Ihe Karịrị Afọ 40 n’Okpuru Mmachibido Iwu nke Ọchịchị Kọmunist
DỊ KA MIKHAIL VASILEVICH SAVITSKII SI KỌỌ
Ụlọ Nche (Bekee) nke April 1, 1956, kọrọ na e nwere “oké mkpochapụ” nke Ndịàmà Jehova n’April 1, 7, na 8, 1951. Ha bụ ụbọchị Ndịàmà Jehova nọ na Russia na-agaghị echezọ echezọ,” ka Ụlọ Nche ahụ kọwara. “N’ụbọchị atọ ndị a, e tinyere Ndịàmà Jehova nile a pụrụ ịchọta n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ukraine, White Russia [Belarus], Bessarabia, Moldavia, Latvia, Lithuania na Estonia—ihe karịrị puku ndị ikom na ndị inyom asaa . . . n’ụgbọ ịnyịnya na-adọkpụ, buga ha n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị iche iche ma nọrọ n’ebe ahụ tinye ha n’ụgbọ e ji ebu ehi wee buga ha n’ebe dị anya.”
N’APRIL 8, 1951, a kpụụrụ nwunye m, nwa m nwoke dị ọnwa asatọ, nne na nna m, nwanne m nwoke nke m tọrọ, na ọtụtụ Ndịàmà ndị ọzọ site n’ebe obibi ha dị n’ime na gburugburu Ternopol’, Ukraine. Mgbe e tinyesịrị ha n’ụgbọ e ji ebu ehi, ha mere njem ruo ihe dị ka izu abụọ. N’ikpeazụ, e busara ha n’oké ọhịa Siberia nke dịdewere ógbè arctic n’ọdịda anyanwụ nke Ọdọ Mmiri Baikal.
N’ihi gịnị ka mkpochapụ a na-ejighị metụta m? Tupu mụ akọọ ebe m nọ n’oge ahụ na ihe mere anyị nile mgbe e mesịrị, ka m gwa gị otú m si bịa bụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.
Eziokwu Bible Erute Anyị Aka
Na September 1947, mgbe m dị nanị afọ 15, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ anyị dị n’obere obodo bụ́ Slaviatin, ihe dị ka kilomita 50 site na Ternopol’. Ka mụ na nne m nọ ala na-ege ndị a na-eto eto ntị—bụ́ ndị aha otu n’ime ha bụ Maria—amatara m na nke a abụghị nanị okpukpe ọzọ. Ha kọwara ihe ha kweere ma zaa ajụjụ ndị anyị jụrụ banyere Bible n’ụzọ doro anya.
Ekwetara m na Bible bụ Okwu Chineke, ma chọọchị emezughị ihe m tụrụ anya ya. Nna m ochie na-asịbu: “Ndị ụkọchukwu na-eji okwu banyere ọkụ ala mmụọ eyi ndị mmadụ egwu, ma ndị ụkọchukwu n’onwe ha adịghị atụ ihe ọ bụla egwu. Ha na-ezu nnọọ ndị ogbenye ohi ma na aghọgbu ha.” M na-echeta ihe ike e mesoro ndị Poland bi n’obodo anyị na ngwongwo ha a gbara ọkụ ná mmalite Agha Ụwa nke Abụọ. N’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ, ọ bụ onye ụkọchukwu Katọlik Ọtọdọks haziri mwakpo ndị ahụ. Mgbe e mesịrị ahụrụ m ọtụtụ ndị e gburu egbu, ọ dịkwa m ọkụ n’obi ịmata ihe kpatara obi ọjọọ dị otú ahụ.
Ka m so Ndịàmà na-amụ Bible, amalitere m ịghọta ya. Amụtara m eziokwu Bible ndị bụ́ isi, gụnyere eziokwu bụ́ na e nweghị hel na-ere ọkụ nakwa na Setan bụ́ Ekwensu na-eji okpukpe ụgha akwalite agha na mwụfu ọbara. Site n’oge ruo n’oge, m na-akwụsịtụ n’oge ọmụmụ ihe onwe onye m ma kpee ekpere sitere n’ala ala obi m iji kelee Jehova maka ihe m na-amụta. Amalitere m iso nwanne m nwoke nke m tọrọ bụ́ Stakh na-ekerịta eziokwu Bible ndị a, obi dịkwa m ụtọ nke ukwuu mgbe ọ nakweere ha.
Itinye Ihe M Mụtara n’Ọrụ
Amatara m mkpa ọ dị ime mgbanwe n’onwe m, akwụsịkwara m ise siga ozugbo. Aghọtakwara m mkpa ọ dị isoro ndị ọzọ na-ezukọ mgbe nile maka ọmụmụ Bible a haziri ahazi. Iji mee nke a ana m aga ije ihe dị ka kilomita iri n’ime oké ọhịa iji ruo n’ebe nzuzo a na-enwe nzukọ. Mgbe ụfọdụ ọ na-abụ nanị ndị inyom ole na ole na-enwe ike ịbịa nzukọ ahụ, ọ bụkwa ezie na e mebeghị m baptism, a na-agwa m ka m duzie ya.
Inwe akwụkwọ e ji amụ Bible bụ ihe ize ndụ, ịhụ ya n’aka mmadụ pụrụ ime ka a tụọ onye ahụ mkpọrọ ruo afọ 25. N’agbanyeghị nke ahụ, achọrọ m inwe ọ́bá akwụkwọ nke m. Otu n’ime ndị agbata obi anyị esowo Ndịàmà Jehova mụọ ihe, ma n’ihi egwu, ọ kwụsịrị ma lie akwụkwọ ya n’ubi ya. Lee ka m si kelee Jehova mgbe nwoke ahụ bọpụtara akwụkwọ na magazin ya nile ma kwere ka m kpokọrọ ha! Ezoro m ha n’akwụ aṅụ nna m, bụ́ ebe ndị ọzọ na-agaghị achọ ịga chọọ ya.
Na July 1949, araara m ndụ m nye Jehova, e mekwara m baptism ná ngosipụta nke nraranye m. Ọ bụ ụbọchị m kasị nwee obi ụtọ ná ndụ m. Onyeàmà mere m baptism nzuzo ahụ mesiri ya ike na ọ dịghị mfe mmadụ ịbụ ezi onye Kraịst, nakwa na ọtụtụ ọnwụnwa dị n’ihu. N’oge na-adịghị anya ahụrụ m otú okwu ya si bụrụ eziokwu! N’agbanyeghị nke ahụ, ndụ m dị ka Onyeàmà e mere baptism ji ọṅụ malite. Ọnwa abụọ mgbe e mesịrị m baptism, alụrụ m Maria, bụ́ otu n’ime mmadụ abụọ ahụ mere ka mụ na nne m mata eziokwu ahụ.
Ọnwụnwa M Mbụ Bịara na Mberede
N’April 16, 1950, esi m n’obere obodo bụ́ Podgaitsi na-alọta mgbe ndị soja kwụsịrị m na mberede ma hụ akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Bible m na-achịgara ìgwè ọmụmụ ihe anyị. E jidere m. N’ụbọchị ole na ole ndị mbụ mgbe a kpọchisịrị m, a pịara m ụtarị, e kweghịkwa ka m rie nri ma ọ bụ rahụ ụra. E nyekwara m iwu ịmali elu dị ka awọ otu narị ugboro, na-achịkwasị aka m n’isi, bụ́ nke m na-enweghị ike imecha n’ihi ike ọgwụgwụ. Mgbe nke a gasịrị a tụbara m n’okpukpu nke ime ala dị udè nke jụrụ oyi ruo awa 24.
Nzube nke mmeso ọjọọ ahụ bụ iji belata ikike nguzogide m na iji mee ka ọ dịrị ha mfe karị inweta ihe ọmụma site n’ọnụ m. “Olee ebe i si nweta akwụkwọ ndị ahụ, ònye kwa ka ị na-achịgara ha?” ka ha jụrụ m. Ajụrụ m ikwu ihe ọ bụla. Mgbe ahụ a gụụrụ m akụkụ iwu nke a ga-eji kpee m ikpe. O kwuru na a ga-akwụgbu ma ọ bụ tụọ onye na-ekesa ma ọ bụ onye nwere akwụkwọ na-ekwugide mba Soviet mkpọrọ afọ 25.
“Olee ntaramahụhụ nke ị ga-ahọrọ?” ka ha jụrụ.
“Ọ dịghị,” ka m zaghachiri, “ma enwere m ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ, sitekwa n’enyemaka ya aga m anakwere ihe ọ bụla ọ gbachiri nkịtị ka o mee.”
N’ụzọ juru m anya, mgbe ụbọchị asaa gasịrị ha hapụrụ m ka m laa. Ahụmahụ ahụ nyeere m aka ịghọta ịbụ eziokwu nke nkwa Jehova: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.
Mgbe m lọtara, adara m oké ọrịa, ma nna m kpọgara m na nke dọkịta, m gbakekwara n’oge na-adịghị anya. Ọ bụ ezie na nna m enweghị nkweta okpukpe nke ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ anyị nwere, ọ kwadoro anyị n’ofufe anyị.
Ịga Mkpọrọ na Nchụpụ
Mgbe ọnwa ụfọdụ gasịrị e debara aha m ije ozi n’usuu ndị agha Soviet. Akọwara m ọjụjụ m n’ihi akọ na uche m. (Aịsaịa 2:4) Ka o sina dị, na February 1951, a tụrụ m mkpọrọ afọ anọ, a kpọgakwara m n’ụlọ mkpọrọ dị na Ternopol’. Mgbe e mesịrị a kpọfere m na nke dị na L’viv, bụ́ obodo ka ukwuu dị ihe dị ka kilomita 120 site n’ebe ahụ. Ka m nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ebe ahụ, anụrụ m na a gbaworo ọtụtụ Ndịàmà ụgbọ nwa mkpi gaa Siberia.
N’oge okpomọkụ nke 1951, a kpọọrọ anyị n’ìgwè gabiga Siberia, ruo n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Anyị mere njem ruo otu ọnwa—ihe dị ka kilomita 11,000—na-agafe ógbè 11 nwere oge ndị dịgasị iche! Nanị otu ugboro, mgbe anyị nọsịrị ihe karịrị izu abụọ n’ụgbọ okporo ígwè, ka anyị kwụsịrị n’otu ebe e kwere ka anyị saa ahụ. Nke ahụ bụ n’otu ebe ọha mmadụ na-asa ahụ na Novosibirsk, Siberia.
N’ebe ahụ, n’etiti oké ìgwè ndị nga, anụrụ m ka otu nwoke ji oké olu kwuo, sị: “Olee onye nọ ebe a sitere n’ezinụlọ Jonadab?” N’oge ahụ e ji okwu ahụ bụ́ “Jonadab” amata ndị nwere olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (2 Ndị Eze 10:15-17; Abụ Ọma 37:11, 29) Ndị nga dị iche iche kọwara onwe ha dị ka Ndịàmà. Lee ọṅụ anyị ji kelee ibe anyị!
Ihe Omume Ime Mmụọ n’Ụlọ Mkpọrọ
Mgbe anyị nọ na Novosibirsk anyị kwekọrịtara n’otu okwu anyị pụrụ iji na-amata ibe anyị mgbe anyị ruru ebe anyị na-aga. E mesịziri tụba anyị nile n’otu ogige ụlọ mkpọrọ n’akụkụ Osimiri Japan, ebe na-adịghị anya site na Vladivostok. N’ebe ahụ anyị haziri ịdị na-enwe nzukọ mgbe nile maka ọmụmụ Bible. Mụ na ụmụnna ndị a tozuru okè, katatụrụ ahụ bụ́ ndị a mara ikpe ịnọ ogologo oge n’ụlọ mkpọrọ ịnọkọta wusiri m ike n’ụzọ ime mmụọ n’ezie. Ha duziri nzukọ anyị onye duzie ibe ya eduzie, na-eji akụkụ Bible na isi ihe ndị yiri ha ha chetara na magazin Ụlọ Nche eme ihe.
A na-ajụ ajụjụ, ụmụnna na-enyekwa azịza ha. Ọtụtụ n’ime anyị na-adọkata mpempe akwụkwọ site n’akpa simenti ihe na-adịghị na ha ma detuo azịza ndị ahụ na ha. Anyị na-edebe mpempe akwụkwọ ndị ahụ ma dụkọta ha ọnụ iji ha eme ihe dị ka ọ́bá akwụkwọ ntụaka anyị. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, e bugara ndị a mara ikpe ịnọ ogologo oge n’ụlọ mkpọrọ dị n’ime ime ebe ugwu Siberia. A kpọfere anyị atọ bụ́ ụmụnna na-akatabeghị ahụ na Nakhodka, bụ́ otu obodo dị nso na-erughị kilomita 650 site na Japan. Anọrọ m afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ dị n’ebe ahụ.
Mgbe ụfọdụ anyị na-enweta otu mkpụrụ Ụlọ Nche. Ruo ọtụtụ ọnwa ọ bụụrụ anyị nri ime mmụọ. Ka oge na-aga, anyị natawakwara akwụkwọ ozi. Nke mbụ m natara site n’ezinụlọ m (ndị a chụpụrụ achụpụ ugbu a) mere ka anya mmiri gbaa m. Ọ kọrọ na, dị ka a kọwara n’Ụlọ Nche ahụ e hotara ihe o kwuru ná mmalite, a wakporo ụlọ Ndịàmà, e nyewokwa ezinụlọ dị iche iche nanị awa abụọ iji pụọ.
Esonyere M Ezinụlọ M Ọzọ
A tọhapụrụ m na December 1952, mgbe m nọsịrị afọ abụọ n’ime afọ anọ m gaara anọ. Agakwuuru m ezinụlọ m n’obere obodo bụ́ Gadaley dị nso na Tulun, Siberia, bụ́ ebe e bugara ha. N’ezie, ọ bụ ihe magburu onwe ya mụ na ha ịnọ ọzọ—nwa m nwoke bụ́ Ivan dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ, nwa m nwanyị bụ́ Anna dịkwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ. Otú ọ dị, a kpaara nnwere onwe m ókè. Ndị ọchịchị ógbè anyị jichiri akwụkwọ ikike ngafe m, a na-esogharịkwa m nke ukwuu. Apụghị m ime njem karịrị kilomita atọ site n’ụlọ m. Mgbe e mesịrị, e kwere ka m na-agba ịnyịnya na-aga ahịa dị na Tulun. N’iji akọ eme ihe, m na-ezute Ndịàmà ibe m n’ebe ahụ.
N’oge ahụ, anyị nwere ụmụ nwanyị abụọ, bụ́ Anna na Nadia, na ụmụ nwoke abụọ, bụ́ Ivan na Kolya. Na 1958 anyị mụrụ nwa nwoke ọzọ, bụ́ Volodya. Mgbe e mesịkwara, na 1961, anyị mụrụ nwa nwanyị ọzọ, bụ́ Galia.
Ndị KGB (nke bụbu ụlọ ọrụ obodo na-ahụ maka nchebe) na-akpọchi ma na-agba m ajụjụ mgbe mgbe. Nzube ha abụghị nanị ime ka m kwuo ihe banyere ọgbakọ kamakwa iji mee ka e nyowe m enyowe na m na-akwado ha. Ya mere ha na-akpọrọ m gaa n’ọmarịcha ụlọ nri ma gbalịa ise m foto ebe m na-amụmụ ọnụ ọchị ma soro ha na-ekpori ndụ. Ma aghọtara m ebumnobi ha, ana m agbalịsikwa ike ịgbarụ ihu m mgbe nile. Mgbe ọ bụla a kpọchiri m, m na-agwa ụmụnna ihe meworonụ kpọmkwem. N’ihi ya, o nweghị mgbe ha nwere obi abụọ banyere iguzosi ike n’ihe m.
Ịkpọtụrụ Ogige Ndị Ahụ
Eri ọtụtụ afọ, a tụbara ọtụtụ narị Ndịàmà n’ogige ụlọ mkpọrọ. N’oge a, anyị so ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ na-ezirịta ozi n’ụzọ chiri anya, na-ezigara ha akwụkwọ. Olee otú e si mee nke a? Mgbe e si n’ụlọ mkpọrọ tọhapụ ụmụnna nwoke ma ọ bụ nwanyị, ha na-akọrọ anyị ụzọ ndị a pụrụ isi webata akwụkwọ na nzuzo n’agbanyeghị nchebe siri ike. Ruo ihe dị ka afọ iri, anyị nwere ike mee ka ụmụnna anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ ndị a nweta magazin na akwụkwọ ndị anyị nwetara site na Poland na mba ndị ọzọ.
Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị nwanyị bụ́ ndị Kraịst na-eji ọtụtụ awa arụ ọrụ siri ike idepụtaghachi akwụkwọ n’aka akwụkwọ dị kịrị kịrị nke na a pụrụ izobe otu magazin n’ihe dị ntakịrị dị ka mkpọ mkpa ọkụ! Na 1991, mgbe anyị na-anọghịzi ná mmachibido iwu ma na-enweta magazin ndị mara mma nwere àgwà anọ, otu n’ime ụmụnna anyị nwanyị kwuru, sị: “Ugbu a a ga-echezọ anyị.” O kwuteghị ya. Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ pụrụ ichezọ, Jehova agaghị echezọ ọrụ ndị na-eguzosi ike n’ihe dị otú ahụ ma ọlị!—Ndị Hibru 6:10.
Nkwagharị na Ọdachi
Ná ngwụsị afọ 1967, e nyochara ụlọ nwanne m nwoke dị na Irkutsk. A hụrụ film na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. A mara ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ afọ atọ. Otú ọ dị, ọ dịghị ihe a hụrụ mgbe e nyochara ụlọ anyị. Ka o sina dị, ndị ọchịchị kwenyesiri ike na aka anyị dị ya, n’ihi ya ezinụlọ m aghaghị ịkwapụ n’ebe ahụ. Anyị kwagara ebe dị ihe dị ka kilomita 5,000 n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo ukwu Nevinnomyssk dị na Caucasus. Anyị nọgidere na-agba àmà mberede n’ebe ahụ.
Ihe ọdachi mere n’ụbọchị mbụ nke oge ezumike ụlọ akwụkwọ na June 1969. Ka ọ na-agbalị iwepụta bọl dị n’akụkụ ígwè ọkụ eletrik nwere ikike dị ukwuu, ike eletrik dọrọ nwa anyị nwoke dị afọ 12, bụ́ Kolya, ajọ ọdịdọ. Ọkụ gbara ihe karịrị pasent 70 nke ahụ ya. N’ụlọ ọgwụ, ọ tụgharịrị ma jụọ m, sị: “Ànyị ka ga-enwe ike ịgakọta ọnụ n’àgwàetiti ahụ?” (Ọ na-ekwu banyere otu àgwàetiti na-atọ anyị ụtọ ileta.) “Ee, Kolya,” ka m kwuru, “anyị ga-aga n’àgwàetiti ahụ ọzọ. Mgbe Jisọs Kraịst ga-akpọlite gị ịdịghachi ndụ, anyị aghaghị ịga n’àgwàetiti ahụ.” N’ịbụ onye na-amachaghị onwe ya, ọ nọgidere na-abụ otu n’ime abụ Alaeze nke na-amasịkarị ya, bụ́ nke ọ na-enwe mmasị iji opi ya na-abụ mgbe ìgwè ndị abụ ọgbakọ na-abụ abụ. Ụbọchị atọ ka e mesịrị ọ nwụrụ, na-enwe obi ike n’olileanya nke mbilite n’ọnwụ.
N’afọ na-esonụ e debara aha nwa anyị nwoke dị afọ 20, bụ́ Ivan, n’ozi agha. Mgbe ọ jụrụ ije, e jidere ya, ọ nọkwara afọ atọ n’ụlọ mkpọrọ. Na 1971, e debara aha m ma kwuo ọzọ na a ga-atụ m mkpọrọ n’ihi na m ejeghị. Okwu m gara n’ihu ruo ọtụtụ ọnwa. Ka ọ dị mgbe ahụ nwunye m malitere ịrịa ọrịa cancer ma nwee mkpa nke nlebara anya dị ukwuu. N’ihi nke a ha kagburu okwu m. Maria nwụrụ na 1972. Ọ bụwo onye ibe kwesịrị ntụkwasị obi, na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova ruo ọnwụ ya.
Ezinụlọ Anyị Agbasasịa Gaa Mba Ọzọ
Na 1973, alụrụ m Nina. Nna ya achụpụwo ya n’ụlọ na 1960 n’ihi na ọ ghọwo Onyeàmà. Ọ bụ onye ozi na-anụ ọkụ n’obi so n’ime ụmụnna nwanyị ndị ahụ rụsiworo ọrụ ike idepụtaghachi magazin maka ndị nọ n’ogige ndị ahụ. Ụmụ m bịakwara hụ ya n’anya.
Obi adịghị ndị ọchịchị mma n’ihi ọrụ anyị na Nevinnomyssk, ha rụgidekwara anyị ịkwapụ. Ya mere na 1975 mụ na nwunye m, na ụmụ m ndị nwanyị, kwagara n’ógbè ndịda bụ́ Caucasus dị na Georgia. N’otu oge ahụ, ụmụ m ndị nwoke bụ́ Ivan na Volodya kwagara Dzhambul n’ókèala dị n’akụkụ ndịda Kazakstan.
Na Georgia ọrụ Ndịàmà Jehova ka na-amalite amalite. Anyị gbara àmà mberede n’ime na gburugburu Gagra na Sukhumi dị n’Ụsọ Osimiri Ojii, mgbe otu afọ gasịkwara, e mere Ndịàmà ọhụrụ iri baptism n’otu osimiri si n’ugwu na-asọpụta. N’oge na-adịghị anya, ndị ọchịchị siri ọnwụ ka anyị pụọ ebe ahụ, anyị kwagakwara n’ebe ọwụwa anyanwụ Georgia. N’ebe ahụ anyị mụbara mgbalị anyị ịchọta ndị yiri atụrụ, Jehova gọzikwara anyị.
Anyị na-ezukọta ọnụ n’ìgwè ndị dị nta. Asụsụ bụ nsogbu, ebe anyị na-amaghị asụsụ Georgian, ndị Georgia ụfọdụ adịghịkwa asụ asụsụ Russian nke ọma. Na mbụ, anyị so nanị ndị Russia na-amụ ihe. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ime nkwusa na izi ihe n’asụsụ Georgian gara n’ihu, ugbu a e nwekwara ọtụtụ puku ndị nkwusa Alaeze na Georgia.
Na 1979, n’ihi nrụgide nke ndị KGB onye m na-arụrụ ọrụ kwuru na a chọkwaghị m na mba ya. Ọ bụ n’oge ahụ ka nwa m nwanyị bụ́ Nadia nwere ihe mberede ụgbọala bụ́ nke gburu ma ya ma obere nwa ya nwanyị. Nne m anwụwo n’ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’afọ bu ụzọ na Nevinnomyssk, na-ahapụ nna m na nwanne m nwoke. N’ihi ya anyị kpebiri ịgaghachi ebe ahụ.
Ngọzi Dị Iche Iche n’Ihi Ntachi Obi
Na Nevinnomyssk anyị nọgidere na-emepụta akwụkwọ e ji amụ Bible na nzuzo. Otu mgbe n’etiti afọ ndị 1980 mgbe ndị ọchịchị kpọrọ m òkù, agwara m ha na arọrọ m nrọ ka m na-ezo magazin anyị. Ha chịrị ọchị. Ka m na-apụ, otu n’ime ha kwuru, sị: “Arọkwala nrọ ọzọ banyere otú i si ezo akwụkwọ unu.” O kwubiri, sị: “N’oge na-adịghị anya ị ga na-edebe akwụkwọ ndị ahụ n’elu shelf gị, gị na nwunye gị ga na-ejidekwa aka ma jiri Bible unu n’aka na-aga nzukọ.”
Na 1989 o wutere anyị mgbe nwa m nwanyị bụ́ Anna nwụrụ n’ihi akwara ụbụrụ ịza aza. Ọ dị nanị afọ 38. N’otu afọ ahụ, n’August, Ndịàmà nọ na Nevinnomyssk naara ụgbọ okporo ígwè ná ngo ma gaa Warsaw, Poland, maka mgbakọ mba nile. E nwere mmadụ 60,366 bịaranụ, tinyere ọtụtụ puku mmadụ si Soviet Union. Anyị chere n’ezie na anyị na-arọ nrọ! N’ihe na-erughị afọ abụọ n’ihu, na March 27, 1991, enwere m ihe ùgwù nke ịbụ otu n’ime mmadụ ise bụworo okenye ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ na Soviet Union bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ mere ihe akụkọ na Moscow nke mere ka iwu kwado nzukọ okpukpe nke Ndịàmà Jehova!
Obi dị m ụtọ na ụmụ m ndị dị ndụ ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi. Ana m atụkwa anya ụwa ọhụrụ Chineke mgbe m pụrụ ịhụ Anna, Nadia na nwa ya nwanyị anya ọzọ, tinyere Kolya. Mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ, m ga-emezu nkwa m kwere ya ịkpọrọ ya gaa n’àgwàetiti ahụ tọrọ anyị ụtọ ịga ọtụtụ afọ gara aga.
Ka ọ dịgodị, lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ uto dị ngwa nke eziokwu Bible n’ala a buru ibu! Obi dị m ụtọ n’ezie maka ihe m mezuworo ná ndụ, ana m ekelekwa Jehova maka ikwe ka m bụrụ otu n’ime Ndịàmà ya. Ekwenyesiri m ike n’ịbụ eziokwu nke Abụ Ọma 34:8: “Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma: onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ nwoke nke na-agbaba n’ime Ya.”
[Foto dị na peeji nke 25]
Afọ m sonyeere ezinụlọ m na Tulun
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
N’elu: Nna m na ụmụ m n’ihu ụlọ anyị dị na Tulun, Siberia
N’elu aka nri: Nwa m nwanyị bụ́ Nadia na nwa ya nwanyị, bụ́ ndị nwụrụ n’ihe mberede ụgbọala
N’aka nri: Foto ezinụlọ anyị na 1968