Ndị Ntorobịa—Zụọnụ Ike Nghọta Unu!
“Nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.”—NDỊ HIBRU 5:14.
1, 2. (a) Olee otú ọnọdụ anyị taa si yie nke ndị Kraịst oge gboo nọ n’Efesọs? (b) Ikike ndị dị aṅaa pụrụ ichebe unu pụọ n’ihe ize ndụ, oleekwa otú unu pụrụ isi zụlite ha?
“LEZIENỤ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe; na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) Kemgbe puku afọ abụọ gara aga Pọl onyeozi deturu okwu ndị ahụ, ‘ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ agaala n’ihu n’ịjọkarị njọ.’ Anyị na-ebi ‘n’oge dị oké egwu,’ ma ọ bụ n’oge “jupụtara n’ihe ize ndụ,” dị ka nsụgharị ọzọ si kwuo ya.—2 Timoti 3:1-5, 13; Phillips.
2 Otú ọ dị, unu pụrụ izere ịbụ ndị ihe ize ndụ ndị zoro n’ụzọ unu ga-emerụ ahụ site n’ịzụlite “ezi uche . . . ihe ọmụma na izuzu.” (Ilu 1:4) Ilu 2:10-12 na-asị: “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị: ịnapụta gị n’ụzọ onye ọjọọ, n’aka mmadụ na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ.” Ma olee nnọọ otú unu pụrụ isi zụlite ikike ndị ahụ? Ndị Hibru 5:14 na-asị: “Nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” Dị ka ọ dị na nkà ọ bụla, ọ na-achọ ọzụzụ ka mmadụ wee bụrụ ọkà n’iji ike nghọta ya eme ihe. Okwu Grik Pọl ji mee ihe pụtara n’ụzọ nkịtị ‘ịbụ onye e nyeworo ọzụzụ dị ka onye na-eme egwuregwu mmega ahụ.’ Olee otú unu si amalite ọzụzụ dị otú ahụ?
Ịzụ Ike Nghọta Unu
3. Olee otú unu pụrụ isi jiri ike nghọta unu mee ihe mgbe unu chọrọ ime mkpebi?
3 Rịbanụ ama na a na-azụ ike nghọta unu—ikike unu nwere ịghọta ihe ọma na ihe ọjọọ—site ‘n’omume a na-eme mgbe dum.’ Mgbe unu na-aghaghị ime mkpebi, ọ ga-esi ike ime nhọrọ amamihe dị na ha site n’ịkọ nkọ, ime ihe ná mkpali, ma ọ bụ nanị site n’isonyere ìgwè mmadụ. Iji mee mkpebi ndị amamihe dị na ha, unu aghaghị iji ike nghọta unu mee ihe. N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, site n’inyocha ọnọdụ ahụ nke ọma na ịchọpụtacha ihe ndị bụ́ eziokwu. Jụọnụ ajụjụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Chọpụtanụ nhọrọ ndị unu nwere. Ilu 13:16 na-asị: “Onye ọ bụla nke nwere ezi uche ji ihe ọmụma arụ ọrụ.” Ọzọ, gbalịanụ ịchọpụta iwu ma ọ bụ ụkpụrụ Bible nke metụtara okwu ahụ. (Ilu 3:5) N’ezie, iji mee nke a, unu aghaghị inwe ihe ọmụma nke Bible. Ọ bụ ya mere Pọl ji agba anyị ume iri “nri siri ike”—ịmara “ihe bụ́ obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi” nke eziokwu ahụ.—Ndị Efesọs 3:18.
4. N’ihi gịnị ka inwe ihe ọmụma banyere ụkpụrụ Chineke ji dị oké mkpa?
4 Ọ dị oké mkpa ime otú ahụ, ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ma na-emekarị mmehie. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 5:12) “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa,” ka Jeremaịa 17:9 na-ekwu. Ọ bụrụ na e nweghị ụkpụrụ Chineke iduzi anyị, anyị pụrụ ịghọgbu onwe anyị gaa n’iche na ihe dị njọ dị mma—nanị n’ihi na ọ na-agụ anụ ahụ anyị agụụ. (Tụlee Aịsaịa 5:20.) Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Gịnị ka okorobịa ga-eji mee ka ụzọ ya dị ọcha? Ọ bụ n’ilezi ya anya dị ka okwu Gị si dị. M na-esite n’ihe ịrịba ama Gị nile ghọta ihe: n’ihi nke a ka m kpọworo ụzọ okwu ụgha ọ bụla asị.”—Abụ Ọma 119:9, 104.
5. (a) Gịni mere ụfọdụ ndị ntorobịa ji agbaso ụzọ okwu ụgha? (b) Otu onye ntorobịa si aṅaa mee ka eziokwu ahụ bụrụ nke ya?
5 N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ntorobịa a zụlitere n’ezinụlọ ndị Kraịst jiworo gbasoo ụzọ okwu ụgha? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ndị dị otú ahụ ‘anwapụtabeghị ihe bụ́ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè’? (Ndị Rom 12:2) Ụfọdụ pụrụ iso ndị mụrụ ha na-abịa nzukọ ma nwee ike ikwughachi ụfọdụ n’ime ozizi ndị bụ́ isi nke Bible. Ma mgbe a gwara ha ka ha nwapụta nkwenkwe ha ma ọ bụ ka ha kọwaa ụfọdụ n’ime ihe ndị katụ mie emi nke Okwu Chineke, ihe ọmụma ha na-atọgbọ chakoo n’ụzọ na-emechu ihu. A pụrụ iduhie ndị ntorobịa dị otú ahụ n’ụzọ dị mfe. (Ndị Efesọs 4:14) Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ n’ebe ị nọ, gịnị ma i kpebie ime mgbanwe? Otu nwanna nwanyị na-eto eto na-echeta, sị: “Emere m nnyocha. Ajụrụ m onwe m, sị, ‘Olee otú m si mara na nke a bụ ezi okpukpe ahụ? Olee otú m si mara na e nwere Chineke aha ya bụ Jehova?’”a Iji nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ mere ka o kwenyesie ike na ihe ndị ọ mụtara n’aka ndị mụrụ ya bụ eziokwu!—Tụlee Ọrụ 17:11.
6. Olee otú ị pụrụ isi “na-anwapụta ihe dị Onyenwe anyị [bụ́ Jehova] ezi mma”?
6 N’ịbụ ndị e ji ihe ọmụma nke ụkpụrụ Jehova kwadebe, unu ga “na-anwapụta ihe dị Onyenwe anyị ezi mma,” n’ụzọ dị mfe karị. (Ndị Efesọs 5:10) Ma gịnị ma ọ bụrụ na unu ejighị ụzọ amamihe nke unu ga-agbaso n’otu ọnọdụ kpọmkwem n’aka? Kpegaranụ Jehova ekpere maka nduzi. (Abụ Ọma 119:144) Gbalịanụ isoro ndị mụrụ unu ma ọ bụ onye Kraịst tozuru okè kwurịta banyere ya. (Ilu 15:22; 27:17) A pụkwara ịchọta nduzi bara uru site n’ime nnyocha n’ime Bible nakwa n’akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower na-ebipụta. (Ilu 2:3-5) Ka unu na-eji ike nghọta unu eme ihe karị, otú ahụ ka ha ga-adịkwu nkọ karị.
Igosipụta Nghọta ná Ntụrụndụ
7, 8. (a) Olee otú ị pụrụ isi jiri ike nghọta gị mee ihe n’ikpebi ma ị ga-aga otu nnọkọ oriri ma ọ bụ na ị gaghị aga? (b) Gịnị bụ echiche Bible banyere ntụrụndụ?
7 Ugbu a ka anyị leba anya n’otú unu pụrụ isi jiri ike nghọta unu mee ihe n’ọnọdụ ụfọdụ kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, were ya na a kpọwo gị òkù ịga otu nnọkọ oriri. Ị pụrụ ọbụna ịnatawo akwụkwọ ịkpọ òkù e ji akpọsa nnọkọ ahụ. A gwara gị na ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà ga-abịa ya. Ma a ga-anakọta ụtụ maka ịkwụ ụgwọ ihe ndị e mefuru. Ì kwesịrị ịga?
8 Jiri ike nghọta gị mee ihe. Nke mbụ, chọpụta ihe ndị bụ́ eziokwu. Olee otú nnọkọ a ga-aharu? Olee ndị ga-abịa ya? Olee mgbe ọ ga-amalite? Olee mgbe ọ ga-emechi? Olee ihe ndị e mere atụmatụ ime na ya? Olee otú a ga-esi chịkwaa ya? Mgbe nke a gasịrị, mee nnyocha ụfọdụ, na-achọta “Social Gatherings,” (Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ) na “Entertainment” (Ntụrụndụ) n’ime Watch Tower Publications Index.b Gịnị ka nnyocha i mere pụrụ ikpughe? Otu ihe bụ na Jehova adịghị akatọ ịnọkọta ọnụ iji kporie ndụ. N’ezie, Eklisiastis 8:15 na-asị na tinyere ịdọgbu onwe onye n’ọrụ, na “ọ dịghị ezi ihe mmadụ nwere n’okpuru anyanwụ ma ọ́ bụghị iri ihe, na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịṅụrị ọṅụ.” Ọbụna Jisọs Kraịst n’onwe ya gara oriri ndị pụrụ iche nakwa ma ọ dịkarịa ala otu agbamakwụkwọ. (Luk 5:27-29; Jọn 2:1-10) Ọ bụrụ na e meruo ya n’ókè, nnọkọ mmadụ na ibe ya pụrụ ịba uru.
9, 10. (a) Ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka ụfọdụ nnọkọ oriri pụrụ iweta? (b) Olee ajụjụ ndị ị pụrụ ịjụ onwe gị tupu ị na-ekpebi ma ị ga-aga nnọkọ oriri ma ọ bụ na ị gaghị aga?
9 Otú o sina dị, nnọkọ oriri a na-ahazighị nke ọma pụrụ ịkpata nsogbu. Ná 1 Ndị Kọrint 10:8, anyị na-agụ banyere otú mkpakọrịta ndị amamihe na-adịghị na ha si duga n’ịkwa iko nakwa n’ogbugbu nke “[puku iri abụọ na atọ nke ndị Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi] n’otu ụbọchị.” A na-achọta ịdọ aka ná ntị ọzọ na-akpali iche echiche ná Ndị Rom 13:13: “Ka anyị na-ejegharị dị ka o kwesịrị anyị, dị ka n’ehihie; ọ bụghị n’ite egwú na ịṅụbiga mmanya ókè, ọ bụghị n’ịkwa iko na agụụ ịkwa iko, ọ bụghị n’esemokwu na ekworo.” (Tụlee 1 Pita 4:3.) N’eziokwu, a pụghị ikwu kpọmkwem mmadụ ole pụrụ ịga otu nnọkọ oriri. Ma ahụmahụ ndị e nwere na-egosi na ka nnọkọ oriri na-ebuwanye ibu, otú ahụ ka ọ na-esikwu ike ịchịkwa ya. O yikarịghị ka nnọkọ oriri ndị katụ nta, e lekọtara nke ọma hà ga-aghọ “oriri a na-achịkwaghị achịkwa.”—Ndị Galetia 5:21, Byington.
10 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nnyocha gị ga-akpali ajụjụ ndị ọzọ, dị ka: À ga-enwe ụfọdụ ndị Kraịst tozuru okè ná nnọkọ oriri ahụ? N’ezie, olee ndị ga-ahụ maka ya? Nzube nnọkọ oriri ahụ ọ̀ bụ iji kwalite mkpakọrịta dị mma ka ọ̀ bụ iji wetara mmadụ uru? À kpara òkè ọ bụla banyere ndị pụrụ ịbịa ya? Ọ bụrụ na nnọkọ oriri ahụ bụ ná ngwụsị izu, ọ̀ ga-emechi n’ezi oge ka ndị ga-abịa ya wee nwee ike ikere òkè n’ozi ndị Kraịst n’echi ya? Ọ bụrụ na a ga-akụ ma gbaa egwú, ọ̀ ga-ekwekọ n’ụkpụrụ ndị Kraịst? (2 Ndị Kọrint 6:3) E nwere ike ịjụ ajụjụ ndị dị otú ahụ agaghị adị mfe. Ma Ilu 22:3 na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nhà.” Ee, unu pụrụ izere ọnọdụ ndị dị ize ndụ site n’iji ike nghọta unu na-eme ihe.
Igosipụta Nghọta n’Ime Atụmatụ Maka Agụmakwụkwọ Unu
11. Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi jiri ike nghọta ha mee ihe n’ime atụmatụ maka ọdịnihu ha?
11 Bible na-ekwu na ọ bụ ihe amamihe ime atụmatụ maka ọdịnihu. (Ilu 21:5) Ì sorowo ndị mụrụ gị kwurịta banyere ọdịnihu gị? Ikekwe ị na-eme atụmatụ ịbanye n’ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ. N’ezie, ọ dịghị ọrụ pụrụ inye afọ ojuju karịa ya. Ọ bụrụ na ị na-azụlite àgwà ọmụmụ ihe dị mma, na-enwetakwa nkà n’ozi, ị na-akwadebe maka ọrụ a na-akpali akpali. Ì chewo echiche banyere otú ị ga-esi akwado onwe gị n’ozi? Ọ bụrụ na ị họrọ inwe ezinụlọ n’ọdịnihu, ị̀ ga-enwe ike ibu ibu ọrụ nke abụọ ahụ? Ọ na-achọ iji ike nghọta eme ihe iji mee mkpebi ndị ziri ezi, ndị ezi uche dị na ha banyere ihe ndị dị otú ahụ.
12. (a) Olee otú ezinụlọ ụfọdụ siworo họrọ ikwekọ n’ọnọdụ akụ̀ na ụba na-agbanwe agbanwe? (b) Ịgụtụkwu akwụkwọ ọ̀ na-emegiderịrị iwere ịsụ ụzọ dị ka ihe mgbaru ọsọ? Kọwaa.
12 N’ebe ụfọdụ, ọ ka bụ ihe kwere omume ịdị na-arụ ọrụ ma na-anara ọzụzụ n’otu nkà ma ọ bụ ọrụ bara uru. E nwere ndị ntorobịa na-amụta aka ọrụ nke ezinụlọ ha ma ọ bụ na-anata ọzụzụ n’aka ndị enyi ha tọrọ ha bụ́ ndị nwere aka ọrụ. Ndị ọzọ na-amụ ihe ọmụmụ n’ụlọ akwụkwọ bụ́ ndị ga-abara ha uru n’inweta ihe e ji ebi ndụ mgbe e mesịrị. N’ebe a na-enweghị ohere ndị dị otú ahụ, mgbe ndị mụrụ ụmụ chebasịwooro ya echiche nke ọma, ha pụrụ ime ndokwa ka ụmụ ha gụtụkwuo akwụkwọ mgbe ha pụtara n’ụlọ akwụkwọ dị elu. Mmadụ ibu ụzọ mee atụmatụ n’ụzọ dị otú a iji nwee ike ilekọta ibu ọrụ ya mgbe ọ ga-eme okenye nakwa karịsịa iji nwee ike ikere òkè n’ozi ọsụ ụzọ ruo ogologo oge, abụghị ihe na-ekwekọghị n’ibute Alaeze Chineke ụzọ. (Matiu 6:33) Inwetakwu agụmakwụkwọ adịghịkwa akagbu ịsụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, otu Onyeàmà na-eto eto achọwo ịsụ ụzọ eri oge. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, ndị mụrụ ya—ndị bụkwa ndị ọsụ ụzọ—mere ndokwa ka ọ gụtụkwuo akwụkwọ. Ọ sụrụ ụzọ ka ọ na-aga akwụkwọ, ugbu a kwa, o nwere ọrụ aka nke o ji akwado onwe ya ka ọ nọgidere na-asụ ụzọ.
13. Olee otú ezinụlọ kwesịrị isi gụkọọ ihe ịgụtụkwu akwụkwọ ga-efu?
13 N’ihe banyere ịgụtụkwu akwụkwọ, ọ bụ ihe ruuru ezinụlọ nke ọ bụla nakwa ọrụ dịịrị ya ime mkpebi nke aka ya. Mgbe a họọrọ agụmakwụkwọ dị otú ahụ nke ọma, ọ pụrụ ịba uru. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ ọnyà. Ọ bụrụ na ị na-atụle inweta agụmakwụkwọ dị otú ahụ, gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ gị? Ọ̀ bụ iji kwadebe onwe gị ibu ibu dịịrị gị n’ụzọ dị nsọpụrụ mgbe ị ga-etoru ogo mmadụ? Ka ị̀ “na-achọrọ onwe gị ihe ukwu?” (Jeremaịa 45:5; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:10; 1 Timoti 5:8; 6:9) Gịnị banyere ịgụtụkwu akwụkwọ n’ebe dịpụrụ adịpụ site n’ebe obibi unu, ikekwe ibi n’ogige ụlọ akwụkwọ? Nke ahụ ọ̀ ga-abụ ihe amamihe n’ihi ịdọ aka ná ntị Pọl nke bụ́ na “mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma”? (1 Ndị Kọrint 15:33; 2 Timoti 2:22) Chetakwa na “e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ.” (1 Ndị Kọrint 7:29) Oge ha aṅaa ka ị ga-etinye n’agụmakwụkwọ dị otú ahụ? Ọ̀ ga-ewekọrọ oge ka ukwuu n’afọ ndụ ntorobịa gị? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú ị ga-esi etinye agbamume Bible bụ́ ‘icheta Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa’ n’ọrụ? (Eklisiastis 12:1) Ọzọkwa, ihe ndị ị na-agụ ọ̀ ga-enye gị ohere maka ihe omume ndị dị mkpa nke ndị Kraịst dị ka ịga nzukọ, ozi ubi, na ọmụmụ ihe onwe onye? (Matiu 24:14; Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ bụrụ na ike nghọta gị dị nkọ, ị gaghị echefu ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ma ọlị ka gị na ndị mụrụ gị na-eme atụmatụ maka ọdịnihu gị.
Ime Ka Mbedo Dị Nsọpụrụ
14. (a) Ụkpụrụ ndị dị aṅaa kwesịrị iduzi ndị na-eme mbedo ka ha na-egosirịta ibe ha mmetụta ịhụnanya? (b) Olee otú ụfọdụ ndị siworo gosipụta enweghị ezi uche na nke a?
14 Ebe ọzọ ike nghọta unu dị mkpa bụ ná mbedo. Ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị ịchọ igosi mmetụta ịhụnanya n’ebe onye masịrị gị nọ. Ihe àmà na-egosi na mmadụ abụọ ahụ na-emerụghị onwe ha bụ́ ndị e dekọrọ n’Abụ nke Abụ gosirịtara onwe ha ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mmetụta ịhụnanya tupu ha alụọ. (Abụ nke Abụ 1:2; 2:6; 8:5) Taa, ụfọdụ ndị na-eme mbedo pụkwara iche na ijide aka, isutụ ọnụ, na ibi ọma bụ ihe kwesịrị ekwesị, karịsịa mgbe alụmdi na nwunye yiri ka ọ̀ dịla nso. Ma cheta: “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu.” (Ilu 28:26) N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị na-eme mbedo egosiwo enweghị ezi uche site n’itinye onwe ha n’ọnọdụ ndị pụrụ imebi okwukwe ha. Ngosipụta nke mmetụta ịhụnanya aghọwo nke gabigara ókè na nke a na-achịkwaghị achịkwa; ọ kpatawo omume na-adịghị ọcha ọbụnakwa ruo ná mmekọahụ rụrụ arụ.
15, 16. Ihe ndị dị aṅaa ezi uche dị na ha ka ndị na-eme mbedo pụrụ ịkpachara anya na ha iji jide n’aka na mbedo ha ga-anọgide bụrụ nke dị nsọpụrụ?
15 Ọ bụrụ na ị na-eme mkpapụ, ị ga-abụ onye nwere amamihe izere ime ka nanị gị na onye ị na-achọ ịlụ nọrọ n’ọnọdụ ndị na-ekwesịghị ekwesị. Ya mere, mkpakọrịta unu abụọ pụrụ ịkasị mma n’ebe ìgwè mmadụ nọ ma ọ bụ n’ebe ndị na-ezoghị ezo. Ụfọdụ ndị na-eme ndokwa inwe onye nnọnyere. Ọzọkwa, tụlee okwu Hosea 4:11: “Mmanya vine na mmanya vine ọhụrụ na-ewepụ obi amamihe.” Mmanya na-aba n’anya pụrụ imebi ezi echiche ma mee ka nwoke na nwanyị mee ihe n’ụzọ ha ga-emesị kwaa ụta.
16 Ilu 13:10 na-ekwu, sị: “Nanị na nganga ka ịlụ ọgụ na-apụta: ma n’aka ndị [na-agbarịta izu, NW] ka amamihe dị.” Ee, ‘gbarịtanụ izu’ ma kwurịta otú unu ga-esi mee omume. Kpaaranụ ngosipụta nke mmetụta ịhụnanya ókè, onye nke ọ bụla ana-akwanyere mmetụta na akọ na uche nke onye nke ọzọ ùgwù. (1 Ndị Kọrint 13:5; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-7; 1 Pita 3:16) Ikwurịta okwu a chọrọ nlezianya pụrụ ịta akpụ ná mmalite, ma ọ pụrụ ime ka nsogbu ndị siri ike ghara ibilite mgbe e mesịrị.
Ịbụ Ndị E Ziri Ihe “Site na Nwata”
17. Olee otú Devid si mee ka Jehova bụrụ ‘ntụkwasị obi ya site na nwata,’ oleekwa ihe ndị ntorobịa ga-amụta na nke a taa?
17 Izere ọnyà Setan ga-achọ n’aka unu ịnọ na nche mgbe nile—mgbe ụfọdụkwa, obi ike dị ukwuu. Ọbụna mgbe ụfọdụ unu pụrụ ịhụta onwe unu dị ka ndị na-ekwekọghị, ọ bụghị nanị n’ebe ndị ọgbọ unu nọ, kamakwa n’ebe ụwa nile nọ. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kpere ekpere, sị: “Gị onwe gị bụ olileanya m, Onyenwe anyị Jehova: Gị bụ ntụkwasị obi m site na nwata. Chineke, I ziwo m ihe site na nwata; ọ bụkwa ruo ugbu a ka m na-egosi oké ọrụ Gị nile.” (Abụ Ọma 71:5, 17)c A maara Devid maka obi ike ya. Ma olee mgbe ọ zụlitere ya? Ọ bụ n’oge ọ bụ onye ntorobịa! Ọbụna tupu mburịta agha ahụ wuru ewu nke ya na Golaịat, Devid egosipụtawo obi ike dị ịrịba ama n’ichebe ìgwè atụrụ nna ya—na-egbu ma ọdụm ma anụ ọhịa bear. (1 Samuel 17:34-37) Otú ọ dị, Devid nyere Jehova otuto nile maka obi ike ọ bụla o gosipụtara, na-akpọ ya “ntụkwasị obi m site na nwata.” Ikike Devid nwere ịdabere n’ebe Jehova nọ mere ka ọnwụnwa ọ bụla o chere ihu ghara ịkarị ya. Unu onwe unu ga-achọpụtakwa na ọ bụrụ na unu adabere n’ebe Jehova nọ, ọ ga-enye unu obi ike na ume iji ‘merie ụwa.’—1 Jọn 5:4.
18. Olee agbamume e nyere ndị ntorobịa na-asọpụrụ Chineke taa?
18 Ọtụtụ puku ndị na-eto eto dị ka unu onwe unu ewerewo nguzo siri ike ma na-eje ozi ugbu a dị ka ndị nkwusa ozi ọma e mere baptism. Anyị na-ekele Chineke maka okwukwe na obi ike nke unu bụ́ ndị na-eto eto! Nọgidenụ ná mkpebisi ike unu izere mmetọ nke ụwa. (2 Pita 1:4) Nọgidenụ na-eji ike nghọta unu e ji Bible zụọ na-eme ihe. Ime otú ahụ ga-echebe unu ugbu a pụọ n’ọdachi, ọ ga-emekwa ka nzọpụta unu bụrụ ihe e ji n’aka n’ikpeazụ. N’ezie, dị ka isiokwu ikpeazụ anyị ga-egosi, unu ga-eme ka ndụ unu gaa nke ọma.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Eziokwu ahụ nke M?” ná mbipụta Teta! nke November 8, 1998.
b Isiokwu bụ́ “Nnọkọ Ntụrụndụ—Rie Uru Ndị Dị na Ya, Zere Ọnyà Ndị Dị na Ya” nke pụtara ná mbipụta Ụlọ Nche nke August 15, 1992, nwere ụba ihe ọmụma n’isiokwu a.
c Abụ Ọma nke 71 yiri ka ọ malitere n’Abụ Ọma nke 70, bụ́ nke a kọwara n’ihe e dekwasịrị n’elu ya dị ka abụ ọma Devid.
Ajụjụ Maka Ntụleghachi
◻ Olee otú onye ntorobịa si azụ ike nghọta ya?
◻ Olee otú onye ntorobịa pụrụ isi jiri ike nghọta ya mee ihe n’ihe banyere ịga nnọkọ oriri ndị Kraịst?
◻ Isi ihe ndị dị aṅaa ka mmadụ pụrụ ịtụle mgbe ọ na-eme atụmatụ agụmakwụkwọ ya?
◻ Olee otú ndị na-eme mbedo pụrụ isi zere ọnyà nke mmekọahụ rụrụ arụ?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ịmụta ime nnyocha ga-enyere gị aka ịzụ ike nghọta gị
[Foto dị na peeji nke 16]
Nnọkọ oriri ndị katụ nta na-adị mfe nchịkwa karị, o yikarịghịkwa ka ọ̀ ga-aghọ oriri oké mkpọtụ ndị a na-achịkwaghị achịkwa
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị inyere ụmụ ha aka n’ime atụmatụ maka agụmakwụkwọ ha
[Foto dị na peeji nke 17]
Ime mkpapụ n’ìgwè bụ ihe nchebe