Rịba Ozizi Gị ama
“Rịba onwe gị na ozizi gị ama. Na-anọgide n’ihe ndị a; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.”—1 TIMOTI 4:16.
1, 2. N’ihi gịnị ka e ji chọọ ndị ozizi na-anụ ọkụ n’obi ngwa ngwa taa?
“GAANỤ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) N’ihi iwu a Jisọs Kraịst nyere, ndị Kraịst nile kwesịrị ịgbalịsi ike ịghọ ndị ozizi. A chọrọ ndị ozizi na-anụ ọkụ n’obi iji nyere ndị nwere obi eziokwu aka ịbịa mara Chineke tupu oge agabiga. (Ndị Rom 13:11) Pọl onyeozi gbara ume, sị: “Kwusaa okwu Ya; tụkwasị uche n’ọrụ gị n’oge kwesịrị, ma ọ bụ n’oge na-ekwesịghị.” (2 Timoti 4:2) Nke a na-achọ izi ihe ma n’ime ọgbakọ ma n’èzí. N’ezie, ọrụ nkwusa ahụ n’onwe ya na-agụnye ihe karịrị nanị ikwupụta ozi Chineke. Ọ dị mkpa izi ihe n’ụzọ dị irè ma ọ bụrụ na ndị nwere mmasị ga-aghọ ndị na-eso ụzọ.
2 Anyị bi ‘n’oge dị oké egwu.’ (2 Timoti 3:1) E jiriwo nkà ihe ọmụma ụwa na ozizi ụgha mejuo echiche ndị mmadụ. Ọtụtụ bụ ndị e mere ka ha “gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha,” bụrụkwa ndị “mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ.” (Ndị Efesọs 4:18, 19) Ụfọdụ nwere nsogbu mmetụta uche ndị na-egbu mgbu. Ee, ndị mmadụ bụ n’ezie ndị ‘a na-esogbu, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ (Matiu 9:36) Otú o sina dị, site n’iji nkà izi ihe na-eme ihe, anyị pụrụ inyere ndị nwere obi eziokwu aka ime mgbanwe ndị dị mkpa.
Ndị Ozizi n’Ime Ọgbakọ
3. (a) Gịnị ka ọrụ izi ihe nke Jisọs nyere na-agụnye? (b) Olee ndị nwere ibu ọrụ bụ́ isi nke izi ihe n’ime ọgbakọ?
3 Site ná ndokwa ọmụmụ Bible ebe obibi, ọtụtụ nde mmadụ na-anata ntụziaka onwe onye. Otú ọ dị, mgbe e mesịrị ha baptism, ọ dị ndị ọhụrụ mkpa inwetakwu enyemaka iji bụrụ ndị ‘gbagidere mkpọrọgwụ ma guzosie ike na ntọala ahụ.’ (Ndị Efesọs 3:17, NW) Ka anyị na-arụ ọrụ Jisọs nyere nke e dekọrọ na Matiu 28:19, 20 ma na-eduzi ndị ọhụrụ gaa ná nzukọ Jehova, ha na-erite uru site n’ịbụ ndị e ziri ihe n’ime ọgbakọ. Dị ka Ndị Efesọs 4:11-13 si kwuo, a họpụtawo ndị ikom ije ozi dị ka “ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi; ime ka ndị nsọ zuo okè ịrụ ọrụ nke ije ozi, iwuli ahụ nke Kraịst elu dị ka ụlọ.” Mgbe ụfọdụ, nkà izi ihe ha na-agụnye mkpa ọ dị ‘ịtụ mmadụ mmehie ha n’anya, ịba mba, ịrịọ arịrịọ, n’ogologo ntachi obi nile.’ (2 Timoti 4:2) Ọrụ ndị ozizi dị oké mkpa nke na, n’idegara ndị Kọrint akwụkwọ, Pọl dere ndị ozizi ozugbo o desịrị ndị ozi na ndị amụma.—1 Ndị Kọrint 12:28.
4. Olee otú ikike izi ihe si enyere anyị aka irube isi na ndụmọdụ Pọl e dekọrọ ná Ndị Hibru 10:24, 25?
4 N’eziokwu, ọ bụghị ndị Kraịst nile na-eje ozi dị ka ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta. Ka o sina dị, a na-agba mmadụ nile ume ịkpasurịta “ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Ime nke ahụ ná nzukọ na-agụnye inye azịza ndị sitere n’obi, ndị a kwadebere nke ọma ndị pụrụ iwuli ndị ọzọ elu ma gbaa ha ume. Ndị nkwusa Alaeze nwere ahụmahụ pụkwara ‘ịkpasu ọrụ ọma dị iche iche’ site n’iso ndị ọhụrụ na-ekerịta ihe ọmụma na ahụmahụ ha mgbe ha so ha na-arụkọ ọrụ n’ozi ubi. N’oge ndị dị otú ahụ nakwa n’oge ndị a na-akwadebeghị maka ha, a pụrụ inye ntụziaka bara uru. Dị ka ihe atụ, a na-agba ndị inyom tozuru okè ume ịbụ “ndị na-ezi ihe nke ọma.”—Taịtọs 2:3.
Ndị E Mere Ka Ha Kwere
5, 6. (a) Olee otú ezi Iso Ụzọ Kraịst si dị iche n’ebe ofufe ụgha dị? (b) Olee otú ndị okenye si enyere ndị ọhụrụ aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha?
5 Ezi Iso Ụzọ Kraịst si otú a dị nnọọ iche n’ebe okpukpe ụgha dị, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-achọ ịchịkwa echiche ndị òtù ha. Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, ndị ndú okpukpe chọrọ ịchịkwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ ndị mmadụ site n’ọdịnala ndị siri ike mmadụ mere. (Luk 11:46) Ndị ụkọchukwu Krisendọm emewo ihe yiri nke ahụ mgbe mgbe.
6 Otú ọ dị, ezi ofufe bụ “ije ozi dị nsọ” nke anyị ji “ike iche echiche” anyị na-eje. (Ndị Rom 12:1, NW) Ndị ohu Jehova bụ ndị ‘e mere ka ha kwere.’ (2 Timoti 3:14) Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị ndị na-edu ndú mkpa ịtụpụta ụkpụrụ nduzi na usoro ụfọdụ maka ihe ịga were were n’ọgbakọ. Otú ọ dị, kama ịchọ imere ndị Kraịst ibe ha mkpebi, ndị okenye na-ezi ha “ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) Ndị okenye na-eme nke a n’ụzọ bụ́ isi site n’iji ‘okwu nile nke okwukwe anyị, na nke ozizi ọma ahụ’ na-azụ ọgbakọ.—1 Timoti 4:6.
Ịrịba Ozizi Gị Ama
7, 8. (a) Olee otú ndị nwere ikike dị nta si nwee ike ije ozi dị ka ndị ozizi? (b) Gịnị na-egosi na mgbalị onwe onye dị mkpa iji ghọọ onye ozizi dị irè?
7 Otú ọ dị, ka anyị laghachi n’ọrụ izi ihe anyị n’ozuzu ya. Ọ̀ na-achọ nkà, agụmakwụkwọ, ma ọ bụ ikike ọ bụla kpọmkwem iji kere òkè n’ọrụ a? Ọ bụchaghị otú ahụ. N’akụkụ kasị ukwuu, ndị nkịtị bụ́ ndị nwere ikike dị nta na-arụ ọrụ izi ihe a zụrụ ụwa ọnụ. (1 Ndị Kọrint 1:26-29) Pọl na-akọwa, sị: “Anyị nwere akụ̀ a [ozi ahụ] n’ite ájá [ahụ na-ezughị okè], ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ihe ịga nke ọma dị ukwuu nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ nweworo bụ ihe na-agbara ike nke mmụọ Jehova akaebe!
8 Otú o sina dị, ọ na-ewe mgbalị onwe onye siri ike iji ghọọ “onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime ya, onye na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.” (2 Timoti 2:15) Pọl gbara Timoti ume, sị: “Rịba onwe gị na ozizi gị ama. Na-anọgide n’ihe ndị a; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.” (1 Timoti 4:16) Olee nnọọ otú mmadụ si arịba ozizi ya ama, ma ọ bụ n’ime ọgbakọ ma ọ bụ n’èzí? Ime otú ahụ ọ̀ na-achọcha mmadụ inwe nkà ma ọ bụ usoro izi ihe ụfọdụ?
9. Gịnị dị mkpa karịa ikike ebumpụta ụwa?
9 N’ezie Jisọs gosipụtara na o nwere usoro izi ihe ndị dị ịrịba ama n’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama. Mgbe o kwuchara okwu, “ibobo ozizi Ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ.” (Matiu 7:28) N’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ izi ihe nke ọma otú Jisọs si zie. Otú ọ dị, ọ dịghị anyị mkpa ịbụ ndị ọkà okwu iji bụrụ ndị ozizi dị irè. Leenụ, dị ka Job 12:7 si kwuo, ọbụna “anụmanụ” na “anụ ufe” pụrụ izi ihe n’ekwughị okwu! Gụnyere ikike ma ọ bụ nkà ebumpụta ụwa ndị anyị pụrụ inwe, ihe dị mkpa karịsịa bụ “aha mmadụ” anyị bụ—omume ndị anyị nwere na àgwà ime mmụọ ndị anyị zụliteworo nke ndị anyị na-amụrụ ihe pụrụ iṅomi.—2 Pita 3:11; Luk 6:40.
Ndị Na-amụ Okwu Chineke
10. Olee otú Jisọs si setịpụ ezi ihe nlereanya dị ka onye na-amụ Okwu Chineke?
10 Onye ozizi dị irè nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ aghaghị ịbụ onye na-amụ Okwu Chineke. (Ndị Rom 2:21) Jisọs Kraịst setịpụrụ ihe nlereanya dị ịrịba ama n’akụkụ a. N’oge ozi ya, Jisọs zoro aka ma ọ bụ kwupụta echiche ndị kwekọrọ n’akụkụ okwu ndị dị n’ihe dị ka ọkara nke akwụkwọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.a Ọmụma ọ maara Okwu Chineke nke ọma pụtara ìhè mgbe ọ dị afọ 12, bụ́ mgbe a hụrụ ya “ka Ọ nọdụrụ n’etiti ndị ozizi, na-anụ okwu ha, na-ajụkwa ha ajụjụ.” (Luk 2:46) Dị ka onye toruworo ogo mmadụ, ọ bụ omume e ji mara Jisọs ịga n’ụlọ nzukọ, bụ́ ebe a gụrụ Okwu Chineke.—Luk 4:16.
11. Olee ezi àgwà ịmụ ihe ndị onye ozizi kwesịrị ịzụlite?
11 Ị̀ bụ onye na-agụchi Okwu Chineke anya? Igwuba n’ime ya bụ ụzọ ‘ị ga-esi aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.’ (Ilu 2:4, 5) Ya mere zụlite ezi àgwà ịmụ ihe. Gbalịa ịgụ otu akụkụ nke Okwu Chineke kwa ụbọchị. (Abụ Ọma 1:2) Mee ka ọ bụrụ àgwà gị ịgụ mbipụta nke ọ bụla nke Ụlọ Nche na Teta! ngwa ngwa ị natara ha. Gee ntị nke ọma ná nzukọ ọgbakọ. Mụta iji nlezianya na-eme nnyocha. Site n’ịmụta ‘iso ihe nile nke ọma,’ ị pụrụ izere ikwubiga okwu ókè na ikwu okwu ndị na-ezighị ezi mgbe ị na-ezi ihe.—Luk 1:3.
Inwe Ịhụnanya na Nkwanye Ùgwù n’Ebe Ndị A Na-ezi Ihe Nọ
12. Gịnị bụ omume Jisọs n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ?
12 Àgwà ọzọ dị mkpa bụ inwe omume kwesịrị ekwesị n’ebe ndị ị na-ezi ihe nọ. Ndị Farisii lelịrị ndị ṅara Jisọs ntị, anya. “Ìgwè mmadụ a nke na-amaghị iwu anyị bụ ndị a na-abụ ọnụ,” ka ha kwuru. (Jọn 7:49) Ma Jisọs nwere ịhụnanya na nkwanye ùgwù miri emi n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ. O kwuru, sị: “Akpọkwaghị m unu ndị ohu ọzọ site n’ugbu a; n’ihi na ohu adịghị amata ihe onyenwe ya na-eme: ma akpọwo m unu ndị enyi; n’ihi na ihe nile M nụrụ site n’ọnụ Nna m ka M mere ka unu mara.” (Jọn 15:15) Nke a gosiri otú ndị na-eso ụzọ Jisọs kwesịrị isi na-arụ ọrụ izi ihe ha.
13. Olee mmetụta Pọl nwere banyere ndị o ziri ihe?
13 Dị ka ihe atụ, Pọl enweghị mmekọrịta na-adịghị ekpo ọkụ, yiri nke azụmahịa n’ebe ndị ọ na-amụrụ ihe nọ. Ọ gwara ndị Kọrint, sị: “A sị na unu nwere [puku ndị ozizi iri] n’ime Kraịst, ma unu enweghị ọtụtụ nna: n’ihi na mụ onwe m n’ime Kraịst Jisọs weere ozi ọma mụọ unu.” (1 Ndị Kọrint 4:15) N’oge ụfọdụ, ọbụna anya mmiri gbara Pọl ka ọ na-adụ ndị o ziri ihe ọdụ! (Ọrụ 20:31) O gosipụtakwara ndidi na obiọma dị ịrịba ama. Ya mere ọ pụrụ ịgwa ndị Tesalọnaịka, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma.”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:7.
14. N’ihi gịnị ka inwe mmasị onwe onye n’ebe ndị anyị na-amụrụ Bible nọ ji dị oké mkpa? Nye ihe atụ.
14 Ị̀ na-eṅomi Jisọs na Pọl? Inwe ezi ịhụnanya n’ebe ndị anyị na-amụrụ ihe nọ pụrụ imeju nnọọ erughị eru ọ bụla anyị pụrụ inwe n’ikike ebumpụta ụwa. Ndị anyị na-amụrụ Bible hà na-aghọta na anyị nwere ezi mmasị n’ebe ha nọ? Ànyị na-ewepụta oge ịmata ha? Mgbe otu nwanyị bụ́ onye Kraịst nọ na-enwe ihe isi ike n’inyere onye ọ na-amụrụ ihe aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, o ji obiọma jụọ, sị: “Ọ̀ dị ihe na-enye gị nsogbu?” Nwanyị ahụ malitere ikwupụta ihe dị ya n’obi, na-akọ ọtụtụ nchegbu o nwere. Mkparịta ụka ịhụnanya ahụ mesịrị mee ka nwanyị ahụ mee oké mgbanwe. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ echiche Akwụkwọ Nsọ na okwu nkasi obi na agbamume kwesịrị ekwesị. (Ndị Rom 15:4) Otú ọ dị, e nwere okwu ịdọ aka ná ntị: Onye a na-amụrụ Bible pụrụ inwe ọganihu n’ụzọ dị ngwa ma bụrụ onye ka nwere ụzọ ndụ ụfọdụ na-ekwesịghị ndị Kraịst ndị ọ ga-emeri. Ya mere ọ pụghị ịbụ ihe amamihe dị na ya iso onye ahụ na-akpakọchi anya. E kwesịrị inwe ókè ndị Kraịst kwesịrị ekwesị.—1 Ndị Kọrint 15:33.
15. Olee otú anyị pụrụ isi kwanyere ndị anyị na-amụrụ Bible ùgwù?
15 Ịkwanyere ndị anyị na-amụrụ ihe ùgwù na-agụnye na anyị agaghị anwa ịchịkwa ndụ ha. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:11) Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ iso nwanyị ya na nwoke na-abụghị di ya bi, na-amụ ihe. Ikekwe ha amụtawo ụmụ. N’ịbụ onye nwetaworo ezi ihe ọmụma banyere Chineke, nwanyị ahụ achọọ imezi ihe iji kwekọọ n’ụkpụrụ Jehova. (Ndị Hibru 13:4) Ò kwesịrị ịlụ nwoke ahụ ka ọ bụ ikewapụ onwe ya n’ebe ọ nọ? Ikekwe anyị na-eche n’ụzọ siri ike na ịlụ nwoke na-enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ ga-egbochi ya inwe ọganihu n’ọdịnihu. N’aka nke ọzọ, anyị pụrụ ịtụ egwu maka ọdịmma nke ụmụ ya ma na-eche na ọ ga-akara ya mma ịlụ nwoke ahụ. N’ọnọdụ nke ọ bụla, ọ bụ enweghị nkwanye ùgwù na enweghị ịhụnanya ịmabanye ná ndụ onye anyị na-amụrụ ihe ma na-anwa ịmanye ya ikwere echiche anyị n’okwu ndị dị otú ahụ. E kwuwerị, ọ bụ ya ka ihe ndị si ná mkpebi ahụ pụta na-aghaghị ịdịkwasị n’isi. Mgbe ahụ, ọ́ bụghị ihe kasị mma ịzụ onye mmụta dị otú ahụ, iji “nghọta” ya mee ihe ma kpebiere onwe ya ihe o kwesịrị ime?—Ndị Hibru 5:14.
16. Olee otú ndị okenye pụrụ isi gosi ịhụnanya na nkwanye ùgwù n’ebe ìgwè atụrụ Chineke nọ?
16 Ọ dị ndị okenye ọgbakọ mkpa karịsịa iji ịhụnanya na nkwanye ùgwù na-emeso ìgwè atụrụ ahụ ihe. N’idegara Faịlimọn akwụkwọ, Pọl kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na enwere m oké nkwuwa okwu n’ime Kraịst iwere ihe nke kwesịrị nye gị n’iwu, ma n’ihi ịhụnanya ahụ ọ ka m mma ịrịọ arịrịọ.” (Faịlimọn 8, 9) Mgbe ụfọdụ, ọnọdụ ndị na-akpata obi nkoropụ pụrụ ibilite n’ime ọgbakọ. Ịkwụsi ike pụrụ ọbụna ịdị mkpa. Pọl gbara Taịtọs ume ka o “werekwa aka ike tụọ [ndị mere ihe ọjọọ] mmehie ha n’anya, ka ha wee nwee ezi ndụ n’ime okwukwe anyị.” (Taịtọs 1:13) Ya bụrụgodị otú ahụ, ndị nlekọta aghaghị ịkpachara anya ịghara ịgwa ọgbakọ okwu mgbe ọ bụla n’ụzọ obi ọjọọ. “Ohu nke Onyenwe anyị aghaghị ịbụ onye na-adịghị alụ ọgụ,” ka Pọl dere, “kama ọ ghaghị ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ, ọ ghaghịkwa ịbụ onye nwere ike izi ihe, onye na-anagide ihe ọjọọ.”—2 Timoti 2:24; Abụ Ọma 141:3.
17. Mmehie ihe dị aṅaa ka Mosis mere, gịnịkwa ka ndị okenye pụrụ ịmụta site na ya?
17 Ndị nlekọta aghaghị ịnọgide na-echetara onwe ha na ọ bụ ‘ìgwè atụrụ Chineke’ ka ha so na-emekọ ihe. (1 Pita 5:2) Echiche a funahụrụ Mosis ná mkpirikpi oge, ọ bụ ezie na ọ dị umeala n’obi. Ụmụ Israel “nupụrụ isi n’okpuru ya, o wee were egbugbere ọnụ ya abụọ kwuo okwu efu.” (Abụ Ọma 106:33) O wutere Chineke nke ukwuu n’ihi mmeso ọjọọ a e mesoro ìgwè atụrụ Ya, ọ bụ ezie na ụta dịịrị ha. (Ọnụ Ọgụgụ 20:2-12) Mgbe ha chere ihe ịma aka ndị yiri nke ahụ ihu taa, ndị okenye kwesịrị ịgbalịsi ike iji nghọta na obiọma na-ezi ihe ma na-enye ntụzi. Ụmụnna anyị na-emeghachi omume n’ụzọ kasị mma mgbe e ji nchebara echiche mesoo ha ihe dị ka ndị na-achọ enyemaka, ọ bụghị dị ka ndị funyụworo anya. Ọ dị ndị okenye mkpa inwe echiche ahụ ziri ezi Pọl nwere mgbe o kwuru, sị: “Anyị atụkwasịwo obi n’ahụ unu n’ime Onyenwe anyị, na unu na-eme, ga-emekwa, ihe nile anyị na-enye n’iwu.”—2 Ndị Tesalọnaịka 3:4.
Ime Ihe Banyere Mkpa Ha
18, 19. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume ná mkpa ndị a na-amụrụ Bible bụ́ ndị nwere ikike ndị a kpaara ókè? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị a na-amụrụ ihe bụ́ ndị na-enwe nsogbu n’okwu ụfọdụ aka?
18 Onye ozizi dị irè na-adị njikere ịgbanwe iji kwekọọ n’ike na erughị eru nke ndị ọ na-amụrụ ihe. (Tụlee Jọn 16:12.) N’ilu Jisọs banyere talent, nna ukwu ahụ nyere ‘onye ọ bụla ihe ùgwù dị ka ike nke aka ya hà.’ (Matiu 25:15) Anyị pụrụ ịgbaso ụkpụrụ yiri nke ahụ mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụ ihe a na-achọsi ike bụ́ ịmụcha akwụkwọ dabeere na Bible n’oge dị nnọọ mkpirikpi. Otú ọ dị, a ghaghị ịghọta na ọ bụghị mmadụ nile nwere nkà ịgụ ihe nke ọma ma ọ bụ ikike ịghọta echiche ọhụrụ ngwa ngwa. Ya mere, nghọta dị mkpa iji mata oge e kwesịrị isi n’otu isi ihe gafee n’ọzọ n’ọmụmụ ihe ahụ ma ọ bụrụ na ọ na-esiri ndị na-aṅa ntị ike ịghọta ihe ngwa ngwa. Ihe ka mkpa karịa ịmụcha ihe n’oge a kapịrị ọnụ bụ inyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịghọta ihe ha na-amụ.—Matiu 13:51.
19 A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ndị a na-amụrụ Bible bụ́ ndị na-enwe ihe isi ike n’okwu ụfọdụ, dị ka Atọ n’Ime Otu ma ọ bụ ezumike dị iche iche nke okpukpe. Ọ bụ ezie na ọ dịchaghị mkpa iwebata nnyocha ndị dabeere na Bible n’ọmụmụ ihe anyị, anyị pụrụ ime otú ahụ mgbe ụfọdụ ma ọ bụrụ na o doro anya na nke a ga-aba uru. E kwesịrị iji ezi echiche mee ihe iji gbochie ịkwụsịlata ọganihu nke onye anyị na-amụrụ ihe n’ụzọ na-adịghị mkpa.
Bụrụ Onye Na-ekpo Ọkụ!
20. Olee otú Pọl si setịpụ ihe nlereanya n’igosipụta ikpo ọkụ na nkwenyesi ike n’izi ihe ya?
20 “N’akụkụ mmụọ unu, na-adịnụ ọkụ,” ka Pọl na-ekwu. (Ndị Rom 12:11) Ee, ma ànyị na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi ma ànyị na-ekere òkè n’ihe omume ná nzukọ ọgbakọ, anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na ikpo ọkụ na-eme nke ahụ. Pọl gwara ndị Tesalọnaịka, sị: “Ọ bụghị nanị n’okwu ọnụ ka ozi ọma anyị bịaruru unu, kama ọ bịakwara n’ike, na n’ime Mmụọ Nsọ na ọtụtụ nkwezu.” (1 Ndị Tesalọnaịka 1:5) Pọl na ndị ibe ya si otú ahụ mee ka ndị mmadụ keta “ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka [ha].”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:8.
21. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe àgwà ikpo ọkụ n’ebe ọrụ izi ihe anyị dị?
21 Ezi ikpo ọkụ na-abịa site n’ikwenyesi ike na ọ dị ndị anyị na-amụrụ Bible mkpa ịnụ ihe anyị nwere ikwu. Ka anyị ghara ile ọrụ izi ihe ọ bụla anya dị ka mmezu iwu. N’ezie odeakwụkwọ ahụ bụ́ Ezra rịbara ozizi ya ama n’akụkụ a. O “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya, na izi [ihe, NW] n’Israel.” (Ezra 7:10) Anyị kwesịkwara ime otú ahụ site n’ịkwadebe nke ọma ma na-atụgharị uche n’ịdị mkpa nke ihe ọmụmụ ahụ. Ka anyị kpegara Jehova ekpere ka o mee ka anyị jupụta n’okwukwe na nkwenyesi ike. (Luk 17:5) Ikpo ọkụ anyị pụrụ inyere ndị a na-amụrụ Bible aka ịzụlite ezi ịhụnanya maka eziokwu ahụ. N’ezie, ịrịba ozizi anyị ama pụrụ ịgụnye iji usoro izi ihe ụfọdụ kpọmkwem na-eme ihe. Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle ụfọdụ n’ime ndị a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 1071, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka e ji chọọ ndị Kraịst bụ́ ndị ozizi nwere nkà taa?
◻ Olee ezi àgwà ịmụ ihe ndị anyị pụrụ ịzụlite?
◻ N’ihi gịnị ka inwe ịhụnanya na nkwanye ùgwù n’ebe ndị anyị na-ezi ihe nọ ji dị oké mkpa?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe banyere mkpa nke ndị anyị na-amụrụ Bible?
◻ N’ihi gịnị ka ikpo ọkụ na nkwenyesi ike ji dị mkpa mgbe a na-ezi ndị ọzọ ihe?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ezi ndị ozizi bụ ndị na-amụ Okwu Chineke n’onwe ha
[Foto dị na peeji nke 13]
Gosi mmasị onwe onye n’ebe ndị a na-amụrụ Bible nọ