Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 6/1 p. 4-7
  • Chineke Anọghị Ọdụ n’Ime Nkwa Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Anọghị Ọdụ n’Ime Nkwa Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iko nke Ajọ Omume A Ga-emeju
  • Oge Chineke Ga-eme Ihe Eruwo
  • Oge I Nwere Iji Mee Ihe
  • Olee Ihe Mere Chineke ji Lụso ndị Kenan Agha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Mbibi Chineke Bibiri Ndị Mmadụ Ọ̀ Na-egosi na Obi Tara Ya Mmiri?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Gịnị Bụ Ụbọchị Ikpe?
    Teta!—2010
  • Ụbọchi Ikpe—Oge Inwe Olileanya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 6/1 p. 4-7

Chineke Anọghị Ọdụ n’Ime Nkwa Ya

“JEHOVA, ruo ole mgbe ka m ga na-etiku Gị, ma Ị dịghị anụ?” Ndị ahụ bụ okwu onye amụma Hibru bụ́ Habakuk, bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke asaa T.O.A. Ma ha na-ada dị ka ihe anyị maara nke ọma, ọ̀ bụ na ha adịghị ada otú ahụ? Ọ bụ ihe e bu pụta ụwa bụ́ ịchọ inweta ihe ndị anyị na-achọsi ike ozugbo ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere mee. Nke a dị otú ahụ karịsịa n’ọgbọ anyị a nke ịchọ inweta afọ ojuju ozugbo.—Habakuk 1:2.

Na narị afọ mbụ, e nwere ụfọdụ ndị ihe àmà na-egosi na ha chere na Chineke kwesịrị imezuwo nkwa ya dị iche iche ngwa ngwa karị. Ha enweghịzi nnọọ ndidi nke na ọbụna ha weere ya na Chineke na-egbu oge ma ọ bụ na-eme ihe na-azụ oge. N’ihi nke a, Pita onyeozi chetaara ha na ụzọ Chineke si ele oge anya dị nnọọ iche n’ụzọ anyị si ele. Pita na-ede, sị: “Unu ekwela ka otu ihe a mee unu nchefu, ndị m hụrụ n’anya, na otu ụbọchị dị ka [otu puku afọ] n’anya Onyenwe anyị, [otu puku afọ] dịkwa ka otu ụbọchị.”—2 Pita 3:8.

Dị ka ụzọ a nke ịmara oge si dị, onye dị afọ 80 adịwo ndụ nanị ihe dị ka awa abụọ, akụkọ ihe mere eme nile nke ihe a kpọrọ mmadụ adịruwo nanị ụbọchị isii. Mgbe anyị lere ihe anya n’ụzọ a, ọ ga-adịrị anyị mfe karị ịghọta ụzọ Chineke si emeso anyị ihe.

Otú ọ dị, Chineke abụghị onye na-enweghị mmasị n’ihe banyere oge. N’ụzọ dị iche, ọ na-eji oge akpọrọ ihe. (Ọrụ 1:7) Ya mere, Pita gara n’ihu ikwu, sị: “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) N’adịghị ka ụmụ mmadụ, Chineke adịghị enwe mmetụta nke ịbụ onye a rụgidere ime ihe dị ka a ga-asị na oge na-aganahụ ya. Dị ka “Eze nke mgbe nile,” o nwere ụzọ dị egwu o si ahụzu ihe nile, ọ pụkwara ikpebi oge mgbe ihe omume ya ga-emere ndị nile o metụtara ihe kasị mma.—1 Timoti 1:17.

Mgbe ọ kọwasịrị ihe kpatara ịnọ ọdụ o yiri ka Chineke ọ na-anọ, Pita nyere ịdọ aka ná ntị a: “Ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi.” Ya bụ, ụbọchị ime mpịazi ga-abịa nnọọ mgbe ụmụ mmadụ na-adịghị atụ anya ya. Mgbe ahụ, n’amaokwu ndị na-esonụ, Pita kwuru banyere atụmanya dị ebube dịịrị ndị na-egosi ‘ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile,’ ya bụ, ka ha wee nwee ike ịlanarị baa n’ime “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” nke Chineke kwere ná nkwa.—2 Pita 3:10-13.

Nke a kwesịrị ime ka anyị nwee ekele karịsịa na ikpe Chineke abịabeghị. Ndidi ya emewo ka o kwe anyị omume ịbịa mara nzube ya na ime mgbanwe ná ndụ anyị iji nweta ngọzi ndị o kwere ná nkwa. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgụ “ogologo ntachi obi Onyenwe anyị na ọ bụ nzọpụta,” dị ka Pita na-ekwu? (2 Pita 3:15) Otú ọ dị, e nwere ihe ọzọ kpatara ndidi Chineke.

Iko nke Ajọ Omume A Ga-emeju

N’ịmụ banyere otú Chineke si mesoo ihe a kpọrọ mmadụ ihe n’oge gara aga, anyị na-ahụ na ọ naghị ekpebi ikpe ruo mgbe olileanya na-adịghịzi maka mmekwata. Dị ka ihe atụ, banyere ikpe Chineke megide ndị Kenean, o mere ka Abraham mata mmehie ha dị iche iche ogologo oge tupu mgbe ahụ. Ma oge maka mkpebi ikpe ya erubeghị mgbe ahụ. N’ihi gịnị? Bible na-asị: “N’ihi na ajọ omume ndị Amọraịt [ndị Kenean] aka-ezughị,” ma ọ bụ dị ka nsụgharị Knox si tinye ya: “Ajọ omume nke ndị Amọraịt erubeghị oge ya zuru ezu.”—Jenesis 15:16.a

Otú ọ dị, n’ihe dị ka afọ 400 mgbe e mesịrị, ikpe Chineke bịara, ụmụ Abraham, bụ́ ụmụ Israel, weghaarakwara ala ahụ. A zọpụtara ole na ole n’ime ndị Kenean, dị ka Rehab na ndị Gibeọn, n’ihi àgwà na omume ha, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha eruwo ọ̀tụ̀tụ̀ kasịnụ nke adịghị ọcha, dị ka ihe mgbe ochie e gwupụtara n’oge a kpughere. Ha fere ihe oyiyi nke akụkụ ahụ e ji enwe mmekọahụ, gbaa akwụna ụlọ nsọ, chụọkwa ụmụaka n’àjà. Halley’s Bible Handbook na-ekwu, sị: “Ọ tụrụ ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie, bụ́ ndị gwuru ihe ná mkpọmkpọ ebe ndị ahụ nke obodo ndị Kenean n’anya na Chineke ebibighị ha n’oge karịa ka o mere.” N’ikpeazụ, ‘iko nke mmehie nke ndị Kenean juru’; ajọ omume ha ‘eruwo oge ya zuru ezu.’ Ọ dịghị onye pụrụ izi ezi n’ibo Chineke ebubo nke ịbụ onye na-ekpe ikpe na-ezighị ezi mgbe o kwere ka e kpochaa ala ahụ ka ọ na-echebe ndị gosiworo ezi àgwà.

Anyị na-ahụ ihe yiri nke ahụ n’ụbọchị Noa. N’agbanyeghị eziokwu bụ́ na mmadụ ndị nọ tupu Iju Mmiri ahụ jọrọ njọ, Chineke ji obi ebere kpebie na oge ha ga-adịru afọ 120 ọzọ. N’akụkụ ụfọdụ nke oge ahụ, Noa jere ozi dị ka “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Ka oge na-aga, ihe àmà na-egosi na ajọ omume ha dịwanyere njọ. “Chineke wee hụ ụwa, ma, lee, e bibiri ya; n’ihi na anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, bibiri ụzọ ya n’elu ụwa.” (Jenesis 6:3, 12) ‘Iko nke mmehie ha juru eju’; ọchịchọ obi ha na-ezighị ezi eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu ka oge na-aga. Chineke ziri ezi kpam kpam mgbe o mere ihe. Nanị mmadụ asatọ gosipụtara onwe ha ịbụ ndị ezi omume n’anya Chineke, ọ zọpụtakwara ha.

A hụrụ otu ụkpụrụ ahụ ná mmeso Chineke mesoro Israel. N’agbanyeghị na ha mere omume n’ụzọ ekwesịghị ntụkwasị obi nakwa n’ụzọ rụrụ arụ, Chineke nwere ndidi n’ebe ha nọ ruo ọtụtụ narị afọ. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Jehova, . . . wee zigara ha . . . ndị ozi Ya, na-ebili n’isi ụtụtụ, na-ezikwa; n’ihi na O nwere ọmịiko n’ahụ ndị Ya . . . ha wee . . . na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.” (2 Ihe E Mere 36:15, 16) Ndị ahụ eruwo n’ókè nke mmekwata na-agakwaghị ekwe omume. Nanị Jeremaịa na ole na ole ndị ọzọ ka a pụrụ ịzọpụta. A pụghị ịkpọ Chineke onye na-ekpe ikpe na-ezighị ezi mgbe o mesịziri mee ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị fọdụrụnụ.

Oge Chineke Ga-eme Ihe Eruwo

Site n’ihe atụ ndị a anyị pụrụ ịhụ na Chineke na-ahapụ ikpe usoro ihe a ikpe nanị ruo mgbe oge zuru. E kwupụtara nke a n’iwu e nyere onye mmezu ikpe ihe atụ nke Chineke: “Tinye mma iwe ihe ubi gị dị nkọ, bipụ ụyọkọ nile nke vine nke ụwa; n’ihi na mkpụrụ vine ya achazuwo. Mmụọ ozi ahụ wee tụba mma iwe ihe ubi ya n’ụwa, wee bipụ mkpụrụ vine nke ụwa, tụba ya n’ime ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ, nke dị ukwuu, bụ́ nke ọnụma Chineke.” Rịba ama na ajọ omume nke ihe a kpọrọ mmadụ “achazuwo,” ya bụ, o ruwo n’ókè nke mmekwata na-agaghị ekwe omume. Mgbe Chineke ga-emezu ihe e kpere n’ikpe, obi abụọ agaghị adị ya na ntinye aka ọ ga-etinye ziri ezi.—Mkpughe 14:18, 19.

N’ịtụle ihe ndị dị n’elu, o doro anya na ikpe Chineke megide ụwa aghaghị ịbụ nke dị nso n’ihi na ụwa na-akpazi àgwà ndị kpatara ikpe Chineke n’oge gara aga. N’ebe ọ bụla anyị lere anya n’ụwa, ime ihe ike jupụtara na ya, dị nnọọ ka ọ dị tupu Iju Mmiri nke ụbọchị Noa. Omume ndị mmadụ na-adịwanye nnọọ ka ihe a kọwara na Jenesis 6:5: “Nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi [mmadụ] bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.” Ọbụna ajọ mmehie ndị kpatara ikpe Chineke megide ndị Kenean ejupụtawo ebe nile taa.

Karịsịa kemgbe a lụsịrị Agha Ụwa Mbụ, ihe a kpọrọ mmadụ ahụwo mgbanwe ndị jọgburu onwe ha. Ọ hụwo ka e ji ọbara nke ọtụtụ nde mmadụ ruchie ụwa. Agha, mgbukpọ, iyi egwu, mpụ, na mmebi iwu etiwapụwo gburugburu ụwa. Ụnwụ nri, ọrịa, na omume rụrụ arụ ewekọrọwo ụwa anyị. Ihe àmà nile ahụ na-egosi na anyị na-ebi ugbu a n’etiti ajọ ọgbọ ahụ nke Jisọs kwuru banyere ya, sị: “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” (Matiu 24:34) Ụwa na-emeju “iko nke mmehie” ya ugbu a. “Ụyọkọ nile nke vine nke ụwa” amalitela ịcha maka owuwe ihe ubi.

Oge I Nwere Iji Mee Ihe

A gwara Jọn onyeozi na ka oge ikpe na-eru nso, ụdị nchazu abụọ ga-ewere ọnọdụ. N’otu akụkụ, “onye na-eme ajọ omume, ya mee ajọ omume gaa n’ihu: onye rukwara unyi, ka e mee ka o ruo unyi gaa n’ihu.” Ma n’aka nke ọzọ, “onye ezi omume, ya mee ezi omume gaa n’ihu: onye dịkwa nsọ, ka e doo ya nsọ gaa n’ihu.” (Mkpughe 22:10, 11) Ihe omume nke ikpeazụ a na-ewere ọnọdụ n’ihe metụtara ọrụ ịkụzi Bible nke Ndịàmà Jehova na-akụzi gburugburu ụwa. Nzube nke ọrụ ahụ bụ izi ndị mmadụ ihe Chineke chọrọ ha n’aka ka e wee nwee ike ịgụ ha ná ndị ruru eru inweta ndụ ebighị ebi. Ọrụ a na-eru n’ala 233 ugbu a site n’aka ihe dị ka ọgbakọ 87,000.

Chineke anọghị ọdụ. O jiriwo ndidi nye ndị mmadụ n’otu n’otu oge dị ha mkpa iji ‘yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ’ iji soro ná ndị ga-enweta ihe ndị o kwere ná nkwa. (Ndị Efesọs 4:24) Taa, Chineke ka na-echere, n’agbanyeghị ọnọdụ ụwa ndị na-ajọwanye njọ mgbe nile. Ndịàmà Jehova nọ gburugburu ụwa na-eme ihe nile ha pụrụ ime n’ụzọ ezi uche dị na ya iji soro ndị agbata obi ha kerịta ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3, 17) N’ụzọ na-enye obi ụtọ, kwa afọ ihe karịrị mmadụ 300,000 na-anabata ya, a na-emekwa ha baptism.

N’inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi, ugbu a bụ oge ime ihe, ọ bụghị ichere echere. N’ihi na n’oge na-adịghị anya, anyị ga-ahụ mmezu nke nkwa Jisọs: “Onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.”—Jọn 11:26.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Nkọwa ala ala peji banyere amaokwu a n’akwụkwọ bụ́ The Soncino Chumash na-ekwu, sị: “Iji kwesị nchụpụ, ebe ọ bụ na Chineke adịghị enye mba ntaramahụhụ ruo mgbe iko nke mmehie ya juru.”

[Foto dị na peeji nke 6]

A gwara onye mmezu ikpe Chineke ka o tinye mma iwe ihe ubi ya mgbe vine nile nke ụwa chazuworo

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndịàmà Jehova nọ gburugburu ụwa na-enyere ndị mmadụ aka ịbịa soro ná ndị ga-enweta ngọzi ebighị ebi nke Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya