Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 3/1 p. 18-23
  • Ngọzi Jehova ‘n’Ala’ Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngọzi Jehova ‘n’Ala’ Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Osimiri Eruo n’Ala E Weghachiri
  • Nrupụta Dị Ukwuu nke Ngọzi
  • Mmiri ahụ Eweta Ndụ!
  • Osimiri ahụ Eruo n’Ime Paradaịs
  • “Ihe Ọ Bụla nke Dị n’Ebe Iyi ahụ Sọrutere Ga-adị Ndụ”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • ‘Tụkwasị Obi Gị’ N’ụlọukwu Chineke!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • ‘Kọọ Otú Ụlọ Nsọ A Dị’
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 3/1 p. 18-23

Ngọzi Jehova ‘n’Ala’ Anyị

“Ihe nile ọ bụla ga-adịkwa ndụ n’ebe osimiri ahụ ga-erute.”—EZIKIEL 47:9.

1, 2. (a) Olee otú mmiri dịruru ná mkpa? (b) Gịnị ka mmiri nke osimiri ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-ese onyinyo ya?

MMIRI dị mkpa. Ndụ nke ihe ọ bụla a na-ahụ anya dabeere na ya. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịdịte ndụ aka ma ọ dịghị. Anyị na-ejikwa ya asacha ihe, ebe mmiri pụrụ ịgbari ma sachapụ ihe ndị na-adịghị ọcha. Ya mere anyị na-eji ya asa ahụ, uwe anyị, ọbụna ihe oriri anyị. Ime otú ahụ pụrụ ịzọpụta ndụ anyị.

2 Bible ji mmiri ese onyinyo ndokwa ime mmụọ nile nke Jehova maka ndụ. (Jeremaịa 2:13; Jọn 4:7-15) Ndokwa ndị a gụnyere nsacha nke ndị ya site n’àjà mgbapụta Kraịst na ihe ọmụma Chineke a na-achọta n’Okwu ya. (Ndị Efesọs 5:25-27) N’ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu, osimiri ọrụ ebube ahụ nke si n’ụlọukwu ahụ na-erupụta na-anọchite anya ngọzi ndị dị otú ahụ na-enye ndụ. Ma olee mgbe mmiri ahụ na-eru, gịnịkwa ka ọ pụtara nye anyị taa?

Otu Osimiri Eruo n’Ala E Weghachiri

3. Gịnị ka Ezikiel hụrụ, dị ka e dekọrọ n’Ezikiel 47:2-12?

3 Dị ka ndị e ji eji na Babilọn, ndokwa Jehova dị ndị obodo Ezikiel mkpa nke ukwuu. Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe agbamume nye Ezikiel ịhụ ka ntakịrị mmiri si n’ebe nsọ ahụ pụta, sikwa n’ụlọukwu ahụ a hụrụ n’ọhụụ na-erupụta! Otu mmụọ ozi na-atụ osimiri ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’agbata nke cubit 1,000 site n’ebe mbụ ọ tụrụ ya. Ọ na-adịwanye ogbu malite n’iru na nkwonkwo ụkwụ ruo n’iru n’ikpere ụkwụ ruo n’iru n’úkwù ruo n’ịghọ mmiri na-ekwo ekwo nke a pụrụ igwu egwu. Osimiri ahụ na-eweta ndụ ma na-eme ka ala mepụta ihe. (Ezikiel 47:2-11) A gwara Ezikiel, sị: “Ọ bụkwa n’osimiri ahụ, n’ụsọ ya, n’otu akụkụ na n’akụkụ nke ọzọ, ka osisi ọ bụla nke na-amị mkpụrụ oriri ga-eto.” (Ezikiel 47:12a) Ka osimiri ahụ na-abanye n’Osimiri Nwụrụ Anwụ—mmiri nke na-enweghị ihe dị ndụ n’ime ya—ihe ndị dị ndụ amalite ịdị! Azụ̀ ejupụta. Ọrụ ịkụ azụ̀ na-aga n’ihu.

4, 5. Olee otú amụma Joel banyere otu osimiri si yie nke Ezikiel, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji dị ịrịba ama?

4 Amụma a mara mma pụrụ ichetawororị ndị Juu ahụ a chụpụrụ n’ala ha amụma ọzọ e dekọrọ ihe karịrị narị afọ abụọ tupu mgbe ahụ: “Isi iyi ga-esikwa n’ụlọ Jehova pụta, dee ndagwurugwu Shitim.”a (Joel 3:18) Amụma Joel, dị ka nke Ezikiel, na-ekwu na osimiri ga-esi n’ụlọ Chineke, ụlọukwu ahụ, rupụta ma mee ka ndụ dị n’ógbè kpọrọ nkụ.

5 Ruo ogologo oge Ụlọ Nche akọwawo na a na-emezu amụma Joel n’oge anyị.b Mgbe ahụ, n’ezie, ọ bụkwa otu ihe ahụ banyere ọhụụ Ezikiel nke yiri ya. Taa, n’ala ndị Chineke e weghachiri, dị ka ọ dị n’Israel oge ochie, ngọzi Jehova erupụtawo n’ezie.

Nrupụta Dị Ukwuu nke Ngọzi

6. Ịwụsa ọbara n’elu ebe ịchụàjà ahụ a hụrụ n’ọhụụ kwesịrị ichetawororị ndị Juu gịnị?

6 Ònye bụ isi iyi nke ngọzi na-awụkwasị ndị Chineke e weghachiri? Rịba ama na mmiri ahụ si n’ụlọukwu Chineke na-erupụta. N’otu aka ahụ taa, ngọzi na-abịa site n’aka Jehova site n’oké ụlọukwu ime mmụọ ya—ndokwa maka ofufe dị ọcha. Ọhụụ Ezikiel na-agbakwụnye ihe dị mkpa. N’ogige nke dị n’ime, mmiri iyi ahụ na-eru gafere ebe ịchụàjà ahụ, n’akụkụ ndịda ya kpọmkwem. (Ezikiel 47:1) Ebe ịchụàjà ahụ dị kpọmkwem n’etiti ụlọukwu ahụ a hụrụ n’ọhụụ. Jehova kọwaara ya Ezikiel nke ọma ma nye iwu ka a wụsa ọbara nke anụ e ji chụọ àjà n’elu ya. (Ezikiel 43:13-18, 20) Ebe ịchụàjà ahụ pụtara oké ihe nye ndị Israel nile. E mewo ka ọgbụgba ndụ ha na Jehova dị irè ogologo oge gara aga mgbe Mosis wụsara ọbara n’elu ebe ịchụàjà dị n’ala ala Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 24:4-8) Ịwụsa ọbara n’elu ebe ịchụàjà ahụ a hụrụ n’ọhụụ kwesịrị ichetawororị ha na ozugbo ha laghachiri n’ala ha e weghachiri, ngọzi Jehova ga na-eru ma ọ bụrụhaala na ha na-edebe ọgbụgba ndụ ha na ya.—Deuterọnọmi 28:1-14.

7. Gịnị ka ebe ịchụàjà ihe atụ ahụ pụtara nye ndị Kraịst taa?

7 N’otu aka ahụ, a gọziwo ndị Chineke taa site n’otu ọgbụgba ndụ—nke ka mma, bụ́ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (Jeremaịa 31:31-34) E jikwa ọbara mee ka ọ dị irè eri ogologo oge, ọbara Jisọs Kraịst. (Ndị Hibru 9:15-20) Taa, ma ànyị so ná ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị so n’ọgbụgba ndụ ahụ, ma ànyị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ, bụ́ ndị na-erite uru na ya, ebe ịchụàjà ihe atụ ahụ pụtara oké ihe nye anyị. Ọ na-anọchite anya uche Chineke n’ihe banyere àjà Kraịst. (Jọn 10:16; Ndị Hibru 10:10) Dị nnọọ ka ebe ịchụàjà ihe atụ ahụ dị kpọmkwem n’etiti ụlọukwu ime mmụọ ahụ, àjà mgbapụta Kraịst bụ ebe ofufe dị ọcha hiwere isi. Ọ bụ ihe ndabere maka ịgbaghara anyị mmehie anyị, n’ihi ya kwa, bụrụ ihe ndabere olileanya anyị nile maka ọdịnihu. (1 Jọn 2:2) N’ihi ya anyị na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’iwu ya na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ so, bụ́ “iwu Kraịst.” (Ndị Galetia 6:2) Ọ bụrụhaala na anyị na-eme nke ahụ, anyị ga-erite uru site ná ndokwa Jehova maka ndụ.

8. (a) Gịnị bụ ihe na-adịghị n’ogige ahụ dị n’ime nke ụlọukwu ahụ a hụrụ n’ọhụụ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị nchụàjà nọ n’ụlọukwu ahụ a hụrụ n’ọhụụ pụrụ isi sachaa onwe ha?

8 Otu n’ime uru dị otú ahụ bụ nguzo dị ọcha n’ihu Jehova. N’ụlọukwu ahụ a hụrụ n’ọhụụ, ọ dị ihe na-adịghị n’ogige ahụ dị n’ime bụ́ nke dị ịrịba ama n’ogige nke ụlọikwuu ahụ na n’ụlọ nsọ Solomọn—ite ọsịsa mmiri, nke e mesịrị kpọọ osimiri, maka ndị nchụàjà iji na-asa ahụ. (Ọpụpụ 30:18-21; 2 Ihe E Mere 4:2-6) Gịnị ka ndị nchụàjà nọ n’ụlọukwu ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ pụrụ iji saa ahụ? Osimiri ọrụ ebube ahụ nke si n’ogige dị n’ime na-asọfe! Ee, Jehova ga-eji ụzọ isi nwee nguzo dị ọcha, nke dị nsọ, gọzie ha.

9. Olee otú ndị so ná ndị e tere mmadụ na ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ pụrụ isi nwee nguzo dị ọcha taa?

9 N’otu aka ahụ taa, ndị e tere mmanụ abụrụwo ndị e ji nguzo dị ọcha n’ihu Jehova gọzie. Jehova na-ele ha anya dị ka ndị dị nsọ, na-akpọ ha ndị ezi omume. (Ndị Rom 5:1, 2) Olee banyere “oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị ebo ndị na-abụghị ndị nchụàjà sere onyinyo ha? Ha na-efe ofufe n’ogige dị n’èzí, otu osimiri ahụ gafekwara akụkụ ahụ nke ụlọukwu ahụ a hụrụ n’ọhụụ. Mgbe ahụ, lee ka o si kwesị ekwesị na Jọn onyeozi hụrụ ka oké ìgwè mmadụ ahụ yi uwe mwụda ọcha nke dị ọcha ka ha na-efe ofufe n’ogige nke ụlọukwu ime mmụọ ahụ! (Mkpughe 7:9-14) N’agbanyeghị otú e siworo mesoo ha n’ụwa a rụrụ arụ, ha pụrụ ijide n’aka na ọ bụrụhaala na ha anọgide na-egosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst, Jehova na-ele ha anya dị ka ndị dị ọcha, ndị na-enweghị ntụpọ. Olee otú ha si egosipụta okwukwe? Site n’ịgbaso nzọụkwụ Jisọs, na-enwe obi ike zuru ezu n’àjà mgbapụta ahụ.—1 Pita 2:21.

10, 11. Gịnị bụ otu akụkụ dị mkpa nke mmiri ihe atụ ahụ, oleekwa otú nke a si metụta uto dị egwu nke osimiri ahụ?

10 Dị ka e kwuworo, e nwere akụkụ ọzọ dị mkpa nke mmiri ihe atụ a—ihe ọmụma. N’Israel ahụ e weghachiri, Jehova ji ntụziaka Akwụkwọ Nsọ gọzie ndị ya site n’aka òtù ndị nchụàjà ahụ. (Ezikiel 44:23) N’ụzọ a pụrụ iji tụnyere ya, Jehova ejiriwo ntụziaka bara ụba banyere Okwu ya nke eziokwu gọzie ndị ya taa, site n’aka “òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze.” (1 Pita 2:9) Ihe ọmụma banyere Jehova Chineke, banyere nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ, na karịsịa banyere Jisọs Kraịst na Alaeze Mesaịa ahụ ekwowo ekwo n’ụzọ na-amụbawanye amụbawanye na mgbe ikpeazụ a. Lee ka ụbara ume ọhụrụ ime mmụọ na-ebuwanye ibu nke anyị na-enweta si maa mma!—Daniel 12:4.

11 Dị nnọọ ka osimiri ahụ mmụọ ozi ahụ tụrụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nọ na-adịwanye ogbu, otú a ka ngọzi ndị na-enye ndụ ndị sitere n’aka Jehova siworo mụbaa nke ukwuu ịgụnye ọtụtụ mmadụ na-enubata n’ala ime mmụọ anyị a gọziri agọzi. Amụma mweghachi ọzọ kwuru, sị: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” (Aịsaịa 60:22) Okwu ndị a emezuwo—ọtụtụ nde enubatawo isonyere anyị n’ofufe dị ọcha! Jehova enyewo ndị nile chigharịkwutere ya “mmiri” dị ukwuu. (Mkpughe 22:17) Ọ na-ahụ na nzukọ ya nke elu ala na-ekesa Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ụwa nile, n’ọtụtụ narị asụsụ. N’otu aka ahụ, e mewo ndokwa maka nzukọ na mgbakọ ndị Kraịst n’ụwa nile ka mmadụ nile nwee ike inweta mmiri nke eziokwu dị ezigbo ọcha. Olee otú ndokwa ndị dị otú ahụ si emetụta ndị mmadụ?

Mmiri ahụ Eweta Ndụ!

12. (a) N’ihi gịnị ka osisi ndị ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel ji nwee ike imepụta ihe dị ka ha na-eme? (b) Gịnị ka osisi ndị a na-emepụta ihe na-anọchite anya ya na mgbe ikpeazụ?

12 Osimiri ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel na-enye ndụ na ahụ ike. Mgbe Ezikiel nụrụ banyere osisi ndị ga-eto n’akụkụ osimiri ahụ, a gwara ya, sị: “Akwụkwọ ya agaghị akpọnwụ, mkpụrụ ya agaghị agwụkwa . . . Mkpụrụ ya ewee bụrụ ihe oriri; akwụkwọ ya ga-abụkwa ihe ịgwọ agwọ.” N’ihi gịnị ka osisi ndị a ji na-emepụta ihe n’ụzọ na-atụ n’anya otú a? “N’ihi na mmiri ya, n’ebe nsọ Chineke ka ha si apụta.” (Ezikiel 47:12b) Osisi ihe atụ ndị a na-ese onyinyo ndokwa Chineke nile maka iweghachi ihe a kpọrọ mmadụ n’izu okè na-adabere n’àjà mgbapụta Jisọs. Ugbu a n’elu ala, ihe fọdụrụnụ e tere mmanụ na-ebute ụzọ n’inye nri na ọgwụgwọ ime mmụọ. Mgbe 144,000 nile natasịrị ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe, uru ndị ga-esite n’ije ozi ha nke ịbụ ndị nchụàjà dị ka ndị ga-eso Kraịst chịa ga-adịru n’ọdịnihu, na-eduga n’ikpeazụ n’imeri ọnwụ sitere n’aka Adam kpam kpam.—Mkpughe 5:9, 10; 21:2-4.

13. Ọgwụgwọ dị aṅaa ka e mezuworo n’oge anyị?

13 Osimiri ahụ a hụrụ n’ọhụụ rubanyere n’Osimiri Nwụrụ Anwụ ahụ ma gwọọ ihe nile o metụrụ. Osimiri a na-ese onyinyo ọnọdụ ịnwụ anwụ ime mmụọ. Ma ndụ na-ejupụta “n’ebe ọ bụla osimiri [ahụ ha ka abụọ] ga-erute.” (Ezikiel 47:9) N’otu aka ahụ, na mgbe ikpeazụ, ndị mmadụ anọwo na-adịghachi ndụ n’ụzọ ime mmụọ n’ebe ọ bụla mmiri nke ndụ ahụ banyere. Ndị mbụ e si otú a nyeghachi ndụ bụ ihe fọdụrụnụ e tere mmanụ na 1919. Ha dịghachiri ndụ n’ụzọ ime mmụọ site n’ọnọdụ yiri ọnwụ, nke arụghị ọrụ. (Ezikiel 37:1-14; Mkpughe 11:3, 7-12) Mmiri ndị ahụ dị mkpa eruwo ndị ọzọ nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ aka kemgbe, ndị a adịghachiwokwa ndụ ma ghọọ oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ nọgidere na-amụba, bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-ejere ya ozi. N’isi nso, ndokwa a ga-erute ìgwè ndị a kpọlitere n’ọnwụ.

14. Ọrụ ịkụ azụ̀ ahụ na-aga n’ihu n’ogologo ụsọ Osimiri Nwụrụ Anwụ na-egosi nnọọ gịnị taa?

14 Ịdị ndụ n’ụzọ ime mmụọ na-akpata ịrụpụta ihe. E gosiri nke a n’ọrụ ịkụ azụ̀ nke na-aga n’ihu n’ụsọ osimiri ahụ nwụburu anwụ. Jisọs gwara ụmụazụ ya, sị: “M ga-eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” (Matiu 4:19) Na mgbe ikpeazụ, ọrụ ịkụ azụ̀ ahụ jiri nchịkọta nke ihe fọdụrụnụ ná ndị e tere mmanụ malite, ma ọ kwụsịbeghị ebe ahụ. Mmiri ahụ na-enye ndụ nke sitere n’ụlọukwu ime mmụọ Jehova, gụnyere ngọzi nke ezi ihe ọmụma, na-emetụta ndị nke mba nile. Ebe ọ bụla osimiri ahụ ruworo, ọ rụpụtawo ndụ ime mmụọ.

15. Gịnị na-egosi na ọ bụghị onye ọ bụla ga-anara ndokwa ndị Chineke mere maka ndụ, gịnịkwa ka ọ ga-arụpụtara ndị dị otú ahụ n’ikpeazụ?

15 N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile na-aṅa ntị ugbu a n’ozi ndụ ahụ; ọ bụghịkwa ndị nile e si n’ọnwụ kpọlite n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst ga-eme otú ahụ. (Aịsaịa 65:20; Mkpughe 21:8) Mmụọ ozi ahụ na-ekwu na a gwọghị akụkụ ụfọdụ nke osimiri ahụ. Ebe ndị a bụ́ apịtị, nke ndụ na-adịghị na ha bụ “nnu ka a ga-arara ha nye.” (Ezikiel 47:11) Banyere ndị mmadụ n’oge anyị, ọ bụghị mmadụ nile e nyere mmiri na-enye ndụ nke Jehova na-anara ya. (Aịsaịa 6:10) N’Amagedọn, ndị nile họọrọ ịnọgide n’ọnọdụ adịghị ndụ na nke ịrịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ bụ nnu ka a ga-arara ha nye, ya bụ, bibie ha ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 19:11-21) Otú ọ dị, ndị nọworo na-aṅụ mmiri a n’ikwesị ntụkwasị obi pụrụ inwe olileanya ịdị ndụ ma hụ mmezu ikpeazụ nke amụma a.

Osimiri ahụ Eruo n’Ime Paradaịs

16. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu ga-enwe mmezu ikpeazụ ya?

16 Dị ka amụma mweghachi ndị ọzọ, ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu na-enwe mmezu ikpeazụ ya n’oge Narị Afọ Iri ahụ. Ndị so n’òtù ndị nchụàjà ahụ agaghị anọkwa n’elu ala ebe a mgbe ahụ. “Ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa Ya bụrụ eze [n’eluigwe ruo otu puku afọ].” (Mkpughe 20:6) Ndị nchụàjà a nke eluigwe ga-esonyere Kraịst n’iji uru nke àjà mgbapụta Kraịst mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Otú a, a ga-azọpụta ihe a kpọrọ mmadụ na-eme ezi omume, weghachi ha n’izu okè!—Jọn 3:17.

17, 18. (a) Olee otú e si kọwaa otu osimiri na-enye ndụ ná Mkpughe 22:1, 2, ole mgbekwa bụ oge bụ́ isi maka mmezu nke ọhụụ ahụ? (b) N’ime Paradaịs, n’ihi gịnị ka osimiri nke mmiri nke ndụ ahụ ga-eji enwe oge oké mbasawanye?

17 Ya bụ, osimiri ahụ Ezikiel hụrụ ga-ejupụta mgbe ahụ na mmiri nke ndụ kasị dị irè. Nke a bụ oge bụ́ isi a ga-emezu amụma ahụ e dekọrọ ná Mkpughe 22:1, 2: “O wee gosi m osimiri nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ pụta, n’etiti ámá ya. N’akụkụ a na n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ ka osisi nke ndụ dịkwa, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.”

18 Na Narị Afọ Iri ahụ, a ga-agwọ nrịanrịa nile—nke anụ ahụ, nke uche, na nke mmetụta uche. E sere onyinyo nke a nke ọma site n’iji osisi ihe atụ ndị ahụ ‘mee ka ahụ dị mba nile ike.’ N’ihi ndokwa Kraịst na 144,000 ahụ mere, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Osimiri ahụ ga-abanyekwa n’oge uto ya kasị ukwuu. Ọ ga-agbasawanye ma dịkwuo ogbu iji gụnye ọtụtụ nde, ikekwe ọtụtụ ijeri, nke ụmụ mmadụ a kpọlitere n’ọnwụ bụ́ ndị ga-aṅụ mmiri nke ndụ a dị ọcha. Osimiri ahụ a hụrụ n’ọhụụ gwọrọ Osimiri Nwụrụ Anwụ, na-eme ka ndụ dị n’ebe ọ bụla mmiri ya rugara. N’ime Paradaịs, ndị ikom na ndị inyom ga-adịghachi ndụ n’echiche kasị zuo ezu, na-abụ ndị a gwọrọ pụọ n’ọnwụ e ketara eketa site n’aka Adam ma ọ bụrụ na ha egosipụta okwukwe n’uru àjà mgbapụta ahụ e mere ka o rute ha. Mkpughe 20:12 na-ebu amụma na a ga-asaghe “akwụkwọ dị iche iche” n’oge ahụ, na-enyekwu ihe ọmụma nke ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-erite uru na ya. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ga-ajụ ịbụ ndị a gwọrọ, ọbụna n’ime Paradaịs. Ndị nnupụisi a bụ ndị ‘a ga-arara nye nnu’ nke mbibi ebighị ebi.—Mkpughe 20:15.

19. (a) Olee otú a ga-esi mezuo nkenyesị nke ala ahụ n’ime Paradaịs? (b) Akụkụ dị aṅaa n’ime Paradaịs ka obodo ahụ na-ese onyinyo ya? (ch) Gịnị ka ọdịdị obodo ahụ dị n’ebe dịpụrụ adịpụ site n’ụlọukwu ahụ pụtara?

19 N’oge ahụkwa, nkenyesị nke ala ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ga-enwe mmezu ikpeazụ ya. Ezikiel hụrụ ka e kere ala ahụ otú kwesịrị ekwesị; n’otu aka ahụ, onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ijide n’aka na ya ga-enweta òkè, ihe nketa, n’ime Paradaịs. Ma eleghị anya, ọchịchọ nke mmadụ inwe ụlọ nke ya ọ ga-ebi na ya ma lekọta bụ nke a ga-emezu n’ụzọ dị n’usoro. (Aịsaịa 65:21; 1 Ndị Kọrint 14:33) N’ụzọ dabara adaba, obodo ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-ese onyinyo ndokwa ọchịchị nke Jehova na-ezube maka ụwa ọhụrụ ahụ. Òtù ndị nchụàjà e tere mmanụ agakwaghị anọ ya n’anụ ahụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. Ọhụụ ahụ na-atụ aro nke ahụ site n’ịkọwa obodo ahụ dị ka nke dị n’ala “na-adịghị nsọ” n’ebe dịpụrụ adịpụ site n’ụlọukwu ahụ. (Ezikiel 48:15) Ka 144,000 so Kraịst na-achị n’eluigwe, Eze ahụ ga-enwekwa ndị nnọchiteanya n’elu ala. Ụmụ mmadụ ọ na-achị ga-erite uru nke ukwuu site ná nduzi ịhụnanya nke òtù onyeisi ahụ. Otú ọ dị, isi ọnọdụ ọchịchị ahụ n’ezie ga-adị, ọ bụghị n’elu ala, kama n’eluigwe. Onye ọ bụla nọ n’elu ala, gụnyere òtù onyeisi ahụ, ga-edo onwe ya n’okpuru Alaeze Mesaịa ahụ.—Daniel 2:44; 7:14, 18, 22.

20, 21. (a) N’ihi gịnị ka aha obodo ahụ ji kwesị ekwesị? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka nghọta anyị ghọtara ọhụụ Ezikiel kwesịrị ime ka anyị jụọ onwe anyị?

20 Rịba ama okwu ikpeazụ dị n’amụma Ezikiel: “Aha obodo ahụ site n’ụbọchị ahụ ga-abụ, Jehova nọ n’ebe ahụ.” (Ezikiel 48:35) Obodo a agaghị adị iji nye ndị mmadụ ike ma ọ bụ nchịkwa; ọ gaghị adịkwa ebe ahụ maka imezu uche mmadụ ọ bụla. Ọ bụ obodo Jehova, nke na-egosipụta uche ya na ụzọ ịhụnanya ya ndị ezi uche dị na ha, mgbe nile. (Jemes 3:17) Nke a na-enye anyị mmesi obi ike na-ekpo obi ọkụ na Jehova ga-agọzi òtù “ụwa ọhụrụ” nke ihe a kpọrọ mmadụ o mere ruo n’ọdịnihu ebighị ebi.—2 Pita 3:13.

21 Ọ̀ bụ na anyị enweghị obi ụtọ n’olileanya dị anyị n’ihu? Mgbe ahụ, n’ụzọ dabara adaba, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ sị: ‘Olee otú m si emeghachi omume ná ngọzi ndị dị ebube e kpughere n’ọhụụ Ezikiel? Èji m ikwesị ntụkwasị obi na-akwado ọrụ ndị nlekọta na-ahụ n’anya na-arụ, gụnyere nke ndị fọdụrụnụ e tere mmanụ na nke ndị ga-eso n’òtù onyeisi ahụ? Èmewo m ofufe dị ọcha isi ihe ná ndụ m? Àna m eji mmiri nke ndụ ahụ na-eru taa n’ụba eme ihe n’ụzọ zuru ezu?’ Ka onye ọ bụla n’ime anyị nọgide na-eme otú ahụ, na-enwekwa obi ụtọ ná ndokwa Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ndagwurugwu a mmiri na-ekwo ekwo na ya pụrụ ịdị na-ezo aka na Ndagwurugwu Kidrọn, bụ́ nke dịịrị gbadaa n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ site na Jerusalem ma kwusị n’Osimiri Nwụrụ Anwụ. Mmiri adịghị karịsịa n’ebe ala ala ya, ọ na-akpọkwa nkụ n’afọ dum.

b Lee mbipụta Ụlọ Nche nke May 1, 1881 (Bekee), na December 1, 1981.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Gịnị ka mmiri ahụ si n’ụlọukwu ahụ na-erupụta na-ese onyinyo ya?

◻ Ọgwụgwọ dị aṅaa ka Jehova mezuworo site n’osimiri ihe atụ ahụ, n’ihi gịnịkwa ka osimiri ahụ jiworo dịkwuo ogbu?

◻ Gịnị ka osisi ndị dị n’ogologo ikpere osimiri ahụ na-ese onyinyo ya?

◻ Gịnị ka obodo ahụ ga-ese onyinyo ya n’oge Ọchịchị Puku Afọ ahụ, n’ihi gịnịkwa ka aha obodo ahụ ji kwesị ekwesị?

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Osimiri nke ndụ ahụ na-anọchite anya ndokwa Chineke maka nzọpụta

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya