam mee ihe, Chineke kpụkwaara nwoke onye inyeaka—nwanyị. Oké ịma mma Iv karịrị ọbụna nke nwanyị kasị mma taa. (Jenesis 2:21-23) Ọzọkwa, e nyere di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ ahụ na ike iche echiche ndị e mere n’ụzọ zuru okè maka ịrụzu ọrụ e kenyere ha bụ́ ime ka elu ala a ghọọ paradaịs. E nyekwara ha ikike nke imezu iwu Chineke nke e dekọrọ na Jenesis 1:28: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” N’ikpeazụ, ogige a zuru ụwa ọnụ ga-abụ nke ọtụtụ ijeri mmadụ ndị nwere ọṅụ ga-ejupụta, bụ́ ndị ụdị ịhụnanya nke bụ “ihe nkekọ nke izu okè” jikọrọ ọnụ.—Ndị Kọlọsi 3:14.
3. Olee otú nne na nna anyị mbụ si ghọọ arịa ndị na-eweta ihere, gịnịkwa si na ya pụta?
3 N’ụzọ dị mwute, nne na nna anyị mbụ ma ụma họrọ inupụ isi megide ịbụisi nke Onye Okike Ukwu ha, bụ́ Ọkpụite Ukwu ahụ. Ụzọ ndụ ha ghọrọ nke dị ka nke a kọwara n’Aịsaịa 29:15, 16: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ezonahụ Jehova ndụmọdụ ha n’ebe dị omimi, ndị ọ bụkwa n’ọchịchịrị ka a na-arụ ọrụ nile ha, ha wee sị, Ònye na-ahụ anyị? ma ọ bụ ònye maara anyị? . . . Ọ̀ bụ n’ụrọ ka a ga-agụ ọkpụite? na ihe e mere eme ga-ekwu okwu banyere onye meworo ya, sị, O meghị m; ma ọ bụ na ihe a kpụrụ akpụ ga-ekwu okwu banyere onye kpụworo ya, sị, Ọ ghọtaghị.” Isi ike ha wetara ọdachi—amamikpe nke ọnwụ ebighị ebi. Ọzọkwa, agbụrụ mmadụ nile ha mụtara ketara mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12, 18) Ịma mma nke ihe Ọkpụite Ukwu ahụ kere ghọrọ nke e nyere ntụpọ dị ukwuu.
4. Uru dị aṅaa na-eweta nsọpụrụ ka anyị pụrụ ịba?
4 Otú ọ dị, ọbụna n’ọnọdụ ezughị okè anyị, anyị bụ́ ụmụ Adam bụ́ onye mmehie pụrụ ito Jehova n’okwu ndị nke Abụ Ọma 139:14: “M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile [bụ]; mkpụrụ obi m [maarakwara] ya nke ọma.” Otú ọ dị, lee ihe mwute ọ bụ na e mewo ka ọrụ aka mbụ nke Ọkpụite Ukwu ahụ nwee ntụpọ n’ụzọ dị egwu!
Ọkpụite ahụ Agbasapụ Ọrụ Ya
5. Olee otú a gaje isi gosipụta nkà nke Ọkpụite Ukwu ahụ?
5 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, a gaje iji nkà nke Onye Okike anyị dị ka Ọkpụite mee ihe karịrị nnọọ ọkpụkpụ ọ kpụrụ ihe mbụ o kere eke bụ́ mmadụ. Pọl onyeozi na-agwa anyị, sị: “Ajụjụ kwesịkarịrị ịjụ, gị mmadụ, bụ, Gị onwe gị bụ ònye, nke na-aza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ ga-abụ na ihe a kpụworo ga-asị onye kpụrụ ya, Gịnị mere ị kpụrụ m otú a? Ma ọ bụ ọkpụite, ò nweghị ike n’ebe ụrọ dị, isite n’otu ọkpụkpụ ụrọ ahụ o doziri mee nke a ka ọ bụrụ ihe ga-anara nsọpụrụ, meekwa nke ọzọ ka ọ bụrụ ihe a ga-eme ihe ihere?”—Ndị Rom 9:20, 21.
6, 7. (a) Olee otú ọtụtụ ndị taa si ahọrọ ịbụ ndị a kpụrụ maka ihe na-eweta ihe ihere? (b) Olee otú e si akpụzi ndị ezi omume ịbụ ihe na-eweta nsọpụrụ?
6 Ee, a ga-akpụzi ụfọdụ n’ime ọrụ Ọkpụite Ukwu ahụ ịbụ ihe na-eweta nsọpụrụ, ụfọdụkwa, ịbụ ihe na-eweta ihere. A na-akpụzi ndị ahụ họọrọ isoro ụwa na-agakọ ka ọ na-emikpukwu n’ọnọdụ nke asọpụrụghị Chineke gaa n’ụzọ nke ga-aka ha akara maka mbibi. Mgbe Eze ahụ dị ebube, bụ́ Kraịst Jisọs, ga-abịa maka ikpe ikpe, arịa ndị dị otú ahụ na-eweta ihe ihere ga-agụnye ndị nile yiri ewu bụ́ ndị na-akpọ ekwo nkụ ndị, dị ka Matiu 25:46 na-ekwu, “ga-apụ jee baa n’ahụhụ mmehie ebighị ebi.” Ma “ndị ezi omume” yiri atụrụ, bụ́ ndị a kpụziri iweta “nsọpụrụ,” ga-eketa “ndụ ebighị ebi.”
7 N’ụzọ obi umeala, ndị ezi omume a ga-ekwenyewo ná mkpụzi Chineke. Ha abanyewo n’ụzọ ndụ nke Chineke. Ha anabatawo ndụmọdụ ahụ dị na 1 Timoti 6:17-19 bụ́: “Ịtụkwasị obi [ọ bụghị] n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ̀, kama ka ha tụkwasị obi na Chineke, Onye na-ewere akụ̀ Ya nye anyị ihe nile ka ha bụrụ ihe ga-atọ anyị ụtọ.” Ha etinyewo onwe ha ‘n’ime ezi ihe, ịbụ ọgaranya n’ọrụ ọma nile, ịbụ ndị kwadebeworo ime ka ndị ọzọ keta ihe ha nwere, ịbụ ndị kwere ka ndị ọzọ soro ha nwekọọ ihe; ịkpadoro onwe ha ntọala ọma nye oge gaje ịbịa, ka ha wee jide ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’ Ọ bụ eziokwu Chineke na-akpụzi ha, ha na-egosipụtakwa okwukwe a na-apụghị imebi emebi ná ndokwa Jehova site na Kraịst Jisọs, bụ́ onye “nyere Onwe ya ka Ọ bụrụ ihe mgbapụta” iji weghachi ihe nile a tụfuru site ná mmehie Adam. (1 Timoti 2:6) Mgbe ahụ, lee otú anyị kwesịrị isi jiri obi anyị kwenye n’ịdọ aka ná ntị Pọl bụ́ “[iyikwasị onwe anyị] mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ [a na-akpụzi] ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị”!—Ndị Kọlọsi 3:10.
Ụdị Arịa Dị Aṅaa Ka Ị Ga-abụ?
8. (a) Gịnị na-ekpebi ụdị arịa mmadụ ga-aghọ? (b) Ihe abụọ dị aṅaa na-ekpebi otú a ga-esi kpụzie mmadụ?
8 Gịnị na-ekpebi ụdị arịa mmadụ ga-aghọ? Àgwà na omume ya. Nke mbụ, a na-akpụzi ihe ndị a site n’ọchịchọ na agụụ nke obi. Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Obi mmadụ na-eche ụzọ ya: ma Jehova na-eme ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Ilu 16:9) Nke abụọ, a na-akpụzi ha site n’ihe ndị a na-anụ ma na-ahụ, mkpakọrịta na ahụmahụ. Lezie otú o si dị mkpa na anyị ga-aṅa ntị na ndụmọdụ bụ́: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Dị ka 2 Pita 1:16 na-adọ anyị aka ná ntị, anyị aghaghị izere ịgbaso “akụkọ ifo nke e ji amamihe kọọ,” ma ọ bụ dị ka nsụgharị knox nke Roman Katọlik si kwuo ya, “akụkọ ifo ndị mmadụ chepụtara.” Ndị a ga-agụnye ọtụtụ n’ime ozizi na ememe nke Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ.
9. Olee otú anyị pụrụ isi meghachi omume n’ụzọ dị mma nye mkpụzi nke Ọkpụite Ukwu ahụ?
9 Dị ka ụzọ anyị si emeghachi omume si dị, Chineke pụziri ịkpụzi anyị. Anyị pụrụ iji obi umeala kpeghachi ekpere Devid n’ihu Jehova, sị: “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: na-anwa m, wee mara iche uche m nile: hụkwa ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu dị n’ime m, durukwa m n’ụzọ ebighị ebi.” (Abụ Ọma 139:23, 24) Jehova na-eme ka e kwusaa ozi Alaeze ahụ. Obi anyị ejiriwo ekele zaghachi n’ozi ọma ahụ na nduzi ya ndị ọzọ. Site ná nzukọ ya ọ na-eme ka ihe ùgwù dị iche iche ndị metụtara ikwusa ozi ọma rute anyị aka; ka anyị jigide ihe ndị a ma jiri ha kpọrọ ihe.—Ndị Filipaị 1:9-11.
10. Olee otú anyị kwesịrị isi dọgbuo onwe anyị n’ọrụ n’ịgbaso usoro ihe omume ime mmụọ dị iche iche?
10 Ọ dị oké mkpa ka anyị na-aṅa ntị mgbe nile n’Okwu Chineke, na-agbaso usoro ọgụgụ Bible a na-enwe kwa ụbọchị, na-emekwa Akwụkwọ Nsọ na ozi Jehova ihe ndabere maka nkwurịta okwu n’ime ezinụlọ anyị nakwa n’etiti ndị enyi anyị. Usoro ihe omume maka ife ofufe n’ụtụtụ nke ezinụlọ Betel na ìgwè ndị ozi ala ọzọ ọ bụla nke Ndịàmà Jehova na-enwe na tebụl nri ha n’ụtụtụ na-agụnyekarị ọgụgụ dị mkpirikpi nke Bible ma ọ bụ nke Yearbook kasị ọhụrụ, bụ́ ndị a na-eme a gụọ nke a n’izu a, n’izu nke ọzọ a gụọ ibe ya. Ezinụlọ gị ọ̀ pụrụ inwe ndokwa yiri nke ahụ? Leekwa abamuru anyị nile na-enweta site ná mkpakọrịta nke anyị na-enwe n’ọgbakọ ndị Kraịst, ná nzukọta ọnụ anyị, karịsịakwa site n’òkè anyị na-ekere n’ọmụmụ ihe Ụlọ Nche kwa izu!
Ndị A Kpụziri Ịnagide Ọnwụnwa
11, 12. (a) Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Jemes banyere ule ndị anyị na-enwe ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị n’ọrụ? (b) Olee otú ahụmahụ Job si agba anyị ume iguzosi ike n’ezi ihe?
11 Ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, Chineke na-ekwe ka ọnọdụ ụfọdụ bilite, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha pụrụ isiri anyị ike. Olee otú anyị kwesịrị isi lee ndị a anya? Dị ka Jemes 4:8 si dụọ ọdụ, ka anyị ghara inwe obi ilu ma ọlị, kama ka anyị bịaruo Chineke nso, jiri obi anyị nile tụkwasị ya obi, na-enwe obi ike na ka anyị ‘na-abịaru ya nso, Ọ ga-abịarukwa anyị nso.’ N’eziokwu, anyị gaje ịtachiri ihe isi ike na ule dị iche iche obi, ma e kwere ka ha dịrị dị ka ihe na-atụnye ụtụ ná mkpụzi anyị, bụ́ nke na-arụpụta obi ụtọ. Jemes 1:2, 3 na-emesi anyị obi ike, sị: “Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụnwa dị iche iche; ebe unu maara na nnwapụta nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi.”
12 Jemes na-ekwukwa, sị: “Ka onye ọ bụla ghara ịsị, mgbe a na-anwa ya, A na-esite n’aka Chineke anwa m: n’ihi na Chineke bụ Onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa Ya, Ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla: kama a na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya.” (Jemes 1:13, 14) Ọnwụnwa anyị pụrụ ịdị ọtụtụ ma dịgasịa iche, ma dị ka ọ dị n’ebe Job nọ, ha nile na-ekere òkè n’ịkpụzi anyị. Lee mmesi obi ike magburu onwe ya nke Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị na Jemes 5:11: “Lee, anyị na-akpọ ha ndị ngọzi dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi: unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị zubere, na Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” Dị ka arịa ndị dị n’aka Ọkpụite Ukwu ahụ, ka anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe nile, na-enwe obi ike yiri nke Job n’ihe ga-esi na ya pụta!—Job 2:3, 9, 10; 27:5; 31:1-6; 42:12-15.
Ịkpụzi Ụmụntakịrị Anyị
13, 14. (a) Olee mgbe ndị nne na nna kwesịrị ịmalite ịkpụzi ụmụ ha, ọ̀ bụkwa n’atụmanya nke ịrụpụta gịnị n’ikpeazụ? (b) Olee ihe ndị na-eweta obi ụtọ ọ rụpụtaworo ndị ị pụrụ ihota?
13 Nne na nna pụrụ ikere òkè n’ịkpụzi ụmụaka ha, site n’oge ụmụntakịrị ahụ bụ ụmụ ọhụrụ, leekwa ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ụmụ anyị na-eto eto pụrụ ịghọ! (2 Timoti 3:14, 15) Nke a abụwo eziokwu ọbụna mgbe ule ndị ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ụfọdụ afọ gara aga, mgbe mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’otu ala Africa, otu ezinụlọ a pụrụ ịtụkwasị obi hụrụ maka mbipụta nke Ụlọ Nche na nzuzo n’ime otu ụlọ dị n’azụ ụlọ. Otu ụbọchị ndị soja si n’okporo ámá na-agbadata, na-eme nnyocha site n’ụlọ ruo n’ụlọ maka ndị ikom na-eto eto a ga-edenye aha ha n’usuu ndị agha. Oge ka dịịrị ụmụ okoro abụọ nọ n’ezinụlọ a izo, ma nnyocha ndị soja ahụ ga-eme ka a hụ ígwè obibi akwụkwọ ahụ. Nke a pụrụ iduga ná mmekpọ ọnụ ma ọ bụ ikekwe n’igbu ezinụlọ ahụ dum. Gịnị ka a pụrụ ime? Ụmụ okoro abụọ ahụ kwupụtara obi ha, jiri anyaike na-ehota Jọn 15:13: “Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karị nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.” Ha siri ọnwụ na ha ga-anọ na palọ ahụ. Ndị soja ahụ ga-ahụ ha, obi abụọ adịghịkwa ya na ha ga-emekpọ ha ọnụ n’ụzọ obi ọjọọ ma ọ bụ ọbụna gbuo ha mgbe ha ga-ajụ ịbụ ndị e denyere aha ha n’usuu ndị agha. Ma ha agaghịzi emekwu nnyocha. A ga-echebe ígwè obibi akwụkwọ ahụ na ndị òtù ọzọ nke ezinụlọ ahụ. Otú ọ dị, e nwere ihe dị ịrịba ama merenụ. Ndị soja ahụ mafere otu ụlọ a n’ezie, na-aga ná ndị ọzọ! Arịa ndị ahụ bụ́ mmadụ bụ́ ndị a kpụziri maka iweta nsọpụrụ lanarịrị, ha na ígwè obibi akwụkwọ ahụ, iji nọgide na-ebipụta nri ime mmụọ n’oge ya. Otu n’ime ụmụ okoro abụọ ahụ na nwanne ya nwanyị na-eje ozi ugbu a na Betel; ọ ka na-eji ígwè ochie ahụ arụ ọrụ.
14 A pụrụ ịkụziri ndị na-eto eto otú e si ekpe ekpere, Chineke na-azakwa ekpere ha. Otu ihe atụ pụtara ìhè banyere nke a mere n’oge mgbuchapụ ndị mere na Rwanda. Mgbe ndị agha nnupụisi kwadebeworo otu nwata dị afọ isii na nne na nna ya maka iji bọmbụ grenade gbuo ha, nwa ha nwanyị ahụ kpesiri ekpere ike n’olu dara ụda ka e chebe ha maka ijekwuru Jehova ozi. A kpaliri ndị ahụ gaje igbu ha ịhapụ ha, ha sịrị, “Anyị apụghị igbu unu n’ihi nwatakịrị nwanyị a.”—1 Pita 3:12.
15. Mmetụta ndị dị aṅaa na-emerụ emerụ ka Pọl dọrọ aka ná ntị banyere ha?
15 Ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ anyị na-eto eto adịghị eche ọnọdụ ndị siri ike dị ka ndị ahụ a kọwara n’elu ihu, ma e nwere ọtụtụ ule ha na-eche ihu n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ọha mmadụ rụrụ arụ taa: okwu ọjọọ, ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ntụrụndụ rụrụ arụ, na nrụgide ndị ọgbọ itinye aka n’omume na-ezighị ezi, na-arị ibe ha elu n’ọtụtụ ebe. Ugboro ugboro, Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị megide ihe ndị a.—1 Ndị Kọrint 5:6; 15:33, 34; Ndị Efesọs 5:3-7.
16. Olee otú mmadụ pụrụ isi ghọọ arịa na-eweta nsọpụrụ?
16 Mgbe o zosịrị aka n’arịa ndị e mere “ụfọdụ ka ha bụrụ ihe nsọpụrụ, meekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ihe ihere,” Pọl sịrị: “Ya mere ọ bụrụ na onye ọ bụla asachaa onwe ya pụọ n’ihe ndị a, ọ ga-abụ ihe e mere ka ọ bụrụ ihe nsọpụrụ, ihe e doworo nsọ, ihe bara n’ihe ka Onyenwe ya were ya mee ihe, ihe e doziworo iji rụọ ezi ọrụ nile ọ bụla.” Ya mere ka anyị gbaa ndị ntorobịa anyị ume ilezi anya ná mkpakọrịta ha. Ka ha “na-agbanahụ agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa, na-agbasokwa ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo, [ha] na ndị na-akpọku Onyenwe anyị site n’obi dị ọcha.” (2 Timoti 2:20-22) Usoro ihe omume ezinụlọ maka ‘iwulirịta ibe anyị elu’ pụrụ ịba oké uru n’ịkpụzi ndị ntorobịa anyị. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:11; Ilu 22:6) Ọgụgụ na ọmụmụ Bible kwa ụbọchị bụ́ nke e ji mbipụta ndị kwesịrị ekwesị nke Society na-eme pụrụ ịbụ ihe enyemaka dị mma.
Mkpụzi Dịịrị Mmadụ Nile
17. Olee otú ịdọ aka ná ntị ga-esi akpụzi anyị, ihe dị aṅaa na-eweta ọṅụ ga-esikwa na ya apụta?
17 Iji kpụzie anyị, Jehova na-enye ndụmọdụ site n’Okwu ya na site ná nzukọ ya. Eguzogidela ndụmọdụ dị otú ahụ nke Chineke ma ọlị! Jiri amamihe meghachi omume n’ebe ọ dị, kweekwa ka ọ kpụzie gị maka Jehova iji gị mee ihe na-eweta nsọpụrụ. Ilu 3:11, 12 na-adụ ọdụ, sị: “Nwa m, ajụla ịdọ aka ná ntị nke Jehova: ike agwụkwala gị n’ịba mba Ya: n’ihi na onye Jehova na-ahụ n’anya ka Ọ na-abara mba; ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.” E nyekwuru ndụmọdụ yiri nke nna ná Ndị Hibru 12:6-11: “Onye Onyenwe anyị hụrụ n’anya ka Ọ na-ezi ihe site n’inye ya ahụhụ . . . Ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute: ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e werewooro ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.” Ebe bụ́ isi e si enweta ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ aghaghị ịbụ Okwu si n’obi Chineke pụta.—2 Timoti 3:16, 17.
18. Banyere nchegharị, gịnị ka anyị na-amụta na Luk isi nke 15?
18 Jehova nwekwara obi ebere. (Ọpụpụ 34:6) Ebe e gosipụtara nchegharị si n’obi maka ọbụna mmehie kasị njọ, ọ na-agbaghara. Ọbụna a pụrụ ịkpụzi ‘ụmụ mmefu’ nke oge a ịghọ arịa ndị na-eweta nsọpụrụ. (Luk 15:22-24, 32) Mmehie anyị nwere ike ọ gaghị adịru njọ dị ka nke nwa mmefu ahụ. Ma mmeghachi omume anyị n’ụzọ obi umeala nye ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ga-eduga mgbe mgbe na anyị ịbụ ndị a kpụziri ịghọ arịa na-eweta nsọpụrụ.
19. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-eje ozi dị ka arịa ndị na-eweta nsọpụrụ bụ́ ndị dị n’aka Jehova?
19 Mgbe mbụ anyị mụtara eziokwu, anyị gosiri ịdị njikere ikwe ka Jehova kpụzie anyị. Anyị hapụrụ ụzọ nke ụwa, malite iyikwasị mmadụ ọhụrụ, ghọọkwa ndị Kraịst raara onwe ha nye, e mekwara baptism. Anyị rubere isi ná ndụmọdụ nke Ndị Efesọs 4:20-24, ‘na-atụpụ mmadụ ochie ahụ, nke na-emebi emebi n’ụzọ agụụ nke aghụghọ, dị ka ibi obi anyị na mbụ si dị; na-eyikwasịkwa mmadụ ọhụrụ ahụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ Ka anyị nọgide n’otu n’otu na-abụ ndị dị mfe mkpụgharị n’aka Jehova, bụ́ Ọkpụite Ukwu ahụ, na-eje ozi mgbe nile dị ka arịa ndị na-ewetara ya nsọpụrụ!
Ná Ntụleghachi
◻ Gịnị bụ nzube Ọkpụite Ukwu ahụ banyere elu ala anyị?
◻ Olee otú a pụrụ isi kpụzie gị maka iweta nsọpụrụ?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi kpụzie ụmụaka anyị?
◻ Olee otú anyị kwesịrị isi ele ịdọ aka ná ntị anya?
[Foto dị na peeji nke 10]
À ga-akpụzi gị maka iweta nsọpụrụ ka à ga-ajụ gị?
[Foto dị na peeji nke 12]
A pụrụ ịkpụzi ndị na-eto eto site n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ