Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Anyị Pụrụ Ịdịru Ndụ?
Ndị mmadụ n’ozuzu ha na-adịtewanye ndụ aka, na-eme ka ọtụtụ ndị na-eche, sị, ‘Ogologo oge hà aṅaa ka anyị pụrụ ịdịru ndụ?’
DỊ KA The New Encyclopædia Britannica (1995) si kwuo, n’oge ndị gara aga, e kwetara n’ọha na ọ bụ Pierre Joubert dịtekarịsịrị ndụ aka. Ọ nwụrụ na 1814 mgbe ọ dị afọ 113. N’eziokwu, a na-ekwu na ndị ọzọ adịtewo ndụ aka karịa ya, ma e nweghị ihe ndekọ a pụrụ ịnakwere banyere afọ ndụ ha. Otú ọ dị, ezi ihe ndekọ anwapụtawo na ọtụtụ ndị adịtewo ndụ aka karịa Pierre Joubert.
A mụrụ Jeanne Louise Calment na Arles, na ndịda ọwụwa anyanwụ France, na February 21, 1875. A kọsara ihe banyere ọnwụ ya n’August 4, 1997—ihe karịrị afọ 122 ka e mesịrị—nke ukwuu. Na 1986, Shigechiyo Izumi bụ́ onye Japan nwụrụ mgbe ọ dị afọ 120. Akwụkwọ bụ́ Guinness Book of Records 1999 depụtara Sarah Knauss dị afọ 118 dị ka onye kasị mee okenye n’oge e dere ya. A mụrụ ya na September 24, 1880, na Pennsylvania, U.S.A. Mgbe Marie-Louise Febronie Meilleur bụ́ onye Quebec, Canada, nwụrụ na 1998, mgbe ọ dị afọ 118, o ji ụbọchị 26 tọọ Sarah.
N’ezie, ọnụ ọgụgụ ndị meworo ezigbo agadi amụbawo nke ukwuu. A na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ndị ruru otu narị afọ ga-amụba gafee nde 2.2 n’ọkara mbụ nke narị afọ na-abịanụ! N’otu aka ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị dị afọ 80 na karịa amụbawo site na nde 26.7 na 1970 ruo nde 66 na 1998. Nke ahụ bụ mmụba dị pasent 147, ma e jiri ya tụnyere mmụba dị pasent 60 maka ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa.
Ọ bụghịkwa nanị na ndị mmadụ na-adịte ndụ aka karị. Ọtụtụ na-emezukwa ihe ihe ka ukwuu ná ndị dị afọ 20 na-apụghị ime. Na 1990, John Kelley dị afọ 82 gbasịrị ọsọ marathon—ọsọ dị kilomita 42.195—n’ime awa ise na minit ise. Na 1991, nne nne ochie dị afọ 84 bụ́ Mavis Lindgren ji awa asaa na minit itoolu gbasịa ya. Na nso nso a karị, otu nwoke dị afọ 91 gbasịrị ọsọ New York City Marathon!
Nke a apụtaghị na ndị agadi n’oge gara aga emezughị ihe ndị dị ịtụnanya. Mgbe ọ dị afọ 99, nna ochie a kpọrọ aha na Bible bụ́ Abraham ‘gbara ọsọ izute’ ndị ọbịa ya. Mgbe ọ dị afọ 85, Keleb kwuru, sị: “Dị ka ike m si dị mgbe ahụ [afọ 45 tupu mgbe ahụ], otú a ka ike m dịkwa ugbu a, ibu agha, na ịpụ apụ, na ịbata abata.” Bible na-ekwukwa banyere Mosis na mgbe ọ dị afọ 120, “anya ya adịghị ahụ inyoghị inyoghị, ume ya apụghị n’ahụ ya.”—Jenesis 18:2; Joshua 14:10, 11; Deuterọnọmi 34:7.
Jisọs Kraịst kwuru okwu banyere nwoke mbụ, bụ́ Adam, na onye ahụ wuru ụgbọ, bụ́ Noa, dị ka ndị dị n’akụkọ ihe mere eme. (Matiu 19:4-6; 24:37-39) Jenesis na-ekwu na Adam biri ndụ ruo afọ 930, Noa kwa afọ 950. (Jenesis 5:5; 9:29) Ndị mmadụ hà adịruwo ndụ otú ahụ n’ezie? Ànyị pụrụ ịdị ndụ ọbụna gafee otú ahụ, ikekwe ruo mgbe ebighị ebi? Biko nyochaa ihe àmà dị n’isiokwu na-esonụ.