Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 9/1 p. 30-31
  • Meri Ahọrọ “Ezi Òkè Ahụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Meri Ahọrọ “Ezi Òkè Ahụ”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmụta Ihe n’Ụkwụ Jisọs
  • Ihe Mmụta Dịịrị Anyị
  • “Ekwerewo M”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • “Ekwerewo M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ndụmọdụ E Nyere Mata, na Ntụziaka Banyere Ekpere
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Akụzie Gbasara Ile Ọbịa na Ikpe Ekpere
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 9/1 p. 30-31

Ha Mere Uche Jehova

Meri Ahọrọ “Ezi Òkè Ahụ”

N’OGE Jisọs, e ji ọdịnala ndị rabaị kee ndị inyom Juu agbụ. N’ihi ya, a kụdara ha aka ịmụ Iwu ahụ. N’ezie, otu echiche e hotara n’ime Mishnah kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nwoke ọ bụla akụziere nwa ya nwanyị Iwu ahụ, ọ na-adị nnọọ ka a ga-asị na ọ na-akụziri ya inwebiga mmekọahụ ókè.”—Sotah 3:4.

N’ihi ya, ọtụtụ ndị inyom nọ na Judia nke narị afọ mbụ agụghị akwụkwọ nke ọma. “E nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na tupu ozi Jisọs na a hapụtụrụ ndị inyom Juu ịbụ ndị na-eso ụzọ nke onye ozizi ukwu, ma ya fọdụzie iso onye ozizi dị otú ahụ mee njem, ma ọ bụ izi onye ọ bụla ihe ma e wezụga ụmụaka,” ka The Anchor Bible Dictionary na-ekwu. N’iwedakwu ndị inyom ala, ọbụna ụfọdụ ndị ndú okpukpe tiri iwu na-ekwu na nwoke ekwesịghị ịgwa nwanyị okwu n’ihu ọha!

Jisọs leghaara omume asọpụrụghị Chineke dị otú ahụ anya. O ziri ma ndị inyom ma ndị ikom ihe, a pụkwara ịhụ ndị ikom na ndị inyom n’etiti ụmụazụ ya. (Luk 8:1-3) N’otu oge, Mata na Meri kpọrọ Jisọs òkù ịbụ ọbịa ha. (Luk 10:38) Ndị inyom abụọ a bụ ụmụnne Lazarọs, ha atọ bụkwa ndị na-eso ụzọ na ezi ndị enyi Jisọs. (Jọn 11:5) Ezinụlọ a pụrụ ịbụwo nke a ma ama, n’ịtụle ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmadụ bịara ịkasi Mata na Meri obi mgbe Lazarọs nwụrụ. Otú o sina dị, ihe mere n’ebe obibi ha mgbe Jisọs bụ ọbịa n’ebe ahụ nyere ihe mmụta bara uru, ọ bụghị nanị nye ha kamakwa nye anyị.

Ịmụta Ihe n’Ụkwụ Jisọs

Obi abụọ adịghị ya na Mata na Meri chọrọ nnọọ inye Jisọs ezigbo nri, ma eleghịkwa anya, aka ha ruru ya nnọọ. (Tụlee Jọn 12:1-3.) Otú ọ dị, mgbe ọbịa ha bịarutere, Meri ‘nọdụrụ ala n’ụkwụ Onyenwe anyị, wee nụ okwu Ya.’ (Luk 10:39) Ọ dịghị ọdịnala ụmụ mmadụ nke ga-egbochi Jisọs izi nwanyị nwere ezi obi nke nwere ọchịchọ siri ike ịmụta ihe, ihe! Anyị pụrụ iji uche hụ ebe Meri nọ n’ihu Jisọs, were onwe ya dị ka nwa akwụkwọ nke tinyere uche ya nile n’ige ntị n’ihe Onye Nkụzi ya na-akụzi.—Tụlee Deuterọnọmi 33:3; Ọrụ 22:3.

N’adịghị ka Meri, “uche Mata na-agbasasị n’ije ozi nke ukwuu.” N’ịkwadebe oké nri, o ji nnọọ ọrụ n’aka n’ọrụ ya na-agwụ ike. N’oge na-adịghị anya, iwe were Mata na a hapụrụ ya ka ọ na-arụ ọrụ ahụ nile ebe nwanne ya nwanyị na-anọdụ ala n’ụkwụ Jisọs! Ya mere Mata kwụsịtụrụ okwu Jisọs na-agwa Meri, ikekwe n’ike, na-asị: “Onyenwe anyị, ó metụghị Gị n’obi na nwanne m nwanyị na-ahapụ m ka nanị mụ na-eje ozi? ya mere, gwa ya ka o nyere m aka.”—Luk 10:40.

Ọ dịghị ihe ọ bụla dị njọ n’onwe ya n’arịrịọ Mata. E kwuwerị, ịkwadebere ìgwè mmadụ nri bụ ọrụ siri ike, otu onye ekwesịghịkwa iburu ibu ahụ. Otú ọ dị, Jisọs hụrụ ohere ọ ga-eji kụzie ihe mmụta bara uru site n’okwu Mata. “Mata, Mata,” ka ọ sịrị, “ị na-echegbu onwe gị na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe: ma otu ihe bụ ihe dị mkpa: n’ihi na Meri họpụtara ezi òkè ahụ, nke a na-agaghị anapụ ya.”—Luk 10:41, 42.

Jisọs adịghị ekwu na Mata enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ. N’ụzọ dị iche, ọ maara ya dị ka nwanyị nwere nsọpụrụ Chineke n’ụzọ miri emi.a Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ nke ahụ medịrị o ji kpọọ Jisọs òkù ịbịa n’ebe obibi ya. Otú ọ dị, n’ịdọ aka ná ntị o nyere n’ụzọ dị nro, Jisọs na-ekwu na ohere a na-adịghị enwekebe bụ́ ịnara ntụziaka onwe onye site n’aka Ọkpara Chineke, na-efunahụ Mata, n’ihi nchegbu ọ na-echegbu onwe ya banyere nri ahụ.

N’eziokwu, ọdịbendị nke oge ahụ nwere ike ịkwadowo echiche bụ́ na a na-eji ikike nwanyị nwere ịrụ ọrụ ụlọ anwapụta iru eru ya. Ma okwu Jisọs gosiri na ndị inyom, dịkwa ka ndị ikom, pụrụ ịnọdụ n’ụkwụ Ọkpara Chineke ma nụrụ okwu nke ndụ! (Jọn 4:7-15; Ọrụ 5:14) N’ihi nke a, ọ gaara akara nnọọ Mata mma isi nanị nri ole na ole—ma ọ bụ ọbụna nanị otu—ma ọ bụrụ na ọ gaara enyewo ya ohere ịnọdụ n’ụkwụ Onyenwe anyị ma mụta ihe n’ọnụ ya.—Tụlee Matiu 6:25.

Ihe Mmụta Dịịrị Anyị

Taa, a na-achọta ma ndị ikom ma ndị inyom n’etiti ndị na-anabata òkù Jisọs na-akpọ ‘ịnara mmiri nke ndụ n’efu.’ (Mkpughe 22:17) N’ịbụ ndị ịhụnanya kwaliri, ụfọdụ—dị nnọọ ka Mata—na-anwa ike ha ilekọta mkpa nke ndị kwere ekwe ibe ha. Ha nwere echiche nke ihe ndị bara uru ma na-adị ngwa ime ihe, Jehova na-ekwekwa nkwa ịkwụghachi ọrụ ịhụnanya ha ụgwọ ọrụ. (Ndị Hibru 6:10; 13:16) Ikekwe ndị ọzọ ka yie Meri. Ha na-anọ jụụ ma na-atụgharị uche. Ịnụ ọkụ n’obi ha nwere ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na-enyere ha aka ịkwụrụ chịm n’okwukwe.—Ndị Efesọs 3:17-19.

Ụzọ ndị mmadụ abụọ ahụ na-egbo mkpa dị ukwuu n’ọgbakọ ndị Kraịst. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, mmadụ nile kwesịrị ‘ịhọrọ ezi òkè ahụ’ site n’ibute ihe ime mmụọ ụzọ. Site n’ịmara ihe ndị ka mkpa, anyị ga-enwe ihu ọma na ngọzi Jehova.—Ndị Filipaị 1:9-11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Na Mata bụ nwanyị nwere okwukwe dị ukwuu pụtara ìhè site ná nkwurịta okwu ya na Jisọs nwere mgbe nwanne ya nwoke, bụ́ Lazarọs, nwụsịrị. N’oge a, ọ bụ Mata gosipụtara ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu ijekwuru Onyenwe ya.—Jọn 11:19-29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya