“Jehova” Ka Ọ̀ Bụ “Yahweh”?
“OKWU a gwakọtara agwakọta,” “okwu e tigwara etigwa,” “okwu na-adabaghị adaba.” Gịnị ga-eme ka ndị ọkà mmụta n’asụsụ Hibru e ji dee Bible jiri okwu ndị dị ike otú ahụ mee ihe? Ihe na-ese okwu bụ ma “Jehova” ọ̀ bụ ụzọ ziri ezi isi akpọpụta aha Chineke n’asụsụ Bekee. Ruo ihe karịrị otu narị afọ, esemokwu a anọwo na-aga n’ihu. Taa, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta yiri ka ha kwadoro okwu ahụ nwere nkeji ụda olu abụọ bụ́ “Yahweh.” Ma ịkpọ okwu ahụ bụ́ “Jehova” ọ̀ bụ nnọọ nke “na-adabaghị adaba” n’ezie?
N’ebe Esemokwu ahụ Si Malite
Dị ka Bible si kwuo, Chineke n’onwe ya kpughere aha ya nye ihe a kpọrọ mmadụ. (Ọpụpụ 3:15) Ihe àmà dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ndị ohu Chineke n’oge ochie alaghị azụ n’iji aha ahụ mee ihe. (Jenesis 12:8; Rut 2:4) Mba ndị ọzọ makwaara aha Chineke. (Joshua 2:9) Nke a bụ eziokwu karịsịa mgbe ndị Juu si ná ndọrọ n’agha na Babilọn lọta soworo ndị si n’ọtụtụ mba mekọọ ihe. (Abụ Ọma 96:2-10; Aịsaịa 12:4; Malakaị 1:11) The Interpreter’s Dictionary of the Bible na-ekwu, sị: “E nwere ihe àmà buru ibu na-egosi na mgbe ndọrọ n’agha ahụ gasịrị, a dọtara ọtụtụ ndị ala ọzọ n’okpukpe ndị Juu.” Otú ọ dị, ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., nkwenkwe ụgha banyere aha Chineke amalitela. N’ikpeazụ, ọ bụghị nanị na mba ndị Juu kwụsịrị iji aha Chineke eme ihe n’ihu ọha kamakwa ụfọdụ ndị machibidoro ịkpọpụta ya iwu kpam kpam. E si otú a tụfuo ụzọ ziri ezi e si akpọpụta ya—ka è tufuru ya n’ezie?
Gịnị Dị n’Aha?
N’asụsụ Hibru, otú e si ede aha Chineke bụ יהוה. A na-akpọkarị mkpụrụ akwụkwọ anọ a, bụ́ ndị a na-agụ site n’aka nri gaa n’aka ekpe, Tetragrammaton. Ọtụtụ aha ndị mmadụ na ebe ndị a kpọtụrụ aha n’ime Bible nwere aha Chineke n’ụdị e gburu nkenke. Ò kwere omume na aha aka ndị a pụrụ inye ntụpenye azụ̀ ụfọdụ n’ihe banyere otú e si akpọpụta aha Chineke?
Dị ka George Buchanan, bụ́ onye e nyere ọkwá prọfesọ na Seminarị Nkà Mmụta Okpukpe nke Wesley, Washington, D.C., U.S.A., si kwuo, azịza ya bụ ee. Prọfesọ Buchanan na-akọwa, sị: “N’oge ochie, ndị mụrụ ụmụ na-agụkarị ụmụ ha aha chi ha. Nke ahụ pụtara na ha ga-akpọpụtaworị aha ụmụ ha otú ahụ e si akpọpụta aha chi ahụ. E ji Tetragrammaton mee ihe n’aha ndị mmadụ, ha na-ejikwa ụdaume ahụ dị n’etiti eme ihe mgbe nile.”
Tụlee ihe atụ ole na ole nke aha aka ndị dị n’ime Bible bụ́ ndị na-agụnye ndebiri nke aha Chineke. Jonatan, nke na-apụta dị ka Yoh·na·thanʹ ma ọ bụ Yehoh·na·thanʹ na Bible Hibru, pụtara “Yaho ma ọ bụ Yahowah enyewo,” ka Prọfesọ Buchanan na-ekwu. Aha Elaịja onye amụma bụ ʼE·li·yahʹ ma ọ bụ ʼE·li·yaʹhu n’asụsụ Hibru. Dị ka Prọfesọ Buchanan si kwuo, aha ahụ pụtara: “Chineke m bụ Yahoo ma ọ bụ Yahoo-wah.” N’otu aka ahụ, aha Hibru maka Jehoshafat bụ Yehoh-sha·phatʹ, nke pụtara “Yaho ekpewo ikpe.”
Mkpọpụta nwere nkeji ụda olu abụọ nke Tetragrammaton ahụ dị ka “Yahweh” agaghị ekwe ka ụda ụdaume o ahụ dịrị dị ka akụkụ nke aha Chineke. Ma n’ọtụtụ aha Bible ndị e tinyere aha Chineke, ụda ụdaume etiti a na-apụta ma n’ebe e si were ha ma n’ụdị e debiiri edebiri, dị ka ọ dị na Jehonathan na Jonathan. N’ihi ya, Prọfesọ Buchanan na-ekwu banyere aha Chineke, sị: “Ọ dịghị mgbe a na-amafere ụdaume ahụ bụ́ oo ma ọ bụ oh. Mgbe ụfọdụ, a na-egbu okwu ahụ nkenke dị ka ‘Ya,’ ma ọ dịghị mgbe ọ bụ dị ka ‘Ya-weh.’ . . . Mgbe a kpọpụtara Tetragrammaton n’otu nkeji ụda olu, ọ bụ ‘Yah’ ma ọ bụ ‘Yo.’ Mgbe a kpọpụtara ya ná nkeji ụda olu atọ ọ ga-abụworị ‘Yahowah’ ma ọ bụ ‘Yahoowah.’ Ọ bụrụ na ọ dị mgbe e gburu ya nkenke gaa ná nkeji ụda ọlụ abụọ ọ ga-abụworị ‘Yaho.’”—Biblical Archaeology Review.
Okwu ndị a na-enyere anyị aka ịghọta okwu onye ọkà mmụta Hibru nke narị afọ nke 19 bụ́ Gesenius kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Hebrew and Chaldee Lexicon to the Old Testament Scriptures: “Ndị na-eche na יְהוָֹה [Ye-ho-wah] bụ mkpọpụta nke [aha Chineke] n’ezie abụghị ndị na-enwechaghi ebe ha gbakwasịrị ụkwụ iji kwadoo echiche ha. N’ụzọ dị otú a ka a pụrụ isi kọwaa nkeji ụda olu ndị ahụ e gburu nkenke bụ́ יְהוֹ [Ye-ho] na יוֹ [Yo], bụ́ nke ọtụtụ aha aka ji malite, n’ụzọ na-eju afọ karị.”
Otú o sina dị, n’okwu mmalite nke nsụgharị nke The Five Books of Moses nke o mere na nso nso a, Everett Fox na-ekwu, sị: “Ma mgbalị ndị ochie ma ndị ọhụrụ e merela iji wetaghachi ụzọ ‘ziri ezi’ e si akpọpụta aha Hibru [nke Chineke] enwebeghị isi; a pụghị ịnwapụta ‘Jehova’ ahụ a na-anụ mgbe ụfọdụ ma ọ bụ ‘Yahweh’ ahụ ndị ọkà mmụta nakweere, n’enweghị mgbagha.”
Obi abụọ adịghị ya na arụmụka nke ndị nkà mmụta ahụ ga-aga n’ihu. Ndị Juu kwụsịrị ịkpọ aha ezi Chineke ahụ tupu ndị Masorete ewepụta usoro nke akara ụdaume. N’ihi ya, e nweghị ụzọ doro anya isi nwapụta ụdaume ndị so mgbochiume ndị bụ́ YHWH (יהוה). Ma, aha nke ndị a kpọrọ aha n’ime Bible—ndị na-atụfubeghị ụzọ ziri ezi e si akpọpụta ha—na-enye ntụpenye azụ̀ gbara ọkpụrụkpụ n’ụzọ e si akpọpụta aha Chineke n’oge ochie. N’ihi eziokwu a, ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwetara na mkpọpụta ahụ bụ́ “Jehova” abụchaghị nke “na-adabaghị adaba” ma e kwuwerị.
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
“Jehova” abụrụwo mkpọpụta a kasị mara nke aha Chineke