“Onyinye n’Ụdị Mmadụ” Iji Lekọta Atụrụ Jehova
“Mgbe ọ rịgooro n’elu o bupụrụ ndị a dọọrọ n’agha; o nyere onyinye n’ụdị mmadụ.”—NDỊ EFESỌS 4:8, NW.
1. Gịnị ka otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst kwuru banyere ndị okenye nọ n’ọgbakọ ya?
“UNU emeela maka inwe nchegbu banyere anyị hie nne. Ihu ọchị unu, ikpo ọkụ unu, na nchegbu unu bụ nnọọ nke ezigbo ya. Unu nọ ya mgbe nile ige anyị ntị na ịgwa anyị okwu ndị sitere na Bible bụ́ ndị na-akpali mmụọ anyị. Ana m ekpe ekpere ka m ghara ileda unu anya mgbe ọ bụla.” Ihe a ka otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst degaara ndị okenye nọ n’ọgbakọ ya. N’ụzọ doro anya, ịhụnanya nke ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya gosiri ya emetụwo ya n’obi.—1 Pita 5:2, 3.
2, 3. (a) Dị ka Aịsaịa 32:1, 2 si kwuo, olee otú ndị okenye nwere ọmịiko si elekọta atụrụ Jehova? (b) Olee mgbe a pụrụ ile onye okenye anya dị ka onyinye?
2 Ndị okenye bụ ndokwa Jehova mere iji lekọta atụrụ ya. (Luk 12:32; Jọn 10:16) Jehova hụrụ atụrụ ya n’anya—n’ezie, ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu nke na o ji ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Jisọs zụta ha. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere obi ji adị Jehova ụtọ mgbe ndị okenye na-emeso atụrụ ya ihe n’ụzọ dị nro. (Ọrụ 20:28, 29) Rịba ama otú e si kọwaa ndị okenye, ma ọ bụ “ndị isi” a n’ụzọ amụma: “Otu onye ga-adịkwa ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:1, 2) Ee, ha ga-echebe atụrụ ya, nye ha ume ọhụrụ, kasiekwa ha obi. Ndị okenye bụ́ ndị ji ọmịiko na-azụ ìgwè atụrụ ahụ si otú a na-agbalị ime ihe kwekọrọ n’ihe Chineke na-atụ anya n’aka ha.
3 N’ime Bible, e zoro aka n’ebe ndị okenye dị otú ahụ nọ dị ka “onyinye n’ụdị mmadụ.” (Ndị Efesọs 4:8) Mgbe i chere echiche banyere onyinye, ị na-eche banyere ihe e nyere iji gboo mkpa ma ọ bụ iji wetara onye a na-enye ya obi ụtọ. A pụrụ ile onye okenye anya dị ka onyinye mgbe o ji ikike ya na-eme ihe iji nye enyemaka dị mkpa na ime ka atụrụ ahụ nwee obi ụtọ. Ọ̀ pụrụ isi aṅaa mee nke a? Azịza ya, bụ́ nke a na-achọta n’okwu Pọl ndị dị ná Ndị Efesọs 4:7-16, na-eme ka nchegbu ịhụnanya Jehova nwere n’ebe atụrụ ya dị pụtakwuo ìhè.
“Onyinye n’Ụdị Mmadụ”—Hà Si Ebee?
4. Ná mmezu nke Abụ Ọma 68:18, n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova ‘rịgooro n’elu,’ olee ndị bụkwa “onyinye dị n’ụdị mmadụ”?
4 Mgbe Pọl ji okwu ahụ bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” mee ihe, ọ nọ na-ehota ihe Eze Devid kwuru, bụ́ onye kwuworo banyere Jehova, sị: “Ị rịgoruwo n’elu; i bupụwo ndị a dọọrọ n’agha; i werewo onyinye dị n’ụdị mmadụ.” (Abụ Ọma 68:18, NW) Mgbe ụmụ Israel nọsịworo n’Ala Nkwa ahụ ruo afọ ụfọdụ, Jehova ‘rịgooro’ n’Ugwu Zaịọn n’ụzọ ihe atụ ma mee ka Jerusalem bụrụ isi obodo nke alaeze Israel nke Devid bụ eze ya. Ma olee ndị bụ́ “onyinye dị n’ụdị mmadụ”? Ha bụ ndị ikom a dọọrọ n’agha n’oge e meriri ala ahụ. E mesịrị kpọgara ndị Livaị ụfọdụ n’ime ndị a a dọọrọ n’agha iji nye aka n’ọrụ a na-arụ n’ụlọikwuu.—Ezra 8:20.
5. (a) Olee otú Pọl si egosi na Abụ Ọma 68:18 na-emezu n’ọgbakọ ndị Kraịst? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs ‘rịgooro n’elu’?
5 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, Pọl na-egosi na okwu ọbụ abụ ahụ nwere mmezu ka ukwuu n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’ikwughachi Abụ Ọma 68:18 n’ụzọ ọzọ, Pọl na-ede, sị: “Ma e nyere onye ọ bụla n’ime anyị obiọma na-erughịrị mmadụ dị ka Kraịst si tụọ onyinye ahụ e nyere n’efu n’ọ̀tụ̀tụ̀. Ya mere ọ na-ekwu, sị: ‘Mgbe ọ rịgooro n’elu o bupụrụ ndị a dọọrọ n’agha; o nyere onyinye n’ụdị mmadụ.’” (Ndị Efesọs 4:7, 8, NW) N’ebe a, Pọl ji abụ ọma a mee ihe n’ebe Jisọs nọ dị ka onye nnọchiteanya Chineke. Jisọs ‘meriri ụwa’ site n’ụzọ ikwesị ntụkwasị obi ya. (Jọn 16:33) O merikwara ọnwụ na Setan site ná mkpọlite Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ. (Ọrụ 2:24; Ndị Hibru 2:14) N’afọ 33 O.A., Jisọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ rịgooro “n’ebe kachasị eluigwe nile elu nke ukwuu”—dị elu karịa ihe ndị ọzọ e kere eke nọ n’eluigwe. (Ndị Efesọs 4:9, 10; Ndị Filipaị 2:9-11) Dị ka onye mmeri, Jịsọs naara onye iro ahụ ndị ọ “dọọrọ n’agha.” N’ụzọ dị aṅaa?
6. Malite na Pentikọst 33 O.A., olee otú Jisọs ahụ rịgoworo eluigwe si malite ịkwakọrọ ihe n’ụlọ Setan, gịnịkwa ka o ji “ndị a dọọrọ n’agha” mee?
6 Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs gosipụtara na ya ka Setan ike site n’ịgbapụta ndị ndị mmụọ ọjọọ ji n’agbụ. Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na Jisọs wakporo ụlọ Setan, kee ya agbụ, ma kwakọrọ ngwongwo ya. (Matiu 12:22-29) Cheedị banyere ihe Jisọs pụziri ịkwata n’agha ozugbo a kpọlitere ya n’ọnwụ ma were “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa” nye ya! (Matiu 28:18) Malite na Pentikọst 33 O.A., Jisọs ahụ rịgoworo n’eluigwe, dị ka onye nnọchiteanya Chineke, malitere ịkwakọrọ ihe ndị dị n’ụlọ Setan site ‘n’ibupụ ndị a dọọrọ n’agha’—mmadụ ndị buworo ohu nke mmehie na ọnwụ eri oge, ndị nọkwa n’okpuru nchịkwa Setan. ‘Ndị a a dọọrọ n’agha’ ji ọchịchọ obi ha ghọọ “ndị ohu Kraịst, na-eme ihe Chineke na-achọ site ná mkpụrụ obi [ha].” (Ndị Efesọs 6:6) Dị ka a pụrụ ikwu ya, Jisọs tọhapụrụ ha ná nchịkwa Setan, ma were ha nye ọgbakọ dị ka “onyinye n’ụdị mmadụ,” n’aha Jehova. Cheedị banyere iwe na-enweghị isi Setan ga-ewe mgbe a napụtara ha n’aka ya, kpọmkwem n’ihu ya!
7. (a) N’ọnọdụ dịgasị aṅaa ka “onyinye n’ụdị mmadụ” na-eje ozi n’ọgbakọ? (b) Olee ohere Jehova nyeworo nwoke ọ bụla na-eje ozi dị ka okenye?
7 Ànyị na-ahụ “onyinye n’ụdị mmadụ” dị otú ahụ taa n’ọgbakọ? N’ezie, anyị na-ahụ ha! Anyị na-ahụ ha ka ha na-eje ozi dị ka ndị okenye, na-arụsi ọrụ ike dị ka ‘ndị na-ezisa ozi ọma, ndị na-azụ atụrụ, na ndị ozizi’ n’ihe karịrị ọgbakọ 87,000 nke ndị Chineke n’ụwa nile. (Ndị Efesọs 4:11) Ọ dịghị ihe ọzọ Setan ga-aka enwe mmasị na ya karịa ka ha megbuo ìgwè atụrụ ahụ. Ma nke ahụ abụghị ihe mere Chineke ji were ha nye ọgbakọ site n’aka Kraịst. Kama nke ahụ, Jehova ewepụtawo ndị ikom a maka ọdịmma nke ọgbakọ, ha ga-azakwa ajụjụ n’ihu ya maka atụrụ ahụ o nyefere ha. (Ndị Hibru 13:17) Ọ bụrụ na ị na-eje ozi dị ka okenye, Jehova enyewo gị ohere magburu onwe ya iji gosi na ị bụụrụ ụmụnna gị onyinye, ma ọ bụ ngọzi. Ị pụrụ ime otú ahụ site n’imezu ibu ọrụ anọ dị mkpa.
Mgbe E Nwere Mkpa Maka ‘Mgbazigharị’
8. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ọ dị mkpa ka a gbazigharịa anyị nile mgbe ụfọdụ?
8 Nke mbụ, “onyinye n’ụdị mmadụ” bụ nke e wepụtara “iji wee gbazigharịa ndị nsọ,” ka Pọl na-ekwu. (Ndị Efesọs 4:12, NW) Mkpọaha Grik a sụgharịrị ịbụ ‘mgbazigharị’ na-ezo aka n’idebe ihe “n’usoro kwesịrị ekwesị.” Dị ka ndị na-ezughị okè, ọ dị anyị nile mkpa ịbụ ndị a na-agbazigharị site n’oge ruo n’oge—ime ka echiche, àgwà, ma ọ bụ omume anyị soro echiche na uche Chineke dịrị “n’usoro kwesịrị ekwesị.” Jehova ejiriwo ịhụnanya wepụta “onyinye n’ụdị mmadụ” iji nyere anyị aka ime mgbanwe ndị dị mkpa. Olee otú ha si eme nke a?
9. Olee otú onye okenye pụrụ isi nye aka n’ịgbazigharị atụrụ meworo mmehie?
9 Mgbe ụfọdụ, a pụrụ ịgwa onye okenye ka o nyere atụrụ meworo mmehie aka, ikekwe onye ‘a nwudeworo mgbe ọ nọ ná ndahie.’ Olee otú onye okenye pụrụ isi nye aka? “Meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ,” ka Ndị Galetia 6:1 na-ekwu. N’ihi ya, mgbe ọ na-enye ndụmọdụ, onye okenye agaghị abara onye ahụ mere mmehie mbá, na-ekwu okwu ndị na-akpasu iwe. Ndụmọdụ kwesịrị ịgba onye a na-enye ya ume, ọ bụghị ‘ime ka ọ tụọ egwu.’ (2 Ndị Kọrint 10:9; tụlee Job 33:7.) Ihere pụrụ ịdị na-emeworị onye ahụ, ya mere onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya na-ezere ịkụda mmụọ onye ahụ. Mgbe o doro anya na ịhụnanya kpaliri ndụmọdụ na ọbụna ịdọ aka ná ntị siri ike, nakwa na e ji ịhụnanya nye ya, o yikarịrị ka ọ ga-edozighachi echiche ma ọ bụ omume nke onye ahụ mere mmehie, si otú ahụ na-eweghachi ya.—2 Timoti 4:2.
10. Gịnị ka ịgbazigharị ndị ọzọ gụnyere?
10 N’iwepụta “onyinye n’ụdị mmadụ” maka ịgbazigharị anyị, Jehova bu n’uche ka ndị okenye bụrụ ndị na-enye ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ nakwa ndị ndị ya kwesịrị iṅomi. (1 Ndị Kọrint 16:17, 18; Ndị Filipaị 3:17) Ịgbazigharị ndị ọzọ na-agụnye, ọ bụghị nanị ịgbazi ndị na-agahie agahie, kamakwa inyere ndị kwesịrị ntụkwasị obi aka ịrapagidesi ike n’ezi ụzọ ahụ.a Taa, ebe e nwere ọtụtụ nsogbu ndị yiri ka ha na-akụda mmụọ, agbamume dị ọtụtụ ndị mkpa iji nagide ha. Enyemaka dị nro pụrụ ịdị ụfọdụ mkpa iji mee ka echiche ha kwekọọ ná nke Chineke. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na-enwe mmetụta dị ukwuu nke ịbụ ndị na-erughị eru ma ọ bụ ndị na-abaghị n’ihe. “Ndị dara mbà n’obi” dị otú ahụ nwere ike iche na Jehova apụghị ịhụ ha n’anya ma ọlị nakwa na Chineke apụtụghị ịnabata ọbụna mgbalị ndị kasị mma ha na-eme iji jeere ya ozi. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ma ụzọ iche echiche a ekwekọghị n’otú Chineke si ele ndị na-efe ya ofufe anya n’ezie.
11. Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji nyere ndị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị na-abaghị n’ihe, aka?
11 Ndị okenye, gịnị ka unu pụrụ ime iji nyere ndị dị otú a aka? Jirinụ obiọma gosi ha ihe nnwapụta dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na Jehova na-eche banyere onye ọ bụla n’ime ndị ohu ya, mesighachikwanụ ha obi ike na akụkụ Bible ndị a na-ezo aka kpọmkwem n’ebe ha nọ. (Luk 12:6, 7, 24) Nyerenụ ha aka ịghọta na Jehova ‘adọtawo’ ha ijere ya ozi, ya mere ọ bụ ihe e ji n’aka na ọ ghaghị ịhụta uru ha bara. (Jọn 6:44) Mesienụ ha obi ike na ọ bụghị nanị ha na-enwe ụdị mmetụta ahụ—ọtụtụ ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi enwewo mmetụta ndị yiri nke ahụ. N’otu oge, Elaịja onye amụma dara mbà n’obi nke ukwuu nke na ọ chọrọ ịnwụ. (1 Ndị Eze 19:1-4) Obi nke ụfọdụ ndị Kraịst e tere mmanụ na narị afọ mbụ ‘mara ha ikpe.’ (1 Jọn 3:20) A na-enweta nkasi obi n’ịmara na ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible nwere “mmetụta dị ka nke anyị.” (Jemes 5:17, NW) Unu pụkwara iso onye ahụ dara mbà n’obi tụleghachi isiokwu ndị na-agba ume dị n’Ụlọ Nche na Teta! Chineke nke nyeworo unu dị ka “onyinye n’ụdị mmadụ” ga-ahụ mgbalị ndị unu ji ịhụnanya na-eme iji weghachi obi ike nke ndị dị otú ahụ.—Ndị Hibru 6:10.
‘Iwuli Ìgwè Atụrụ ahụ Elu’
12. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “iwuli ahụ nke Kraịst elu dị ka ụlọ” na-egosi, gịnịkwa bụ isi sekpụ ntị n’iwuli ìgwè atụrụ ahụ elu?
12 Nke abụọ, e nyere “onyinye n’ụdị mmadụ” maka “iwuli ahụ nke Kraịst elu dị ka ụlọ.” (Ndị Efesọs 4:12) Pọl ji atụmatụ okwu mee ihe n’ebe a. ‘Iwuli elu’ na-echetara anyị ihe owuwu, “ahụ nke Kraịst” na-ezokwa aka n’ebe ndị mmadụ nọ—ndị so n’ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ. (1 Ndị Kọrint 12:27; Ndị Efesọs 5:23, 29, 30) Ọ dị ndị okenye mkpa inyere ụmụnna ha aka ịgbasi ike n’ụzọ ime mmụọ. Nzube ha bụ ‘iwuli ìgwè atụrụ ahụ elu, ọ bụghị iweda’ ha ala. (2 Ndị Kọrint 10:8) Ịhụnanya bụ isi sekpụ ntị n’iwuli ìgwè atụrụ ahụ elu, n’ihi na “ịhụnanya na-ewuli elu dị ka ụlọ.”—1 Ndị Kọrint 8:1.
13. Gịnị ka inwe mmetụta ọmịiko pụtara, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa ka ndị okenye gosi mmetụta ọmịiko?
13 Mmetụta ọmịiko bụ otu akụkụ nke ịhụnanya nke na-enyere ndị okenye aka iwuli ìgwè atụrụ ahụ elu. Inwe mmetụta ọmịiko pụtara iche ihe banyere ndị ọzọ—ịghọta echiche na mmetụta ha, na-echebara erughị eru ha echiche. (1 Pita 3:8) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị okenye na-enwe mmetụta ọmịiko? Karịsịa ọ bụ n’ihi na Jehova—onye na-enye “onyinye n’ụdị mmadụ”—bụ Chineke nke na-enwe mmetụta ọmịiko. Mgbe ndị ohu ya na-ata ahụhụ ma ọ bụ nọrọ n’ihe mgbu, ọ na-enwe mmetụta maka ha. (Ọpụpụ 3:7; Aịsaịa 63:9) Ọ na-echebara erughị eru ha echiche. (Abụ Ọma 103:14) Oleezi otú ndị okenye pụrụ isi gosi mmetụta ọmịiko?
14. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị okenye pụrụ isi gosipụta mmetụta ọmịiko n’ebe ndị ọzọ nọ?
14 Mgbe onye dara mbà n’obi bịakwutere ha, ha ga-ege ya ntị, na-aghọta mmetụta onye ahụ nwere. Ha ga-agbalị ịghọta nzụlite, àgwà, na ọnọdụ nke ụmụnna ha. Mgbe ndị okenye nyeziri aka n’ụzọ na-ewuli elu bụ́ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ọ ga-adịrị atụrụ ahụ mfe ịnara ya n’ihi na o si n’aka ndị ọzụzụ atụrụ na-aghọta ma na-echebara ha echiche n’ezie. (Ilu 16:23) Mmetụta ọmịiko na-akpalikwa ndị okenye ịtụle erughị eru nke ndị ọzọ na mmetụta ndị nwere ike isi na ya pụta. Dị ka ihe atụ, ndị Kraịst ụfọdụ nwere ezi akọ na uche pụrụ inwe obi amamikpe n’ihi na ha enweghị ike ime ihe karị ka ha na-eme n’ijere Chineke ozi, ikekwe n’ihi nká ma ọ bụ ahụ esighị ike. N’aka nke ọzọ, agbamume pụrụ ịdị ụfọdụ mkpa iji mee ka ozi ha dịwanye mma. (Ndị Hibru 5:12; 6:1) Mmetụta ọmịiko ga-akpali ndị okenye ịchọpụta “okwu nile na-atọ ụtọ” bụ́ ndị na-ewuli ndị ọzọ elu. (Eklisiastis 12:10) Mgbe e wuliri atụrụ Jehova elu ma kwalie ha, ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ ga-akpali ha ime ihe nile ha pụrụ ime n’ijere ya ozi!
Ndị Ikom Na-akwalite Ịdị n’Otu
15. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ịdị n’otu nke okwukwe” pụtara?
15 Nke atọ, e wepụtara “onyinye n’ụdị mmadụ” ka ‘anyị nile wee ruo ịdị n’otu nke okwukwe na nke mmazu nke Ọkpara Chineke.’ (Ndị Efesọs 4:13) Nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “ịdị n’otu nke okwukwe” pụtara ịdị n’otu, ọ bụghị nanị nke nkwenkwe, kamakwa nke ndị kwere ekwe. Nke a bụzi ihe ọzọ mere Chineke jiworo nye anyị “onyinye n’ụdị mmadụ”—iji kwalite ịdị n’otu n’etiti ndị ya. Olee otú ha si eme nke a?
16. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị okenye nọgide na-adị n’otu n’etiti onwe ha?
16 Iji malitegodị, ha aghaghị ịnọgide na-adị n’otu n’etiti onwe ha. Ọ bụrụ na ndị ọzụzụ atụrụ enwee nkewa, a pụrụ ileghara atụrụ anya. Oge dị oké ọnụ ahịa a pụrụ iji zụọ atụrụ pụrụ ịbụ nke e ji nwee nzụkọ na nrụrịta ụka banyere okwu ndị dapụtaranụ, nke were oge n’ụzọ na-enweghị isi. (1 Timoti 2:8) Ndị okenye nwere ike ghara ikwekọrịta ozugbo n’okwu nile ha na-ekwurịta, n’ihi na ha bụ ndị ikom nwere àgwà ndị pụrụ ịdịwaga nnọọ iche. Ịdị n’otu apụtaghị na ha agaghị enwe echiche ndị dị iche ma ọ bụ ọbụna na-ekwupụta ha n’ụzọ ziri ezi mgbe ha na-enwe mkparịta ụka e ji obi ghere oghe na-enwe. Ndị okenye na-echekwa ịdị n’otu ha site n’iji nkwanye ùgwù na-aṅa ibe ha ntị n’ebughị ụzọ kpee ha ikpe. Ọ bụrụkwahaala na ọ dịghị ụkpụrụ Bible a na-emebi, onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị ịdị njikere ikwenye na ịkwado mkpebi ikpeazụ òtù ndị okenye mere. Inwe mmụọ nke nkwenyere na-egosi na ọ bụ “amamihe ahụ nke si n’elu bịa,” bụ́ nke “dị udo, nwee obiọma,” na-eduzi ha.—Jemes 3:17, 18.
17. Olee otú ndị okenye pụrụ isi nye aka iji chekwaa ịdị n’otu n’ọgbakọ?
17 Ndị okenye na-amụkwa anya ịkwalite ịdị n’otu n’ọgbakọ. Mgbe mmetụta ndị na-akpata nkewa—dị ka asịrị ọjọọ, omume nke ịkọwahie ebumnobi ndị ọzọ, ma ọ bụ mmụọ nkewa—yiri udo egwu, ha na-adị njikere inye ndụmọdụ na-enye aka. (Ndị Filipaị 2:2, 3) Dị ka ihe atụ, ndị okenye pụrụ ịma banyere mmadụ ndị na-eme nkatọ gabiga ókè ma ọ bụ ndị na-achọ ịmabanye n’ihe gbasara ndị ọzọ, si otú a na-aghọ ndị na-ele ihe na-abụghị nke aka ha anya. (1 Timoti 5:13; 1 Pita 4:15) Ndị okenye ga-agbalị inyere ndị dị otú a aka ịmata na omume a megidere ihe Chineke kụziwooro anyị nakwa na onye ọ bụla aghaghị ‘ibu ibu nke aka ya.’ (Ndị Galetia 6:5, 7; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:9-12) N’iji Akwụkwọ Nsọ mee ihe, ha ga-akọwa na Jehova na-ahapụ anyị iji akọ na uche anyị mee ihe, na ọ dịghị onye n’ime anyị kwesịrị ikpe ndị ọzọ ikpe n’okwu ndị dị otú ahụ. (Matiu 7:1, 2; Jemes 4:10-12) Iji jiri ịdị n’otu na-ejekọ ozi, a ghaghị inwe ntụkwasị obi na nkwanye ùgwù n’ime ọgbakọ. Site n’inye ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ dị mkpa, “onyinye n’ụdị mmadụ” na-enyere anyị aka ichekwa udo na ịdị n’otu anyị.—Ndị Rom 14:19.
Ichebe Ìgwè Atụrụ Ahụ
18, 19. (a) “Onyinye n’ụdị mmadụ” na-echebe anyị pụọ n’aka ole ndị? (b) Olee ihe ize ndụ ọzọ ọ dị mkpa ka e chebe atụrụ ahụ pụọ na ya, oleekwa otú ndị okenye si eme ihe iji chebe atụrụ ahụ?
18 Nke anọ, Jehova na-ewepụta “onyinye n’ụdị mmadụ” iji chebe anyị pụọ n’ịbụ ndị “ifufe nile ọ bụla nke ozizi, . . . n’ime ịtụ ntụ nke mmadụ, n’ime aghụghọ, nke ha ji ezupụta nduhie,” na-emetụta. (Ndị Efesọs 4:14) A sịrị na okwu mbụ e ji mee ihe maka “ịtụ ntụ” pụtara “ịghọ aghụghọ mgbe a na-agba chaa chaa” ma ọ bụ “inwe nkà n’iji aghụghọ agba chaa chaa.” Nke ahụ ọ́ dịghị echetara anyị ụzọ akọ ndị si n’ezi ofufe dapụ ji eme ihe? N’iji arụmụka ire ụtọ eme ihe, ha na-asụgharị Akwụkwọ Nsọ isi ná mgbalị iji dọpụ ezi ndị Kraịst n’okwukwe ha. Ndị okenye aghaghị ịnọ na nche maka “agụ jọgburu onwe ha” dị otú ahụ!—Ọrụ 20:29, 30.
19 Ọ dịkwa atụrụ Jehova mkpa ịbụ ndị e chebere pụọ n’ihe ize ndụ ndị ọzọ. Onye ọzụzụ atụrụ oge ochie bụ́ Devid ji obi ike chebe ìgwè atụrụ nna ya pụọ n’aka anụ ndị na-eri ibe ha. (1 Samuel 17:34-36) Taa kwa, a pụrụ inwe mgbe ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ ọ dị n’ubu ha na-aghaghị igosipụta obi ike iji chebe ìgwè atụrụ ahụ pụọ n’aka onye ọ bụla nke pụrụ imeso atụrụ Jehova ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ megbuo ha, nke ka nke, ndị na-adịghị ike. Ndị okenye ga-adị ngwa ịchụpụ ndị ma ụma eme mmehie n’ọgbakọ, bụ́ ndị kpachapụrụ anya na-eji ịtụ ntụ, aghụghọ, na atụmatụ ọjọọ eme ihe iji na-eme ihe ọjọọ.b—1 Ndị Kọrint 5:9-13; tụlee Abụ Ọma 101:7.
20. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe ná nlekọta nke “onyinye n’ụdị mmadụ”?
20 Lee ka anyị si enwe ekele maka “onyinye n’ụdị mmadụ”! Ná nlekọta ịhụnanya ha, anyị pụrụ inwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe, n’ihi na ha na-agbazigharị anyị n’ụzọ dị nro, jiri ịhụnanya na-ewuli anyị elu, jiri obi ha na-echekwa ịdị n’otu anyị, jirikwa obi ike na-echebe anyị. Ma olee otú “onyinye n’ụdị mmadụ” kwesịrị isi na-ele ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ anya? Oleekwa otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekele maka ha? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ná nsụgharị Grik Septuagint, e ji otu ngwaa nke a a sụgharịrị ịbụ “gbazigharịa” mee ihe n’Abụ Ọma 17[16]:5, bụ́ ebe Devid kwesịrị ntụkwasị obi kpere ekpere ka nzọụkwụ ya gbadosie ike n’ụzọ nile nke Jehova.
b Dị ka ihe atụ, lee “Ajuju Ufọdu Ndi Nagu Akwukwọ Ayi Naju” ná mbipụta Ụlọ Nche nke May 15, 1980, peji nke 31-32, na “Ka Anyị Kpọọ Ihe Ọjọọ Asị” ná mbipụta nke January 1, 1997, peji nke 26-29.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee ndị bụ “onyinye n’ụdị mmadụ,” n’ihi gịnịkwa ka Chineke jiworo si n’aka Kraịst were ha nye ọgbakọ?
◻ Olee otú ndị okenye si emezu ibu ọrụ ha nke ịgbazigharị ìgwè atụrụ ahụ?
◻ Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji wulie ndị kwere ekwe ibe ha elu?
◻ Olee otú ndị okenye pụrụ isi chekwaa ịdị n’otu nke ọgbakọ?
[Foto dị na peeji nke 10]
Mmetụta ọmịiko na-enyere ndị okenye aka ịgba ndị dara mbà n’obi ume
[Foto dị na peeji nke 10]
Inwe ịdị n’otu n’etiti ndị okenye na-akwalite ịdị n’otu n’ime ọgbakọ