Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/1 p. 22-25
  • Nrụgide Ndị Ọgbọ—Ọ̀ Pụrụ Ịbara Gị Uru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nrụgide Ndị Ọgbọ—Ọ̀ Pụrụ Ịbara Gị Uru?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmetụta Ọ Na-enwe n’Òtù Ọgbọ Nile
  • Iji Mmetụta Ndị Ọgbọ Dị Mma Eme Ihe nke Ọma
  • Zere Mmetụta Ndị Na-adịghị Mma
  • Ụfọdụ Ndị Ritere Uru
  • Ndị Na-eto Eto—unu Esola Ndị Ọgbọ Unu Eme Ihe Na-adịghị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Nrụgide Ndị Ọgbọ—Ò Siri Nnọọ Ike n’Ezie?
    Teta!—2002
  • Otú Ị Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ Gị Na-enye Gị
    Teta!—2014
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nrụgide Ndị Ọgbọ?
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/1 p. 22-25

Nrụgide Ndị Ọgbọ—Ọ̀ Pụrụ Ịbara Gị Uru?

A mụnyere n’ime anyị nile ọchịchọ bụ́ isi nke ịbụ ndị ndị ọgbọ anyị nabatara. Ọ dịghị onye chọrọ ịbụ onye a na-enweghị mmasị n’ebe ọ nọ, onye a jụrụ ajụ. N’ihi ya, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche, ndị ọgbọ anyị na-enwe mmetụta n’ahụ anyị.

A NA-AKỌWA onye ọgbọ dị ka “onye ya na mmadụ nọ n’otu ọnọdụ; . . . onye ya na ya nọ n’otu òtù, karịsịa na-adabere n’afọ ndụ, ma ọ bụ ọkwá.” N’aka nke ya, nrụgide ndị ọgbọ bụ ike nke ndị ọgbọ anyị na-enwe n’ahụ anyị, nke na, ma ànyị maara ma ọ bụ na anyị amaghị, anyị na-ekwekọ n’ụzọ ha si eche echiche ma ọ bụ eme omume. A na-elekarị nrụgide ndị ọgbọ anya ọjọọ. Ma, dị ka anyị ga-ahụ, anyị pụrụ ime ka ọ baara anyị uru.

Mmetụta Ọ Na-enwe n’Òtù Ọgbọ Nile

Ọ bụghị nanị ndị na-eto eto na-enwe nrụgide ndị ọgbọ; ọ na-emetụta òtù ọgbọ nile. Mmetụta ya na-apụta ìhè mgbe anyị hụrụ onwe anyị ka anyị na-ajụ ajụjụ ndị dị ka: “Ndị ọzọ na-eme ya, n’ihi gịnị ka m na-agaghị eji eme ya?” “N’ihi gịnị ka m ga-eji na-adị iche mgbe nile?” “Gịnị ka ndị ọzọ ga-eche ma ọ bụ kwuo?” “Ndị enyi m nile na-eme mkpapụ ma na-alụ di ma ọ bụ nwunye, ma ọ dịghị nke m na-eme. Ọ̀ dị ihe na-eme m?”

Ọ bụ ezie na nrụgide iji kwenyekọ na-emetụta ndị òtù ọgbọ nile, ọ na-akpụ ọkụ n’ọnụ karị n’oge uto. The World Book Encyclopedia na-ekwu na “ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’oge uto na-etinye oge dị ukwuu n’ebe ndị òtù ọgbọ ha nọ—ya bụ, ndị enyi ha na ndị ha maara. Ndị a nọ n’afọ iri na ụma na-achọ ka ndị òtù ọgbọ ha, kama ịbụ ndị mụrụ ha, nabata ha, ha pụkwara ịgbanwe àgwà ha iji bụrụ ndị a nabatara.” Ọ na-agbakwụnye na ndị nọ n’afọ iri na ụma “na-ewere ya na ha na-etolite otú o kwesịrị ma ọ bụrụ na ndị ọgbọ ha anabata ha ma nwee mmasị n’ebe ha nọ.” Iji mezuo nke ahụ, ha “na-emikpu onwe ha n’ihe ndị ha chere na-emetụta ha ịbụ ndị a ma ama, dị ka ụdị uwe ha, ikike idu ndú, na inwe ihe ịga nke ọma n’iso ụmụ okoro ma ọ bụ ụmụ agbọghọ na-eme mkpapụ.”

Di na nwunye pụrụ ịchọpụta na mkpebi ha banyere ụdị ụlọ ha ga-azụ ma ọ bụ biri na-akwụ ụgwọ na ya, ụdị ụgbọala ha ga na-agba, ma hà ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na ha agaghị amụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ bụ nke nrụgide ndị ọgbọ na-emetụta—ihe a na-anabata n’ógbè ha, n’etiti ndị enyi ma ọ bụ agbụrụ ha. Ọbụna ezinụlọ ụfọdụ na-abanye n’ụgwọ dị ukwuu nanị iji chụkwudo ndị agbata obi ma ọ bụ ndị ọgbọ ha n’ụzọ ihe onwunwe. Ee, ihe mgbaru ọsọ anyị, echiche anyị, na mkpebi anyị na-egosipụtakarị ikike dị aghụghọ nke nrụgide ndị ọgbọ. N’ihi ikike ya, ànyị pụrụ iji nrụgide ndị ọgbọ mee ihe n’ụzọ bara uru, iji nyere anyị aka n’ụzọ anyị chọrọ ịga? N’ezie, anyị pụrụ!

Iji Mmetụta Ndị Ọgbọ Dị Mma Eme Ihe nke Ọma

Ndị dọkịta na ndị ọkachamara ahụ ike ndị ọzọ maara uru nke iji ndị na-enwe nchekwube na mmetụta ọma ndị ọzọ gbaa ndị ọrịa ha gburugburu. Gburugburu ebe dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe na-akpali mgbake. Dị ka ihe atụ, a na-enyekarịrị ndị na-enwekwaghị otu aka ma ọ bụ ụkwụ aka site n’usoro na-ewe ogologo oge nke e ji enyere ndị ọrụsị aka ịba uru nakwa ịgbake n’ụzọ mmetụta uche site n’ezi ihe nlereanya na agbamume nke ndị ọzọ hụsiworo anya n’ụzọ yiri nke ahụ. N’ụzọ doro anya, mmadụ imikpu onwe ya na gburugburu ebe dị mma bụ́ ebe e nwere ndị nwere nchekwube, ndị bụ́ ezi ndị nlereanya bụ otu ụzọ isi jiri ụdị nrụgide ndị ọgbọ nke dị mma mee ihe nke ọma.

Ụkpụrụ a dịkwa iré n’ọgbakọ ndị Kraịst, n’ihi na mmetụta ziri ezi nke ndị ọgbọ bụ otu n’ime ihe ndị mere Jehova ji tụziere ndị ya ịgbakọta ọnụ mgbe nile. Chineke na-agba anyị ume ‘ịkpasurịta ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche nakwa ịdụrịta ibe anyị ọdụ.’ (Ndị Hibru 10:24, 25) Agbamume dị otú ahụ bara oké uru n’ihi ọtụtụ nrụgide na-adịghị mma na ndị na-emerụ ahụ dị n’ụwa nke oge a. N’ihi nrụgide ndị a, ndị Kraịst aghaghị ‘ijisi ike’ iji nọgide na-esi ike n’ụzọ ime mmụọ. (Luk 13:24) N’ihi ya, nkwado ịhụnanya sitere n’aka ndị kwere ekwe ibe anyị dị anyị mkpa, anyị na-enwekwa ekele maka ya. Tụkwasị na nke a, ụfọdụ aghaghị ịtachiri “ogwu n’anụ ahụ” obi, ikekwe nrịanrịa ma ọ bụ nkwarụ. (2 Ndị Kọrint 12:7) Ndị ọzọ pụrụ ịdị na-adọga iji merie àgwà ọjọọ ma ọ bụ ịda mbà n’obi, ma ọ bụ, ọ pụrụ isiri ha ike igbo mkpa ndị e nwere ná ndụ. Ya mere, ọ bụ ihe amamihe dị na ya anyị iji ndị na-anọ Jehova Chineke nso, bụ́kwa ndị na-enwe ọṅụ ijere ya ozi, gbaa onwe anyị gburugburu. Ndị ọgbọ dị otú ahụ ga-akwalite mmụọ anyị ma nyere anyị aka ‘iji ikwesị ntụkwasị obi tachie obi ruo ọgwụgwụ ihe nile.’—Matiu 24:13.

Site n’ịhọrọ ezi ndị ọgbọ, anyị pụziri ịchịkwa mmetụta ha na-enwe n’ebe anyị nọ. Tụkwasị na nke a, ọmarịcha nri ime mmụọ na nduzi bara uru a na-enye ná nzukọ ndị Kraịst na-eme ka agbamume anyị na-enweta n’aka ndị ọgbọ anyị sikwuo ike.

N’ezie, ịga nzukọ ndị Kraịst anaghị adị mfe mgbe nile. Ụfọdụ nwere ike ha agaghị enweta nkwado n’aka di ma ọ bụ nwunye ha, ndị ọzọ nwere ike inwe ụmụaka ha ga-akwadebe, ime njem pụkwara ịbụ nsogbu nye ndị ọzọ. Ma chee echiche: Ọ bụrụ na i kweghị ka ihe mgbochi ndị a kwụsị gị, mgbe ahụ ihe nlereanya gị pụrụ ịkpali ndị ọzọ bụ́ ndị pụrụ ịdị na-alụso ọnọdụ ndị yiri nke ahụ ọgụ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, gị na ndị ọzọ dị ka gị na-enye ọ bụghị nanị ezi ihe nlereanya kamakwa ụdị mmetụta ndị ọgbọ nke ziri ezi—nke na-enweghịkwa ihe ọ bụla na-egosipụta mmanye.

N’ezie, Pọl onyeozi, bụ́ onye ya onwe ya gbasoro ọtụtụ ihe isi ike na ihe mgbochi mgba, gbara ndị Kraịst ume iṅomi ezi ihe nlereanya ya na nke ndị Kraịst ọzọ tozuru okè. O kwuru, sị: “Ụmụnna m, dịnụ n’otu n’iṅomi m, na-elekwanụ ndị na-ejegharị otú a, otú unu nwere anyị dị ka ihe atụ.” (Ndị Filipaị 3:17; 4:9) Ndị Kraịst oge mbụ nọ na Tesalọnaịka lekwasịrị anya n’ezi ihe nlereanya Pọl. Pọl dere banyere ha, sị: “Unu onwe unu ghọkwara ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị, ebe unu weere ọṅụ nke Mmụọ Nsọ nara okwu ahụ nke ọma n’ime ọtụtụ mkpagbu; ya mere unu ghọrọ ihe atụ n’ebe ha nile nọ, bụ́ ndị kwere ekwe n’ime Masedonia na n’ime Akaịa.” (1 Ndị Tesalọnaịka 1:6, 7) Àgwà na ihe nlereanya anyị ziri ezi pụrụ inwe mmetụta yiri nke ahụ n’ebe ndị anyị na ha na-akpakọrịta nọ.

Zere Mmetụta Ndị Na-adịghị Mma

Ọ bụrụ na anyị chọrọ izere nrụgide ndị ọgbọ nke na-adịghị mma, anyị aghaghị ịjụ mmetụta nke ‘ndị na-eje dị ka anụ ahụ si chọọ.’ (Ndị Rom 8:4, 5; 1 Jọn 2:15-17) Ma ọ bụghị ya, nrụgide ndị ọgbọ na-emerụ ahụ ga-eme ka anyị si n’ebe Jehova na ndụmọdụ amamihe ya nọ kpafuo. Ilu 13:20 na-ekwu, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” Ị̀ pụrụ icheta onye e mejọrọ n’ihi nrụgide ndị ọgbọ nke na-adịghị mma? Dị ka ihe atụ, e dubawo ndị Kraịst ụfọdụ n’ịhụ ihe onwunwe n’anya, n’omume rụrụ arụ, n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ nakwa n’ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè n’ihi mmetụta nke ndị ọgbọ ha.

Ọbụna n’ime ọgbakọ ndị Kraist, anyị pụrụ ịbụ ndị nrụgide ndị ọgbọ nke na-adịghị mma metụtara ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ ndị na-esighị ike n’ụzọ ime mmụọ dị ka ezi ndị enyi anyị. (1 Ndị Kọrint 15:33; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:14) Ndị dị otú ahụ adịghị achọkarị ikwurịta ihe ime mmụọ; ọbụna ha pụrụ ịchị ndị nkwurịta okwu dị otú ahụ na-amasị ọchị. Ọ bụrụ na anyị ahọrọ ndị a dị ka ezi ndị enyi anyị, nrụgide ndị ọgbọ pụrụ ịmanye anyị ịdị ka ha, n’oge na-adịghịkwa anya, anyị nwere ike ịchọpụta na echiche na àgwà anyị eyiwela nke ha. Ọbụna anyị pụrụ ịmalite iche echiche na-ezighị ezi banyere ndị nwere ezi okwukwe, bụ́ ndị na-agbalịkwa inwe ọganihu ime mmụọ.—1 Timoti 4:15.

Lee ka o si bụrụ ihe amamihe ka dịrị na ya iso ndị na-agbalị ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, bụ́ ndị ihe ime mmụọ na-atọ ụtọ mee enyi! Ndị enyi dị otú ahụ ga-enyere anyị aka igosipụta “amamihe ahụ nke si n’elu bịa.” O “buru ụzọ dị ọcha, e mesịa ọ dị udo, nwee obiọma, na-ekwenye okwu nke ọma, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, . . . n’enweghị ihu abụọ.” (Jemes 3:17) Nke a apụtaghị na ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe enweghị ike ikwu banyere ihe ọzọ ma e wezụga ihe ime mmụọ. Ọ bụghị otú ahụ! Cheedị echiche banyere isiokwu dị iche iche na-adọrọ mmasị nke a na-atụle n’akwụkwọ ndị Watch Tower na-ebipụta dị ka magazin Teta! N’eziokwu, isiokwu nkwurịta okwu ndị na-ewuli elu bara nnọọ ụba, sitekwa n’inwe mmasị n’isiokwu ndị sara mbara, anyị na-egosipụta na anyị hụrụ ndụ na ọrụ aka Jehova n’anya.

Dị nnọọ ka onye maara apịa tennis na-enwetakwu nkà site n’isoro onye ọzọ maara apịa na-apịa, ezi ndị enyi na-ewelite anyị elu n’uche, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ ime mmụọ. N’aka nke ọzọ, ndị enyi ọjọọ pụrụ iduba anyị n’omume ihu abụọ site n’ịgba anyị ume ibi ụdị ndụ abụọ. Lee ka o si ka mma inwe akọ na uche dị ọcha na ùgwù onwe onye!

Ụfọdụ Ndị Ritere Uru

Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-achọpụta na ịmụta ozizi Bible na omume na ihe ime mmụọ ndị ọ chọrọ esighị oké ike. Otú ọ dị, ihe pụrụ isi ike bụ ime ihe ndị a eme. Dị ka ihe atụ ndị na-esonụ na-egosi, mmetụta ndị ọgbọ nke dị mma pụrụ inyere anyị aka iji obi dum na-ejere Jehova ozi.

Otu Onyeàmà nke ya na nwunye ya nọ n’ozi oge nile kwuru na ihe nlereanya nke ndị ọgbọ ya metụtara ihe mgbaru ọsọ ya ná ndụ. Mgbe ọ nọ na-etolite, ọ ghaghị ịgbaso mmetụta ndị na-ezighị ezi mgba. Ma ọ họọrọ ndị na-agba ya ume ijechi ozi na nzukọ ndị Kraịst anya ịbụ ndị enyi ya. Ịrapagidesi ike n’ebe ndị enyi a nọ nyeere ya aka ịnọgide n’ụzọ na-eduga ná ntozu okè ime mmụọ.

Onyeàmà ọzọ na-ede, sị: “Mgbe mụ na nwunye m lụsịrị, anyị gafere n’otu ọgbakọ ebe otu di na nwunye anyị na ha bụtewere ọgbọ bụ ndị ọsụ ụzọ oge nile. Ihe nlereanya ha tụnyere ụtụ n’ime ka anyị banye n’ozi oge nile. Mgbe ahụ anyị onwe anyị kwa rụrụ ọrụ n’iwulite mmụọ ọsụ ụzọ n’ọgbakọ ahụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị sonyeere anyị dị ka ndị ọsụ ụzọ.”

Iso ndị nwere ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke na-akpakọrịta pụrụ ime ka irubere Jehova isi dị mfe karị. Nke a bụ abamuru ọzọ nke mmetụta ndị ọgbọ nwere. Otu Onyeàmà nke malitere n’ozi oge nile dị ka nwa okoro ma mesịa ghọọ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eje ozi ugbu a n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society. Ọ na-ede, sị: “Ụfọdụ n’ime ihe ndị kasị amasị m nke m na-echeta banyere oge m bụ nwata bụ banyere ndị ozi oge nile na-abịa n’ụlọ anyị. Anyị na-emekarị ohere maka otu onye ọbịa isoro anyị rie ihe. Otu onye nlekọta sekit nyere m akpa ozi ọma mgbe m dị afọ iri. Eji m akpa ahụ kpọrọ ihe ruo taa.”

N’ịtụgharị uche n’oge ọ dị afọ iri na ụma, Onyeàmà a na-agbakwụnye, sị: “Ọtụtụ ụmụ okoro ndị nọ n’ọgbakọ ahụ chọrọ ikere òkè n’ihe omume ọgbakọ, ihe nlereanya ha kpalikwara ndị ọzọ n’ime anyị inwe otu ọchịchọ ahụ.” Ndị ọgbọ dị mma nyeere onye ntorobịa a aka, dị ka ome, itolite ghọọ nwoke ọma bụ́ onye Kraịst, nke yiri osisi. Ndị nne na nna, ùnu na-akpọ ndị pụrụ inwe mmetụta dị mma, nke na-ewuli elu n’ebe ụmụ unu nọ òkù ịbịa n’ụlọ unu?—Malakaị 3:16.

N’ezie, ọ bụghị anyị nile pụrụ ikere òkè n’ozi oge nile dị ka ndị ahụ a ka kpọtụsịrị aha. Ma anyị nile pụrụ ịmụta iwere ‘obi, mkpụrụ obi, na uche anyị dum’ hụ Jehova n’anya. (Matiu 22:37) Ụdị ndị ọgbọ anyị na-ahọrọ na-ekere òkè dị ukwuu na anyị ịzụlite ịhụnanya ahụ, nakwa n’atụmanya anyị maka ndụ ebighị ebi.

Ọbụ abụ ahụ nyere usoro ime ihe dị mfe ma dị irè iji nwee ezi ihe ịga nke ọma ná ndụ: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu, nke na-eguzoghịkwa n’ụzọ ndị mmehie, nke na-anọghịkwa n’ọnọdụ ndị na-akwa emo. Kama n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụla kwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.”—Abụ Ọma 1:1-3.

Lee ihe mmesi obi ike dị ebube nke a bụ! Ọ bụ ezie na anyị ezughị okè, na-emehiekwa ihe, ndụ anyị ga-aga nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova na-eduzi anyị, ma ọ bụrụkwa na anyị ejiri obi sara mbara jiri mmetụta dị mma nke ndị ọgbọ nke Chineke nyere anyị n’ụba—“òtù ụmụnna [anyị] ndị nọ n’ụwa”—mee ihe nke ọma.—1 Pita 5:9.

[Foto dị na peeji nke 24]

A na-enweta ụdị mmetụta ndị ọgbọ ziri ezi n’ime ọgbakọ

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị nne na nna, na-agbanụ ụmụ unu ume isoro ndị ọgbọ na-ewuli elu na-akpakọrịta

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya