Olee Otú Ọchịchọ A Na-achọ Ndụ Ka Ogologo Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma?
ỤFỌDỤ na-enwe olileanya na n’ime narị afọ iri ọhụrụ, a ga-enwe ọganihu ná mgbalị mmadụ na-eme iji gbatịkwuo ndụ. Dr. Ronald Klatz bụ otu n’ime ha. Ọ bụ president nke Òtù Maka Ọganihu na Nkà Ọgwụ E Ji Alụso Ịka Nká Ọgụ nke America, bụ́ òtù ndị dibịa Bekee na ndị ọkà mmụta sayensị bụ́ ndị tinyere onwe ha n’ọrụ ịgbatị afọ ndụ mmadụ. Ya na ndị òtù ya na-eme atụmatụ ịdị ndụ dị nnọọ ogologo. “Ana m atụ anya ịdịru afọ 130, ma ọ dịkarịa ala,” ka Dr. Klatz na-ekwu. “Anyị kwere na ịka nká abụghị ihe a na-apụghị izere ezere. E nweela nkà na ụzụ ndị pụrụ ibelata, ịkwụsị na ikekwe ọbụna ịgbanwe n’ụzọ dị ịrịba ama, ndakpọ anụ ahụ na ọrịa bụ́ ndị a na-akpọ ịka nká ebumpụta ụwa ugbu a.” Dr. Klatz n’onwe ya na-aṅụ ihe dị ka mkpụrụ ọgwụ 60 kwa ụbọchị n’ọchịchọ ọ na-achọ ime ka ndụ ya dị ogologo.
Usoro Ọgwụgwọ E Ji Mmiri Ọgwụ Ahụ Eme na Usoro Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa—À Ga-eji Ha Enwe Olileanya?
Usoro ọgwụgwọ e ji mmiri ọgwụ ahụ eme bụ otu ihe na-akpali olileanya. Nnwale ndị e ji mmiri ọgwụ ahụ a maara dị ka DHEA mee yiri ka ọ na-ebelata usoro ịka nká n’ahụ anụmanụ ndị e ji mee nnyocha.
Banyere mmiri ọgwụ ihe ọkụkụ bụ́ kinetin, akwụkwọ akụkọ Sweden bụ́ Aftonbladet hotara Dr. Suresh Rattan, bụ́ prọfesọ na Mahadum Aarhus, Denmark, dị ka onye na-ekwu, sị: “Nnyocha ndị e mere n’ụlọ ime nnyocha anyị na-egosi na mkpụrụ ndụ akpụkpọ ahụ mmadụ ndị a zụlitere na kinetin adịghị agbanwe otú ha kwesịrị isi agbanwe ka oge na-aga. Ha na-adị ka nke nwata ná ndụ ha nile.” A sịrị na ụmụ ahụhụ a gbanyere mmiri ọgwụ a na-eji pasent 30 ruo 45 adịfe ndụ otú ha kwesịrị ịdịru.
A sịrị na mgbanye a gbanyere mmiri ọgwụ melatonin n’ahụ òké, gbatịkwuru afọ ha ga-adịru ndụ ruo nnọọ pasent 25. Ọzọkwa, òké ndị ahụ yiri ka hà nwere ahụ dị ka nke nwa òké, nwekwuo ahụ ike, ma dịkwuo ike.
Ndị na-akwalite mmiri ọgwụ uto mmadụ (hGH) na-azọrọ na ọ na-atụnye ụtụ n’inwe akpụkpọ ahụ na-egbuke egbuke, n’ịmụba uru ahụ, n’inwekwu mkpali mmekọahụ, n’inwe obi ụtọ karị, n’inwe ụbụrụ na-aghọ nkọ karị, nakwa n’inwe ahụ na-arụ ọrụ dị ka nke onye nọ n’afọ iri na ụma.
Ọtụtụ ndị na-elegakwara usoro mkpụrụ ndụ ihe nketa anya. Ndị ọkà mmụta sayensị ekwubiwo na site n’ịchịkwa mkpụrụ ndụ ihe nketa, ha pụrụ ịchịkwa oge ndụ mkpụrụmkpụ. N’ezie, ha enweela ihe ịga nke ọma n’idebe ụfọdụ n’ime ha ndụ ruo ihe ji okpukpu isii karịa oge ha kwesịrị ịdịru ndụ. Nke a emeela ka a na-enwe olileanya nke ịchọta na ịchịkwa mkpụrụ ndụ ihe nketa dị otú ahụ n’ahụ mmadụ. Magazin bụ́ Time hotara Dr. Siegfried Hekimi nke Mahadum McGill, Montreal, dị ka onye na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na anyị achọpụtachaa mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị na-ekpebi oge ndụ mmadụ, ikekwe anyị pụrụ ibelatatụ ike ịrụ ọrụ ha, ka anyị wee nwee ike ịgbatị ndụ.”
Ndị ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ amarawo eri oge na a na-egbubilata isi isi nke chromosome, nke a na-akpọ telomere, mgbe ọ bụla mkpụrụ ndụ mụbara. Mgbe e gbubilatara ihe dị ka pasent 20 nke ogologo telomere, ikike mkpụrụ ndụ ahụ nwere ịmụba na-agwụsị, o wee nwụọ. Otu mmiri ọgwụ mkpụrụ ndụ na-emepụta nke a na-akpọ telomerase pụrụ ime ka telomere ahụ dịghachi ogologo otú ọ dịbu, si otú a na-eme ka mkpụrụ ndụ ahụ nọgide na-amụba. N’ihe ka ọtụtụ ná mkpụrụ ndụ, a na-egbochi ma na-eme ka mmiri ọgwụ a mkpụrụ ndụ na-emepụta ghara ịrụ ọrụ, ma e nweela ihe ịga nke ọma n’itinye telomerase na-arụ ọrụ n’ime mkpụrụ ndụ ụfọdụ, na-eme ka ha na-eto ma na-amụba gabiga nnọọ otú ha kwesịrị.
Dị ka ndị nchọpụta si kwuo, nke a na-eme ka e nwee ohere ndị na-akpali akpali n’ịlụso ọrịa ndị ịka nká na-akpata ọgụ. Gịnị banyere iji mkpụrụ ndụ ndị e jiworo telomerase na-arụ ọrụ mee ka ha “ghara ịnwụ anwụ” dochie mkpụrụ ndụ ndị na-eme ka anụ ahụ na-adịghachi ọhụrụ? Dr. William A. Haseltine na-ekwu, sị: “Nke a bụ echiche a kọwara nke ọma banyere anwụghị anwụ nke mmadụ bụ́ nke a ga-eji nwayọọ nwayọọ webata n’ime afọ 50 na-abịanụ.”—The New York Times.
Nanotechnology na Cryonics Hà Na-enye Ihe Ngwọta Ya?
Nanotechnology, bụ́ nkà mmụta nke ịrụpụta ihe ndị pere mpe nke ukwuu n’ụzọ nkà na ụzụ, na-akpalikwa olileanya. Ndị maara nke a na-akọ n’akụkụ ahụ na-azọrọ na n’ọdịnihu, e nwere ike imepụta ígwè ọrụ ndị kọmputa ga na-eduzi, bụ́ ndị ga-adị nnọọ nta karịa mkpụrụ ndụ, iji jiri ihe ndị dị nnọọ nta dozie ma nyeghachi mkpụrụ ndụ, anụ ahụ, na akụkụ ahụ ndị na-aka nká, ume. N’otu nnọkọ nkwurịta okwu maka ịlụso ịka nká ọgụ, otu onye na-eme nchọpụta tụrụ aro na ndị dibịa Bekee nke narị afọ nke 21 nwere ike iji nanotechnology mee ihe iji mee ka mmadụ nwee ike ịghọ onye na-apụghị ịnwụ anwụ n’ụzọ anụ ahụ.
Cryonics bụ iji oyi agbasi ahụ mmadụ n’olileanya na sayensị ga-enwe ike ịtụteghachi mkpụrụ ndụ nwụrụ anwụ, si otú a na-eme ka ha dịghachi ndụ ọzọ. A pụrụ ịgbasi ahụ nile, ma ọ bụ nanị ụbụrụ. Otu nwoke gbasiri ọbụna ákwà ihe ndina. N’ihi gịnị ka o ji gbasie ákwà ihe ndina? Ọ bụ otu enyi ya furu efu nwe ya, ụfọdụ mkpụrụ ndụ akpụkpọ ahụ na ajị ole na ole dịkwa na ya. Ọ chọrọ ka a gbasie ha iji mee ka enyi ya nwee ohere nke ịdịghachi ndụ ma ọ bụrụ na sayensị eruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke iji nanị ole na ole ma ọ bụkwanụ otu n’ime mkpụrụ ndụ ndị mmadụ, kpụghachi ha.
Olee Ebe Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Obi Anyị?
Mmadụ nwere ọchịchọ ebumpụta ụwa nke ịdị ndụ, ọ bụghị ịnwụ anwụ. Ya mere, a na-anakwere ọganihu sayensị na-enwe n’akụkụ a ngwa ngwa, ọ na-akpalikwa nnukwu olileanya. Ma ka ọ dị ugbu a, e nwebeghị ihe àmà siri ike na DHEA, kinetin, melatonin, hGH, ma ọ bụ mmiri ọgwụ ọzọ pụrụ n’ezie ime ka mmadụ ghara ịka nká ngwa ngwa. Ndị na-enwe obi abụọ na-atụ ụjọ na ọ dịghị ihe ọzọ ịchịkwa telomerase ná mkpụrụ ndụ gaje ime karịa imepụta mkpụrụ ndụ ndị pụrụ ịkpata ọrịa cancer. Iji nanotechnology na cryonics eme ihe ka bụkwa nchepụta efu nke sayensị kama ịbụ ihe e ji n’aka.
Sayensị atụnyela ụtụ, ọ ka pụkwara ịtụnye ụtụ, n’ime ka ụfọdụ dị ndụ ka ogologo ma nwee ahụ ike ka mma, ma ọ gaghị enye mmadụ ọ bụla ndụ ebighị ebi ma ọlị. N’ihi gịnị? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ n’ihi na isi ihe na-akpata ịka nká na ọnwụ dị n’ebe aka sayensị nke mmadụ na-apụghị iru.
Isi Ihe Na-akpata Ịka Nká na Ọnwụ
Ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta sayensị na-ekweta na o yiri ka ọ dị ụzọ e si tibanye ịka nká na ọnwụ n’ime mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị. Ajụjụ bụ: Ole mgbe, n’ụzọ dị aṅaa, ọ bụkwa n’ihi gịnị ka ha ji banye ná mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya?
Bible na-enye anyị azịza ya dị mfe—ọ bụ ezie na o kwughị ya n’ụdị usoro mkpụrụ ndụ ihe nketa ma ọ bụ DNA. Ndị Rom 5:12 na-agụ, sị: “N’ihi nke a, dị ka mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”
Mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam, nwere atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi. E mere ahụ ya inwe ikike ndị dị mkpa iji dịrị ma nụ ụtọ ndụ ebighị ebi. Otú ọ dị, ndụ ebighị ebi dabeere n’imezu ihe ụfọdụ. Adam aghaghị ịkwado na irubere Isi Iyi nke ndụ, bụ́ Onye Okike ya isi, iji nọgide na-elekọta ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.—Jenesis 1:31; 2:15-17.
Adam họọrọ inupụrụ Onye Okike isi. N’ụzọ dị otú a, Adam zọọrọ na ọ kaara mmadụ mma ịchị onwe ya n’adabereghị n’ebe Chineke nọ. N’ụzọ dị otú a, o mehiere. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, ọ dị nnọọ ka a ga-asị na a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ya. Kama ibufere ụmụ ya ndụ ebighị ebi dị ka ihe nketa, Adam bufeere ha mmehie na ọnwụ.—Jenesis 3:6, 19; Ndị Rom 6:23.
Ezi Olileanya Ahụ
Otú ọ dị, ọnọdụ ahụ agaghị adịgide. Ndị Rom 8:20 na-ekwu, sị: “E doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu, ọ bụghị na ọ chọrọ ya, kama n’ihi Onye ahụ Nke doro ya n’okpuru ya n’olileanya.” Onye Okike mmadụ, bụ́ Jehova Chineke, doro ụmụ mmadụ n’okpuru ọnwụ n’ihi na ha mehiere megide ya, ma ka ọ na-eme nke a, o guzobekwara ihe ndabere maka olileanya.
A matara ihe ndabere a nke ọma mgbe Jisọs Kraịst bịara n’ụwa. Jọn 3:16 na-ekwu, sị: “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Otú ọ dị, olee otú igosipụta okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ pụrụ isi zọpụta anyị pụọ n’ọnwụ?
Ọ bụrụ na ọ bụ mmehie na-akpata ọnwụ, a ghaghị iwepụ mmehie tupu e nwee ike ikpochapụ ọnwụ. Ná mmalite nke ozi Jisọs dị ka Kraịst, Jọn Onye Na-eme Baptism kwuru, sị: “Lee, Nwa atụrụ Chineke, Nke na-ebupụ mmehie nke ụwa!” (Jọn 1:29) Jisọs Kraịst enweghị mmehie ma ọlị. N’ihi ya, ọ nọghị n’okpuru ọnwụ, nke bụ́ ntaramahụhụ maka mmehie. Otú o sina dị, o kwere ka ndị ọzọ gbuo ya. N’ihi gịnị? N’ihi na site n’ime otú ahụ, ọ kwụrụ ụgwọ maka mmehie anyị.—Matiu 20:28; 1 Pita 3:18.
Ebe a kwụrụla ụgwọ ahụ, e meghere ohere nke ịdị ndụ anwụghị anwụ ma ọlị nye ndị nile na-egosipụta okwukwe n’ebe Jisọs nọ. Sayensị pụrụ ịtụnye ụtụ n’ime ka ndụ anyị dị ogologo ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a kpaara nnọọ ókè, ma igosipụta okwukwe n’ebe Jisọs nọ bụ n’ezie ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Jisọs nwetara ndụ dị otú ahụ n’eluigwe, ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi na ndị ọzọ ga-enwetakwa ya. Ma, nye ọtụtụ n’ime anyị bụ́ ndị na-egosipụta okwukwe n’ebe Jisọs nọ, ndụ ebighị ebi ga-abụ n’ụwa, mgbe Jehova Chineke weghachiri ụwa Paradaịs.—Aịsaịa 25:8; 1 Ndị Kọrint 15:48, 49; 2 Ndị Kọrint 5:1.
Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa Paradaịs
Otu nwoke jụrụ, sị: “Mmadụ ole ga-ahụta ya dị ka ihe bara uru ịdị ndụ ozugbo ha na-agaghị anwụ anwụ?” Ndụ anwụghị anwụ ọ̀ ga-agbụ agbụ? Bible na-emesi anyị obi ike na ọ gaghị. “Ihe nile ọ bụla ka O meworo ka ọ maa mma na mgbe ya: ọzọ, mgbe ebighị ebi ka O tinyeworo n’obi ha, ma ka O si tinye ya mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke rụworo site ná mmalite wee ruo na nsọtụ.” (Eklisiastis 3:11) Ihe okike nke Jehova Chineke bara nnọọ ụba ma dị mgbagwoju anya nke na ọ ga-anọgide na-akpali mmasị anyị, na-akwali anyị, na-emekwa ka anyị nwee obi ụtọ ruo ogologo oge anyị na-adị ndụ—ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.
Otu nwoke nke mụrụ banyere nnụnụ a maara dị ka Ekwulò Siberia kpọrọ ya “enyi pụrụ iche, na-enye obi ụtọ” ma na-azọrọ na ikiri nnụnụ ahụ bụ otu n’ime ahụmahụ ndị kasị enye ọṅụ o nweworo ná ndụ. Ka ọ na-amụkwu banyere nnụnụ ahụ, otú ahụ ka ọ na-ahụta ya dị ka ihe na-akpali mmasị karị. O kwuru na ọbụna mgbe afọ 18 gasịrị, ihe ọmụmụ ya agwụwabeghị. Ọ bụrụ na otu ụdị nnụnụ pụrụ ịkpali mmasị, ịkwali, na ime ka onye nwere ọgụgụ isi nwee obi ụtọ n’ime afọ 18 nke ịmụsi ihe ike, cheedị banyere ohere maka ọṅụ na afọ ojuju a na-aghaghị inwe n’ịmụ banyere ihe nile e kere eke dị n’ụwa.
See onyinyo akụkụ nile na-akpali akpali nke nkà mmụta bụ́ ndị ga-emeghere onye oge na-egbochighị ime ihe. Cheedị banyere ebe nile na-adọrọ mmasị a ga-aga na ndị nile a ga-enwe mmasị izute. Gbalịa ịghọta ohere na-enweghị ọgwụgwụ a ga-enwe iji chepụta, mepụta, ma wuo ihe. A gaghị akpara ohere ndị anyị nwere iji zụlite ma jiri nkà mmepụta ihe anyị mee ihe, ókè. Mgbe anyị na-atụgharị uche n’ịba ụba nke okike, o doro anya na ọ bụ mgbe ebighị ebi bụ nanị oge ga-ezu iji rụzuo ihe ndị a pụrụ ịrụ ná ndụ.
Bible na-egosi na site ná mbilite n’ọnwụ, a ga-eme ka ịdị ndụ ebighị ebi ruokwa ndị nwụrụ anwụ aka. (Jọn 5:28, 29) Ọtụtụ n’ime ihe ndị na-edochaghị anya n’akụkọ ihe mere eme pụrụ ido anyị anya mgbe ndị hụrụ ha pụrụ ịkọ ha n’ụzọ zuru ezu ma zaa ajụjụ anyị. Chee echiche banyere ihe ọmụma ndị ahụ e si n’ọnwụ kpọlite ga-enye banyere oge dịgasị iche n’akụkọ ihe mere eme.—Ọrụ 24:15.
Mgbe ị na-atụgharị uche banyere oge ahụ, ị pụrụ ịghọta na Job ahụ e si n’ọnwụ kpọlite pụrụ ịchọ ikwugharị okwu ahụ a na-achọta na Job 14:1. Ikekwe, ihe ọ ga-ekwuzi bụ: ‘Mmadụ nke nwanyị mụrụ, na-adịzi ndụ ebighị ebi, afọ ejuwokwa ya.’
Nye ndị na-atụkwasị Jehova obi ma na-egosipụta okwukwe n’ebe Jisọs nọ, ịgbatị ndụ gafee oge a kpaara ókè abụghị nnọọ nrọ efu. Ọ ga-aghọ ihe e ji n’aka n’oge na-adịghị anya. Ịka nká na ọnwụ ga-akwụsị. Nke a kwekọrọ n’Abụ Ọma 68:20, bụ́ nke na-asị: “Ọ bụkwa Jehova, bụ́ Onyenwe anyị, nwe ụzọ nile isi n’ọnwụ pụọ.”—Mkpughe 21:3, 4.
[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
Ọganihu nke sayensị emeela ka e nwee olileanya na ịdị ndụ ka ogologo pụrụ ikwe omume
[Foto dị na peeji nke 7]
Mgbe ebighị ebi bụ nanị oge ga-ezu iji rụzuo ihe ndị a pụrụ ịrụ ná ndụ