Nkwurịta Okwu Dị Mma—Isi Ihe Na-eduga n’Ezi Alụmdi na Nwunye
Na 1778, Robert Barron rụpụtara ugodi nwere usoro ntụchi abụọ bụ́ nke nọgideworo na-abụ ihe a na-elekwasị anya arụ ugodi ndị nke oge a. Ihe ọ rụpụtara na-achọ ka e jiri otu mkpịsị ugodi nke nwere ike ibuli usoro ntụchi abụọ nke ugodi ahụ n’otu oge, mee ihe.
N’ỤZỌ yiri nke ahụ, alụmdi na nwunye na-aga nke ọma dabeere na di na nwunye ịrụkọ ọrụ ọnụ. Iji kpọghee ma nweta ọṅụ dị oké ọnụ ahịa nke ezi alụmdi na nwunye, otu ihe dị oké mkpa bụ nkwurịta okwu dị mma.
Ihe Nkwurịta Okwu Dị Mma Na-agụnye
Gịnị ka nkwurịta okwu dị mma na-agụnye? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara nkwurịta okwu dị ka “ịgwa ma ọ bụ inyerịta echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma site n’okwu ọnụ, ide ihe, ma ọ bụ mmegharị ahụ.” N’ihi ya, nkwurịta okwu gụnyere ikerịta mmetụta na echiche. Nkwurịta okwu dị mma gụnyekwara ihe ndị na-ewuli elu, na-enye ume ọhụrụ, ziri ezi, kwesịrị otuto, na ihe ndị na-akasị obi.—Ndị Efesọs 4:29-32; Ndị Filipaị 4:8.
Obi ike, ntụkwasị obi, na inwerịta nghọta na-eme ka inwe nkwurịta okwu dị mma kwe omume. A na-enwe àgwà ndị a mgbe e lere alụmdi na nwunye anya dị ka mmekọrịta na-adịru oge ndụ nile, mgbe e nwekwara ezi mkpebisi ike ime ka ọ gaa nke ọma. N’ikwu okwu banyere mmekọrịta dị otú ahụ, onye na-ede edemede nke narị afọ nke 18 bụ́ Joseph Addison dere, sị: “Mmadụ abụọ họrọwooro onwe ha n’etiti mmadụ nile ọzọ, ná nzube nke ịbụ ndị na-akasi ibe ha obi na ndị na-enye ibe ha obi ụtọ, esitewo n’ime nke ahụ kekọọ onwe ha ịbụ ndị na-enwe ihu ọchị, obiọma, ezi uche, na-agbaghara mmehie, na-enwe ndidi na ọṅụ, banyere adịghị ike na ezughị okè nke ibe ha, ruo ọgwụgwụ nke ndụ ha.” Lee ihe obi ụtọ njikọ dị otú ahụ bụ! Àgwà ndị a yiri ọla pụrụ ịchọ alụmdi na nwunye unu mma, n’ihi na ha pụrụ ịbụ nke unu site ná nkwurịta okwu dị mma.
Ihe Ndị Na-egbochi Nkwurịta Okwu Dị Mma
Ihe ka ọtụtụ ná ndị di na nwunye na-eji nchekwube, ọbụna oké obi ụtọ na mkpali abanye n’alụmdi na nwunye. Otú ọ dị, n’ebe ọtụtụ ndị nọ, oké obi ụtọ na mkpali ahụ na-apụ n’anya n’oge na-adịghị anya, nchekwube ahụ emiekwa ala. Ngwakọta dị ilu nke nkụda mmụọ, iwe, ibu iro, ọbụna oké enweghị mmasị, nwere ike ịnọchi inwe obi ike. Alụmdi na nwunye ahụ aghọzie nke ka a na-edi “ruo ogologo oge anyị abụọ ga-adịru ndụ n’elu ụwa.” Iji meziwanye ma ọ bụ mee ka nkwurịta okwu dị mma bụ́ nke dị mkpa maka ezi alụmdi na nwunye dịgide, mgbe ahụ, a ghaghị imeri ihe mgbochi ụfọdụ.
Ihe na-egbochi nkwurịta okwu dị mma n’ezie pụrụ ịbụ egwu banyere otú di ma ọ bụ nwunye ga-esi meghachi omume nye ihe ọmụma ụfọdụ ma ọ bụ ọchịchọ ụfọdụ e kwupụtara. Dị ka ihe atụ, ịtụ egwu banyere ịbụ onye a jụrụ pụrụ ibilite mgbe mmadụ matasịrị na o nwewala nkwarụ siri ike. Olee otú mmadụ ga-esi kọwaara di ma ọ bụ nwunye ya na ihe gaje imenụ ga-agbanwe n’ụzọ dị ukwuu ọdịdị ma ọ bụ ikike ịrụ ọrụ ya? N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ịgwarịta ibe ha eziokwu na iji ezi uche mee atụmatụ maka ọdịnihu dị mkpa karịa ka ọ dị ná mbụ. Iji okwu ọnụ gwa onye ahụ na a ka hụrụ ya n’anya, ya na omume nke ịdị nro mgbe nile, ga-egosipụta mmasị onwe onye e nwere n’ebe onye ahụ nọ bụ́ nke ga-enye aka ịkwalite alụmdi na nwunye na-enye afọ ojuju n’ezie. E kwesịrị igosipụta ilu a n’ụzọ kasị ukwuu n’alụmdi na nwunye: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”—Ilu 17:17.
Iwe bụ ihe ọzọ na-egbochi nkwurịta okwu dị mma. E kwuwo n’ụzọ dabara adaba na alụmdi na nwunye obi ụtọ bụ njikọ nke mmadụ abụọ na-agbaghara mmehie nke ọma. Iji kwekọọ ná nkọwa ahụ, di na nwunye kwesịrị itinye mgbalị nile iji gbasoo ndụmọdụ bara uru nke Pọl onyeozi: “Ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” (Ndị Efesọs 4:26) A chọrọ iji obi umeala kwurịta okwu iji tinye ndụmọdụ a n’ọrụ kama ibu iwe n’obi. Mmadụ abụọ nọ n’ezi alụmdi na nwunye adịghị adabakarị n’iwe, esemokwu, na ibu iwe n’obi. (Ilu 30:33) Ha na-agbalị iṅomi Chineke, bụ́ onye na-adịghị ebu iwe n’obi. (Jeremaịa 3:12) N’ezie, ha na-agbaghara ibe ha site n’obi.—Matiu 18:35.
Ihe na-egbochirịrị ụdị nkwurịta okwu ọ bụla bụ ekwunyereghị onye nke ọzọ okwu. Nke a pụrụ ịgụnye mgbachi ihu, ịma nnukwu ọsụ, omume ndị e mere n’ụzọ enweghị mmetụta, na otu onye etinyeghị ọnụ n’okwu. Di ma ọ bụ nwunye nke na-akpa àgwà n’ụzọ a na-egosipụta ụdị ụfọdụ nke enweghị obi ụtọ. Ma ikwupụta mmetụta onwe onye site n’obi nakwa n’ụzọ dị mma na-eme ihe dị ukwu karị n’ime ka alụmdi na nwunye ka mma karịa ka ịgba nkịtị ma ọ bụ ịgbachi ihu na-eme.
Egeghị ntị nke ọma ma ọ bụ gharadị ige ege ma ọlị mgbe di ma ọ bụ nwunye na-ekwu okwu bụ ihe mgbochi ọzọ a na-aghaghị imeri iji nwee ezi nkwurịta okwu ná mmekọrịta miri emi nke alụmdi na nwunye. Ma eleghị anya ike gwụrụ anyị nke ukwuu ma ọ bụ anyị ji nnọọ ọrụ n’aka nke ukwuu nke na anyị apụghị inwe ikike uche ma ọ bụ mmetụta uche dị mkpa iji gee ibe anyị ntị nke ọma. Arụmụka pụrụ ibilite n’ihi ndokwa a ghọtahiere aghọtahie bụ́ nke otu onye chere na e kwupụtara ya n’ụzọ doro anya ma onye nke ọzọ esie ọnwụ na nke ahụ bụ nke mbụ ọ na-anụ ya. N’ụzọ doro anya, ọ bụ enweghị ezi nkwurịta okwu na-akpata ihe isi ike ndị dị otú ahụ.
Otú E Si Akwalite Nkwurịta Okwu Dị Mma
Lee ka o si dị mkpa iwepụta oge maka nkwurịta okwu dị mma, nke sitere n’ịhụnanya! Ụfọdụ na-etinye oge dị nnọọ ukwuu n’ihu TV na-ekiri ndụ ndị ọzọ nke na ha na-enwe oge dị nta maka nke ha. N’ihi ya, ịgbanyụ telivishọn na-abụkarị nzọụkwụ dị mkpa na-eduga n’inwe nkwurịta okwu dị mma.
Otú ọ dị, dị nnọọ ka e nwere oge dị mma ikwu okwu, e nwere oge ịgba nkịtị. Nwoke amamihe ahụ kwuru, sị: “Ihe ọ bụla nwere oge, . . . mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu.” N’ezie, e nwekwara okwu ndị kwesịrị ekwesị ikwu. “Okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!” ka otu ilu na-ekwu. (Eklisiastis 3:1, 7; Ilu 15:23) Ya mere chọpụta oge kasị mma ikwu ihe ị chọrọ ikwu ma ọ bụ ikwupụta nchegbu nke obi gị. Jụọ onwe gị: ‘Ike ọ̀ gwụrụ di m ma ọ bụ nwunye m ka ọ̀ nọ n’ọnọdụ uche ruru ala na nke ntụsara ahụ? Ihe m chọrọ ikwu ọ̀ pụrụ ịkpasu iwe? Gịnị bụ ihe na-adịghị di m ma ọ bụ nwunye m mma n’okwu ndị m ji mee ihe n’oge ikpeazụ anyị kwuru okwu a?’
Ọ dị mma icheta na ndị mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ kasị mma mgbe ha pụrụ ịhụ otú ịkwado ma ọ bụ ime ihe a rịọrọ pụrụ isi baara ha uru. Ọ bụrụ na di na nwunye enwewo esemokwu ụfọdụ, otu n’ime ha nwere ike ikwu, sị, “Ọ dị ihe nọworo na-enye m nsogbu n’obi, anyị gajekwa idozi ya ugbu a!” N’ezie, otú a ga-esi kwuo okwu kpọmkwem ga-adabere n’ọnọdụ ndị dịnụ, ma ọ pụrụ ịka mma ikwu ihe dị ka nke a, “Nke m, anọwo m na-eche banyere okwu ahụ anyị kwurịtara na mbụ na otú a pụrụ isi dozie ihe.” Olee ụzọ iwelite okwu nke o yikarịrị ka ọ̀ ga-amasị di gị ma ọ bụ nwunye gị?
Ee, otú e si kwuo ihe dị oké mkpa. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Gbalịa ime ka olu okwu na okwu ndị i ji eme ihe dị n’amara. Buru n’uche na “ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ka okwu ọnụ ụtọ nile bụ, nke na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.”—Ilu 16:24.
Nye di na nwunye ụfọdụ, ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ụlọ pụrụ ime ka e nwee ọnọdụ dị mma maka nkwurịta okwu. Mmekọ ihe ọnụ dị otú ahụ pụrụ ịkwalite echiche nke ikerịta ihe ka ọ na-enyekwa ohere maka mkparịta ụka dị mma. Nye di na nwunye ndị ọzọ, oge dị jụụ ha nọkọrọ ọnụ n’anwaghị ịrụ ọrụ ụfọdụ na-aka mma, ọ na-adịkwa mma karị maka nkwurịta okwu dị mma.
A pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu mgbe mgbe site n’ịrịba ama otú di na nwunye ihe na-agakọrọ si eso ibe ha ekwurịta okwu. Gịnị meworo ka ha dị otú ahụ? O yikarịrị ka ọ bụ mgbalị onwe onye, ndidi, na iji ịhụnanya echebara ibe ha echiche rụpụtara nkwekọ na ahụ iru ala ha na-eji ekwurịta okwu. O doro anya na ha onwe ha nwere ihe dị ukwuu ha mụtara, n’ihi na a dịghị enwe ezi alụmdi na nwunye n’arụghị ọrụ. Mgbe ahụ, lee ka o si dị mkpa ịtụle echiche nke di ma ọ bụ nwunye gị, ịghọta mkpa ya, na iji okwu ezi uche dị na ya belata ọnọdụ ndị na-akpata esemokwu. (Ilu 16:23) Ọ bụrụ na ị lụwo di ma ọ bụ nwunye, mgbe ahụ, rụọ ọrụ n’ịbụ onye mmadụ ga-enwe obi ụtọ ibinyere na onye ọ na-adị mfe mmadụ ịrịọ mgbaghara. Nke ahụ ga-enye nnọọ aka ime ka alụmdi na nwunye gị bụrụ nke dị mma.
Jehova Chineke chọrọ ka ndị mmadụ nwee alụmdi na nwunye obi ụtọ, nke na-adịte anya. (Jenesis 2:18, 21) Ma mkpịsị ugodi ahụ dị n’aka ndị ahụ e jikọrọ ọnụ n’alụmdi na nwunye. Ọ na-ewe mmadụ abụọ na-ahụ n’anya bụ́ ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ezie iji kpọghee ụzọ ahụ na-eduba n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma site n’ịmụta nkà nke nkwurịta okwu dị mma.
[Foto dị na peeji nke 22]
Ịgbanyụ TV na-eme ka e nwekwuo oge maka nkwurịta okwu
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Nkwurịta okwu dị mma na-enye aka ijikọta obi mmadụ abụọ n’ịhụnanya na-adịte anya