Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/15 p. 8-9
  • Ekwela Ka Iwe Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekwela Ka Iwe Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Iwe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Chịkwaa Iwe Gị?
    Teta!—1997
  • “Nghọta Mmadụ Nwere Na-eme Ka Ọ Ghara Iwe Iwe Ọsọ Ọsọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-ejide Onwe Gị ma A Kpasuo Gị Iwe
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/15 p. 8-9

Ekwela Ka Iwe Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ

“KURU ezigbo ume!” “Jide obi gị aka!” “Jide ire gị aka!” Ị̀ maara nkebi ahịrịokwu ndị a? Ikekwe ị na-agwa ha onwe gị ugboro ugboro iji mee ka iwe gị dajụọ. Ụfọdụ ndị na-apụ jegharịa, ná mgbalị iji gbochie ntiwapụ nke iwe. Ihe ndị a bụ ụzọ ndị dị mfe isi chịkwaa iwe ma chekwaa mmekọrịta gị na ndị ọzọ.

Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndụmọdụ ndị na-emegiderịta onwe ha bụ́ ndị sitere n’aka ndị ọkachamara banyere ma è kwesịrị ịchịkwa iwe ma ọ bụ gbochie ya na-etigharị ọtụtụ ndị anya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ akwalitela nchepụta echiche bụ́ na “ọ bụrụ na ọ na-eme ka ahụ dị gị mma karị,” wee iwe. Ndị ọzọ na-adọ aka ná ntị na inwe ntiwapụ nke iwe mgbe nile bụ “ihe na-egosi n’ụzọ siri ike na mmadụ ga-anwụchu ọnwụ karịa [otú] ihe ndị ọzọ dị ize ndụ dị ka ise siga, ọbara mgbali elu, na oké cholesterol, si egosi.” Okwu Chineke na-ekwu hoo haa, sị: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ.” (Abụ Ọma 37:8) N’ihi gịnị ka Bible ji enye ndụmọdụ dị otú ahụ a kapịrị ọnụ?

Mmetụta uche ndị a na-achịkwaghị achịkwa na-eduga n’omume ndị a na-achịkwaghị achịkwa. Nke a pụtara nnọọ ìhè ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Anyị na-agụ, sị: “Ken wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu, ihu ya wee gbarụọ.” Ebee ka nke a dugara ya? Iwe ya jichiri ya ma chịkwaa ya, n’ụzọ dị nnọọ ukwuu nke na o mere ka obi ya kpọọ nkụ n’ebe ndụmọdụ Jehova nyere ya ka o chigharịa gaa n’ime ihe ọma dị. Iwe Ken nke ọ na-achịkwaghị achịkwa dugara ya ná mmehie dị oké njọ—igbu nwanne ya nwoke.—Jenesis 4:3-8.

N’ụzọ yiri nke ahụ, iwe jidere Sọl, bụ́ eze mbụ nke Israel, mgbe ọ nụrụ ka a na-enye Devid nnukwu otuto. “Ndị inyom wee zarịta onwe ha, bụ́ ndị na-egwuri egwú, sị, Sọl etigbuwo ndị iro ya, [ọtụtụ puku ndị ikom], Devid kwa ndị iro ya, [ọtụtụ iri puku ndị ikom]. Iwe Sọl wee dị ọkụ nke ukwuu, okwu a jọkwara njọ n’anya ya.” Iwe chịkwara nnọọ echiche Sọl nke na ọ kpaliri ya ịnwa ugboro ugboro igbu Devid. Ọ bụ ezie na Devid weere nzọụkwụ dị iche iche ime ka ha bụrụ enyi, Sọl enweghị mmasị ọ bụla n’ịchọ udo na mkpezi. N’ikpeazụ, ọ tụfuru ihu ọma Jehova kpam kpam.—1 Samuel 18:6-11; 19:9, 10; 24:1-21; Ilu 6:34, 35.

Mgbe mmadụ na-achịkwaghị iwe ya, ọ ga-ekwurịrị ma mee ihe ndị ga-akpasu ndị nile o metụtara iwe. (Ilu 29:22) Ken na Sọl were iwe n’ihi na nke ọ bụla n’ime ha kworo ekworo ma nwee anyaụfụ n’ụzọ nke ya. Otú ọ dị, ọtụtụ ihe pụrụ ịkpata iji iwe emeghachi omume. Nkatọ na-ezighị ezi, mkparị, nghọtahie, ma ọ bụ mmeso na-adịghị mma pụrụ ịbụ ihe ga-akpalite oké iwe.

Ihe atụ Ken na Sọl na-egosi otu erughị eru siri ike ha abụọ nwere. Ihe àmà na-egosi na ọ bụghị okwukwe kwaliri àjà Ken chụrụ. (Ndị Hibru 11:4) Ọdịda Sọl dara n’irube isi n’iwu doro anya nke Jehova na mgbalị ndị o mere mgbe nke ahụ gasịrị iji mee ka ihe o mere yie ihe ziri ezi dugara ya n’ịbụ onye ihu ọma na mmụọ Chineke funahụrụ. N’ụzọ doro anya, ndị ikom abụọ ahụ mebiri mmekọrịta ha na Jehova.

Jiri àgwà ndị dị otú ahụ tụnyere nke Devid, bụ́ onye nwere ihe mere ọ ga-eji wee iwe ná mmeso Sọl mesoro ya. Devid chịkwara mmụọ ya. N’ihi gịnị? O kwuru, sị: “Ya bụrụ m ihe arụ site na Jehova; m gaghị eme onyenwe m, bụ́ onye Jehova e tere mmanụ, ihe a ma ọlị.” Devid bu nnọọ mmekọrịta ya na Jehova n’uche, ọ metụtakwara ụzọ o si mesoo Sọl ihe. O ji obi umeala hapụrụ Jehova okwu.—1 Samuel 24:6, 15.

N’ezie, ihe iwe a na-achịkwaghị achịkwa na-arụpụta abụghị obere ihe. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe.” (Ndị Efesọs 4:26) Ọ bụ ezie na iwe ezi omume nwere ọnọdụ ya, e nwere ihe ize ndụ na-adịgide adịgide na iwe pụrụ ịghọrọ anyị ihe mkpọbi ụkwụ. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na anyị na-eche ihe ịma aka nke ịchịkwa iwe anyị ihu. Ànyị pụrụ isi aṅaa mee otú ahụ?

Otu ụzọ bụ́ isi bụ iwulite mmekọrịta siri ike n’ebe Jehova nọ. Ọ na-agba gị ume imeghere ya obi na uche gị. Gwa ya nchegbu gị nile, ma rịọ ya maka obi dị jụụ iji merie iwe. (Ilu 14:30) Jide n’aka na “anya abụọ nke Onyenwe anyị dị n’ahụ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ dịkwa n’ebe arịrịọ ha dị.”—1 Pita 3:12.

Ekpere pụrụ ịkpụzi ma duzie gị. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ụzọ i si emeso ndị ọzọ ihe. Cheta otú Jehova siworo mesoo gị ihe. Dị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, “ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka [Jehova mesoworo] anyị.” (Abụ Ọma 103:10) Mmụọ mgbaghara dị mkpa ka “Setan wee ghara irigbu” gị. (2 Ndị Kọrint 2:10, 11) Ọzọkwa, ekpere na-emeghe obi gị nye nduzi nke mmụọ nsọ, bụ́ nke pụrụ ịgbanwe ụzọ ndụ ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike. Jehova ji obi ụtọ na-enye ‘udo nke kachasị uche nile,’ bụ́ nke pụrụ ịtọhapụ gị pụọ n’ike njichi nke iwe.—Ndị Filipaị 4:7.

Otú ọ dị, a ghaghị iji inyocha Akwụkwọ Nsọ mgbe dum sochie ekpere ka anyị wee “[ghọta] ihe bụ́ ihe Onyenwe anyị na-achọ.” (Ndị Efesọs 5:17; Jemes 3:17) Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịchịkwa iwe gị, gbalịsie ike ịmara ihe bụ́ echiche Jehova n’okwu ahụ. Tụlee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị metụtara kpọmkwem ịchịkwa iwe.

Pọl onyeozi na-enye ihe ncheta a dị mkpa: “Ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Mee ka echiche na omume gị dịkwasị n’imere ndị ọzọ ihe ọma. Ọrụ dị mma, ziri ezi, dị otú ahụ ga-akpali mmetụta ọmịiko na ntụkwasị obi, ọ ga-ebelatakwa nghọtahie ndị pụrụ ịkpata iwe n’ụzọ dị mfe.

Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Mee ka nzọụkwụ m nile guzosie ike n’okwu ọnụ Gị: ekwekwala ka ajọ ihe ọ bụla bụrụ onyeisi m. Udo nke hiri nne ka ndị na-ahụ iwu Gị n’anya nwere; ọ dịghịkwa ihe ịsụ ngọngọ ha nwere.” (Abụ Ọma 119:133, 165) Ọ pụkwara ịdị otú ahụ n’ebe ị nọ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

IHE NDỊ A GA-EME IJI CHỊKWAA IWE

□ Na-ekpegara Jehova ekpere.—Abụ Ọma 145:18.

□ Na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị.—Abụ Ọma 119:133, 165.

□ Na-arụ ọrụ dị mma mgbe nile.—Ndị Galetia 6:9, 10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya