Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 6/1 p. 28-31
  • Ndị Ha na Pọl Rụkọrọ Ọrụ—Hà Bụ Ole Ndị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ha na Pọl Rụkọrọ Ọrụ—Hà Bụ Ole Ndị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị So Ya Mee Njem na Ndị Ikom na Ndị Inyom Lere Ya Ọbịa
  • Ìgwè Ndị Enyi
  • Nkwado E Ji Iguzosi Ike n’Ihe Nye n’Oge A Tụrụ Ya Mkpọrọ
  • “Anyị Bụ Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ”
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • “Ọbara Onye Ọ Bụla A Na-azọpụtaghị Adịghị M n’Isi”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Mgbe Pọl Nọ na Rom
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 6/1 p. 28-31

Ndị Ha na Pọl Rụkọrọ Ọrụ—Hà Bụ Ole Ndị?

N’AKWỤKWỌ Bible bụ́ Ọrụ Ndị Ozi nakwa n’ime akwụkwọ ozi dị iche iche nke Pọl, a kpọrọ aha ihe dị ka otu narị mmadụ, bụ́ ndị òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ bụ́ ndị ha na “onyeozi nke ndị mba ọzọ” nwere mmekọrịta. (Ndị Rom 11:13) A maara ihe dị ukwuu banyere ọtụtụ n’ime ha. Ma eleghị anya ị maara ọrụ ndị Apọlọs, Banabas, na Saịlas rụrụ nke ọma. N’aka nke ọzọ, ọ ga-esiri gị ike karị ma eleghị anya ikwu ọtụtụ ihe banyere Akịpọs, Klọdịa, Damaris, Laịnọs, Pesis, Pudins, na Sopata.

N’oge ndị dị iche iche nakwa n’ọnọdụ ndị dịgasị iche, ọtụtụ mmadụ keere òkè dị ukwuu n’ịkwado ozi Pọl. Ndị dị ka Aristakọs, Luk, na Timoti so onyeozi ahụ jee ozi ruo ọtụtụ afọ. Ụfọdụ nọnyeere ya mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ mgbe ọ nọ na njem, dị ka ndị so ya mee njem ma ọ bụ dị ka ndị ikom ma ọ bụ ndị inyom lere ya ọbịa. N’ụzọ dị mwute, ndị ọzọ, dị ka Aleksanda, Dimas, Hamọgenis, na Faịgelọs, anọgidesighị ike n’okwukwe ndị Kraịst.

A bịa n’ihe banyere ụfọdụ ndị enyi ndị ọzọ nke Pọl, dị ka Asịnkritọs, Hamis, Julia, ma ọ bụ Fịlọlọgọs, iji kpọtụ nanị ole na ole aha, anyị matụkwu ihe banyere ha karịa aha ha. N’ihe banyere nwanne nwanyị Nireọs ma ọ bụ nne Rufọs ma ọ bụ ndị ezinụlọ Klọị, anyị amaghịdị aha ha. (Ndị Rom 16:13-15; 1 Ndị Kọrint 1:11) Ka o sina dị, nnyocha nke ntakịrị ihe ọmụma ọ bụla anyị nwere banyere ihe dị ka otu narị mmadụ a na-eme ka anyị matakwuo ụzọ Pọl onyeozi si rụọ ọrụ. Ọ na-akụzikwara anyị ihe banyere abamuru dị n’ịbụ onye ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị kwere ekwe ibe anyị gbara gburugburu nakwa iso ha rụọ ọrụ.

Ndị So Ya Mee Njem na Ndị Ikom na Ndị Inyom Lere Ya Ọbịa

Ozi Pọl onyeozi gụnyere ime njem nke ukwuu. Otu onye edemede gụkọrọ na ebe ndị o meruru njem n’elu ala nakwa n’ime mmiri dị ka e dekọrọ ya n’Ọrụ Ndị Ozi nanị ruru ihe dị ka kilomita 16,000. Ọ bụghị nanị na ime njem n’oge ahụ na-agwụ ike kama ọ dịkwa ize ndụ. N’ime ihe ize ndụ ndị o zutere bụ ụgbọ okpukpu, n’ihe ize ndụ site n’osimiri na ndị na-apụnara mmadụ ihe, n’ihe ize ndụ n’ime ọhịa, nakwa n’ihe ize ndụ n’ime oké osimiri. (2 Ndị Kọrint 11:25, 26) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, nanị Pọl adịghị emekebe njem ndị ahụ o mere site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ.

Ndị ahụ sonyeere Pọl ga-abụ ndị ha na ya ga na-akpakọrịta, ndị ga na-agba ya ume, nakwa ndị ga na-enyere ya aka n’ụzọ bara uru n’ozi. N’oge ụfọdụ, Pọl hapụrụ ha gawa ka ha nwee ike ilekọta mkpa ime mmụọ nke ndị ọhụrụ kwere ekwe. (Ọrụ 17:14; Taịtọs 1:5) Ma o yiri ka ọ dị oké mkpa na ya na ndị mmadụ ga-eso maka nchebe na nkwado iji nagide ihe isi ike nke njem ahụ. Ya mere mmadụ ndị dị ka Sopata, Sekundọs, Gaịọs, na Trọfimọs, bụ́ ndị anyị maara na ha so n’ime ndị ha na Pọl mere njem, pụrụ ikerewo òkè dị mkpa n’ịga nke ọma nke ozi ya.—Ọrụ 20:4.

E jikwa obi ụtọ nabata enyemaka nke ndị ikom na ndị inyom lere ya ọbịa. Mgbe Pọl rutere n’obodo o bu n’uche ime nkwusa ma ọ bụ nanị ịnọ ọnọdụ abalị, ihe mbụ ọ na-eme bụ ịchọta ebe ọ ga-anọ. Onye ọ bụla mere njem n’ụzọ sara mbara dị ka Pọl mere aghaghị ihi ụra n’ezie n’imerime ihe ndina dị iche iche. Ọ pụrụ ịdị na-anọ n’ụlọ ndị ọbịa mgbe mgbe, ma ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kọwara nke a dị ka “ebe dị ize ndụ, nke na-adịghịkwa mma,” ya mere, n’ebe o kwere mee, o yiri ka Pọl nọnyeere ndị kwere ekwe ibe ya.

Anyị maara aha ndị ikom na ndị inyom ụfọdụ lere Pọl ọbịa—Akwila na Priska, Gaịọs, Jeson, Lidia, Neson, Faịlimọn, na Filip. (Ọrụ 16:14, 15; 17:7; 18:2, 3; 21:8, 16; Ndị Rom 16:23; Faịlimọn 1, 22) Na Filipaị, Tesalọnaịka, nakwa Kọrint, ebe obibi ndị dị otú ahụ ghọọrọ Pọl ebe ọ ga na-anọ ahazi ọrụ ozi ala ọzọ ya. Na Kọrint, Taịtọs Jọstọs meghekwara ụlọ ya iji meere onyeozi ahụ ebe ọ ga-esi na-eme nkwusa ya.—Ọrụ 18:7.

Ìgwè Ndị Enyi

Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, e chetara ndị ha na Pọl matara nke ọma n’ụzọ dị iche iche n’ihi ọnọdụ dịgasị iche ọ nọ zute ha. Dị ka ihe atụ, Meri, Pasis, Fibi, Traịfina, na Traịfosa bụcha ndị inyom kwere ekwe ibe ya bụ́ ndị a jara mma maka ọrụ ha na ndọgbu ha dọgburu onwe ha n’ọrụ. (Ndị Rom 16:1, 2, 6, 12) Pọl mere Krispọs, Gaịọs, na ndị ezinụlọ Stefanas baptism. Daịọnisịọs na Damaris nabatara ozi nke eziokwu ahụ site n’aka ya n’Atens. (Ọrụ 17:34; 1 Ndị Kọrint 1:14, 16) A kpọrọ Andronaịkọs na Junias, bụ́ “mmadụ ndị a maara aha ha n’etiti ndị ozi” bụ́ ndị bụworo ndị kwere ekwe ogologo oge karịa Pọl, ‘ndị a dọkọọrọ ha na ya n’agha.’ Ikekwe ha na ya anọwo mkpọrọ n’oge ụfọdụ. Pọl onyeozi kwuru banyere mmadụ abụọ a, dịkwa ka o kwuru banyere Hirọdịọn, Jeson, Lusịọs, na Sosipata, dị ka “ndị ikwu” ya. (Ndị Rom 16:7, 11, 21) Ọ bụ ezie na okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a pụrụ ịpụta “ndị ha na ya si n’otu mba,” ihe bụ́ isi ọ pụtara bụ “ndị ikwu si n’otu ọbara bụ́ ndị a mụrụ n’otu oge.”

Ọtụtụ n’ime ndị enyi Pọl mere njem n’ihi ozi ọma ahụ. E wezụga ndị enyi ya a maara nke ọma karị, e nwekwara Akaịkọs, Fọtunatọs, na Stefanas, bụ́ ndị mere njem site na Kọrint gaa Efesọs iji gwa Pọl banyere ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ ha. Atemas na Tikikọs dị njikere ime njem iji sonyere Taịtọs, bụ́ onye na-eje ozi n’àgwàetiti Krit, Zenas na Apọlọs ga-eme njem.—1 Kọrint 16:17; Taịtọs 3:12, 13.

E nwere ndị Pọl nyere obere nkọwa ndị na-adọrọ adọrọ banyere ha. Dị ka ihe atụ, a gwara anyị na Epinetọs bụ “mkpụrụ mbụ nke Esia,” na Erastọs bụ “onye na-achị ihe obodo” na Kọrint, na Luk bụ dibịa, na Lidia bụ onye na-ere ihe e ji esiji ákwà odo odo, nakwa na Tatiọs bụ onye Pọl ji mee ihe n’ide akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom. (Ndị Rom 16:5, 22, 23; Ọrụ 16:14; Ndị Kọlọsi 4:14) Nye onye ọ bụla ga-achọ ịmarakwu banyere mmadụ ndị a, obere nkọwa ndị a na-eto akpịrị n’ihi ịdị mkpirikpi ha.

Ndị enyi Pọl ndị ọzọ natara ozi nke aka ha, bụ́ ndị e dekọrọ ugbu a n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọlọsi, Pọl gbara Akịpọs ume, sị: “Lezie ije ozi nke ị natara n’ime Onyenwe anyị anya, ka i jezuo ya.” (Ndị Kọlọsi 4:17) Ihe àmà na-egosi na Yuodia na Sintiki nwere nsogbu ụfọdụ dịịrị ha idozi. N’ihi ya, Pọl gbara ha ume site n’aka ‘onye e kekọtaworo ya na ya n’ọrụ Chineke’ bụ́ onye a na-akpọghị aha ya nọ na Filipaị “ka ha tụkwasị uche n’otu ihe ahụ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Filipaị 4:2, 3) N’ezie, nke a bụ ezi ndụmọdụ nye anyị nile.

Nkwado E Ji Iguzosi Ike n’Ihe Nye n’Oge A Tụrụ Ya Mkpọrọ

A tụrụ Pọl mkpọrọ ọtụtụ ugbo. (2 Ndị Kọrint 11:23) N’oge ndị ahụ, ndị Kraịst nọ n’ógbè ahụ, ma ọ bụrụ mgbe e nwere ha, aghaghị ịgbalịwo ime ihe nile ha pụrụ ime iji mee ka o nwee ike ịnagide ahụmahụ ya karị. Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ mbụ ya na Rom, e kwere ya ka ọ chọrọ ụlọ nke aka ya ruo afọ abụọ, ndị enyi ya pụkwara ileta ya. (Ọrụ 28:30) N’oge ahụ, o degaara ọgbakọ ndị dị n’Efesọs, Filipaị, na Kọlọsi akwụkwọ ozi, degakwara Faịlimọn. Akwụkwọ ozi ndị a na-agwa anyị ihe dị ukwuu banyere ndị ahụ nọrọ Pọl nso n’oge e ji ya eji.

Dị ka ihe atụ, anyị na-amata na Onisimọs, bụ́ ohu Faịlimọn nke gbara ọsọ, zutere Pọl na Rom, dịkwa ka Tikikọs mere, bụ́ onye ga-esonyere Onisimọs ná njem ọ ga-eme iji laghachikwuru nna ya ukwu. (Ndị Kọlọsi 4:7-9) E nwekwara Epafrọdaịtọs, bụ́ onye ji onyinye ndị ọgbakọ ya nyere si na Filipaị mee ogologo njem, bụ́kwa onye mesịrị daa ọrịa. (Ndị Filipaị 2:25; 4:18) Ndị so Pọl rụkọọ ọrụ na Rom n’ụzọ chiri anya bụ Arịstakọs, Mak, na Jisọs bụ́ onye a na-akpọ Jọstọs, bụ́ ndị Pọl kwuru banyere ha, sị: “Nanị ndị a bụ ndị sooro m na-arụkọ ọrụ n’ikwusa alaeze Chineke, mmadụ ndị e mere ka ha bụụrụ m ndị ngụgụ obi.” (Ndị Kọlọsi 4:10, 11) Tinyere ndị a nile kwesịrị ntụkwasị obi, e nwere Timoti na Luk bụ́ ndị a maara nke ọma karị, nakwa Dimas, bụ́ onye mesịrị gbahapụ Pọl n’ihi ịhụ ụwa n’anya.—Ndị Kọlọsi 1:1; 4:14; 2 Timoti 4:10; Faịlimọn 24.

Ihe àmà na-egosi na ọ dịghị onye n’ime ha si Rom, ma ha nọ n’ebe ahụ n’akụkụ Pọl. Ikekwe ụfọdụ agawo kpọmkwem iji nyere ya aka n’oge ọ nọ na mkpọrọ. Obi abụọ adịghị ya na ụfọdụ jeere ya ozi, e zigara ndị ọzọ ozi n’ebe ndị dị anya, Pọl kpọpụtakwaara ndị ọzọ akwụkwọ ozi ka ha na-ede. Lee akaebe doro anya nke a na-agba banyere otú nkekọ na nguzosi ike n’ihe nke ndị a nile nwere n’ebe Pọl nọ nakwa n’ọrụ Chineke hàruru!

Site ná mmechi nke ụfọdụ n’ime akwụkwọ ozi Pọl, anyị na-amata na ma eleghị anya ìgwè buru ibu nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Kraịst, ndị ọnụ ọgụgụ ha karịrị ole na ole ahụ anyị maara aha ha, gbara ya gburugburu. N’oge dị iche iche, o dere, sị: “Ndị nsọ na-ekele unu” nakwa “ndị nile mụ na ha nọ na-ekele gị.”—2 Ndị Kọrint 13:13; Taịtọs 3:15; Ndị Filipaị 4:22.

N’oge nke ugboro abụọ a tụrụ Pọl mkpọrọ dị oké njọ na Rom bụ́ mgbe o yiri ka ọ ga-anwụ n’ihi okwukwe ya, Pọl bu nnọọ ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ n’uche. Ọ ka dị gara gara n’ilekọta na ịhazi ọrụ nke ma ọ dịkarịa ala ụfọdụ n’ime ha. E zigawo Taịtọs na Tikikọs ozi, Krisens agawo Galetia, Erastọs anọrọwo na Kọrint, a hapụwo Trọfimọs na-arịa ọrịa n’ime Miletus, ma Mak na Timoti ga-abịakwute ya. Otú ọ dị, Luk nọ n’akụkụ Pọl, mgbe onyeozi ahụ degakwaara Timoti akwụkwọ ozi ya nke abụọ, ụfọdụ ndị kwere ekwe ibe ya ndị ọzọ, gụnyere Yubulọs, Pudins, Laịnọs, na Klọdịa, nọ nso izipụ ozi ekele ha. Obi abụọ adịghị ya na ha nọ na-eme ihe ha pụrụ ime iji nyere Pọl aka. N’otu oge ahụ, Pọl n’onwe ya zigaara Priska na Akwila nakwa ezinụlọ Onisifọrọs ozi ekele. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, n’oge nsogbu ahụ, Dimas gbahapụrụ ya, Aleksanda mekwara ya ọtụtụ ihe ọjọọ.—2 Timoti 4:9-21.

“Anyị Bụ Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ”

Ọ na-esi ike Pọl ịnọrọ nanị ya n’ọrụ nkwusa ya. “Ihe ndị a na-ahụ,” ka onye na-enye nkọwa bụ́ E. Earle Ellis na-ekwu, “bụ onye ozi ala ọzọ nke nwere ọtụtụ ndị enyi. N’ezie, ọ na-esi ike ịhụ Pọl n’enweghị ndị ya na ha so.” Site ná nduzi nke mmụọ nsọ Chineke, Pọl kwaliri ọtụtụ ndị ma hazie mkpọsa ozi ala ọzọ ndị dị irè. Ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ mgbe nile, ndị na-enyere ya aka mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị nwere ikike, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi bụ́ ndị dị umeala n’obi gbara ya gburugburu. Ma, ndị a abụghị nanị ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ. N’agbanyeghị ókè ọ bụla ha so Pọl rụruo ọrụ ma ọ bụ kpakọruo, a pụrụ ịhụ nkekọ nke ịhụnanya ndị Kraịst na ọbụbụ enyi dị n’etiti ha nke ọma.

Pọl onyeozi nwere ihe a kpọworo “nkà nke ọbụbụenyi.” O mere ihe dị ukwuu n’iji ozi ọma ahụ gakwuru ndị mba ọzọ, ma ọ nwaghị ime ya nanị ya. O sonyeere ma jiri ọgbakọ ndị Kraịst a haziri ahazi mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Pọl anaraghị otuto ọ bụla maka ihe ndị a rụpụtara kama nke ahụ o ji obi umeala kweta na ya bụ ohu nakwa na nsọpụrụ nile kwesịrị ịgara Chineke dị ka onye mere ka e nwee uto ahụ.—1 Ndị Kọrint 3:5-7; 9:16; Ndị Filipaị 1:1.

Oge Pọl dị iche na nke anyị, ma ya bụrụgodị otú ahụ, ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst taa kwesịrị iche na ya pụrụ ma ọ bụ na ọ dị ya mkpa ime ihe n’adabereghị n’ebe ndị ọzọ nọ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iso nzukọ Chineke, ọgbakọ anyị, na ndị kwere ekwe ibe anyị na-arụkọ ọrụ mgbe nile. Enyemaka, nkwado, na nkasi obi ha dị anyị mkpa n’oge dị mma nakwa n’oge nsogbu. Anyị nwere ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ịbụ akụkụ nke ‘òtù ụmụnna ndị nọ n’ụwa.’ (1 Pita 5:9) Ọ bụrụ na anyị ejiri ikwesị ntụkwasị obi na ịhụnanya soro ha nile na-arụkọ ọrụ ná nkwekọ, mgbe ahụ dị nnọọ ka Pọl, anyị onwe anyị kwa pụrụ ikwu na “anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.”—1 Ndị Kọrint 3:9.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

APỌLỌS

ARỊSTAKỌS

BANABAS

LIDIA

ONISIFỌRỌS

TASỊỌS

TIKIKỌS

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya