Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 6/15 p. 14-19
  • Onye Okike Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwee Nzube

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Okike Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwee Nzube
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịchọ Azịza na Nzube
  • Ihe Ndị Mere A Ga-eji Kwere
  • Kwee Ka Onye Okike Mee Ka O Nwee Nzube
  • Onye Okike Gị—Mụta Ihe Ọ Dị Ka Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Olee Otú Eluigwe na Ala na Ndụ Si Malite?
    Teta!—2002
  • Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịma Ihe Ị Ga-ekpebi?
    Teta!—2021
  • Mee Ka Okwukwe Gị Sie Ike na E Nwere Onye Kere Ihe Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 6/15 p. 14-19

Onye Okike Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwee Nzube

“Ka ha too aha Jehova: n’ihi na Ya onwe ya nyere iwu, e wee kee ha.”—ABỤ ỌMA 148:5.

1, 2. (a) Ajụjụ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịtụle? (b) Olee otú e si gụnye ihe e kere eke n’ajụjụ Aịsaịa?

“Ị́ MAGHỊ?” Nke ahụ pụrụ ịda nanị ka ajụjụ na-eduga n’ihe, na-akwali ọtụtụ ndị ịjụ, sị, ‘Ịma gịnị?’ Ma ọ bụ ajụjụ siri ike. Anyị pụkwara ịghọta azịza ya karịsịa site n’ịrịba ama ebe e si weta ya—isiakwụkwọ nke 40 nke akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa. Ọ bụ onye Hibru oge ochie, bụ́ Aịsaịa, dere ya, ya mere ajụjụ ahụ emeela ochie. Ma, o metụtakwara nnọọ oge a, na-emetụtakwa nzube bụ́ isi nke ndụ gị.

2 Ebe ọ dị mkpa otú ahụ, anyị kwesịrị nnọọ ịtụle ajụjụ ahụ dị n’Aịsaịa 40:28: “Ị́ maghị? ị́ nụghị? Chineke nke mgbe ebighị ebi ka Jehova, Onye keworo nsọtụ nile nke ụwa, bụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere ‘ịmara’ ahụ metụtara Onye Okike ụwa, ihe a na-ekwu banyere ya na-egosikwa na ọ bụghị nanị ụwa ka ọ gụnyere. Aịsaịa dere banyere kpakpando n’amaokwu abụọ ndị bu ụzọ: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ . . . site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.”

3. Ọ bụrụgodị na ị mara ihe dị ukwuu banyere Onye Okike, n’ihi gịnị ka i kwesịrị iji chọọ ịmara karị?

3 Ee, ajụjụ ahụ bụ́, “Ị́ maghị?” bụ banyere Onye Okike eluigwe na ala anyị n’ezie. Gị onwe gị pụrụ ikwenyesi ike na Jehova Chineke bụ “Onye keworo nsọtụ nile nke ụwa.” Ị pụkwara ịma ihe dị ukwuu banyere àgwà ya na ụzọ ya nile. Ma gịnị ma ọ bụrụ na i zute nwoke ma ọ bụ nwanyị nke na-enwe obi abụọ ma è nwere Onye Okike, onye o dokwara anya na ọ maghị ihe ọ dị ka ya? O kwesịghị iju gị anya izute onye dị otú ahụ n’ihi na e nwere nde kwuru nde mmadụ bụ́ ndị na-amaghị banyere Onye Okike ma ọ bụ ndị na-ekweghị na Ya.—Abụ Ọma 14:1; 53:1.

4. (a) N’ihi gịnị ka ịtụle banyere Onye Okike ji kwesị ekwesị ugbu a? (b) Azịza ndị dị aṅaa ka sayensị na-enweghị ike inye?

4 Ụlọ akwụkwọ na-azụpụta ọtụtụ ndị na-enwe obi abụọ bụ́ ndị na-eche na sayensị nwere (ma ọ bụ ga-achọta) azịza nye ajụjụ ndị e nwere banyere mmalite nke eluigwe na ala nakwa ndụ. N’akwụkwọ bụ́ The Origin of Life (isiokwu French mbụ ya bụ: Aux Origines de la Vie) ndị na-ede akwụkwọ bụ́ Hagene na Lenay na-ekwu, sị: “A ka na-arụrịta ụka banyere mmalite nke ndụ ná mmalite nke narị afọ nke iri abụọ na otu. Nsogbu a, bụ́ nke siri nnọọ ike idozi, chọrọ ka e mee nchọpụta banyere ya n’akụkụ nile, site na mbara igwe dị ukwuu ruo n’ihe dị nnọọ obere.” Ma, isiakwụkwọ ikpeazụ ya, bụ́ “A Ka Na-ajụ Ajụjụ Ahụ,” na-ekweta, sị: “Anyị enyochawo azịza ụfọdụ ndị dabeere na sayensị nye ajụjụ ahụ bụ́, Olee otú ndụ si malite ịdị n’elu ụwa? Ma n’ihi gịnị ka ndụ ji malite ịdị? Ndụ ò nwere nzube? Sayensị enweghị ike ịza ajụjụ ndị a. Nanị ihe ọ na-eme bụ ịchọpụta ‘olee otú’ nke ihe dị iche iche. ‘Olee otú’ na ‘n’ihi gịnị’ bụ nnọọ ajụjụ abụọ dị iche. . . . N’ihe banyere ajụjụ bụ́ ‘n’ihi gịnị,’ nkà ihe ọmụma, okpukpe, na—karịsịa—onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịchọ azịza ya.”

Ịchọ Azịza na Nzube

5. Ụdị ndị dị aṅaa ga-erite uru karịsịa site n’ịmụ banyere Onye Okike?

5 Ee, anyị chọrọ ịghọta ihe mere ndụ ji dịrị—karịsịa ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a. Ọzọkwa, anyị kwesịrị inwe mmasị ná ndị na-ekwubibeghị na e nwere Onye Okike bụ́ ndị makwaara ihe dị nta n’ezie banyere ụzọ ya. Ma ọ bụ chee echiche banyere ndị nzụlite ha gụnyere echiche dị nnọọ iche n’ihe Bible na-ekwu banyere Chineke. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu tolitere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ bụ́ ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-adịghị eche echiche banyere Chineke nke bụ́ onye, onye dị adị n’ezie nke nwere àgwà na-adọrọ adọrọ. Nye ha, okwu ahụ bụ́ “chi” pụrụ ịkpali echiche nke ike na-edoghị anya ma ọ bụ ihe a na-amaghị ihe ọ bụ. Ha ‘amaghị Onye Okike’ ma ọ bụ ụzọ ya nile. Ọ bụrụ na ha, ma ọ bụ ọtụtụ nde mmadụ ndị nwere echiche yiri nke ahụ, pụrụ ikwenye na e nwere Onye Okike, lee aha abamuru ha pụrụ inweta, gụnyere atụmanya ebighị ebi! Ha pụkwara inweta ihe a na-adịghị enwetakebe n’ezie—ezi abamuru, ezi nzube na udo nke uche, ná ndụ.

6. Olee otú ndụ nke ọtụtụ ndị taa na nke Paul Gauguin na ihe ndị o sere si yirịta?

6 Iji maa atụ: Na 1891, onye France na-ese ihe osise bụ́ Paul Gauguin gara ịchọ ndụ na-eju afọ na French Polynesia, n’ebe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ paradaịs. Ma n’oge na-adịghị anya, ụzọ ndụ ya nke oge gara aga bụ́ nke rụrụ arụ wetaara ya na ndị ọzọ ọrịa. Ka ọ malitere inwe mmetụta na ọnwụ ya na-eru nso, o sere ihe n’otu nnukwu ibe ákwà e ji ese ihe bụ́ ebe o yiri ka ọ ‘na-akọwa ndụ dị ka oké ihe omimi.’ Ị̀ maara aha Gauguin kpọrọ ihe osise ahụ? “Ebee Ka Anyị Si Bịa? Gịnị Ka Anyị Bụ? Ebee Ka Anyị Na-aga?” Ị pụrụ ịnụwo ka ndị ọzọ jụrụ ajụjụ yiri ndị ahụ. Ọtụtụ ndị na-ajụ ha. Ma mgbe ha na-achọtaghị azịza ndị na-eju afọ—enweghị ezi nzube ná ndụ—olee ebe ha pụrụ ịga? Ha pụrụ ikwubi na ndụ ha dịtụ iche na nke anụmanụ.—2 Pita 2:12.a

7, 8. N’ihi gịnị ka nnyocha ndị sayensị mere ji ghara izu ezu n’onwe ha?

7 Ị pụrụ isi otú ahụ ghọta ihe mere onye dị ka prọfesọ nke physics bụ́ Freeman Dyson pụrụ iji dee, sị: “Enwere m ndị mụ na ha kwụ mgbe m jụghachiri ajụjụ ndị ahụ Job jụrụ. N’ihi gịnị ka anyị ji ata ahụhụ? N’ihi gịnị ka ụwa ji jupụta nnọọ n’ikpe na-ezighị ezi? Gịnị bụ nzube e ji enwe ihe mgbu na ọdachi?” (Job 3:20, 21; 10:2, 18; 21:7) Dị ka e kwuru, ọtụtụ mmadụ na-echigharịkwuru sayensị iji nweta azịza kama ichigharịkwuru Chineke. Ndị ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ, ndị ọkà mmụta ihe ndị dị n’oké osimiri, na ndị ọzọ na-etinye ihe n’ihe ọmụma e nwere banyere ụwa anyị na ihe dị ndụ dị n’ime ya. N’ịchọ n’akụkụ ọzọ, ndị na-enyocha mbara igwe na ndị ọkà n’ihe ọmụmụ physics na-amụtakwu banyere mbara igwe anyị, kpakpando dị iche iche, ọbụna ụyọkọ kpakpando ndị dị anya. (Tụlee Jenesis 11:6.) Nkwubi okwu ndị dị aṅaa ezi uche dị na ha ka eziokwu ndị dị otú ahụ pụrụ iduga na ha?

8 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu banyere “uche” Chineke ma ọ bụ “aka ọrụ” ya ndị e kpughere n’eluigwe na ala. Ma nke ahụ ọ̀ pụrụ ịbụ ileghara ihe ka mkpa anya? Magazin bụ́ Science kwuru, sị: “Mgbe ndị nnyocha kwuru na ịmụ ihe banyere usoro mbara igwe na ụwa na-ekpughe ‘uche’ ma ọ bụ ‘aka ọrụ’ Chineke, ha na-asị na ọ bụ Chineke mere ihe pụrụ imesị bụrụ akụkụ ka nta nke eluigwe na ala—ọdịdị ya a na-ahụ anya.” N’eziokwu, ọkà n’ihe ọmụmụ physics na onye nwetara ihe nrite Nobel bụ́ Steven Weinberg dere, sị: “Ka eluigwe na ala na-eyiwanye ihe a na-aghọta, otú ahụ ka ọ na-eyikwa ihe a na-aghọtaghị ihe mere o ji dịrị.”

9. Ihe àmà dị aṅaa pụrụ inyere anyị na ndị ọzọ aka ịmụta banyere Onye Okike?

9 Ma, ị pụrụ ịbụ otu n’ime ọtụtụ nde bụ́ ndị tụleworo okwu a nke ọma ma ghọta na ezi nzube ná ndụ nwere ihe jikọrọ ya na ịma Onye Okike. Cheta ihe Pọl onyeozi dere: “Ụmụ mmadụ apụghị ịsị na ha amaghị banyere Chineke. Site ná mmalite ụwa, ụmụ mmadụ pụrụ ịhụ ihe Chineke dị ka ya site n’ihe ndị O meworo. Nke a na-egosi ike Ya nke na-adịru ebighị ebi. Ọ na-egosi na Ọ bụ Chineke.” (Ndị Rom 1:20, Holy Bible, New Life Version) Ee, e nwere eziokwu ndị dị banyere ụwa anyị na banyere anyị bụ́ ndị pụrụ inyere ndị mmadụ aka ịmata Onye Okike na ịchọta nzube n’ebe ọ nọ. Tụlee akụkụ atọ n’ime nke a: eluigwe na ala gbara anyị gburugburu, mmalite nke ndụ, na ikike uche anyị.

Ihe Ndị Mere A Ga-eji Kwere

10. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ichebara “mmalite” echiche? (Jenesis 1:1; Abụ Ọma 111:10)

10 Olee otú eluigwe na ala anyị si bịa dịrị? Ị pụrụ ịma site n’akụkọ dị iche iche banyere ígwè teliskop ndị e ji ahụ ihe ndị dị na mbara igwe na nnyocha dị iche iche na ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta sayensị na-aghọta na eluigwe na ala anyị adịghị adị mgbe nile. O nwere mmalite, ọ na-agbasakwa agbasa. Gịnị ka nke a na-egosi? Gee onye na-enyocha mbara igwe bụ́ Sir Bernard Lovell ntị: “Ọ bụrụ na n’oge ụfọdụ gara aga, Eluigwe na Ala fọrọ nke nta ka ọ dị nnọọ nta ma nwee ịdị arọ nke na-enweghị ọ̀tụ̀tụ̀, anyị aghaghị ịjụ ihe dịbu ebe ahụ . . . Anyị aghaghị iche nsogbu nke Mmalite ihu.”

11. (a) Olee Otú eluigwe na ala saruru mbara? (b) Gịnị ka nkwekọ e nwere n’eluigwe na ala na-enye echiche ya?

11 Ihe mejupụtara eluigwe na ala, gụnyere ụwa anyị, na-egosi ezigbo nkwekọ dị ịtụnanya. Dị ka ihe atụ, njimara abụọ dị ịrịba ama nke anyanwụ anyị na kpakpando ndị ọzọ bụ ịdị irè na ịkwụsi ike na-adịte anya. Ọnụ ọgụgụ ụyọkọ kpakpando ndị a na-eme atụmatụ n’oge a na ha dị na mbara igwe dị site n’ijeri 50 (50,000,000,000) ruo ijeri 125. Ụyọkọ kpakpando Milky Way anyị nwekwara ijeri kwuru ijeri kpakpando ndị dị n’ime ya. Ugbu a tụlee: Anyị maara na injin ụgbọala chọrọ ọ̀tụ̀tụ̀ mmanụ na ikuku hà otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na i nwere ụgbọala, ị pụrụ igo onye mekanik maara ọrụ n’ọrụ iji mee ka injin ya nwee nkwekọ, ka ụgbọala gị wee nwee ike ịgba were were nakwa n’ụzọ ka mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nkwekọ dị otú ahụ dị mkpa n’ebe injin nkịtị dị, gịnị banyere anyanwụ anyị nke “na-enwu” n’ụzọ dị irè? N’ụzọ doro anya, a na-eme ka ihe ndị bụ́ isi ọ gụnyere kwekọọ kpọmkwem ka ndụ wee dịrị n’ụwa. Nke ahụ ò mere nnọọ na mberede? A jụrụ Job nke oge ochie, sị: “Ị̀ kpọsara iwu ndị na-achịkwa eluigwe, ma ọ bụ kpebie iwu okike n’ụwa?” (Job 38:33, The New English Bible) Ọ dịghị mmadụ ọ bụla mere ya. N’ihi ya olee ebe e si nweta nkwekọ ahụ?—Abụ Ọma 19:1.

12. Gịnị mere na ọ bụghị ihe ezi uche na-adịghị na ya iche na ihe ndị e kere eke si n’aka Onye Nwere Ọgụgụ Isi dị ike?

12 Ọ̀ pụrụ isite n’ihe ka ọ bụ n’Onye a na-apụghị iji anya mmadụ hụ? Tụlee ajụjụ a n’ụzọ sayensị nke oge a si ele ihe anya. Ugbu a ihe ka ọtụtụ ná ndị na-enyocha mbara igwe na-anakwere na e nwere ihe ndị dị nnọọ ike dị n’eluigwe—oghere ojii. A pụghị ịhụ oghere ojii ndị a anya, ma ndị ọkachamara kwenyere na ha dị adị. N’otu aka ahụ, Bible na-akọ na e nwere ihe ndị e kere eke siri ike a na-apụghị ịhụ anya nọ n’ógbè ọzọ—ihe ndị e kere eke bụ́ mmụọ. Ọ bụrụ na ndị dị ike dị otú ahụ a na-adịghị ahụ anya dị adị, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na nkwekọ ahụ e kpughere n’eluigwe na ala nile si n’aka Onye Nwere Ọgụgụ Isi dị ike?—Nehemaịa 9:6.

13, 14. (a) Gịnị ka sayensị chọpụtaworo n’ezie banyere mmalite nke ndụ? (b) Gịnị ka ịdị adị nke ndụ n’elu ụwa na-atụ aka na ya?

13 Ihe àmà nke abụọ bụ́ nke pụrụ inyere ndị mmadụ aka ikweta na e nwere Onye Okike gụnyere mmalite nke ndụ. Kemgbe Louis Pasteur mere nnwale ya, e kwerewo na ndụ adịghị esi n’ihe ndị na-adịghị adị malite dịwa ná ndapụta. Ya mere, olee otú ndụ si malite n’elu ụwa? N’afọ ndị 1950, ndị ọkà mmụta sayensị nwara igosipụta na ọ pụrụ ịmaliteworị nwayọọ nwayọọ n’ime oké osimiri mbụ mgbe àmụ̀mà nọgidere na-egbukwasị mbara ikuku nke mgbe ochie. Otú ọ dị, ihe àmà e nwetara na nso nso a na-egosi na mmalite dị otú ahụ nke ndụ elu ala eyighị ihe ga-ekwe omume n’ihi na ụdị mbara ikuku ahụ adịghị mgbe ọ bụla ọ dị adị. N’ihi ya, ndị ọkà mmụta sayensị na-achọ nkọwa nwere ntụpọ ka nta. Ma hà sokwu na-eleghara ihe kasị mkpa anya?

14 Mgbe o tinyesịrị ọtụtụ iri afọ n’ịmụ banyere eluigwe na ala na ndụ dị n’ime ya, ọkà mmụta sayensị bụ́ onye Britain bụ́ Sir Fred Hoyle, kwuru, sị: “Kama ikwere n’ohere dị nnọọ nta nke ndụ ịbụ nke malitere site n’ikike efu dị iche iche nke okike, o yiri ka ọ ka mma ikwere na mmalite nke ndụ bụ ihe a kpachaara anya jiri ọgụgụ isi mee.” Ee, ka anyị na-amụta banyere ihe ịtụnanya nile nke ndụ karị, otú ahụ ka ọ na-abụ ihe ezi izù dị na ya na ndụ si n’aka Onye nwere ọgụgụ isi.—Job 33:4; Abụ Ọma 8:3, 4; 36:9; Ọrụ 17:28.

15. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ị pụrụ iche?

15 Ya mere, ụzọ echiche nke mbụ gụnyere eluigwe na ala, nke abụọ kwa, mmalite nke ndụ n’elu ụwa. Rịba nke atọ ama—ịpụ iche nke anyị onwe anyị. N’ọtụtụ ụzọ, mmadụ nile pụrụ iche, n’ihi ya nke ahụ pụtara na gị onwe gị pụkwara iche. Ò si aṅaa dị otú ahụ? Ikekwe ị nụwo na e jiriwo ụbụrụ tụnyere ọkpọka kọmputa. Ma n’ezie, nchọpụta ndị e mere na nso nso a na-egosi na ntụnyere a erughị nnọọ eru. Otu ọkà mmụta sayensị n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà na Ụzụ nke Massachusetts kwuru, sị: “Kọmputa ndị dị taa erughịdị mmadụ dị afọ 4 n’ikike ha nwere ịhụ ihe, ikwu okwu, imegharị ahụ, ma ọ bụ iji ọgụgụ isi eme ihe. . . . E mewo atụmatụ na ikike idokwa ozi nke ọbụna ọkpọka kọmputa kasị ike na usoro akwara ejula hà nhata—akụkụ dị oké nta nke ike dị n’ọkpọka kọmputa nke dị n’okpokoro isi [gị].”

16. Ikike i nwere ịsụ asụsụ na-egosi gịnị?

16 Asụsụ bụ ikike i nwere n’ihi ụbụrụ gị. Ụfọdụ ndị na-asụ asụsụ abụọ, atọ, ma ọ bụ karịa, ma inwe ike ịsụ ọbụna otu na-egosi na anyị pụrụ iche. (Aịsaịa 36:11; Ọrụ 21:37-40) Prọfesọ R. S. Fouts na Prọfesọ D. H. Fouts jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ nanị mmadụ . . . nwere ike iji asụsụ na-ekwurịta okwu? . . . N’ezie, anụmanụ nile maara ihe na-eji . . . mmegharị ahụ, ísìsì, ubé, ákwá na uri, ọbụnakwa ite egwú nke aṅụ, na-ekwurịta okwu. Ma ụmụ anụmanụ ma e wezụga mmadụ eyighị ka ha nwere asụsụ a haziri ahazi. Ọ pụkwara ịdị ịrịba ama nke ukwuu na ụmụ anụmanụ adịghị ese ihe osise. Oké ihe ha pụrụ ime bụ nanị ịkakasị ihe.” N’ezie, ọ bụ nanị ụmụ mmadụ pụrụ iji ụbụrụ mee ihe iji sụọ asụsụ ma see ihe osise ndị nwere ihe ha pụtara.—Tụlee Aịsaịa 8:1; 30:8; Luk 1:3.

17. Gịnị bụ ọdịiche bụ́ isi dị n’anya anụmanụ lere n’enyo na nke mmadụ lere?

17 Ọzọkwa, ị ma onwe gị; ị ma ihe ị bụ. (Ilu 14:10) Ì kiriwo ka nnụnụ, nkịta, ma ọ bụ nwamba lere anya n’enyo, mgbe ahụkwa tụọ ya ọnụ, gbọọ ụja, ma ọ bụ wakwuru ya? Ọ na-eche na ọ na-ahụ anụmanụ ọzọ, n’amataghị na ọ bụ ya onwe ya. N’ụzọ dị iche, mgbe i lere enyo, ị na-ama na ọ bụ gị. (Jemes 1:23, 24) Ị pụrụ ile ọdịdị gị ma ọ bụ chee ihe ị ga-adị ka ya n’ime afọ ole na ole. Ụmụ anụmanụ adịghị eme nke ahụ. Ee, ụbụrụ gị na-eme gị ọpụrụiche. Ònye ka a na-enye otuto maka nke a? Olee otú ụbụrụ gị si bịa dịrị, ma ọ bụrụ na o sighị n’aka Chineke?

18. Ikike iche echiche ndị dị aṅaa mere ka ị pụọ iche n’ebe ụmụ anụmanụ nọ?

18 Ụbụrụ gị na-emekwa ka i nwee mmasị n’ihe osise na egwú nakwa inwe ụkpụrụ omume. (Ọpụpụ 15:20; Ndị Ikpe 11:34; 1 Ndị Eze 6:1, 29-35; Matiu 11:16, 17) N’ihi gịnị ka i ji nwee ya kama ụmụ anụmanụ inwe ya? Ha na-eji ụbụrụ ha eme ihe n’ụzọ bụ́ isi iji gboo mkpa ha nwere mgbe ahụ—inweta nri, ịchọta onye ibe, ma ọ bụ ịkpa akwụ́. Ọ bụ nanị ụmụ mmadụ na-eche echiche gabiga oge dị mkpụmkpụ. Ọbụna ụfọdụ na-eche echiche otú ihe ndị ha mere ga-esi metụta gburugburu ebe obibi ma ọ bụ ụmụ ha ruo ogologo oge n’ọdịnihu. N’ihi gịnị? Eklisiastis 3:11 na-ekwu banyere ụmụ mmadụ, sị: “Mgbe ebighị ebi ka [Onye Okike] tinyeworo n’obi ha.” Ee, ikike i nwere ịtụle ihe mgbe ebighị ebi pụtara ma ọ bụ ọbụna iche banyere ndụ ebighị ebi bụ ihe pụrụ iche.

Kwee Ka Onye Okike Mee Ka O Nwee Nzube

19. Ụzọ ntụgharị uche dị aṅaa nwere akụkụ atọ ka ị pụrụ iji mee ihe n’inyere ndị ọzọ aka iche banyere Onye Okike?

19 Anyị ekwuwo banyere nanị akụkụ atọ: nkwekọ nke a na-ahụ n’eluigwe na ala buru ibu, mmalite nke ndụ n’elu ala, na ịpụ iche nke a na-apụghị ịgọnahụ agọnahụ nke ụbụrụ mmadụ, ya na ikike ya dịgasị iche. Na gịnị ka ihe atọ ndị a na-atụ aka? Lee ntụgharị uche nke ị pụrụ iji mee ihe n’inyere ndị ọzọ aka irute ná nkwubi okwu. Ị pụrụ ibu ụzọ jụọ, sị: Eluigwe na ala ò nwere mmalite? Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ga-ekwe na o nwere. Mgbe ahụ jụọ: Mmalite ahụ ó nweghị ihe ọ bụla kpatara ya, ka ò nwere ihe kpatara ya? Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ chere na e nwere ihe kpatara mmalite nke eluigwe na ala. Nke a na-eduga n’ajụjụ ikpeazụ: Mmalite ahụ ọ̀ bụ ihe na-adịru ebighị ebi kpatara ya ka ọ bụ Onye na-adịru ebighị ebi? N’isi otú a kwuo okwu ahụ n’ụzọ doro anya na n’ụzọ ezi izù dị na ya, a pụrụ iduga ọtụtụ ndị ikwubi: A ghaghị inwe Onye Okike! Ebe ọ dị otú ahụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị ekwe omume ime ka ndụ nwee nzube?

20, 21. N’ihi gịnị ka ịmara Onye Okike ji dị oké mkpa n’ime ka anyị nwee nzube ná ndụ?

20 Ịdị adị anyị n’ozuzu ya, gụnyere echiche anyị banyere omume ọma nakwa omume ọma n’onwe ya kwesịrị ịbụ ndị e jikọtara n’ebe Onye Okike nọ. Dr. Rollo May dere n’otu mgbe, sị: “Nanị usoro kwesịrị ekwesị e nwere maka omume ọma bụ nke ahụ dabeere ná nzube bụ́ isi nke ndụ.” Olee ebe a ga-ahụ nke ahụ? Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Usoro ahụ bụ́ isi bụ àgwà Chineke. Ụkpụrụ Chineke bụ ụkpụrụ ndị ndụ dabeere na ha site ná mmalite nke okike ruo ná ngwụsị ya.”

21 Anyị pụziri ịghọta nke ọma ihe mere ọbụ abụ ahụ ji gosipụta ma ịdị ụmeala n’obi ma amamihe mgbe ọ rịọrọ Onye Okike, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile. Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu Gị, Gị zikwa m ihe; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke nke nzọpụta m.” (Abụ Ọma 25:4, 5) Ka ọ bịara mara Onye Okike nke ọma karị, ndụ ọbụ abụ ahụ ga-abaworị uru, nwee nzube, ma nweekwa ebe o chere ihu karị. Ọ pụkwara ịdịrị onye ọ bụla n’ime anyị otú ahụ.—Ọpụpụ 33:13.

22. Gịnị ka ịmara ụzọ nile nke Onye Okike gụnyere?

22 Ịmara ‘ụzọ nile’ nke Onye Okike gụnyere ịmara ihe ọ dị ka ya ọbụna karị, ma àgwà ya ma ụzọ ya nile. Ma ebe ọ bụ na Onye Okike bụ onye a na-adịghị ahụ anya na onye dị ike n’ụzọ na-atụ egwu, olee otú anyị pụrụ isi mara ya nke ọma karị? Isiokwu na-esonụ ga-atụle nke a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a  N’ikwu banyere ahụmahụ ndị e nwere n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke Nazi, Dr. Viktor E. Frankl ghọtara, na: “Ọchịchọ mmadụ na-achọ nzube bụ nkwali bụ́ isi ná ndụ ya, ọ bụghịkwa ‘nchepụta dị n’ọnọdụ nke abụọ’ ndị amamihe ebumpụta ụwa na-akpali,” dị ka ụmụ anụmanụ nwere. Ọ gbakwụnyere na ọtụtụ iri afọ mgbe agha ụwa nke abụọ gasịrị, nnyocha e mere na France “gosiri na 89% nke mmadụ ndị a jụtara echiche ha kwetara na ‘ihe’ mmadụ ga-adịrị ndụ dị ya mkpa.”

Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa inweta ihe karịrị ihe ọmụma dabeere na nkà mmụta sayensị banyere eluigwe na ala anyị?

◻ N’inyere ndị ọzọ aka iche echiche banyere Onye Okike, gịnị ka ị pụrụ ịrụtụ aka?

◻ N’ihi gịnị ka ịmara Onye Okike ji bụrụ isi ihe na-eduga n’inweta nzube na-enye afọ ojuju ná ndụ?

[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 18]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Gịnị Bụ Nkwubi Okwu Gị?

Eluigwe na Ala Anyị

↓ ↓

Enweghị Mmalite Nwere Mmalite

↓ ↓

Enweghị Ihe Nwere Ihe

Kpatara Ya Kpatara Ya

↓ ↓

Ọ Bụ Ihe Na-adịru Ọ Bụ Onye Na-adịru

Ebighị Ebi Ebighị Ebi

[Foto dị na peeji nke 15]

Ịsa mbara na nkwekọ nke eluigwe na ala edugawo ọtụtụ ndị iche echiche banyere Onye Okike

[Ebe E Si Nweta Foto]

Peji nke 15 na 18: Jeff Hester (Mahadum Arizona State) nakwa NASA

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya