Ọgbakọ Ndị Kraịst—Ebe E Si Enweta Enyemaka Na-ewusi Ike
POPI, bụ́ nwanyị nọ ná mmalite afọ ndị 20 ya, nwere obi nkoropụ n’ihi otu ọnọdụ na-egbu mgbu nke dị n’ezinụlọ ha bụ́ nke gụnyere enweghị nkwurịta okwu n’etiti ya na ndị mụrụ ya.a Mgbe ọ gwasịrị otu onye Kraịst bụ́ okenye na nwunye ya ihe dị ya n’obi, o degaara ha akwụkwọ, sị: “Unu emeela nke ukwuu maka iwepụta oge iji gwa m okwu. Unu amaghị otú m jiruru nchegbu unu nwere banyere m kpọrọ ihe. Ana m ekele Jehova maka inye m ndị m pụrụ ịtụkwasị obi ma gwa okwu.”
Toula, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ na nso nso a nke ji ụmụ abụọ ndị nọ afọ iri na ụma, chọtara onwe ya n’ime ihe isi ike kpụ ọkụ n’ọnụ nke mmetụta uche na nke ego. Otu di na nwunye bụ́ ndị Kraịst si n’ọgbakọ ha letara ya na ụmụ ya nleta na-ewusi ike mgbe mgbe. Mgbe ọ nagidesịrị ọnọdụ ya n’ụzọ gara nke ọma, o zigaara ha kaadị, na-ekwu, sị: “Ana m echeta unu n’ekpere m mgbe nile. Ana m echeta ọtụtụ mgbe unu nyeere m aka ma kwadoo m.”
Ị̀ na-enwe mmetụta mgbe ụfọdụ na nrụgide na-arị elu nke ụwa a ‘ebowo gị ibu dị arọ’? (Matiu 11:28) “Mgbe na ihe ndapụta” ò jiriwo ahụmahụ ndị na-egbu mgbu mebie ndụ gị? (Eklisiastis 9:11) Mgbe ahụ, ọ bụghị nanị gị. Ma dị ka ọtụtụ puku ndị nwere nsogbu chọtawororịị, gị onwe gị kwa pụrụ ịchọta enyemaka bara uru n’ọgbakọ ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova. Na narị afọ mbụ O.A., Pọl onyeozi chọpụtara na ụfọdụ ndị kwere ekwe ibe ya bụụrụ ya “ndị ngụgụ obi” karịsịa. (Ndị Kọlọsi 4:10, 11) Ị pụrụ inwe ahụmahụ yiri nke ahụ.
Nkwado na Enyemaka
N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e si n’okwu Grik bụ́ ek·kle·siʹa, nke pụtara ìgwè mmadụ a kpọkọtara ọnụ, sụgharịa okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ.” Okwu ahụ na-enye echiche nke ịdị n’otu na nkwadorịta.
Ọgbakọ ndị Kraịst na-ebuli eziokwu nke Okwu Chineke elu ma na-akpọsa ozi ọma nke Alaeze ya. (1 Timoti 3:15; 1 Pita 2:9) Otú ọ dị, ọgbakọ na-enyekwa ndị òtù ya nkwado ime mmụọ na enyemaka. N’ebe ahụ, mmadụ pụrụ ịhụ ìgwè ndị enyi na-ahụ n’anya, nwere mmasị ma na-echegbu onwe ha banyere mmadụ, bụ́ ndị dị njikere inyere ndị ọzọ aka na ịkasi ha obi n’oge nsogbu.—2 Ndị Kọrint 7:5-7.
Ndị na-efe Jehova achọtawo nchebe na ịnọ ná ntụkwasị obi mgbe nile n’ọgbakọ ya. Ọbụ abụ ahụ gosiri na ya nwere ọṅụ na mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi n’etiti mgbakọta nke ndị Chineke. (Abụ Ọma 27:4, 5; 55:14; 122:1) N’otu aka ahụ taa, ọgbakọ ndị Kraịst bụ njikọ nke ndị kwere ekwe ibe anyị bụ́ ndị na-ewuli ibe ha elu ma na-agba ibe ha ume.—Ilu 13:20; Ndị Rom 1:11, 12.
A na-akụziri ndị òtù nke ọgbakọ ka ha “na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka [ha] na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe [ha] nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Ọzụzụ dabeere na Bible ha na-enweta na-akwali ha igosi ibe ha ịhụnanya ụmụnna n’ụzọ dị nro. (Ndị Rom 12:10; 1 Pita 3:8) A na-akwali ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ ndị nọ n’ọgbakọ inwe obiọma, ịbụ ndị na-eme udo, nakwa ndị nwere obi ọmịiko. (Ndị Efesọs 4:3) Kama nanị ịbụ ndị na-efe ofufe, ha na-egosipụta nchegbu ịhụnanya maka ndị ọzọ.—Jemes 1:27.
Ya mere, n’ime ọgbakọ, ndị e boro ibu arọ na-achọta ọnọdụ ọma nke yiri nke ezinụlọ. (Mak 10:29, 30) Mmetụta nke ịbụ ndị so n’òtù ndị nwere njikọ ma na-ahụ n’anya na-ewusi ha ike. (Abụ Ọma 133:1-3) Site n’ọgbakọ, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enye ‘nri ime mmụọ na-edozi ahụ n’oge ya.’—Matiu 24:45.
Enyemaka Site n’Aka Ndị Nlekọta Na-ahụ n’Anya
Ndị òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ ịtụ anya ịchọta n’ime ya ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, ndị nwere nghọta, nakwa ndị ruru eru bụ́ ndị na-enye nkwado na agbamume ime mmụọ. Ndị ọzụzụ atụrụ nwere àgwà dị otú ahụ yiri “ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.” (Aịsaịa 32:1, 2) Ndị okenye ma ọ bụ ndị nlekọta, e ji mmụọ nsọ họpụta na-elekọta ndị Chineke yiri atụrụ, na-agba ndị ọrịa na ndị nwere nkụda mmụọ ume, na-achọkwa iweghachi ndị mehieworonụ.—Abụ Ọma 100:3; 1 Pita 5:2, 3.
N’ezie, òtù ndị okenye nke ọgbakọ abụghị ndị ọkà n’ịgwọ ọrịa ma ọ bụ ndị ọrụ ahụ ike, bụ́ ndị nwere ike ịgwọ nsogbu anụ ahụ ma ọ bụ nke uche nke ndị kwere ekwe ibe ha na-enwe. N’usoro ihe a, ndị na-arịa ọrịa ka nwere “mkpa dibịa.” (Luk 5:31) Ka o sina dị, ndị ọzụzụ atụrụ dị otú ahụ pụrụ inyere ndị nọ ná mkpa n’ụzọ ime mmụọ aka. (Jemes 5:14, 15) Mgbe ọ bụla o kwere mee, ndị okenye na-edokwakwa maka enyemaka ndị ọzọ.—Jemes 2:15, 16.
Ònye na-eme ndokwa ịhụnanya dị otú ahụ? Ọ bụ Jehova Chineke n’onwe ya! Onye amụma bụ́ Ezikiel kọwara na Jehova kwuru, sị: “M ga-achọkwa . . . atụrụ nke m, chọpụta ha. . . . M ga-anapụtakwa ha n’ebe nile ha gbasara . . . Mụ onwe m ga-azụ . . . atụrụ nke m, Mụ onwe m ga-emekwa ka ha makpuo amakpu.” Chineke nwekwara nchegbu banyere atụrụ ndị na-adịghị ike.—Ezikiel 34:11, 12, 15, 16.
Ezi Enyemaka Bịara n’Ezi Oge
Ezi enyemaka ọ̀ dị n’ọgbakọ ndị Kraịst n’ezie? Ee, ihe atụ ndị na-esonụ na-egosikwa ọtụtụ ọnọdụ ebe ọgbakọ na-enye aka.
◆ Ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Di Anna nwụrụ mgbe ọ rịasịrị nrịanrịa na-adịghị ala ala. “Kemgbe ahụ, anọwo m na-enweta ịhụnanya si n’obi n’aka òtù ụmụnna ndị Kraịst,” ka ọ na-ekwu. “Okwu agbamume na nke nkwado nke ndị kwere ekwe ibe m nọgidere na-agwa m, gụnyere mmakụ ha ndị si n’obi, emewo ka obi m nọgide na-eti eti kama ịgbawa kpam kpam, ana m ekelekwa Jehova. Ịhụnanya ha emewo ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye a kwadoro n’ụzọ dị ukwuu, onye e mesịrị bulie elu, onye e lekọtara anya n’ụzọ dị nro.” Gị onwe gị kwa pụrụ inwewo ahụmahụ na-akpaghasị uche nke onye ị hụrụ n’anya ịnwụnahụ gị. N’oge ndị dị otú ahụ, ndị òtù nke ọgbakọ pụrụ inye gị nkasi obi dị mkpa na nkwado n’ụzọ mmetụta uche.
◆ Ọrịa. Arthur, bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị si Poland, letara ọgbakọ ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia mgbe mgbe iji wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ. N’otu n’ime nleta ndị a, ọ dara nnọọ ọrịa, o nwetakwara ajọ nsogbu ná mgbake ya. “Achọrọ m ịgwa gị otú ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị nọ [n’otu obodo dị na Kazakhstan] si lekọta m anya,” ka Arthur ji ekele dị ukwuu na-echeta. “Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị, bụ́ ndị m na-amaghị ọtụtụ n’ime ya—ọbụnakwa ndị nwere mmasị—wetaara m ego, nri, na ọgwụ. . . . Ha jikwa oké ọṅụ mee ya.
“Cheedị banyere mmetụta ndị m nwere mgbe m natara otu envelopu ego ụfọdụ dị n’ime ya na akwụkwọ ozi na-esonụ: ‘Ezigbo Nwanna m, ana m ekele gị site n’obi m. Mama m nyere m ego iji zụrụ ice cream, ma ekpebiri m inye gị ya iji zụrụ ọgwụ. Biko gbakee ngwa ngwa. Anyị dị Jehova mkpa ruo ogologo oge. Ya gaziere gị. Kọkwuokwara anyị akụkọ ọma ụfọdụ, ndị na-akụzi ihe. Vova.’” Ee, dị ka e gosiri n’ọnọdụ a, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi nọ n’ọgbakọ pụrụ inye aka ndị na-ewusi ike n’oge ọrịa.—Ndị Filipaị 2:25-29.
◆ Ịda mbà n’obi. Teri nwere ọchịchọ si n’obi nke ije ozi dị ka ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye mkpọsa Alaeze oge nile. Ma n’ihi ihe isi ike, ọ ghaghị ịkwụsị ịsụ ụzọ. “Enwere m obi amamikpe dị egwu maka ịgbalị ije ozi n’ọnọdụ a ma ghara irudị otu afọ zuru ezu,” ka ọ na-ekwu. Teri kweere n’ụzọ hiere ụzọ na inweta ihu ọma Jehova dabeere nanị n’otú ozi ọ na-ejere ya hà. (Tụlee Mak 12:41-44.) N’ịbụ onye dara nnọọ mbà n’obi, o kewapụrụ onwe ya iche. Ma mgbe ahụ, enyemaka na-enye ume ọhụrụ si n’aka ọgbakọ bịa.
Teri na-echeta: “Otu nwanna nwanyị tọrọ m nke bụ́ ọsụ ụzọ gbataara m ọsọ enyemaka ma gee m ntị ka m na-agwa ya mmetụta ndị m nwere. Mgbe m hapụrụ ụlọ ya, ọ dị m ka e bunaara m ibu dị arọ. Site mgbe ahụ gawa, nwanna nwanyị a bụ́ ọsụ ụzọ na di ya, bụ́ onye okenye n’ọgbakọ, nyeere m aka n’ụzọ bara uru. Ha kpọrọ m na fon kwa ụbọchị na-ajụ otú m dị. . . . Ha ekwewo ka m sonye n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ha mgbe ụfọdụ, bụ́ nke meworo ka m mata uru ezinụlọ ịnọkọ ọnụ bara.”
Ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe bụ́ ọtụtụ ndị—ọbụna ndị Kraịst raara onwe ha nye—ịda mbà n’obi, inwe nkụda mmụọ na inwe mmetụta nke ịbụ ndị nọ nanị ha. Lee obi ekele anyị pụrụ inwe na enyemaka ịhụnanya na nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị dị n’ọgbakọ Chineke!—1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.
◆ Ọdachi na ihe ọghọm. Tinye onwe gị n’ọnọdụ nke otu ezinụlọ dị mmadụ anọ bụ́ ndị ihe onwunwe ha nile funahụrụ mgbe ụlọ ha gbara ọkụ. N’oge na-adịghị anya, ha nwetara ihe ha kpọrọ “ahụmahụ na-agba ume nke ga na-emetụ anyị n’ahụ ruo mgbe ebighị ebi nke mekwara ka anyị matakwuo ezi ịhụnanya dị n’etiti ndị Jehova.” Ha na-akọwa, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ anyị kpọrọ anyị na fon ọtụtụ mgbe iji gosipụta nkwado na ọmịiko ha ndị sitere n’ezi obi. Fon kụrụ n’esepụghị aka. Nchegbu na ịhụnanya sitere n’ezi obi nke onye ọ bụla metụrụ anyị n’ahụ nke ukwuu nke na anya mmiri obi ekele gbara anyị.”
N’oge na-adịghị anya, ndị okenye ọgbakọ ahụ haziri otu ìgwè buru ibu nke ụmụnna, n’ụbọchị ole na ole kwa, ha wuuru ezinụlọ a ụlọ ọhụrụ. Otu onye agbata obi ha tipụrụ, sị: “I kwesịrị ịhụ ya! E nwere ụdị mmadụ dị iche iche na-arụ ọrụ n’ebe ahụ—ndị ikom, ndị inyom, ndị isi ojii, ndị na-asụ asụsụ Spanish!” Nke a bụ ihe àmà pụtara ìhè nke ịhụnanya ụmụnna.—Jọn 13:35.
Ndị Kraịst ibe ha nyekwara ezinụlọ ahụ uwe, nri, na ego. Nna ha na-ekwu, sị: “Nke a bụ n’oge Krismas mgbe onye ọ bụla na-enye onyinye, ma anyị pụrụ ikwu n’eziokwu na ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ nwetara ụdị ezi mmesapụ aka na-eri ọnụ anyị nwetara.” Ha na-agbakwụnyekwa, sị: “Anyị ji nwayọọ nwayọọ na-echefu ọkụ ahụ, ncheta ọma nke omume obiọma na ezi ndị enyi na-anọchikwa ya. Anyị na-ekele Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, na anyị nwere ezinụlọ nke ụmụnna dị otú ahụ nke magburu onwe ya, nke dị n’otu n’ụwa, anyị nwekwara nnọọ ekele iso na ya!”
N’ezie, ntinye aka dị otú ahụ agaghị ekwe omume, a naghịkwa atụ anya inweta ya, n’ọdachi nile dị otú ahụ. Ma ihe atụ a na-egosi n’ezie nkwado nke ọgbakọ pụrụ inye.
Amamihe Si n’Elu Bịa
Ọtụtụ ndị achọtawo ebe ọzọ e si enweta enyemaka na ume n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ̀ bụ ole ebe? Mbipụta ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” na-akwadebe. Ndị kasị pụta ìhè n’ime ha bụ Ụlọ Nche na Teta! Iji nye ndụmọdụ nghọta dị na ya na ntụziaka bara uru, mbipụta ndị a na-adabere n’ụzọ bụ́ isi n’amamihe Chineke a na-achọta na Bible. (Abụ Ọma 119:105) A na-eji nnyocha ndị a pụrụ ịdabere na ha nakwa ndị a na-apụghị ịgbagha agbagha n’isiokwu ndị dị ka mkpaghasị uche, isi ná mmetọ gbakee, nsogbu dị iche iche nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya na nke akụ̀ na ụba, ihe ịma aka ndị na-eto eto na-eche ihu, na ihe isi ike ndị a na-enwe n’ala ndị ka na-emepe emepe, atụkwasị n’ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ. Karịsịa, mbipụta ndị a na-ebuli ụzọ Chineke elu dị ka ụzọ ndụ kasị mma.—Aịsaịa 30:20, 21.
Kwa afọ, Watch Tower Society na-anata ọtụtụ puku akwụkwọ ozi ekele. Dị ka ihe atụ, otu nwa okoro nọ na Russia dere banyere otu Teta! na-ekwu banyere igbu onwe onye, sị: “N’ihi àgwà ịda mbà n’obi m nwere, . . . atụlewo m igbu onwe m ọtụtụ ugbo. Isiokwu a mere ka nkwere m kweere na Chineke ga-enyere m aka ịchịkwa nsogbu m sikwuo ike. Ọ chọrọ ka m dịrị ndụ. Ana m ekele ya maka nkwado o nyere m site n’isiokwu a.”
Ọ bụrụ na nsogbu ndị tara akpụ dị n’ụwa a eyie ka ha sibigara ike ókè ịchịkwa, ị pụrụ ijide n’aka na e nwere ebe dị nchebe n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’ezie, ọ bụrụ na ọzara kpọrọ oké nkụ nke usoro ihe a nke ịhụnanya kọrọ na-eme ka ike gwụ gị, ị pụrụ ịchọta ala mmiri nke na-enye ume ọhụrụ ná nzukọ Jehova. Mgbe i nwetasịrị nkwado dị otú ahụ, gị onwe gị kwa pụrụ ikwughachi mmetụta nke otu nwanyị bụ́ onye Kraịst bụ́ onye nagidere nrịanrịa siri ike nke di ya n’ụzọ gara nke ọma ma dee, sị: “N’ihi ịhụnanya na nlekọta e gosiri anyị, ọ dị m ka a ga-asị na Jehova buuru anyị n’ọbọ aka ya gabiga nsogbu a. Lee ka m si nwee ekele iso ná nzukọ Jehova dị ebube!”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ.
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Anyị pụrụ inyere ndị ọrịa, ndị mmadụ nwụnahụrụ, nakwa ndị ọzọ aka n’ụzọ na-ewusi ike